Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka M Ji Kwesị Ịma Nne na Nna M Ochie?

N’ihi Gịnị Ka M Ji Kwesị Ịma Nne na Nna M Ochie?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

N’ihi Gịnị Ka M Ji Kwesị Ịma Nne na Nna M Ochie?

“Mgbe mụ na mama m sere okwu, nne m ochie nyeere anyị aka ikpezi.”—Damaris.

“N’AKỤKỌ ihe mere eme nile, ndị nne na nna ochie abụrụwo ndị bụ́ isi n’ime ka ezinụlọ dị n’otu ma nwee ọganihu.” Otú a ka Dr. Arthur Kornhaber dere n’akwụkwọ ya bụ́ Grandparent Power! O kwukwara, sị: “Dị ka ndị nkụzi, ndị na-enyere ndị nne na nna aka, ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme, ndị na-enye ọzụzụ, ndị na-enye ndụmọdụ, na ọbụna ndị na-eme ihe ntụrụndụ, ọrụ ndị ha na-arụ n’ịkpụzi akparamàgwà, ime ka e soro ndị ọzọ na-enwe mmekọrịta, na n’idozi ọnọdụ ime mmụọ dị oké mkpa. M na-eche banyere otú ọgbọ anyị siworo nwee ike ileghara ọrụ a dị ike ma nwee ọtụtụ akụkụ nke ndị nne na nna ochie na-arụ anya.”

N’oge gara aga, ndị nne na nna ochie bụ ntọala nke ndụ ezinụlọ, karịsịa n’etiti ndị na-efe Jehova Chineke. Bible nyere ụmụ Israel iwu ịkwanyere ndị agadi ùgwù na iji ha akpọrọ ihe. (Levitikọs 19:32) A na-ele ndị nne na nna ochie anya karịsịa dị ka ndị kwesịrị nsọpụrụ.—1 Timoti 5:4.

Ọ dị mwute ikwu na ọnọdụ agbanwewo. Ndị òtù ezinụlọ dị iche iche na-ebikarị n’ebe dị anya n’ebe ibe ha bi, ọtụtụ ndị ntorobịa na ndị nne na nna ha ochie adịghịkwa enwekebe mmekọrịta. Omume agbanwewokwa. N’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, a dịghịzi eji ùgwù kwesịrị ndị agadi—gụnyere ndị ikwu—emeso ha ihe. (2 Timoti 3:1-3) Ihe a na-akpọbu nsogbu nke enweghị mkparịta ụka n’etiti ndị ntorobịa na ndị agadi na-akawanye njọ ugbu a. Ọtụtụ ndị ntorobịa na-eche na ndị nne na nna ha ochie emewo agadi ma bụrụ ndị na-amaghị nke a na-akọ. Ha adịghị enwe ike iche echiche na ndị agadi a pụrụ ịghọta nrụgide na nsogbu ndị ntorobịa na-eche ihu taa.

Ọ bụrụ na ọ bụ otú ahụ ka ị na-eche, dị njikere ịtụle ya ọzọ! N’ihi na nnukwu abamuru dị n’ịmara nne na nna gị ochie—karịsịa ma ọ bụrụ na ha na-atụ egwu Chineke. Ọ bụrụkwa na ị mabeghị ha, ọ pụrụ ịbụ na ihe dị ukwuu na-efunahụ gị. N’ụzọ dị aṅaa?

Ebe E Si Enweta Amamihe na Ndụmọdụ

Ọtụtụ ndị na-eto eto achọpụtawo na ndị nne na nna ochie pụrụ ịbụ ebe nchebe n’oge ntorobịa nke jupụtara ná nsogbu. Magazin bụ́ Seventeen kwuru, sị: “N’ịbụ ndị nwere ahụmahụ ruo ọtụtụ iri afọ n’otú e si ebi ndụ, ọtụtụ mgbe ha pụrụ inyere gị aka ịnagide nsogbu karịa ndị enyi gị bụ́ ndị ọgbọ gị, bụ́ ndị na-enwe otu nchegbu ndị ahụ ị na-enwe. Gị na ndị ọgbọ gị na-enwe nsogbu mgbanwe ndị mbụ a na-enwe ná ndụ na-akpata; nne na nna gị ochie agafewo ọtụtụ mgbanwe ndị dị otú ahụ. Ha na-abụkarị ndị nwere amamihe na ndị ụbụrụ ha na-aghọ nkọ.” Ndụmọdụ a na-ekwughachi nnọọ ihe Bible kwuru n’ọtụtụ narị afọ gara aga, sị: “Okpueze nke mara mma ka isi awọ bụ, n’ụzọ ezi omume ka a ga-ahụ ya.”—Ilu 16:31.

