Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Bụ Ezie na M Bụ Onye Ntị Chiri nke Kpuru Ìsì, Enwetara M Nchebe

Ọ Bụ Ezie na M Bụ Onye Ntị Chiri nke Kpuru Ìsì, Enwetara M Nchebe

Ọ Bụ Ezie na M Bụ Onye Ntị Chiri nke Kpuru Ìsì, Enwetara M Nchebe

DỊ KA JANICE ADAMS SI KỌỌ

Malite mgbe a mụrụ m, ọ fọrọ nke nta ka ntị chie m kpam kpam, ma amụtara m iso ndị na-anụ ihe emekọ ihe. Ọzọkwa, mgbe m nọ na mahadum, akpata oyi wụrụ m mgbe a gwara m na m ga-ekpu ìsì. Onyeisi mahadum anyị nwere nzube dị mma nyere m otu isiokwu na-ekwu banyere ịdị ndụ n’enweghị ikike ịhụ ụzọ na ịnụ ihe. Ozugbo, ahụrụ m nkebi ahịrịokwu na-ekwu na ndị ntị chiri bụ́ ndị kpuru ìsì bụ ndị owu kasị ama n’ụwa. Anya mmiri gbara m.

AMỤRỤ m na Des Moines, Iowa, U.S.A., na July 11, 1954, nanị otu nwa Dale and Phyllis Den Hartog mụtara. Ndị mụrụ m amaghị na ha abụọ bucha ọrịa e si ná mkpụrụ ndụ ihe nketa ebufe bụ́ nke a maara dị ka Usher’s syndrome, nke na-akpata ntị ochichi site n’ọmụmụ ma na-eme ka e jiri nke nta nke nta kpuo ìsì.

Ná mmalite ndị mụrụ m echeghị na m nwere nsogbu. Ikekwe nke a bụ n’ihi na m ka nwetụrụ ike ịnụ ụda dị ala, mgbe ụfọdụkwa na-emeghachi omume n’ihi ụda m nụrụ. Otú ọ dị, mgbe m na-enweghị ike ikwu okwu, ha matara na ọ dị ihe gajọrọnụ. N’ikpeazụ dọkịta chọpụtara mgbe m dị ihe dị ka afọ atọ na m bụ onye ntị chiri.

Akụkọ a gbawara ndị mụrụ m obi. Ma, ha kpebisiri ike na m ga-enweta agụmakwụkwọ kasị mma m pụrụ inweta. E tinyere m n’ezigbo ụlọ akwụkwọ ọta akara maka ndị ntị ike. Ma ebe ọ fọrọ nke nta ka m bụrụ onye ntị chiri, emetụghị m nke ọma. Mgbe ụfọdụ m na-egosipụta nkụda mmụọ m site n’ibi isi n’ahụ ájá.

E Ziga M Ụlọ Akwụkwọ Pụrụ Iche

Ndị mụrụ m họọrọ itinye m n’Ụlọ Akwụkwọ Etiti Maka Ndị Ntị Chiri (CID), dị na St. Louis, Missouri. N’agbanyeghị nnukwu ego ọ ga-efu na obi mgbawa nke ịkpọpụ m mgbe m dị afọ ise, ha chere na nke a bụụrụ m olileanya kasị mma maka ịdị ndụ obi ụtọ gara nke ọma. N’ezie mụ na ndị mụrụ m apụghị ikwurịta okwu n’oge ahụ.

Anọ m na-ele ka mama m na-etinye uwe m n’igbe ákwà. Njem ahụ anyị ji ụgbọala mee yiri ka o nweghị njedebe. N’ụlọ akwụkwọ CID, ana m echeta ịhụ ụmụaka nwanyị ndị ọzọ na-enweghị nne ma chee, sị: ‘Ọ gaghị adị m mkpa ịnọ n’ebe a n’ihi na enwere m nne na nna.’ Mgbe oge ruru ka ndị mụrụ m laa, ha gbalịrị ịkọwa na ha ga-alọghachi n’ọnwa ole na ole. Akwasiri m ákwá ike ma jidesie ha ike, ma nwanyị na-elekọta ụlọ akwụkwọ ahụ dọkpụụrụ m ka ha nwee ike ịla.

