Ọchịchọ A Na-achọwanye Ịgwọ Ọrịa na Ịwa Ahụ n’Ejighị Ọbara
Ọchịchọ A Na-achọwanye Ịgwọ Ọrịa na Ịwa Ahụ n’Ejighị Ọbara
“Ndị nile na-eji ọbara arụ ọrụ ma na-elekọta ndị a wara ahụ aghaghị ịtụle ịwa ahụ n’ejighị ọbara.”—Dr. Joachim Boldt, bụ́ prọfesọ nkà mmụta ọgwụ na-akụnwụ ahụ, Ludwigshafen, Germany.
ỌDACHI nke ọrịa AIDS akpaliwo ndị ọkà mmụta sayensị na ndị dibịa imekwu ihe iji mee ka ịwa ahụ ghara ịbụ ihe na-akpata ọdachi. N’ụzọ doro anya, nke a apụtawo inyochasi ọbara ike karị. Ma ndị ọkachamara na-ekwu na ọbụna ihe ndị a adịghị eme ka e nwee mmịnye ọbara na-adịghị ize ndụ. “Ọbụna ka ndị mmadụ na-etinye nnukwu ego n’ime ka ọbara ghara ịdị ize ndụ karịa ka ọ dịbu,” ka magazin bụ́ Transfusion na-ekwu, “anyị maara na ndị ọrịa ka ga-agbalị izere mmịnye ọbara nke onye ọbara ha na ha dabara, nanị n’ihi na ọ dịghị mgbe ọ bụla ọbara ahụ na-agaghị ebutụ nje.”
Ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ ndị dọkịta na-akpacharakwu anya n’ịmịnye ọbara. “N’ụzọ bụ́ isi, mmịnye ọbara adịghị mma, anyị kpebisiri ike izere inye ya onye ọ bụla,” ka Dr. Alex Zapolanski, nke San Francisco, California, na-ekwu.
Ọha na eze kwa amatawala ihe ize ndụ dị ná mmịnye ọbara. N’ezie, njụta echiche e mere na 1996 na-ekpughe na pasent 89 nke ndị Canada ga-ahọrọ ihe e ji edochi anya ọbara e nyere enye. “Ọ bụghị mmadụ nile ga-ekwu ka a ghara ịmịnye ha ọbara onye ọzọ dị ka Ndịàmà Jehova,” ka Journal of Vascular Surgery na-ekwu. “Ka o sina dị, ihe ize ndụ nke ibufe ọrịa na ịkpaghasị usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ na-enye ihe àmà doro anya na anyị aghaghị ịchọta ihe ọzọ a ga-eji edochi anya ọbara maka ndị nile anyị na-agwọ.”
Usoro A Họọrọ
Ọ bụ ihe obi ụtọ na e nwere usoro ọzọ a pụrụ iji dochie anya ya—ịgwọ ọrịa na ịwa ahụ n’ejighị ọbara. Ọtụtụ ndị ọrịa adịghị ele ya anya dị ka ihe ikpeazụ a ga-eme kama dị ka ọgwụgwọ ha họọrọ, e nwekwara ezi ihe kpatara ya. Stephen Geoffrey Pollard, onye Britain bụ́ ọkachamara n’ịwa ahụ, na-ekwu na ọnụ ọgụgụ ndị rịara ọrịa na ndị nwụrụnụ n’etiti ndị a wara ahụ n’ejighị ọbara “ma ọ dịghị ihe ọzọ na nke ndị naara ọbara ha nhata, n’ọtụtụ ọnọdụ ha adịghị ebute ọrịa ndị na-esochi ịwa ahụ na nsogbu ndị ọbara na-akpatakarị.”
