Ikiri Ụwa
Ikiri Ụwa
A Jụ Idebanye Aha Ndị Jesuit n’Akwụkwọ na Russia
Ministri Okwu Ikpe nke Russia ajụwo akwụkwọ Òtù Jisọs tinyere maka idebanye aha ya dị ka òtù okpukpe kwụụrụ onwe ya, ka National Catholic Reporter na-akọ. E guzobere Òtù Jisọs ahụ a maara n’ebe nile dị ka ndị Jesuit na 1540. N’iwu okpukpe ọhụrụ nke Russia, a chọrọ ka ihe ka ọtụtụ n’òtù okpukpe debanyeghachi aha ha n’akwụkwọ ka e wee nakwere ha dị ka iwu si dị. Òtù ndị a jụrụ idebanye aha ha n’akwụkwọ apụghị ibi ma ọ bụ kesaa akwụkwọ okpukpe, ịkpọ ụmụ amaala obodo ọzọ òkù maka ihe omume okpukpe, ma ọ bụ iguzobe ebe a na-enye ọzụzụ. E debanyeghachiri aha Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ ná mba ahụ n’April 29, 1999.
Igbu Onwe Onye Arịa Elu na Japan
Ọtụtụ ndị mmadụ gburu onwe ha na 1998 na Japan karịa n’afọ ọ bụla ọzọ bu ya ụzọ, ka The Daily Yomiuri na-akọ. Dị ka Ụlọ Ọrụ Ndị Uwe Ojii Mba Japan si kwuo, mmadụ 32,863 gburu onwe ha na 1998—ihe ji okpukpu atọ karịa ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ n’ihe ọghọm ụgbọala na Japan. E kwuwo na ihe kasị kpata ịrị elu ahụ bụ nsogbu ego nke enweghị ọrụ na-akpata, bụ́ nke jisiworo mba ahụ ike ka o nwesịrị ndakpọ akụ̀ na ụba n’oge na-adịbeghị anya. Igbu onwe onye bụ ihe nke isii kasị akpata ọnwụ na Japan.
Mmetọ Ikuku Na-egbu Egbu
“Ụgbọala bụ ihe kasị amụba amụba, na-akpata mmetọ na Europe, ná mba ụfọdụ, ọtụtụ ndị na-anwụkwa n’ihi mmetọ ikuku a karịa ndị na-anwụ n’ihe ọghọm [ụgbọala],” ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi bụ́ Reuters na-akọ. Dị ka otu nnyocha nke Òtù Ahụ Ike Ụwa mere na-egosi, mmadụ 21,000 n’Austria, France, na Switzerland na-anwụchu ọnwụ kwa afọ n’ihi ọrịa iku ume na ọrịa obi ndị mmetọ ikuku na-akpata. N’akụkọ ọzọ, e mere atụmatụ na n’obodo ukwu 36 dị n’India, mmadụ 110 na-anwụchu ọnwụ kwa ụbọchị n’ihi mmetọ ikuku.
Ihe Ọmụma Dị ná Ngwá Electronic Na-apụ n’Anya Ngwa Ngwa
Ruo ọtụtụ afọ ndị ọkà mmụta sayensị nke kọmputa kwuru na a pụrụ ịdabere n’ihe ọmụma e chekwara ná ngwa electronic karịa nke e chekwara n’akwụkwọ. Otú ọ dị, ugbu a ndị na-arụ n’ọ́bá akwụkwọ na ndị na-edebe ihe mgbe ochie na-amalite ikwu ihe ọzọ. “Ihe ọmụma dị ukwuu nke nkà sayensị na nke akụkọ ihe mere eme dị anyị mkpa na-efunahụ anyị n’ihi mmebi ma ọ bụ ịbụ ndị na-abakwaghị uru,” ka magazin Newsweek na-ekwu. Okpomọkụ, ude mmiri, ịta nchara, na ikike magnet na-emetụta ebe nchekwa ihe ná ngwá electronic dị ka ebe a na-etinye diskette. Na-adaberekwa n’ọnọdụ e ji chekwaa ya, tepụ nwere ike magnet e ji echekwa ihe ọmụma ná ngwá electronic pụrụ ịdịru nanị afọ iri, ka magazin ahụ na-ekwu. Ihe ịma aka ọzọ na-eche ndị na-agbalị ichekwa ihe ọmụma ná ngwá electronic ihu bụ mgbanwe dị ngwa nke nkà na ụzụ. Ihe e ji echekwa ihe ọmụma na kọmputa na-agbanwe ngwa ngwa nke na ọ na-aghọ ihe na-abakwaghị uru ngwa ngwa. Abby Smith, nke Kansụl Na-ahụ Maka Ọ́bá Akwụkwọ na Ebe E Si Enweta Ihe Ọmụma, na-ekwu, sị: “Ihe ọmụma adịghị anọgidekebe, ọ gwụla ma i debere tepụ na kọmputa ndị ochie.”