Ọ dị m ka a gbahapụrụ m agbahapụ. N’ịbụ onye ya na nanị ụmụaka nwanyị ndị ọzọ nọ n’abalị mbụ anyị nọrọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, agbalịrị m ịgụgụ otu nwatakịrị nwanyị na-akwa ákwá site n’ime ka m̀ na-agwa ya okwu, ọ bụ ezie na apụghị m ikwu okwu n’oge ahụ. Nwanyị ahụ na-elekọta ụlọ akwụkwọ ahụ baara m mba ma were ihe gbabichie etiti mụ na ya ka anyị ghara ịnwa ikwurịta okwu. Site mgbe ahụ gawa ihe mgbochi ahụ dịgidere ebe ahụ. Nkewapụ iche ahụ nyere m nsogbu nke ukwuu.

Eji m nke nta nke nta chọpụta na anyị nile nọ n’ebe ahụ n’ihi na anyị apụghị ịnụ ihe. Ikekwe ndị mụrụ m hụdịrị m n’anya, ma ekwuru m n’obi m na ụta dịịrị m n’ihi na emeghị m nke ọma n’ụlọ akwụkwọ ọta akara. Ekpebisiri m ike ime nke ọma na nke a ma laghachikwuru ezinụlọ anyị otu ụbọchị.

Agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ CID bụ ọkpọka. Ọ bụ ezie na e kweghị ka anyị na-asụ asụsụ ogbi, e nyere anyị n’otu n’otu ọtụtụ ntụziaka n’ịmata ihe mmadụ na-ekwu site n’ile ya anya n’egbugbere ọnụ nakwa banyere ikwu okwu. E mekwara ka ihe ọmụmụ nile a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ ndị na-abụghị maka ndị ogbi pụta ìhè. Ọ bụ ezie na m chere na ịkụzi ihe site nanị n’ikwu okwu, dị ka a na-akpọ ya, adịghị eme ka ọtụtụ ụmụaka nti chiri mụta ihe, o mere ka m mụta ihe, enwekwara m ihe ịga nke ọma. Site n’iji ihe na-enyere m aka ịnụ ihe na-eme ihe, amụtara m ụzọ isi na-aghọta ihe site ná mmegharị ọnụ na n’ụda okwu dị ala nke ndị ọzọ. Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-anụ ihe malitere ịghọta okwu m dịtụworo mma, ọ bụ ezie na ọ dịchaghị mma. Ndị mụrụ m na ụlọ akwụkwọ ahụ nwere afọ ojuju dị ukwuu n’ihe ịga nke ọma m nwere. Ma, ọ gụsiri m agụụ ike ịla.

N’oge ezumike nke oge okpomọkụ ọ bụla m na-arịọ ndị mụrụ m ka ha kwe ka m nọrọ n’ụlọ gawa akwụkwọ na Iowa, ma e nwebeghị ihe ọmụmụ pụrụ iche n’ebe ahụ. Mgbe m laghachisịrị akwụkwọ, mama m na-ezitere m akwụkwọ ozi kwa ụbọchị ma tinye ya otu chịngọm. Lee ka m si eji chịngọm ahụ akpọrọ oké ihe n’ihi ịhụnanya o ji ya na-egosi m! Kama ịta ya, ana m edebe nke ọ bụla, m na-ejikwa ha akpọrọ ihe karịsịa mgbe m dara mbà n’obi.