Olee otú ịgwọ ọrịa n’ejighị ọbara si malite? N’otu echiche, ajụjụ ahụ enweghị isi, ebe ọ bụ na ịgwọ ọrịa n’ejighị ọbara adịworị tupu a malite iji ọbara eme ihe. N’ezie, ọ bụ na narị afọ nke 20 ka nkà ịmịnye ọbara ruru n’ókè nke na a na-eji ya eme ihe mgbe nile. Ka o sina dị, n’ime iri afọ ndị na-adịbeghị anya, ụfọdụ emewo ka ọtụtụ ndị mmadụ mara banyere ịwa ahụ n’ejighị ọbara. Dị ka ihe atụ, n’afọ ndị 1960, dọkịta a ma ama na-awa ahụ bụ́ Denton Cooley wara ahụ ụfọdụ ndị mbụ o mere n’obi n’ejighị ọbara.
N’ihi mmụba nke ịba ọcha n’anya n’etiti ndị naara mmịnye ọbara n’afọ ndị 1970, ọtụtụ ndị dọkịta malitere ịchọ ihe ndị ọzọ a pụrụ iji dochie anya ọbara. Ka ọ na-erule afọ ndị 1980, ọtụtụ ìgwè nke ndị dọkịta awawala ahụ n’ejighị ọbara. Mgbe ọrịa AIDS tiwapụziri, ndị ọzọ bụ́ ndị chọrọ nnọọ ịgbaso otu usoro ahụ kpọtụụrụ ìgwè ndị a ugboro ugboro. N’afọ ndị 1990, ọtụtụ ụlọ ọgwụ malitere ihe omume ndị na-enye ndị ha na-agwọ ohere ịhọrọ ka a ghara iji ọbara gwọọ ha.
Ugbu a ndị dọkịta ejiwo usoro na-achọghị ọbara mee ihe n’ụzọ gara nke ọma mgbe ha na-awa ahụ na mgbe ha na-ahụ maka ọnọdụ mberede bụ́ nke gaara achọ mmịnye ọbara. “A pụrụ ịwa ahụ dị ize ndụ n’obi, n’akwara, n’ahụ nwanyị, n’afọ nwanyị dị ime, n’ọkpụkpụ, na n’ọwara mamịrị n’ụzọ gara nke ọma n’ejighị ọbara ma ọ bụ ihe ndị si n’ọbara,” ka D.H.W. Wong na-ekwu, na Canadian Journal of Anaesthesia.
Otu uru dị n’ịwa ahụ n’ejighị ọbara bụ na ọ na-akwalite nlekọta ahụ ike ka mma. “Nkà nke dọkịta na-awa ahụ kasị mkpa n’igbochi ọbara ọgbụgba,” ka Dr. Benjamin J. Reichstein, bụ́ onye nduzi nke ịwa ahụ na Cleveland, Ohio, na-ekwu. Otu akwụkwọ iwu nke South Africa na-ekwu na n’ọnọdụ ụfọdụ, ịwa ahụ n’ejighị ọbara pụrụ “ịga ọsọ ọsọ karị, ịdị ọcha karị ma na-eri ego dị ala karị.” Ọ na-ekwukwasị: “N’ezie ọgwụgwọ e nyere ọtụtụ ndị mgbe ha hapụsịrị ụlọ ọgwụ riri ego dị ala karị, weekwa oge dị ala.” Ndị a bụ nanị ole na ole n’ime ihe ndị mere ihe dị ka ụlọ ọgwụ 180 n’ụwa nile ji nwee ugbu a ihe omume lekwasịrị anya n’ịgwọ ọrịa na ịwa ahụ n’ejighị ọbara.
Ọbara na Ndịàmà Jehova
N’ihi ihe ndị dabeere na Bible, Ndịàmà Jehova na-ajụ mmịnye ọbara. * Ma ha na-anara —ma na-achụsosi ike—nlekọta ahụ ike ndị ọzọ a pụrụ iji dochie anya ọbara. “Ndịàmà Jehova na-achọsi ihe ndị kasị mma ike ná nlekọta ahụ ike,” ka Dr. Richard K. Spence kwuru, mgbe ọ bụ onye na-eduzi ịwa ahụ n’otu ụlọ ọgwụ dị na New York. “Dị ka otu ìgwè, ha bụ ndị kasị mara nke a na-akọ, bụ́ ndị ọ ga-amasị ndị dọkịta na-awa ahụ izute.”
