È Kwesịrị Igosipụta Mwute?
È Kwesịrị Igosipụta Mwute?
N’AKWỤKWỌ ya bụ́ On Children and Death, Dr. Elisabeth Kübler-Ross na-asị: “Ọtụtụ ndị toworo eto na-ahụsi anya n’ihi na ha enwebeghị ike ịkwụsị mwute ha nwere kemgbe ha bụ nwata. N’ihi ya, e kwesịrị ịhapụ ụmụaka ka ha gosipụta mwute n’akpọghị ha ọkwa ákwá ma ọ bụ nwoke na-eme ka nwanyị, ma ọ bụ ha ana-anụ okwu ahụ ezi uche na-adịghị na ya bụ́ ‘Dimkpa anaghị akwa ákwá.’ ”
Isi otú a ele ihe anya na-emegide echiche e nwere n’ala ụfọdụ nke mmadụ ijide onwe ya iji ghara igosipụta mmetụta ọ bụla.
Ahụmahụ nke Otu Onye Ntụzi Olili Ozu
A na-eme ka ọdịiche nke a pụta ìhè site n’ihe Robert Gallagher, onye ntụzi olili ozu na New York kwuru, bụ́ onye Teta! gbara ajụjụ ọnụ. A jụrụ ya ma è nwere ọdịiche ọ bụla ọ hụrụ dị n’otú ndị a mụrụ n’America na otú ndị si ná mba ndị na-asụ Latin kwafeta si egosi mwute.
“N’ezie, m hụrụ. Mgbe m malitere ọrụ a laa azụ n’afọ ndị 1950, anyị nwere ọtụtụ ezinụlọ so ná ndị mbụ si Itali kwafeta n’ógbè anyị. Ha na-adị nnọọ egosipụta mmetụta. Ugbu a, ndị anyị na ha na-emekọ ihe n’olili ozu bụ ụmụ ha nakwa ụmụ ụmụ ha, ihe dị ukwuu ná mmetụta ahụ adịkwaghị. Ha adịkwaghị egosipụtacha mmetụta ha.”
Ndị Hibru n’oge Bible gosipụtara mwute na mmetụta ha. Rịba ama otú Bible si akọwa mmeghachi omume Jekọb mgbe e mere ka o chee na ajọ anụ ọhịa adọgbuwo nwa ya nwoke bụ́ Josef: “Jekọb, n’ịbụ onye dọwara uwe ya ma kee ákwà mkpe a na-eke n’úkwù, ruuru nwa ya nwoke újú ruo ogologo oge. Ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom nile bịara ịkasi ya obi, ma o kweghị ka a kasie ya obi. ‘Ee e,’ ka ọ sịrị, ‘M ga-eru újú ruo Shiọl, n’akụkụ nwa m nwoke.’ Nna ya wee kwaara ya ákwá.” (Jenesis 37:34, 35, The Jerusalem Bible; ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ee, ihere emeghị Jekọb ịkwara nwa ya nwoke furu efu ákwá.
Ọdịnala Dị Iche, Mmeghachi Omume Dị Iche
N’eziokwu, ọdịnala dịgasị iche iche. Dị ka ihe atụ, n’ọtụtụ ebe na Nigeria, ọ bụ ezie na ezinụlọ dị iche iche na-enwekarị ọtụtụ ụmụ, ọnwụ na-egbukwa mmadụ mgbe mgbe n’ihi ọrịa dị
iche iche, “a na-eru újú dị ukwuu ma nwatakịrị nwụọ, karịsịa ma ọ bụrụ nwa mbụ ma ya fọdụzie na ọ bụ nwa nwoke,” ka onye bụworo onye edemede n’Africa ruo afọ 20, kwuru. “Ihe dị iche bụ na na Nigeria, iru újú na-adịru nwa oge ma dị ukwuu. Ọ dịghị adịru ọtụtụ ọnwa ma ọ bụ ọtụtụ afọ.”N’ala ndị dị na Mediterranean ma ọ bụ Latin-America, a zụlitewo ndị mmadụ n’ógbè ebe a na-ewere imeghachi omume dị ka mkpali mmadụ na-enwe si dị, dị ka ihe dị otú o kwesịrị. N’ebe ahụ, a na-egosipụta ọṅụ na mwute n’ihu ọha. Ekele anaghị ejedebe n’ikwe n’aka; ha na-agụnye ịmakụ mmadụ n’ụzọ na-ekpo ọkụ. N’otu aka ahụ, a na-ejikarị anya mmiri na ịkwa arịrị egosipụta mwute n’ihu ọha.
Katherine Fair Donnelly na-ede akwụkwọ na-ekwu na nna nwa nwụnahụrụ “na-edi, ọ bụghị nanị mmetụta uche ọ na-enwe dị ka onye nwa ya nwụrụ, kama ụjọ ịtụfu àgwà e ji mara ya dị ka nwoke site n’igosipụta mwute ya n’ihu ọha.” Otú ọ dị, ọ sịrị na “nwa ịnwụnahụ mmadụ karịrị iwu nke ihe a na-eme na ihe a na-adịghị eme ma a bịa n’igosipụta mmetụta. Mmetụta sitere nnọọ n’obi nke iji anya mmiri mwute hichaa mkpụrụ obi yiri ịdụpu ọnyá iji mee ka abụ́ ya gbapụsịa.”
Ya mere mgbe a bịara ná mwute, a na-egosipụta ya n’ala ụfọdụ karịa n’ala ndị ọzọ. Ma a gaghị ewere igosipụta mwute na ịkwa ákwá dị ka ihe àmà nke adịghị ike. “Anya mmiri pụrụ n’anya” Jisọs Kraịst n’onwe ya n’ihi ọnwụ enyi ya bụ́ Lazarọs, n’agbanyeghị na Jisọs maara na ya gaje ịkpọlite ya n’ọnwụ n’oge na-adịghị anya.—Jọn 11:35.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]
Ihere emeghị Jekọb ịkwara nwa ya nwoke furu efu ákwá