Ịlọta Ọzọ, Ma Nsogbu Ebilite

N’ikpeazụ, mgbe m dị afọ 10, ndị mụrụ m kpọlatara m. Enwere m nnọọ obi ụtọ na mmetụta nke ịbụ onye nwetara nchebe n’etiti ezinụlọ anyị! E tinyere m n’otu ụlọ akwụkwọ pụrụ iche dị na Des Moines maka ụmụaka ntị chiri. E mesịrị tinye m na klas na-abụghị nke ndị ogbi n’ihi na m na-aghọta ihe ndị mmadụ na-ekwu nke ọma site n’ile ha anya n’egbugbere ọnụ, ana m ekwukwa ihe a pụrụ ịghọta aghọta. Ma, ọnọdụ ọhụrụ m nwere ọtụtụ ihe ịma aka.

N’ụlọ obibi dị n’ụlọ akwụkwọ CID, enwere m mmetụta nke ịbụ onye ndị ọgbọ m ntị chiri nabatara. Ma ugbu a, mgbe mụ na ihe karịrị otu onye na-aghaghị imekọrịta ihe n’otu oge, nkà m nke ile mmadụ anya n’egbugbere ọnụ iji ghọta ihe ọ na-ekwu adịghị adị irè mgbe a na-ekwu okwu ngwa ngwa. N’ihi ya adịghị m aghọtacha ihe nile a na-ekwu. Achọsiri m ike ịbụ onye a nabatara!

Nke a mere ka m mewe ka ụmụntakịrị nwoke nọ n’afọ iri na ụma nwee mmasị n’ebe m nọ, bụ́ nke mere ka m daba n’ọnọdụ ndị mere ka o siere m ike ịghara ime ihe ọjọọ. Amaghịkwa m otú m ga-esi jụ. Mgbe m dị afọ 14, e dinara m n’ike; ma agwaghị m onye ọ bụla. Ọ bụ ezie na ndị mụrụ m hụrụ m n’anya ma na-enwe nchegbu banyere m mgbe nile, enwere m mmetụta nke ịbụ onye e kewapụrụ iche na onye na-enweghị enyemaka.

N’iji ihe na-enyere m aka ịnụ ihe eme ihe, apụrụ m igetụ egwú, ma egwú m na-ahọrọ adịghị mma. Ana m ege egwú rock na-ada oké ụda. Aghọkwara m onye na-ese wii wii mgbe nile ma kewapụkwuo onwe m. M ka na-akwa ụta nke ukwuu ma m cheta ihe ndị m mere n’afọ ndị ahụ m nwere oké nsogbu na ihe mgbu ọ kpataara mụ na ezinụlọ anyị.

Mgbalị Imeziwanye Ndụ M

N’oge a nile, m nọgidere na-enwe ọchịchọ ịmụta ihe na imepụta ihe. Ana m agụ ihe mgbe nile, na-ese ihe, na-adụ ihe, ma na-achọ ákwà mma. Achọrọ m imezu ná ndụ m ihe karịrị ihe ọdịnihu ga-abụrụ ndị enyi m na-aṅụ ọgwụ ọjọọ. N’ihi ya etinyere m aha m na mahadum na-abụghị maka ndị ogbi nke dị nso n’ụlọ anyị iji mejuo ọchịchọ m nwere n’ise ihe. N’oge ahụ amalitere m ịmụ asụsụ ogbi n’ihi na enwere m nkụda mmụọ n’ihi ịbụ onye ndị mmadụ jụrụ.

N’ikpeazụ agafere m n’Ụlọ Akwụkwọ Nkà Mba Maka Ndị Ogbi dị na Rochester, New York, iji mụọ ise ihe n’arịa nkụwa. Ọ bụ ezie na ikike m nwere ịhụ ụzọ ji nwayọọ nwayọọ na-ebelata—eziokwu m na-ekwechaghị anakwere—ka o sina dị, ọ dị m ka ndụ m ọ̀ na-aga otú kwesịrị ekwesị. Ma onyeisi mahadum anyị mere ka m mara ihe ga-emenụ site n’ịgwa m na m ga-ekpu ìsì n’oge na-adịghị anya.

