M̀ Kwesịrị Ibi ná Mba Ọzọ?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
M̀ Kwesịrị Ibi ná Mba Ọzọ?
“Achọrọ m ibi ebe ọzọ.”—Sam.
“Enwere m nanị ọchịchọ ịmata ihe. Achọrọ m ịhụ ihe ọhụrụ.”—Maren.
“Otu ezigbo enyi m gwara m na ịhapụtụ ụlọ ga-adị m mma n’ahụ.”—Andreas.
“Achọrọ m nnọọ inwe ahụmahụ dị ịrịba ama.”—Hagen.
Ọ̀DỊTỤLA mgbe ị na-eche echiche ibi ná mba ọzọ—ikekwe ruo nanị nwa oge? Kwa afọ, ọtụtụ puku ndị na-eto eto na-enwe ike ime nnọọ nke ahụ. Andreas na-ekwu banyere ahụmahụ o nwere ná mba ọzọ, sị: “Ọ ga-amasị m ije ọzọ.”
Ndị ntorobịa ụfọdụ na-akwaga ná mba ọzọ ruo nwa oge n’ihi na ha chọrọ ịkpata ego ma ọ bụ ịmụta asụsụ mba ọzọ. Dị ka ihe atụ, n’ọtụtụ mba ụmụ agbọghọ ịgba odibo ná mba ọzọ na-ewu nnọọ ewu. Nke a na-eme ka ndị na-eto eto bi ná mba ọzọ na-arụrụ ezinụlọ ọzọ ọrụ ụlọ maka ụlọ na nri, ha na-enwekwa ike iji oge ha nwere ohere amụ asụsụ mba ahụ. E nwekwara ndị ntorobịa na-akwaga ná mba ọzọ ije gụọ akwụkwọ. Ndị ọzọ na-akwaga ná mba ọzọ iji chọta ọrụ ka ha nwee ike inyere ezinụlọ ha aka n’ụzọ ego. Ndị ọzọ kwa na-akwaga ná mba ọzọ n’ihi na ha amaghị ihe ha ga-eme mgbe ha gụsịrị akwụkwọ, ha ewee chọọ ịga nọtụ ná mba ọzọ.
Ọ dị mma ịmara na ndị ntorobịa ụfọdụ bụ́ ndị Kraịst akwagawo ná mba ndị a na-enweghị ọtụtụ ndị na-ezisa ozi ọma na ha, iji mụbaa ozi ha. N’agbanyeghị ihe mere a ga-eji kwaga ná mba ọzọ, ibi ná mba ọzọ pụrụ ime ka a mụta ihe ga-aba uru mgbe e mere okenye. Ọ pụrụ ịmụba amamihe gị n’ihe metụtara ọdịbendị. Ị pụrụ ọbụna ịmụta asụsụ mba ọzọ—ihe pụrụ ime ka i nwee ohere ka ukwuu ịchọta ọrụ.
Ka o sina dị, ibi ná mba ọzọ adịghị abụcha ahụmahụ dị mma. Dị ka ihe atụ, Susanne nọrọ otu afọ dị ka nwa akwụkwọ e ji gbanwere onye ọzọ. Ọ na-ekwu, sị: “E jibu m n’aka na ọ ga-amagbu onwe ya site ná mmalite ruo n’ọgwụgwụ. Ọ dịghị otú ahụ.” E rigbuwo ọbụna ndị ntorobịa ụfọdụ ma ọ bụ ha abanyewo ná nnukwu nsogbu. Ya mere tupu i bulie akpa gị, ọ ga-abụ ihe amamihe ịnọdụ ala ma tụlee uru na ọghọm dị na ya.
Tụlee Nzube Gị
Ịtụle uru na ọghọm dị na ya ga-agụnye n’ezie ịtụle ihe mere i ji chọọ ịga mba ọzọ. Ọ dịghị njọ ịga ebe ọzọ maka ọdịmma ime mmụọ ma ọ bụ iji lekọta ibu ọrụ ezinụlọ. Ma dị ka ndị ntorobịa e hotara ihe ha kwuru ná mmalite, ọtụtụ ndị na-achọ ịkwaga ebe ọzọ nanị n’ihi na ha chọrọ inwe ahụmahụ dị ịrịba ama, nnwere onwe ka ukwuu, ma ọ bụ ikpori ndụ. Nke a adịchaghị Eklisiastis 11:9 na-agba ndị na-eto eto ume ‘ịṅụrị ọṅụ na nwata ha bụ.’ Otú ọ dị, Ek 11 amaokwu nke 10 na-adọ aka ná ntị, sị: “Wezụga mkpasu iwe n’obi gị, meekwa ka ihe ọjọọ si n’anụ ahụ gị gabiga.”
njọ. E kwuwerị,Ọ bụrụ na ihe mere i ji chọọ ịkwaga ná mba ọzọ bụ ka i zere iwu ndị mụrụ gị, ọ pụrụ ịbụ na ị na-akpọ “ihe ọjọọ” òkù. Ì chetara ilu Jisọs banyere nwa mmefu? Ọ na-ekwu banyere otu nwa okorobịa nke gara mba ọzọ maka ọdịmma nke onwe ya nanị, ihe àmà na-egosi na ọ bụ iji nwerekwuo onwe ya. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, nsogbu dapụtara, agụụ jidere ya, ọ dara ogbenye ma daa ọrịa n’ụzọ ime mmụọ.—Luk 15:11-16.
