Ihe Ngwọta Ya Ò So Akpata Nsogbu Ahụ?
Ihe Ngwọta Ya Ò So Akpata Nsogbu Ahụ?
“Iwetu ndị mkpọrọ ala na igbu mmụọ ha bụ ụzọ kasị njọ isi kwadebe ha maka ibi ndụ mgbe a tọhapụsịrị ha.”—UCHE AKWỤKWỌ AKỤKỌ BỤ́ THE ATLANTA CONSTITUTION.
N’ỌTỤTỤ ọnọdụ ụlọ mkpọrọ na-arụ ọrụ nanị dị ka ihe mgbochi—nke na-adịru nanị nwa oge. Mgbe a tọhapụrụ onye mkpọrọ, ò nwetala ntaramahụhụ kwesịrị mpụ o mere n’ezie? * Gịnị banyere ndị e mesoro mpụ ahụ ma ọ bụ ndị ha hụrụ n’anya? “Ọ bụ m mụrụ nwatakịrị ahụ e gburu egbu,” ka Rita kwuru mgbe a tọhapụrụ onye a mara ikpe nke gburu nwa ya nwoke dị afọ 16, ka ọ nọsịrị nanị afọ atọ n’ụlọ mkpọrọ. “Biko, chetụdị echiche. Ị̀ makwa ihe nke a pụtara?” Dị ka ihe mere Rita na-egosi, a na-anọgide na-echeta ọdachi ruo ogologo oge mgbe ụlọikpe kpebisịrị ikpe na mgbe e jisịrị ya mee isi akụkọ.
Okwu a agbasaghị nanị ndị e mesoro mpụ kama ọ gbasakwara onye ọ bụla ọzọ. E kwuwerị, ma è mere ka ndị mkpọrọ a tọhapụrụ atọhapụ gbanwee ma ọ bụ na ahụmahụ ha nwere n’ụlọ mkpọrọ mere nanị ka obi taa ha mmiri, o metụtara obi iru gị ala ma ọ bụrụ na o metụtaghị nchebe gị.
Ebe Ndị Na-eme Ka Ndị Omempụ Ka Njọ
Ụlọ mkpọrọ adịghị akwụsịcha ime mpụ mgbe nile. “Mgbe e kponyere ego n’iwu ụlọ mkpọrọ ọzọ kama ime ka onye mkpọrọ nwee echiche ka mma banyere onwe ya, ọtụtụ mgbe ọ na-akpatakwu mpụ—na-akpatakwa nke kasị njọ,” ka Jill Smolowe dere na magazin Time. Peter, * bụ́ onye nọworo n’ụlọ mkpọrọ ruo afọ 14, kwuru ihe kwekọrọ na nke ahụ. “Ihe ka ọtụtụ ná ndị ibe m e ji eji malitere n’obere mpụ, sizie na ya gafee na mpụ ka njọ, n’ikpeazụ ha banyere n’ime mpụ ndị dị oké njọ megide ndị ọzọ,” ka ọ na-ekwu. “Nye ha, ụlọ mkpọrọ dị ka ụlọ akwụkwọ na-akụzi nkà. Ha ga-apụta jọọ njọ karị.”
Ọ bụ ezie na ụlọ mkpọrọ pụrụ ime ka ndị omempụ ghara ịnọ n’okporo ámá ruo nwa oge, o yiri ka ọ dịghị ezigbo ihe ha na-eme—iji kwụsị mpụ ruo ogologo oge. Ụmụntakịrị nwoke na ụmụ okorobịa bi n’ógbè mmadụ bijupụtara na-elekarị ịtụ mkpọrọ anya dị ka ụzọ e si abanye n’òtù. Ọtụtụ mgbe ha na-aghọzi ndị omempụ obi tara mmiri. “Ụlọ mkpọrọ adịghị eme ka mmadụ gbanwee ma ọlị,” ka Larry, bụ́ onye nọworo n’ụlọ mkpọrọ ugboro ugboro n’ihe ka ukwuu ná ndụ ya, na-ekwu. “Ha na-apụta ma mewekwa otu ihe ahụ.”