Ụlọ akwụkwọ ahụ enweghị ngwá zuru ezu iji gboo mkpa m, aghaghịkwa m ịhapụ ya. Gịnị ka m ga-emezi? Ọ bụ ezie na atụmanya nke ịghọ onye ìsì n’oge na-adịghị anya wutere m, ekpebisiri m ike ịchọta ụzọ m ga-esi dịrị ndụ n’adabereghị n’onye ọzọ ma ghara imesị bụrụ, n’ikwu ya otú isiokwu ahụ onyeisi mahadum ahụ nyere m si kwuo ya, ‘otu n’ime ndị owu kasị ama n’ụwa.’ Alaghachiri m Iowa iji mụọ otú e si agụ mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì na otú e si eji osisi agagharị agagharị.

Ịkwaga Washington, D.C.

Mahadum Gallaudet dị na Washington, D.C., bụ́ nanị mahadum na-akụzi ihe ọmụmụ bụ́ isi n’ụwa maka ndị ntị chiri, nwere ihe omume ndị a haziri maka ụmụ akwụkwọ nti chiri bụ́ ndị kpuru ìsì. Agafere m n’ebe ahụ ma nweta akara mmụta dị elu mgbe m gụsịrị akwụkwọ na 1979. Ọzọkwa, enwere m obi ụtọ maka inwe ihe ịga nke ọma n’agụmakwụkwọ.

Ma, m ka na-enwe mmetụta nke ịbụ onye e kewapụrụ iche n’ebe ndị ọgbọ m nọ. Ọ bụ ezie na ikike m nwere ịhụ ụzọ na-ebelata, amụrụ m asụsụ ogbi n’oge iji malite inwe mmetụta nke ịbụ akụkụ nke otu ìgwè, Ndị Ntị Chiri. Asụsụ ogbi m na-asụ na nke ndị ọzọ ntị chiri na-asụ bụ otu ihe. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na aghaghị m imetụ aka ha aka iji ghọta ihe ha na-ekwu, ndị ụfọdụ nti chiri zeere m n’ihi na ahụ adịghị eru ha ala. Amalitere m iche ma ọ dị mgbe ìgwè ọ bụla ga-anabata m n’ezie.

Ịchọ Ezi Okpukpe

Okpukpe enyeghị m nkasi obi mgbe m na-etolite etolite. Na mahadum kwa, ọ bụ ezie na amụrụ m banyere okpukpe, ọ dịghị mgbe m nwetara azịza nye ọtụtụ ajụjụ m. Mgbe m si na mahadum pụta, anọgidere m na-achọ azịza ha. N’oge a, enweghị m obi ụtọ ná mmekọrịta ndị m na-enwe, n’ihi ya amalitere m ikpegara Chineke ekpere maka nduzi ya.

Na 1981, alaghachiri m Mahadum Gallaudet iji nweta akara ugo mmụta bụ́ master na nkà inye ndụmọdụ n’ime ka ndị mmadụ gbanwee omume. Anọgidere m na-ekpe ekpere maka enyemaka iji chọta ezi okpukpe. Ọtụtụ ndị chọrọ ịkpọrọ m gaa chọọchị ha, ma n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, ha emeghị otú ahụ. Mgbe ahụ ezutere m Bill, bụ́ onye na-anụ ihe nke ọma ma na-agụ akwụkwọ inweta akara ugo mmụta bụ́ master. Ọ chọpụtara nnọọ ná ndabara na m nwere mmasị otú o nwere na Bible, ọ gwakwara m na ya na-amụta ụdị ihe dị iche iche dị ịtụnanya n’aka Ndịàmà Jehova.