N’eziokwu, nne na nna gị ochie pụrụ itolitewo n’ụzọ ndụ dị nnọọ iche na nke ị na-ebi ugbu a. Ma ị pụrụ ijide n’aka na site n’oge ruo n’oge, ha enwewo kpọmkwem otu mmetụta ndị ahụ ị na-agbaso mgba ugbu a. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na i nwechabeghị ahụmahụ n’ịnagide mmetụta ndị dị otú ahụ, nne na nna gị ochie ejiriwo ọtụtụ afọ ndụ ha mụta ụzọ isi nagide ha. (Ilu 1:4) “N’ime ndị kara nká ka amamihe dị, n’ụbọchị ndụ dị ogologo ka nghọta dịkwa,” ka onye ezi omume bụ́ Job kwuru. (Job 12:12) Ee, n’ihi nke ahụ kwa, ndị nne na nna ochie pụrụ mgbe mgbe inye ezigbo aka mgbe ndụmọdụ nke ziri ezi, agbamume, ma ọ bụ nkwado dị onye ntorobịa mkpa.

Dị ka ihe atụ, nne ochie Damaris na-eto eto so Damaris na mama ya biri n’otu ụlọ dị n’obodo mepere emepe. “Mgbe mụ na mama m sere okwu,” ka Damaris chetara, “nne m ochie nyeere anyị aka ikpezi. Ọ na-egosi m ụzọ dị iche e si ele ihe anya.”

Alexandria nwere ahụmahụ yiri nke ahụ mgbe ezinụlọ ya kwagara ebe ọzọ nke mere ka ọ gbanwee ụlọ akwụkwọ. “Onye nkụzi ọhụrụ m dị aka ike, ọ na-ewekwa iwe ọkụ site n’oge ruo n’oge,” ka Alexandria kwuru. N’ihi ya ime mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ ụlọ akwụkwọ ọhụrụ ya siiri Alexandria ike. Otú ọ dị, nne ya ochie ghọrọ onye enyemaka ya. O nyeere Alexandria aka ime mgbanwe site n’ịgba ya ume inwe nchekwube n’ọnọdụ ahụ. “Enwere m mmasị n’ụlọ akwụkwọ na n’ebe onye nkụzi m nọ ugbu a,” ka Alexandria na-ekwu.

Otu nwa okorobịa na Brazil aha ya bụ́ Rafael na-echeta aka nne na nna ya ochie nyeere ya mgbe ọ na-agụtụkwu akwụkwọ ka ọ gasịrị ụlọ akwụkwọ dị elu: “Ha nyere m ndụmọdụ dị ukwuu banyere mkpakọrịta na ụzọ isi guzogide iji ọgwụ ọjọọ eme ihe.” Rafael na-eje ozi ugbu a dị ka onye na-ezisa ozi ọma oge nile.

N’akwụkwọ ya bụ́ Grandparenting in a Changing World, Eda LeShan na-akọ ahụmahụ nke ya dị ka nne ochie. Ọ na-ede, sị: “Nwa nwa m nke nwanyị kpọrọ m òkù otu ụbọchị ma kwuo, sị, ‘Nne m ochie, achọrọ m enyemaka n’ihe banyere nrụgide ndị ọgbọ.’ Ụfọdụ n’ime ụmụ klas ha na-agbalị ime ka ya na ụmụ nwoke na-eme mkpapụ, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha na-akpọ ya òkù fon.” N’ihi arịrịọ nwa nwa ya nke nwanyị rịọrọ ya maka enyemaka, o kwere nne ochie ahụ omume inye ndụmọdụ nke mere ka e nweta enyemaka dị mkpa. N’otu aka ahụ, ị pụrụ ịchọpụta na mkparịta ụka dị nkenke nke gị na nne ma ọ bụ nna gị ochie na-ahụ n’anya nwere pụrụ ịbụ ihe na-enye ezi nkwado na-eweta agbamume.

Ndị nne na nna ochie na-abụkarị ndị na-enye aka karịsịa n’oge e nwere nsogbu n’ezinụlọ, dị ka ọrịa ma ọ bụ ọnwụ. Mgbe oké ọrịa gbusịrị papa Lacey bụ́ onye na-eto eto, nne ya ochie nyeere ya aka ịnagide ya. “Anyị enwewo mmekọrịta chiri anya karịa otú anyị nweburu,” ka Lacey na-ekwu.

Nkekọ Ịhụnanya nke Pụrụ Iche

Mmekọrịta gị na nne ma ọ bụ nna gị ochie nwekwara ike ghara inwe ụfọdụ n’ime esemokwu ndị ntorobịa na ndị mụrụ ha na-enwe mgbe ụfọdụ. N’ihi gịnị ka nke a pụrụ iji dị otú ahụ? Otu ihe bụ na ndị nne na nna ochie na ụmụ ụmụ ha na-enwekarị nkekọ pụrụ iche. Bible na-ekwu, sị: “Ndị agadi na-enwe oké mmasị n’ebe ụmụ ụmụ ha nọ.”—Ilu 17:6, Today’s English Version.