Ọnụ Ọgụgụ Ndị India Agafee Otu Ijeri
Dị ka Ngalaba Maka Ụba Mmadụ nke Mba Ndị Dị n’Otu si kwuo, ọnụ ọgụgụ ndị India gafere otu ijeri n’August 1999. Nanị ihe karịrị afọ 50 gara aga, ọnụ ọgụgụ ndị India bụ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ihe ọ bụ ugbu a. Ọ bụrụ na ọ nọgide na-amụba n’ọ̀tụ̀tụ̀ o ji na-amụba ugbu a nke bụ́ pasent 1.6 kwa afọ, n’ihe dị ka afọ iri anọ, India ga-agafe China dị ka mba kasị nwee ọnụ ọgụgụ mmadụ n’ụwa. “India na China ewereworị ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị bi n’ụwa,” ka The New York Times na-akọ. N’ihe na-erughị iri afọ ise, afọ ndụ mmadụ nwere ike iru n’India arịwo elu site n’afọ 39 ruo afọ 63.
Ọnụ Ọgụgụ Ndị Lụrụ Di na Nwunye na United States Na-adalata Adalata
Otu nnyocha nke ngalaba Atụmatụ Alumdi na Nwunye Mba nke Mahadum Rutgers mere chọpụtara na ọnụ ọgụgụ ndị lụrụ di na nwunye na United States adalataruwo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị ala n’akụkọ ihe mere eme, ka The Washington Post na-akọ n’ebe ọ na-edebe ihe ọmụma n’Internet. Nnyocha ahụ gosikwara na ozugbo Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, a zụlitere pasent 80 nke ụmụaka mba ahụ n’ezinụlọ ebe nne na nna ụmụaka ahụ na-ebikọ. Otú ọ dị, taa, ọnụ ọgụgụ ahụ adalataruwo pasent 60. “Ọnụ ọgụgụ ụmụ agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị sịrị na ịmụ nwa n’alụghị di bụ ‘ụzọ ndụ kwesịrị ekwesị’ mụbara site na pasent 33 ruo pasent 53 n’iri afọ abụọ gara aga,” ka
akụkọ ahụ na-ekwu. Ka a sịkwa ihe mere akụkọ ahụ ji kwuo, sị: “Njikọ alụmdi na nwunye nọ ná nnukwu nsogbu”!Nsogbu Agụmakwụkwọ n’Africa
Ihe karịrị nde 40 nke ụmụaka toruworo ịga akwụkwọ ná mba Africa ndị dị na ndịda Sahara adịghị aga akwụkwọ, ka Ụlọ Ọrụ Mgbasa Ozi Africa Nile na-akọ. Ọtụtụ nsogbu akpawo usoro agụmakwụkwọ dị n’ógbè ahụ aka ọjọọ. Dị ka ihe atụ, n’ihi nsogbu akụ̀ na ụba, ọtụtụ ụlọ akwụkwọ enweghị mmiri, nweekwa ụlọ mposi ole na ole ma ọ bụ ghara inwe ma ọlị. E nwere ụkọ akwụkwọ ọgụgụ, a naghịkwa azụ ndị nkụzi ha nke ọma. Tụkwasị ná nsogbu akụ̀ na ụba, e nwere ọtụtụ ụmụ agbọghọ na-eto eto dị ime, nke bụ isi ihe na-eme ka ọtụtụ kwụsị ịga akwụkwọ. Ọrịa AIDS nwekwara mmetụta ọjọọ n’ọnụ ọgụgụ nke ndị na-abịa akwụkwọ. “Ịmalite na nwata nwewe mmekọahụ emewo ka ọtụtụ ndị nọ n’oge uto bute ọrịa AIDS,” ka Akụkọ Africa na-ekwu. N’ọnọdụ ụfọdụ a na-achọ ka ụmụ agbọghọ na-ebutebeghi ọrịa AIDS nọrọ n’ụlọ iji lekọta ndị ikwu ha ọrịa ahụ ji. Dr. Edward Fiske, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere agụmakwụkwọ praịmarị nke Òtù Mmụta, Sayensị, na Ọdịbendị nke Mba Ndị Dị n’Otu na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na agụmakwụkwọ adịghị, e jighị ọdịnihu nke ihe ka ọtụtụ ná mba Africa ndị dị na ndịda Sahara n’aka.”
A Hụ Ozu A Gbasiri Agbasi nke Nwere Mkpịsị Ụkwụ Aka Mere
“Otu mkpịsị ụkwụ aka mere a hụrụ n’ozu a gbasiri agbasi yiri ka a malitere iyi ya mgbe onye nwe ya nọ ndụ tupu e likọta ha afọ 2,500 gara aga,” ka The Sunday Times nke London na-akọ. Dr Nicholas Reeves kọwara mkpịsị ụkwụ adịgboroja ahụ, bụ́ nke ihe mejupụtara ya bụ ákwà a gbajuru gọm e nwetara n’ahụ anụmanụ na plaster of Paris, dị ka “ihe e mere n’ụzọ dị mgbagwoju anya, nke e mere ka ọ maa mma, nke e ji nkà rụsie ike, na ihe e mere kpọmkwem otú e si chọọ ya.” Mkpịsị ụkwụ ahụ nwere mbọ, e tekwara ya ágbá na-acha ka ahụ mmadụ. A kpọpuru oghere asatọ ná mkpịsị ụkwụ ahụ maka ikegide ya n’ihe. Oghere ndị ahụ gara n’ọdịdị yiri nke sandal ka ọ ga-abụ a kwụnye mkpịsị ụkwụ ahụ, elu sandal ahụ ekpuchie oghere ndị ahụ.