Ndị dọkịta ejiriwo Ndịàmà Jehova nwetachaa ihe ha chọrọ n’usoro ịwa ahụ n’ejighị ọbara. Tụlee ahụmahụ nke dọkịta na-awa ahụ n’obi bụ́ Denton Cooley. N’ime afọ 27, ìgwè o so na ya wara mmadụ 663 n’ime Ndịàmà Jehova ahụ n’obi n’ejighị ọbara. Ihe ndị si na ya pụta na-egosi n’ụzọ doro anya na a pụrụ ịwa ahụ n’obi n’ụzọ gara nke ọma n’ejighị ọbara.
Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ akatọwo Ndịàmà Jehova n’ihi ọjụjụ ha na-ajụ ọbara. Ma akwụkwọ nduzi nke Òtù Ndị Ọkà n’Ọgwụ Na-akụnwụ Ahụ nke Great Britain na Ireland bipụtara, kpọrọ ọnọdụ Ndịàmà “ihe na-egosi nkwanye ùgwù maka ndụ.” N’eziokwu, nguzo siri ike nke Ndịàmà abụwo ihe bụ́ isi mere e ji nwewa nlekọta ahụ ike na-adịghị ize ndụ maka mmadụ nile. “Ndịàmà Jehova chọrọ ka a waa ha ahụ egosiwo otú a ga-esi eme ya ma chọsie ike ka e nwee ọganihu n’akụkụ dị mkpa nke ọrụ ahụ ike ndị Norway,” ka Prọfesọ Stein A. Evensen, nke Ụlọ Ọgwụ Mba Norway, na-ede.
Iji nyere ndị dọkịta aka ịgwọ ọrịa n’ejighị ọbara, Ndịàmà Jehova amalitewo ọrụ mmekọrịta na-enye aka. Ka ọ dị ugbu a, a kwadebewo ihe karịrị Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ 1,400 n’ụwa nile inye ndị dọkịta na ndị nnyocha, akwụkwọ ahụ ike ndị sitere n’ihe ọmụma ndị a chịkọtara bụ́ ndị nwere ihe karịrị isiokwu 3,000 ndị metụtara ịgwọ ọrịa na ịwa ahụ n’ejighị ọbara. “Ọ bụghị nanị Ndịàmà Jehova, kamakwa ndị ọrịa nile n’ozuzu ha eyikarịghị ka a ga-amịnye ha ọbara n’ụzọ na-adịghị mkpa n’ihi ọrụ Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ nke Ndịàmà,” ka Dr. Charles Baron, bụ́ prọfesọ n’Ụlọ Akwụkwọ Iwu nke Mahadum Boston, na-ekwu. *
Ihe ọmụma banyere ịgwọ ọrịa na ịwa ahụ n’ejighị ọbara nke Ndịàmà Jehova chịkọtara abaworo ọtụtụ ndị ọrụ ahụ ike uru. Dị ka ihe atụ, n’ịkwadebe ihe ndị a ga-ede n’akwụkwọ a kpọrọ Autotransfusion: Therapeutic Principles and Trends, ndị dere ya gwara Ndịàmà Jehova ka ha nye ha ihe ọmụma banyere ihe ndị a pụrụ iji dochie anya mmịnye ọbara. Ndịàmà ahụ jiri obi ụtọ meere ha ihe ha rịọrọ. Ka e mesịrị ndị ahụ dere ya ji obi ekele kwuo, sị: “N’ihe nile anyị gụrụ banyere isiokwu a, ọ dịtụbeghị mgbe anyị hụrụ ndepụta dị mkpirikpi, zuru ezu otú ahụ, nke ụzọ dị iche iche e si ezere ịmịnyere mmadụ ọbara onye ọzọ.”
