Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

À Pụrụ Inwe Oké Mgbukpọ Ọzọ?

À Pụrụ Inwe Oké Mgbukpọ Ọzọ?

À Pụrụ Inwe Oké Mgbukpọ Ọzọ?

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA SWEDEN

NA January 26-28, 2000, ndị isi ala na ndị nnọchiteanya gọọmenti 48 sitere gburugburu ụwa zukọtara n’isi obodo Sweden maka Mgbakọ Mba Nile nke Stockholm Maka Oké Mgbukpọ. Ụfọdụ okwu ndị e kwuru site n’ebe ikpo okwu kpughere egwu ndị ndú ụwa na-atụ banyere mmaliteghachi nke Ọchịchị Ndị Nazi. Ehud Barak, bụbu Praịm Minista Israel, kwuru, sị: “Nnọkọ nkwụrịta okwu a na-ezipu ozi gburugburu ụwa: Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọzọ a ga-ekwe ka ọchịchị ọjọọ na-egbu mmadụ ma na-akpa ókè n’etiti ndị mmadụ n’ihi okpukpe, agbụrụ ma ọ bụ ụcha akpụkpọ ahụ ha, dịrị n’ebe ọ bụla n’elu ala.”

O Metụtaghị Nanị Ndị Juu

Ọtụtụ ndị mmadụ gburugburu ụwa na-eche na okwu bụ́ “Oké Mgbukpọ” metụtara nanị ndị Juu. Otú ọ dị, o metụtakwara ndị ọzọ. N’oge ememe ncheta Oké Mgbukpọ nke Ndị Juu, bụ́ ememe a kpọsara nke ọma, nke a nọ n’Ụlọ Nzukọ Ukwu nke Stockholm ná mgbakọ ahụ nwee, praịm minista Sweden tụrụ aro ka e nwee nkwekọrịta ka e meghee ebe nile a na-edebe ihe mgbe ochie gburugburu ụwa ka ọha na eze wee mara banyere Oké Mgbukpọ ahụ. “Ka anyị mara,” ka ọ sịrị, “banyere mgbukpọ nke agbụrụ Roma [ndị Gypsy], ogbugbu e gburu ndị nwere nkwarụ n’ìgwè nakwa mkpagbu na ogbugbu e gburu ndị na-edina ụdị onwe ha, ndị na-ekwenyereghị ọchịchị ha na Ndịàmà Jehova.”

Gọọmenti Sweden ebipụtawo otu akwụkwọ nke na-ekwu banyere Oké Mgbukpọ ahụ, nke isiokwu ya bụ Tell Ye Your Children (Kọọrọnụ Ya Ụmụ Unu), bụ́ nke e kesawooro ezinụlọ nile e nwere ụmụntakịrị na ha gburugburu mba ahụ n’efu. Akwụkwọ a na-ekwu na Ndịàmà Jehova “jụrụ ịṅụ iyi ịkwado Hitler na Nazi Germany. Nguzogide dị otú a bụ ihe a na-adịghị ahụkebe n’ihi na nanị ịbịanye aka n’akwụkwọ na-ekwupụta nkwado ha gaara eweta mkpagbu ha ná njedebe—ma nanị mmadụ ole na ole họọrọ nke a.”

Oké Mgbukpọ ahụ na Ndịàmà Jehova

Na 1933, e nwere ihe dị ka Ndịàmà Jehova 25,000 na Germany. Ọtụtụ puku n’ime ha so ná ndị mbụ a tụbara n’ogige na n’ụlọ mkpọrọ ndị Nazi. Ha kwupụtara nnọpụiche ha dị ka ndị Kraịst n’ebe ụdị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ọrụ agha nile dị. Ha etoghị Hitler. Ha jụrụ ịnakwere echiche ịkpa ókè agbụrụ Nazi na iso n’ìgwè ndị agha Hitler. Ihe dị ka mmadụ 2,000 nwụrụ, e gburu ihe karịrị 250 n’ime ha egbu.

Ọzọkwa, Ndịàmà a tụrụ mkpọrọ nyeere ndị mkpọrọ ibe ha aka ịtachi obi, gụnyere ndị Juu na ndị ọzọ. Ha mere otú ahụ site n’ịkụnye olileanya dabeere na Bible n’ime ha nakwa site n’isoro ndị na-arịa ọrịa na ndị na-adịghị ike kerịta ihe ọ bụla ha nwere, ọtụtụ mgbe na-enye ụfọdụ n’ime iberibe bred ikpeazụ ha nwere. Ná mmalite afọ ndị e nwere mkpagbu Nazi, e mere ka ndị nọ n’ebe ndị ọzọ mara banyere ịdị adị nke ogige ịta ahụhụ na ihe ndị na-eme n’ime ha na nzuzo. Kemgbe ahụ ha ebipụtawo na magazin ha ndị a na-ekesa gburugburu ụwa, bụ́ Ụlọ Nche na Teta!, ọtụtụ isiokwu na-ekwu banyere arụrụala ndị Nazi rụrụ, tinyere akụkọ ndụ nke ndị lanarịrịnụ.

Egwu mmaliteghachi nke Ọchịchị Ndị Nazi pụtara ìhè n’etiti ndị bịara Mgbakọ Mba Nile nke Stockholm Maka Oké Mgbukpọ. Prọfesọ Yehuda Bauer, bụ́ onye ntụzi nke Ogige Mba Nile Maka Imụ Ihe Banyere Oké Mgbukpọ ahụ n’Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Juu nke Oge A, nke dị n’Israel, kwuru ya otú a: “Ebe o mere otu mgbe, ọ pụrụ ime ọzọ, ọ gaghị abụ n’otu ụdị ahụ, ọ bụchaghị otu ndị ahụ ka ọ ga-emetụta, ọ gaghị abụ otu ndị ahụ ga-eme ya, kama onye ọ bụla pụrụ ime ya onye ọ bụla. Ọ bụ ihe a na-enwetụbeghị ụdị ya, ma e nweela ya ugbu a.”

[Foto dị na peeji nke 30]

E ji “purple triangle” mata Ndịàmà Jehova n’ogige ndị ahụ

[Foto ndị dị na peeji nke 30, 31]

1. Ndị Nazi gburu Julius Engelhardt, otu n’ime Ndịàmà Jehova, na Brandenburg n’August 14, 1944

2. Mmadụ atọ n’ime Ndịàmà Jehova mgbe ha na-ala ka a tọhapụsịrị ha na Sachsenhausen, 1945

3. Elsa Abt, bụ́ Onyeàmà e kewapụrụ n’ebe obere nwa ya nwanyị nọ wee tụọ ya mkpọrọ ruo ihe fọro nke nta ka ọ bụrụ afọ atọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Nordrhein-Westfälisches Hauptstaatsarchiv, Düsseldorf

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Ndịàmà lanarịrịnụ akọọ ihe merenụ na vidio ndị a