Dị ka otu nnyocha e mere na United States gosiri, ‘ọnọdụ a na-adịgide adịgide’ pụrụ ime ka a mata ihe mere o ji bụrụ pasent 5 nke ndị omempụ na-eme pasent 50 nke mpụ nile dị oké njọ. “Mgbe ndị mkpọrọ na-enweghị ihe bara uru ha ga-eji oge ha mee,” ka magazin Time na-ekwu, “ha na-ejikarị oge ahụ ebuju iwe n’obi, gụnyere ịmụta ụzọ dị iche iche e si eme mpụ, bụ́ ndị . . . ha ga-eji mee ihe ma ha laghachi n’okporo ámá.”
Ọ bụghị nanị na United States ka e nwere ọnọdụ a. John Vatis, bụ́ dibịa n’ụlọ mkpọrọ ndị agha dị na Gris, na-ekwu, sị: “Ụlọ mkpọrọ anyị adịwo nnọọ irè n’ịzụpụta ndị dị ize ndụ, na-eme ihe ike, na ndị nwere obi ọjọọ. Mgbe a tọhapụrụ ha, ihe ka ọtụtụ ná ndị e ji eji na-achọ ‘ịbọ ọ́bọ̀’ n’ahụ ọha mmadụ.”
Ihe Ọ Na-efu Ọha Mmadụ
Nsogbu ụlọ mkpọrọ na-emetụta ego gị kpọmkwem. Dị ka ihe atụ, a na-eme atụmatụ na na United States, ndị na-akwụ ụtụ isi na-emefu ihe ruru $21,000 n’isi onye mkpọrọ nke ọ bụla kwa afọ. A pụrụ imefu ihe karịrị ọnụ ego ahụ ugboro atọ n’isi ndị e ji eji gafeworo afọ 60. N’ọtụtụ mba ntụkwasị obi ọha na eze nwere n’usoro iwu na-ebelata n’ihi ihe ndị ọzọ.
A na-atụ egwu maka ndị omempụ na-anọzughị oge ha a tọhapụrụ, tinyere ndị dara iwu jisiri ike zerechaa ịbụ ndị a mara ikpe n’ihi na ọkàiwu dị nkọ chọpụtara ụmụ irighiri ihe ndị metụtara iwu e leghaara anya. Ọtụtụ mgbe, ndị mpụ ahụ metụtara adịghị enwe mmetụta nke ịbụ ndị e chebere n’ụzọ zuru ezu pụọ n’ịbụ ndị a ga-awakpo ọzọ, ma eleghị anya ọ dịghịkwa ihe ha ga-eme iji gbanwee ụzọ ikpe ahụ si aga.Nchegbu Ọha na Eze Amụbaa
Ọnọdụ ọjọọ a na-edebe ndị mkpọrọ, dị ka a kọwara n’igbe dị n’isiokwu a adịghị akwalite ntụkwasị obi ọha na eze nwere n’usoro ụlọ mkpọrọ. Ndị mkpọrọ e mesoro ihe n’ụzọ na-ezighị ezi mgbe ha nọ n’ụlọ mkpọrọ nwere ike ghara ịgbanwe. Tụkwasịkwa na nke a, ọtụtụ òtù ndị na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ na-enwe nchegbu banyere ọnụ ọgụgụ dịkarịsịrị ukwuu nke ndị si n’agbụrụ ndị ka nta n’ọnụ ọgụgụ bụ́ ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ha na-ajụ ma nke a ọ̀ bụ ihe ndabata ka ọ bụ ịkpa ókè agbụrụ kpatara ya.