Ọganihu e nwere n’ọrụ ahụ ike emewo ka ọtụtụ ndị nwalee ịgwọ ọrịa n’ejighị ọbara. Olee ebe ọzọ anyị ga-atụ anya ọganihu? Prọfesọ Luc Montagnier, bụ́ onye chọpụtara nje ọrịa AIDS, na-ekwu, sị: “Uto nke nghọta anyị nwere n’ọrụ a na-egosi na mmịnye ọbara aghaghị ịkwụsị otu ụbọchị.” Ka ọ dịgodị, ihe ndị ọzọ a pụrụ iji edochi anya ọbara anọwo na-azọpụta ndụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 16 Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ na-egosikwa ndị ọrụ ụlọ ọgwụ ihe ma a kpọọ ha. Ọzọkwa, ọ bụrụ na a rịọ maka enyemaka ha kpọmkwem, ha na-enyere ndị ọrịa aka ịnọgide na-eji obi eziokwu esoro dibịa na-elekọta ha ekwurịta okwu n’oge.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]
Ihe Ndị Dọkịta Ụfọdụ Na-ekwu
‘Ịwa ahụ n’ejighị ọbara abụghị nanị maka Ndịàmà Jehova kama ọ bụ maka mmadụ nile. Echere m na dọkịta nile kwesịrị ịdị na-eme ya.’—Dr. Joachim Boldt, bụ́ prọfesọ nkà mmụta ọgwụ na-akụnwụ ahụ, Ludwigshafen, Germany.
“Ọ bụ ezie na mmịnye ọbara adịrughị ize ndụ taa otú ha dị n’oge gara aga, ha ka nwere ihe ize ndụ, gụnyere mkpaghasị nke usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ na ibute ịba ọcha n’anya ma ọ bụ ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ.”—Dr. Terrence J. Sacchi, bụ́ osote prọfesọ n’ịgwọ ọrịa.
“Ihe ka ọtụtụ ná ndị dibịa adịghị eche echiche tupu ha amịnye ọbara, ha na-enyekwa ya nnọọ aghara aghara. Adịghị m eme otú ahụ.”—Dr. Alex Zapolanski, bụ́ onye na-eduzi ịwa ahụ n’obi n’Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Obi nke San Francisco.
“Echeghị m na e nwere ahụ a ga-awa n’afọ onye ọrịa na-enweghị nsogbu nke na-achọkarị mmịnye ọbara.”—Dr. Johannes Scheele, prọfesọ n’ịwa ahụ, Jena, Germany.
[Foto]
Dr. Terrence J. Sacchi
Dr. Joachim Boldt
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]
Ịgwọ Ọrịa na Ịwa Ahụ n’Ejighị Ọbara
Ụzọ Ụfọdụ E Si Eji Ha Eme Ihe
Mmiri ọgwụ: A na-eji Ringer’s lactate solution, dextran, hydroxyethyl starch, na ndị ọzọ eme ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ghara ịdalata adalata, na-egbochi oké ike ọgwụgwụ nke ụkọ ọbara na-akpata. Mmiri ọgwụ ụfọdụ a na-anwale ugbu a pụrụ ibugharị ikuku oxygen.
Ọgwụ: Protein ndị e megharịrị emegharị pụrụ ịkwalite mmepụta nke mkpụrụ ndụ ọbara uhie (erythropoietin), ihe ndị na-eme ka ọbara kpụkọta (interleukin-11), na mkpụrụ ndụ ọbara ọcha dị iche iche (GM-CSF, G-CSF). Ọgwụ ndị ọzọ na-ebelata ọbara ọgbụgba mgbe a na-awa ahụ n’ụzọ buru ibu (aprotinin, antifibrinolytics) ma ọ bụ na-enye aka ibelata oké ọbara ọgbụgba (desmopressin).