Isi Ọwụwa Na-esite n’Ọgwụ Ahụ Mgbu!
Ndị na-aṅụ ọgwụ maka isi ọwụwa ugboro atọ ma ọ bụ karịa n’izu pụrụ ịbụ na ha nwere isi ọwụwa na-esite n’aṅụghị ọgwụ n’ụzọ dị mma (MMH). N’ịbụ nke e chere na ọ na-emetụta 1 onye n’ime mmadụ 50, ọ bụ ọgwụ ndị dị mfe na-akpata MMH, dị ka aspirin, tinyekwara ọgwụ ahụ mgbu e depụtaara mmadụ. Mgbe ikike o nwere ịkwụsị ahụ mgbu pụsịrị, ọgwụ ahụ pụrụ ịkpatara mmadụ isi ọwụwa nke ọ ga-eche na ọ bụ isi ọwụwa nkịtị ma ọ bụ oké isi ọwụwa. Onye ọrịa ahụ na-aṅụkwu ọgwụ ahụ mgbu, si otú a na-eme ka nsogbu ahụ dịgide. Dr. Tim Steiner, nke Imperial College, London, na-akọwa na “e kwesịrị iwere ya na onye ọ bụla na-ekwu na isi na-awa ya kwa ụbọchị nwere MMH.” Ọ na-ekwukwa na ọ bụ ezie na a matawo banyere ọnọdụ ahụ eri afọ ụfọdụ, ọtụtụ ndị dọkịta amaghị ya, ha na-edepụtakwara ndị mmadụ ọgwụ ahụ mgbu ndị ka sie ike, mgbe nanị ihe ndị ọrịa ahụ kwesịrị ime bụ ịkwụsị ịṅụ ha, ka The Sunday Telegraph nke London, na-ekwu.
Ilekọta Ire
Nje bacteria ndị na-ezo n’azụ ire gị pụrụ iwepụta gas sulphur nke na-akpata ọnụ ísì, ka otu akụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ Prince George Citizen na-ekwu. “Nje bacteria na-amụba n’ebe kpọrọ nkụ nke ikuku oxygen na-adịghị na ya, nke mere ha na-eji ebi n’akụkụ ebe ikuku anyị na-ekuda n’akpa ume anyị na-adịghị erute,” ka akụkọ ahụ na-ekwu. Iji brọsh ezé ata atụ na ịghụcha ezé gị ga-enye aka, ma ọ bụ nanị ihe dị ka pasent 25 nke nje bacteria ka a na-ewepụ site n’iji brọsh ezé ata atụ. Dọkịta ezé bụ́ Allan Grove na-ekweta na ịkpụcha ire, bụ́ omenala ochie a na-eme na Europe, bụ “otu ihe kasị mkpa ị pụrụ ime iji kwụsị ọnụ ísì.” Iji plastik na-akpụcha “ire iji debe ya ọcha ka mma karịa iji brọsh ezé,” ka Citizen na-ekwu.
Anya Ọhụrụ Na-ekiri Mbara Igwe
A malitere iji oké ígwè ọrụ teliskop bụ́ Gemini North, nke e gwunyere na Mauna Kea, dị na Hawaii, ekiri eluigwe na ala na June 1999. Enyo ya ebe ìhè na-amụkwasị, nke dị mita 8.1 n’obosara, ga-enyere ndị na-enyocha mbara igwe aka ịhụ ihe ndị kasị nta dị n’ebe kasị dị anya na mbara igwe, ka akwụkwọ akụkọ Independent nke London na-akọ. Ma oké ígwè nhụta bụ́ Gemini North ma nke e gwunyere na mbara igwe bụ́ Hubble na-enyechara ndị na-enyocha mbara igwe aka ịhụ ihe ndị mere n’oge gara aga ma si otú a “leghachi anya azụ n’ihe ndị merenụ.” Ihe oké ígwè nhụta bụ́ Hubble ji ka mma bụ n’ihi na ọ dị na mbara igwe. Gemini, ọ bụ ezie na e gwunyere ya n’ala, na-adabere ná ngwá ọrụ kọmputa iji mee ka a hụzichaa onyinyo nke ọma bụ́ nke mkpaghasị ọnọdụ mbara igwe na-eme ka a ghara ịhụzi ma na-ewepụta onyinyo ndị dị mma dị ka ndị a na-enweta na Hubble—ma ọ bụrụ na ọ bụghị ndị ka ha mma.