Chetakwa na ọ bụ ndị mụrụ gị—ọ bụghị nne na nna gị ochie—bụ ndị na-aghaghị inwe oké ibu ọrụ nke ịzụlite gị “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Ebe ọ bụ na ọrụ ha adịchaghị achọ oké ihe n’aka ha, nne na nna gị ochie nwere ike ghara ịdị na-abara gị mba otú ndị mụrụ gị na-abara gị. Ọzọkwa, nne na nna ochie mmadụ adịghị abụkarị ndị ibu ọrụ na nrụgide ndị a na-enwe kwa ụbọchị n’ihi nlekọta ezinụlọ na-anyịgbu. N’ihi na ha adịghị enwekebe nchekasị ndị dị otú ahụ, ọ pụrụ ịkara ha mfe igbo mkpa gị ma ọ bụ igosi mmasị n’ebe ị nọ. Tom dị afọ 17 na-echeta mmasị nne na nna ya ochie gosiri ya. Ha na-ezitere ya “obere onyinye dị iche iche maka ime nke ọma n’ule”; ha kwụọrọ ya ọbụna ụgwọ piano ọ na-amụ.

N’ezie, ọ bụghị ndị nne na nna ochie nile na-enwe ike inye onyinye ndị dị otú ahụ, ma ha ka pụrụ igosipụta mmasị ha nwere n’ebe ị nọ, ikekwe site n’ịja gị mma na ịgba gị ume ma ọ bụ site n’ige ntị n’ihe ị na-ekwu site n’oge ruo n’oge. Nke a pụrụ ime ka gị na ha nwee ezi nkekọ ọbụbụenyi. Damaris kwuru banyere nne ya ochie, sị: “Ọ na-eme ka ahụ ruo m ala, m na-enwekwa ike ịgakwuru ya ma kọọrọ ya ihe n’oge ọ bụla n’ihi na ọ na-adị njikere mgbe nile ige m ntị—ọ bụrụgodị na ihe m na-ekwu yiri ihe ezi uche na-adịghị na ya n’oge ahụ.” N’otu aka ahụ, otu nwa okorobịa aha ya bụ Jônatas nwere nkwuwa okwu n’ihu nne na nna ya ochie ma nwee ohere nke isoro ha na-ekwurịta ihe ndị dị mkpa.

Mgbanwerịta Ihe

Ọ bụ ezie na nne na nna gị ochie pụrụ ime ka i nwee amamihe ma gosi gị ịhụnanya, ha pụkwara irite uru n’ike ntorobịa gị na site n’iso gị na-akpakọrịta. N’ụzọ dị aṅaa? Ma eleghị anya, e nwere ọtụtụ ụzọ ị pụrụ isi nyere nne na nna gị ochie aka ma nye ha nkwado. Mgbe mgbe, ike ọkpụkpụ aka ha ebelatawala. Ma ọ bụ ha pụrụ ịdị na-alụso ọrịa ọgụ. Obi abụọ adịghị ya na a ga-agba ha ume ma ọ bụrụ na i nyere ha aka n’ịzụtara ha ihe nakwa n’ịrụrụ ha ọrụ n’ụlọ.

Ọtụtụ ndị nne na nna ochie bụ ndị di ha nwụrụ ma ọ bụ ndị nwunye ha nwụrụ, owu na-amakwa ha mgbe ụfọdụ. Site n’inwe ezi mmasị n’ebe ha nọ, ị pụrụ ime ihe dị ukwuu iji nyere ha aka ịlụso mmetụta nke owu ọmụma ọgụ nakwa ịnọgide na-enwe obi ụtọ ná ndụ. Ime otú ahụ bụ otu n’ime ụzọ isi gbasoo iwu Bible bụ́ ka i ‘nyeghachi ndị mụrụ [gị] ihe: n’ihi na nke a bụ ihe a na-anara nke ọma n’ihu Chineke.’—1 Timoti 5:4.

Obi abụọ adịghị ya na ịdị na-abịaru nne na nna gị ochie nso pụrụ ime ka ndụ gị ka mma—tinyere nke ha! Ma eleghị anya ị dịghị abịaru ha nso ruo ugbu a. Ikekwe ị chọrọ ịgbanwe nke ahụ ma ị maghị ebe ị ga-amalite. Ọ pụrụ ịbụ na nne na nna gị ochie bi n’ebe dị anya ma ọ bụ na ndị mụrụ gị ebịkọtaghịzi ọnụ, ya abụrụkwa na nke a ekewapụwo gị n’ebe nne na nna gị ochie nọ. Isiokwu a ga-enwe n’ọdịnihu ga-atụ arọ ụfọdụ bara uru banyere otú ị pụrụ isi mee ihe banyere ọnọdụ ndị dị otú ahụ.

[Foto dị na peeji nke 25]

Ndị nne na nna ochie pụrụ ịbụ ndị na-ege ntị nke ọma na ebe e si enweta ndụmọdụ na nkwado

[Foto dị na peeji nke 26]

Na-enyere nne na nna gị ochie aka