Mgbalị A Na-eme Ịchụpụ Vatican n’Òtù UN
Mgbalị A Na-eme Ịchụpụ Vatican n’Òtù UN
ỤLỌ ọrụ mgbasa ozi dị na Rom bụ́ Inter Press Service (IPS) kọrọ na “njikọ mba nile nke ihe karịrị òtù 70 na-abụghị nke gọọmenti (ndị òtù NGO) mejupụtara amalitewo mkpọsa zuru ụwa ọnụ ka a chụpụ Vatican n’òtù Mba Ndị Dị n’Otu.” Ka ọ dị ugbu a, Vatican bụ òtù na-ekiri ihe a na-eme mgbe nile, ma ọ bụ mba na-esoghị ná mba ndị so n’òtù UN. Vatican enwewo ọnọdụ ahụ eri afọ 1964.
N’ihi gịnị ka ìgwè ndị òtù NGO a, bụ́ ndị mgbe ọ na-erule April nke afọ gara aga buworo ibu ruo òtù 100 n’ụwa nile, ji emegide ọrụ Vatican na-arụ n’òtù UN? N’ihi na Vatican, ka ndị òtù NGO ahụ na-arụ ụka ya, bụ òtù okpukpe, ọ bụghịkwa mba. Frances Kissling, bụ́ onyeisi Ndị Katọlik Na-achọ Nnwere Onwe Ime Nhọrọ, gwara ụlọ ọrụ IPS na njikọ ahụ emegideghị ikike Vatican nwere ikwu echiche ya, kama “ihe bụ́ isi okwu bụ ikike òtù a na-abụghị mba nwere isoro gọọmenti dị iche iche nwee ọnọdụ.”
Anika Rahman, bụ́ onye nduzi nke Ihe Omume Mba Nile n’Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Iwu na Ụkpụrụ Ọmụmụ, kwetara. Ụlọ ọrụ IPS hotara ya dị ka onye na-ekwu, sị, “ọ bụrụ na òtù UN ewere Ocheeze Popu dị ka mba nwere ihe ùgwù nke ikiri ihe a na-eme mgbe nile n’ihi ikike okpukpe o nwere, òtù ụwa nile na-atụ ụkpụrụ ga-eme ka okpukpe ndị ọzọ meekwa nzọrọ yiri ya.” O kwukwasịrị: “Iji jide n’aka na òtù Mba Ndị Dị n’Otu adịghị akwado okpukpe ọ bụla, e kwesịghị ikwe ka òtù okpukpe ndị dị ka Chọọchị Roman Katọlik na-ekere òkè ná nzukọ a dị ka mba na-esoghị n’òtù.”
Ma gịnị banyere echiche bụ́ na Vatican bụ mba, n’ihi ya kwa ruo eruo inwe ọnọdụ o nwere ugbu a? “Okwu ahụ siri ike nghọta,” ka Nwaada Kissling kwuru n’ajụjụ ọnụ a gbara ya. “Anyị na-ekwu na nke a bụ n’ụzọ bụ́ isi nkọwa e nyere ịbụ mba na narị afọ nke 15 nakwa na Ocheeze Popu bụ, n’ezie, ndokwa na-achị isi nke okpukpe.” O kwukwara na okwu ahụ bụ́ “Vatican” na “Ocheeze Popu” “pụtaara Chọọchị Roman Katọlik otu ihe.”
Ọ bụ echiche Vatican nwere n’okwu banyere ụba mmadụ kasị kpata iwe ndị òtù NGO na-ewe maka ọrụ Vatican na-arụ ugbu a n’òtù UN. Dị ka ihe atụ, Vatican ejiwo nnọkọ nkwurịta okwu dị iche iche nke UN dị ka Nnọkọ Mba Nile Maka Ụba Mmadụ na Mmepe nke 1994, na Cairo, na Nnọkọ Ndị Inyom nke 1995, na Beijing, kwupụta echiche o nwere megide atụmatụ otú ezinụlọ ga-aharu. “Ebe ọ bụ na òtù UN na-eme ihe ka ukwuu ná mkpebi ndị ọ na-eme na-adabere ná nkwekọrịta,” ka ụlọ ọrụ IPS na-ekwu, “echiche ndị dị iche dị ka nke Vatican emebiwo nkwurịta okwu ndị e nwere n’okwu banyere ụba mmadụ, mgbochi afọ ime, ihe ndị ruuru ndị inyom na nlekọta ikike ịmụ nwa.”
Dị ka Nwaada Kissling si kwuo, “ọrụ kwesịrị ekwesị Vatican ga-arụ bụ nke òtù NGO na-arụ—dị ka ndị òtù NGO ndị ọzọ nile na-arụ, bụ́ ndị na-anọchite anya ndị Alakụba, ndị Hindu, ndị Buddha, ndị Bahai na òtù okpukpe ndị ọzọ.” Njikọ ahụ chọrọ ka Odeakwụkwọ Ukwu òtù UN bụ́ Kofi Annan, nakwa karịsịa Nzukọ Ezumezu òtù UN tụleghachi ọrụ Vatican na-arụ n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị kasị ukwuu n’ụwa.
[Foto ndị dị na peeji nke 31]
Onye Vatican na-agwa òtù UN okwu
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Foto UN/DPI nke Sophie Paris sere
Foto UN 143-936/J. Isaac