Ihe ndị a na-enweta n’ihe ndị dị ndụ na-egbochi ọbara ọgbụgba: A na-eji bandeeji ndị e ji collagen na cellulose kpaa akwụsị ọbara ọgbụgba site n’iji ha kechie ebe ọbara si agbapụta. Gọm na ihe e ji anyachi ihe bụ́ ndị e ji fibrin mee pụrụ ịrachi ebe a dụpuru adụpu ma ọ bụ nyachie ebe buru ibu ọbara si agbapụta n’ahụ.
Iweghachị ọbara: Ígwè ndị e ji eweghachi ọbara pụrụ iweghachite ọbara gbafurunụ mgbe a na-awa ahụ ma ọ bụ mgbe e merụrụ ahụ. A na-eme ka ọbara ahụ dị ọcha, a pụkwara ime ka o si na tub banyeghachi n’ahụ onye ọrịa ahụ. N’ọnọdụ ndị dị oké njọ, a pụrụ iji ígwè dị otú ahụ weghachite ọtụtụ lita ọbara.
Ngwá ndị e ji awa ahụ: Ngwá ụfọdụ na-egbubi akwara ma rachie ya n’otu oge ahụ. Ngwá ndị ọzọ pụrụ ịkwụsị ọbara si n’ebe ndị buru ibu n’akwara agbapụta. Ngwá ndị e ji ahụ ime ahụ na ndị na-adịghị emerụkebe mmadụ ahụ na-eme ka a waa ahụ n’enweghị ọbara ọgbụgba dị ka ọ na-adị ma a wapuo oghere buru ibu.
Nkà ịwa ahụ: Ime atụmatụ zuru ezu maka ịwa ahụ, bụ́ nke gụnyere isoro ndị ọrụ ahụ ike nwere nkà tụgharịa uche, na-enyere ndị ahụ ga-awa ahụ aka izere nsogbu. Ime ihe ozugbo iji kwụsị ọbara ọgbụgba dị oké mkpa. Igbu oge karịa awa 24 pụrụ ime ka ohere onye a wara ahụ nwere ịnwụ bukwuo ibu. Ikegasị ebe buru ibu a ga-awapu ka ha bụrụ ọtụtụ ebe ndị dị nta na-eme ka ọbara ghara ịgbafucha.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 10]
Ịgwọ Ọrịa n’Ejighị Ọbara—Ọ̀ Bụ “Ụkpụrụ Inye Nlekọta” Ọhụrụ?
TETA! sooro mmadụ anọ bụ́ ọkachamara n’ịgwọ ọrịa na ịwa ahụ n’ejighị ọbara tụlee abamuru ya.
E wezụga ndị ọrịa na-ajụ mmịnye ọbara n’ihi ihe ndị metụtara okpukpe, olee ndị ọzọ na-egosi mmasị n’ịgwọ ọrịa n’ejighị ọbara?
Dr. Spahn: N’ụlọ ọgwụ anyị, ndị na-arịọ ka a gwọọ ha n’ejighị ọbara na-abụkarị ndị maara nnọọ nke a na-akọ.
Dr. Shander: Na 1998 ọnụ ọgụgụ ndị ọrịa jụrụ mmịnye ọbara n’ihi mkpebi onwe onye ha karịrị ọnụ ọgụgụ ndị ọrịa jụrụ ọbara n’ihi ihe ndị metụtara okpukpe.
Dr. Boyd: Dị ka ihe atụ, e nwere ndị na-arịa cancer. E gosiwo ọtụtụ ugboro na ọ bụrụ na ha anaraghị ọbara, ha na-agbake ngwa ngwa karị, ha adịghị arịakebekwa ụdị ọrịa ahụ ọzọ.