Otu akụkọ sitere n’aka ụlọ ọrụ Associated Press na 1998 mere ka ndị mmadụ mara banyere ọnọdụ nke ndị nọbu n’Ụlọ Mkpọrọ Holmesburg, na Pennsylvania, U.S.A., bụ́ ndị chọrọ ka a kwụọ ha ụgwọ n’ihi ịbụ ndị kwuru na e ji ha mee nchọpụta mmiri ọgwụ mgbe ha nọ n’ụlọ mkpọrọ. Gịnịkwa banyere mmalite a maliteghachiri inwe ndị mkpọrọ a tụkọtara ịga ọnụ na United States? Òtù Na-eme Ka A Mata Banyere Mmebi nke Ihe Ndị Ruuru Mmadụ ná Mba Nile na-akọ, sị: “Ndị mkpọrọ ahụ a tụkọtara ịga ọnụ na-arụgide ọrụ ruo awa 10-12, ọtụtụ mgbe n’oké anwụ, na-ezurutụ ike nanị obere oge iji ṅụọ mmiri, na iji otu awa rie nri ehihie. . . . Ihe ndị ahụ e ji eji a tụkọtara ịga ọnụ ji anyụ nsị́ bụ obere arịa e debere n’azụ ákwà e ji mere mgbidi. Ndị mkpọrọ ahụ na-anọgide n’ịga ahụ mgbe ha na-anyụ nsị́. Mgbe arịa ahụ na-adịghị ya, a na-amanye ndị mkpọrọ ahụ itukwuru ala n’ihu ọha.” N’eziokwu, ọ bụghị ụlọ mkpọrọ nile na-eme otú ahụ. Ka o sina dị, ihe mmeso ọjọọ na-eme bụ ime ka ma ndị mkpọrọ ma ndị ahụ na-eme ya nwee obi ịta mmiri.
Obodo Ọ̀ Na-erite Uru?
Dị ka ọ na-adịkarị, ihe ka ọtụtụ n’obodo dị iche iche na-anọ ná nchebe karị mgbe ndị omempụ dị ize ndụ nọ n’ụlọ mkpọrọ. Obodo ndị ọzọ nwere mmasị n’ụlọ mkpọrọ maka ihe ọzọ. Mgbe a chọrọ imechi otu ụlọ mkpọrọ dị n’obodo nta Australia bụ́ Cooma, ndị mmadụ mere mkpesa. N’ihi gịnị? N’ihi na ụlọ mkpọrọ ahụ mere ka obodo ahụ nwere ihe isi ike ego nwee ọrụ.
N’oge ndị na-adịbeghị anya, gọọmenti ụfọdụ eresịwo ndị nkịtị ụlọ mkpọrọ ha dị ka ụzọ isi belata mmefu ego. N’ụzọ dị mwute, inwekwu ndị mkpọrọ na ịtụ mkpọrọ ruo ogologo oge karị bụ ihe e ji achụ nta ego. N’ihi ya, a pụrụ ịgwakọta ikpe ziri ezi na azụmahịa.
Ná nchịkọta, ajụjụ bụ́ isi ka bụ: Ụlọ mkpọrọ hà na-eme ka ndị omempụ gbanwee? Ọ bụ ezie na azịza ya na-abụkarị ee e, ọ pụrụ ịtụ gị n’anya ịmata na e nyeworo ụfọdụ ndị e ji eji aka ịgbanwe. Ka anyị hụ otú o si mee.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 Ọ bụ ezie na anyị na-ezo aka n’ebe ndị mkpọrọ nọ dị ka ndị ikom, ụkpụrụ ndị a tụlere metụtara ma ndị ikom ma ndị inyom bụ́ ndị e ji eji.
^ par. 6 A gbanwewo aha ụfọdụ dị n’isiokwu a.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 6, 7]
Ilebatụ Anya n’Ọnọdụ E Nwere n’Ụlọ Mkpọrọ
NJUBIGA ÓKÈ NKE MMADỤ: Ụlọ mkpọrọ ndị dị na Britain nwere nnukwu nsogbu njubiga ókè nke mmadụ, ọ bụghịkwa ihe ijuanya! Ala ahụ bụ nke abụọ nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị mkpọrọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe nile ma e jiri ya tụnyere ọnụ ọgụgụ ndị bi na ya, na-enwe ndị mkpọrọ 125 n’ime mmadụ 100,000 ọ bụla bi na ya. Na Brazil, e wuru ụlọ mkpọrọ kasị ibu nke São Paulo ịba ndị mkpọrọ 500. Kama nke ahụ, ndị mkpọrọ 6,000 nọ na ya. Na Russia, ụlọ nga ndị kwesịrị ịba ndị mkpọrọ 28 nwere site ná ndị mkpọrọ 90 ruo ndị mkpọrọ 110. Nsogbu ahụ siri oké ike nke na ndị mkpọrọ aghaghị ịdị na-ehitụ ụra ma na-ebiliri ibe ha. N’otu mba dị n’Esia, ndị mkpọrọ 13 ma ọ bụ 14 na-anọ n’ụlọ nga dị square mita atọ. Ka ọ dịgodị, n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Australia, ndị ọchịchị agwọtawo nsogbu enweghị ohere site n’idebe ndị mkpọrọ n’ime nnukwu igbe e ji ebulata ngwá ahịa.