E nwekwara ndị chọrọ ịkwaga ná mba ọzọ n’ihi na ha chọrọ ịgbanahụ nsogbu ndị dị n’ụlọ. Ma, dị ka Heike Berg dere n’akwụkwọ ya bụ́ What’s Up, “ọ bụrụ na ị chọrọ ịpụ nanị n’ihi na obi adịghị gị mma . . . i cheekwa na ihe ga-aka mma n’ebe ọzọ—chezọọ ya!” N’ezie, ọ ka mma iche nsogbu ihu kpọmkwem. Ọ dịghị uru dị n’ịgbapụ n’ihi ọnọdụ ndị na-amasịghị anyị.
Nzube ndị ọzọ dị ize ndụ bụ anyaukwu na ịhụ ihe onwunwe n’anya. N’ịbụ ndị ọchịchọ inweta akụ̀ na ụba kpaliri, ọtụtụ ndị ntorobịa na-amalite inwe echiche gabigara ókè, bụ́ ndị na-abụghị eziokwu, banyere otú ndụ dị ná mba ndị ụlọ ọrụ mmepụta ihe juru na ha. Ndị ụfọdụ na-eche na ndị nile bi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa bachara ọgaranya. Ma nke a abụtụghị eziokwu. Mgbe ha kwagasịrị ná mba ọzọ, ọtụtụ ndị ntorobịa na-ahụ onwe ha n’ala ha na-amaghị, na-adọlị inwere onwe ha pụọ n’ịda ogbenye. * Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche: nke ụfọdụ na-agbasosi ike, e wee duhie ha n’okwukwe anyị, ha werekwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.”—1 Timoti 6:10.
Ị̀ Dị Njikere?
E nwere ihe ọzọ a ga-atụle: ì toruola n’ezie iche ihe isi ike, nsogbu, na mmegide ndị ga-ebilite ná mba ọzọ ihu? Ma eleghị anya gị na onye ọzọ ma ọ bụ ezinụlọ ọzọ ga-ebi, ị ghaghịkwa ime mgbanwe iji kwekọọ n’ihe ha na-eme mgbe dum. N’ihi ya ruo ókè ha aṅaa ka ị na-enwe ihe ịga nke ọma n’ụlọ ugbu a? Ndị mụrụ gị hà na-eme mkpesa na ị dịghị echebara ndị ọzọ echiche nakwa na ị na-eche nanị banyere onwe gị? Ị̀ na-ahọkarị nri? Ruo ókè ha aṅaa ka ị dị njikere ime òkè nke gị n’ọrụ a na-arụ n’ụlọ? Ọ bụrụ na ihe ndị a bụ ihe ndị na-esiri gị ike ime ugbu a, cheedị otú ha ga-esi siere gị ike karị ná mba ọzọ!
Ọ bụrụ na ị bụ onye Kraịst, ị̀ ga-enwe ike ịnọgide na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe? Ka ndị mụrụ gị hà na-echetara gị mgbe nile ka ị ghara ịleghara ọmụmụ Bible, nzukọ ndị Kraịst, na ọrụ nkwusa, anya? Ị̀ ga-esi ike n’ụzọ ime mmụọ ruo n’ókè nke inwe ike iguzogide nrụgide na ọnwụnwa ndị dị ná mba ọzọ, bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na ị dịghị enweta n’ala nna gi? N’ụbọchị mbụ ọ gara akwụkwọ, a gwara otu onye Kraịst na-eto eto, nke bụ́ nwa akwụkwọ e ji gbanwere onye ọzọ ebe ọ pụrụ inweta ọgwụ ọjọọ. Ka e mesịrị otu nwa akwụkwọ ibe ya bụ́ nwanyị gwara ya ka ha mee mkpapụ. N’ala ha, ọ dịghị ihe ga-eme ka nwa agbọghọ si otú ahụ kwupụta mmasị ya n’ezoghị ọnụ. Otu onye na-eto eto si Africa nke kwagara Europe kwukwara, sị: “N’obodo anyị ị gaghị ahụtụ ihe osise rụrụ arụ 1 Pita 5:9.
n’èzí. Ma n’ebe a ị ga na-ahụ ha n’ebe nile.” Ịkwaga ná mba ọzọ pụrụ ịkpata mbibi n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụrụ na mmadụ esighị “ike n’okwukwe.”—Chọpụta Ihe Ndị Bụ Eziokwu!