Dr. Spahn: Anyị na-agwọkarị ndị prọfesọ mahadum na ezinụlọ ha n’ejighị ọbara. Ọbụna ndị dọkịta na-awa ahụ na-arịọ anyị ka anyị zere ịmịnyere ha ọbara! Dị ka ihe atụ, otu dọkịta na-awa ahụ bịakwutere anyị banyere nwunye ya, bụ́ onye ọ dị mkpa ka a waa ahụ. O kwuru, sị: “Nanị hụnụ na unu mere otu ihe—na a mịnyeghị ya ọbara!”
Dr. Shander: Ndị na-arụ ọrụ ná ngalaba anyị na-ahụ maka ọgwụ na-akụnwụ ahụ, kwuru, sị: ‘Ndị ọrịa a na-adịghị anara ọbara na-emekwa nke ọma, ikekwe ọbụna na-emekwa nke ọma karị. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nwee ụkpụrụ inye nlekọta abụọ? Ọ bụrụ na nke a bụ nlekọta ka mma, anyị kwesịrị inye ya mmadụ nile.’ Ya mere anyị na-atụzi anya ka ịgwọ ọrịa n’ejighị ọbara ghọọ ụkpụrụ inye nlekọta.
Maazị Earnshaw: Ọ bụ ezie na ịwa ahụ n’ejighị ọbara gbasara Ndịàmà Jehova karịsịa. Otú ọ dị, ọ bụ otú a ka anyị chọrọ isi na-agwọ mmadụ nile.
Ejighị ọbara eme ihe ọ̀ ka oké ọnụ ka ọ̀ ka ọnụ ala?
Maazị Earnshaw: Ọ dịghị efu oké ego.
Dr. Shander: Ịgwọ ọrịa n’ejighị ọbara na-eme ka ihe a na-emefu jiri pasent 25 dị ala.
Dr. Boyd: Ọ bụrụgodị nanị maka nke ahụ, anyị kwesịrị ịdị na-eme ya.
Ruo ókè ha aṅaa ka anyị nweruru ọganihu n’ejighị ọbara agwọ ọrịa?
Dr. Boyd: Echere m na ọ na-aga nnọọ n’ihu. Ọ kwụsịbeghị ma ọlị. Mgbe ọ bụla anyị chigharịrị, anyị na-ahụ ezi ihe ọhụrụ mere anyị ga-eji kwụsị ịmịnye ọbara.
[Foto]
Dr. Donat R. Spahn bụ́ prọfesọ na nkà mmụta ọgwụ na-akụnwụ ahụ, Zurich, Switzerland
Dr. Aryeh Shander bụ́ osote prọfesọ na nkà mmụta ọgwụ na-akụnwụ ahụ, United States
Maazị Peter Earnshaw, FRCS, bụ́ ọkachamara n’ịwa ọkpụkpụ, London, England
Dr. Mark E. Boyd bụ́ prọfesọ nkà mmụta ịmụ nwa na ọrịa ụmụ nwanyị, Canada
[Igbe dị na peeji nke 11]
Ọrụ Dịịrị Onye Ọrịa
▪ Gwa dọkịta gị banyere ihe ndị ọzọ a pụrụ iji edochi anya ọbara tupu ọ dị mkpa ka a gwọọ gị. Nke a dị mkpa karịsịa maka ụmụ nwanyị dị ime, ndị nne na nna nwere obere ụmụaka, na ndị agadi.
▪ Detuo ihe ndị ị chọrọ ka e mee n’akwụkwọ, karịsịa ma ọ bụrụ na e nwere akwụkwọ iwu kwadoro a na-eji eme nke ahụ.
▪ Ọ bụrụ na dibịa gị achọghị ịgwọ gị n’ejighị ọbara, chọọ onye dibịa ọzọ ga-eme ihe ị chọrọ.
▪ Ebe ọ bụ na ụfọdụ ihe ndị e ji edochi anya ọbara na-ewe oge iji rụọ ọrụ nke ọma, eyigharịla oge ị ga-aga ka a gwọọ gị ma ọ bụrụ na ị ma na ọ dị mkpa ka a waa gị ahụ.