IME IHE IKE: Magazin akụkọ nke Germany bụ́ Der Spiegel na-akọ na ndị e ji eji dị obi ọjọọ na-egbu ma na-ata ndị mmadụ ahụhụ n’ụlọ mkpọrọ ndị dị na Germany n’ihi “agha dị n’etiti òtù ndị na-amarịta aka maka ịzụ ahịa mmanya na-aba n’anya na ọgwụ ọjọọ n’ụzọ iwu na-akwadoghị, mmekọahụ, na mbinye ego maka ọmụrụ nwa buru ibu.” Ọ bụ esemokwu agbụrụ na-akpalikarị ime ihe ike a na-eme n’ụlọ mkpọrọ. “E nwere ndị a mara ikpe si mba 72,” ka Der Spiegel na-ekwu. “A pụghị izere esemokwu na nghọtahie ndị na-eduga n’ime ihe ike.” N’otu ụlọ mkpọrọ dị n’Ebe Ndịda America, ndị ọchịchị kwuru na a na-egbu, ná nkezi, ndị mkpọrọ 12 kwa ọnwa. Ndị e ji eji kwuru na ọnụ ọgụgụ ya karịrị nke ahụ okpukpu abụọ, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Financial Times nke London kọrọ.
MMETỌ N’ỤZỌ MMEKỌAHỤ: N’isiokwu bụ́ “Nsogbu Idina Mmadụ n’Ike n’Ụlọ Mkpọrọ,” akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times na-ekwu na atụmatụ e leziri anya mee gosiri na na United States, “a na-awakpo ihe karịrị ndị ikom 290,000 n’ụlọ mkpọrọ kwa afọ.” Akụkọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ahụmahụ dị egwu nke ime ihe ike n’ụzọ mmekọahụ na-ewerekarị ọnọdụ ọtụtụ mgbe, ọ na-abụkarị ihe a na-eme kwa ụbọchị.” Otu òtù na-eme atụmatụ na n’ụlọ mkpọrọ ndị dị na United States, a na-amanye ihe dị ka mmadụ 60,000 inwe mmekọahụ kwa ụbọchị.
AHỤ IKE NA ỊDỊ ỌCHA: E nwere ihe ndekọ zuru ezu banyere mgbasa nke ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ n’etiti ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ. Ụwa nile amatala banyere ụkwara nta ndị mkpọrọ nọ na Russia na ụfọdụ mba ndị dị n’Africa na-arịa, dịkwa ka ọ dị nleghara anya a na-eleghara ụdị dị iche iche nke ọgwụgwọ, ịdị ọcha, na ihe oriri na-edozi ahụ n’ọtụtụ ụlọ mkpọrọ gburugburu ụwa.
[Foto]
Ụlọ mkpọrọ mmadụ jupụtara na São Paulo, Brazil
[Ebe E Si Nweta Foto]
Foto AP/Dario Lopez-Mills
[Foto dị na peeji nke 4, 5]
Ụlọ mkpọrọ nwere oké ihe nchebe bụ́ La Santé dị na Paris, France
[Ebe E Si Nweta Foto]
Foto AP/Francois Mori
[Foto dị na peeji nke 6]
Ndị inyom nọ n’ụlọ mkpọrọ dị na Managua, Nicaragua
[Ebe E Si Nweta Foto]
Foto AP/Javier Galeano