Tupu ị kwaga ná mba ọzọ, ọ dị gị mkpa imata ihe nile ọ gụnyere. Adaberela n’ihe mmadụ gwara gị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị na-atụle ịgụ akwụkwọ ná mba ọzọ, ego ole ka ọ ga-efu? Ọ pụrụ iju gị anya ịmata na ọ na-efu ihe karịrị ọtụtụ puku dollar. Ọ dịkwa gị mkpa ịchọpụta ma a ga-anabata agụmakwụkwọ ị ga-enweta ná mba ọzọ n’obodo gị. Ọzọkwa, nweta ihe ọmụma ruo ókè i nwere ike banyere mba ahụ—iwu ya, ọdịbendị ya, omenala ya. Ruo ókè hà aṅaa ka ihe e ji ebi ndụ na-adaru ọnụ n’ebe ahụ? Ụtụ isi ndị dị aṅaa ka ị na-aghaghị ịkwụ? È nwere ihe ndị dị ize ndụ nye ahụ ike i kwesịrị ịtụle? Ị pụrụ ịhụ ya dị ka ihe ga-enye aka iso ndị biworo n’ebe ahụ n’ezie kwurịta okwu.
Ọzọkwa, e nwere okwu banyere ụlọ obibi. Nne na nna nwe ezinụlọ nke nwa akwukwọ si mba ọzọ bi na ya, adịghị achọkarị ka a kwụghachi ha ụgwọ. Ọ bụrụgodị otú ahụ, iso ndị na-adịghị asọpụrụ ụkpụrụ Bible biri pụrụ ịkpata oké nchegbu na mwute. Iso ndị enyi ma ọ bụ ndị ikwu gị biri pụrụ ịbụ ihe ọzọ ị ga-eme. Ma lezie anya ka ị ghara ịghọrọ ha ibu arọ—ọbụna ma ọ bụrụ na ha na-agba gị ume ịnọrọ. Nke a pụrụ ịkpata nsogbu ma ọ bụ ọbụna bibie mmekọrịta gị na ha.—Ilu 25:17.
Ọ bụrụ na ị na-eme atụmatụ ịkpata ego mgbe ị nọ ná mba ọzọ, echezọla ibu ọrụ dịịrị gị dị ka onye Kraịst irubere ndị ọchịchị isi. (Ndị Rom 13:1-7) Iwu ọ̀ kwadoro gị ịrụ ọrụ ná mba ahụ? Ọ bụrụ otú ahụ, n’ọnọdụ ndị dị aṅaa? Ọ bụrụ na ị rụwa ọrụ n’ụzọ iwu na-akwadoghị, ị pụrụ itinye aha ọma gị dị ka onye Kraịst na-eme ihe n’eziokwu n’ihe ize ndụ ma mee ka ị ghara inwe ihe nchebe ndị dị mkpa, dị ka inshọransị maka ihe ọghọm. Ọ bụrụgodị na iwu kwadoro gị ịrụ ọrụ, ọ ga-adị gị mkpa ịkpachara anya na inwe ezi uche. (Ilu 14:15) Ndị ọjọọ na-ewe mmadụ n’ọrụ na-erigbukarị ndị bịara abịa.
Ime Mkpebi
Ya mere, o doro anya na ime mkpebi maka ịkwaga ná mba ọzọ bụ nke siri ike—e kwesịghịkwa ilelị ya anya. Gị na ndị mụrụ gị nọdụ ala ma jiri nlezianya tụlee uru ndị ị ga-atụ anya ha na ihe ize ndụ ndị pụrụ ịdị na ya. Gbalịa ka ị ghara ikwe ka mkpali kpuchie nghọta i nwere. Jiri obi eziokwu mee ihe mgbe ị na-atụle nzube gị. Gee ndị mụrụ gị ntị nke ọma. E kwuwerị, ha ka ga-elekọta gị, ọbụna ma ọ bụrụ na ị nọ ọtụtụ narị kilomita site n’ebe ha nọ. Ma eleghị anya ha inye gị nkwado ego ga-adị gị mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma.
Mgbe ị tụlesịrị ihe nile, ọ pụrụ ịbụ na ọ bụghị ihe amamihe dị na ya ịkwaga ná mba ọzọ—ma ọ dịghị ihe ọzọ ugbu a. Nke a pụrụ ịkụda gị obi, ma e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-enye obi ụtọ ị pụrụ ime. Dị ka ihe atụ, ị̀ tụlewo ohere i nwere ịga ebe ndị mara mma ná mba unu? Ma ọ bụ gịnị ma ị malite ugbu a ịmụ asụsụ mba ọzọ? Ka oge na-aga, ikekwe ị ga-enwe ohere ịga mba ọzọ.
Otú ọ dị, gịnị ma i kpebie ịkwaga ná mba ọzọ? Isiokwu a ga-enwe n’ọdịnihu ga-atụle otú ị pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma mgbe ị nọ ná mba ọzọ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 15 Lee isiokwu bụ́ “Ịgụzi Ihe Ịkwalaga ná Mba nke Bara Ọgaranya Ga-ewe,” dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke April 1, 1991, bụ́ nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 15]
Ndị ntorobịa ụfọdụ na-akwaga ná mba ọzọ iji kwalite ọrụ nkwusa Alaeze
[Foto dị na peeji nke 16]
Soro ndị mụrụ gị kwurịta uru na ihe ize ndụ ndị dị n’ịkwaga ná mba ọzọ