Echiche mbụ m nwere bụ na Ndịàmà Jehova bụ òtù nzuzo ndị Juu, bụ́ nke m chọpụtara na ọtụtụ ndị nti chiri na-enwekarị. Bill mesiri m obi ike na ha abụghị ya, o kwukwara na ụzọ kasị mma isi chọpụta ihe banyere ha ga-abụ ịga otu n’ime nzukọ ha. N’ezie, achọghị m ịga, ma echetara m ekpere m. Ekwetara m, ma o sighị m n’obi, ma ọ bụrụ na anyị ga-anọdụ ala n’ahịrị oche nke dị n’azụ ka anyị nwee ike ịgbapụ ma ọ bụrụ na ha arụgide anyị ime ihe ọ bụla.

Enwere M Nnọọ Ahụ Iru Ala

M na-ama nnọọ jijiji ka anyị ji ụgbọala anyị na-aga nzukọ. Anyị abụọ yicha ákwà jean na-acha anụnụ anụnụ na efe dị fere fere. Enwere m obi ụtọ na oge agatụla mgbe anyị rutere n’ihi na n’oge ahụ ọ dịghị anyị mkpa isoro onye ọ bụla kwurịta okwu tupu nzukọ amalite. Bill tụgharịrị n’ụzọ zuru ezu ihe nile m na-apụghị ịhụ ma ọ bụ nụ. Ọ bụ ezie na aghọtaghị m ihe a na-eme n’ụzọ zuru ezu, ihe abụọ dọọrọ mmasị m: Ọkà okwu ahụ jiri Bible mee ihe ọtụtụ ugboro, ụmụaka, bụ́kwa ndị sooro ndị mụrụ ha nọdụ, keere òkè n’ụzọ dị ukwuu ná nzukọ ahụ. Mgbe a gbasara, n’abụtụghị ndị a rụgidere ime ihe, a nabatara anyị n’ụzọ na-ekpo ọkụ, n’agbanyeghị uwe anyị yi nakwa na anyị si n’agbụrụ dị iche.

Ọ bụ nanị anyị bụ ndị ọcha abụọ nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Ọ bụ ezie na amataghị m na m nwere ajọ mbunobi ọ bụla megide ndị isi ojii, ná mmalite enweghị m ahụ iru ala ịnọ n’ebe ahụ. Otú ọ dị, ozi nke eziokwu Bible dị nnọọ irè nke na o kweghị ka ahụ erughị ala m nwere mee ka m kwụsị. Anyị malitere ịgachi nzukọ anya. Ihe ka ọbụna bụrụ ihe ịma aka nye m bụ na e nweghị ndị ntị chiri n’ọgbakọ ahụ. Ya mere mgbe anyị nụrụ banyere ọgbakọ ọzọ nwere ụfọdụ ndị nti chiri na-aga ya, anyị malitere ịga n’ebe ahụ. Ọzọkwa, n’ọgbakọ ọhụrụ a, ọ bụ nanị anyị bụ ndị ọcha bịaranụ. Ma, e mere ka ahụ ruo anyị nnọọ ala.

Anyị kwetara mgbe e kwuru ka e duziere anyị ọmụmụ Bible. N’ikpeazụ, enwetawara m azịza nye ajụjụ m dị iche iche. Adịghị m aghọtakarị azịza ha ozugbo, ma ha dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. Site n’imekwu nchọpụta na ịtụgharị uche, emesịrị m ghọta eziokwu Bible. Na nke mbụ ya ná ndụ m, abịara m nwee mmetụta nke ịnọ Jehova nso dị ka ezi Chineke. N’otu oge ahụ, mụ na Bill ghọrọ ezi enyi. Amatara m na o nwere mmasị n’ebe m nọ, ma ọ tụrụ m n’anya mgbe ọ jụrụ m ma m ga-ekwe ka ya lụọ m. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, m kweere. E mere Bill baptism nwa obere oge mgbe anyị gbasịrị akwụkwọ, esochikwara m ya mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, na February 26, 1983.

Inweta Nchebe M Na-achọ

Na mbụ atụrụ m egwu na a ga-ekewapụ m iche n’ihi na ọgbakọ anyị nwere nanị ndị ogbi abụọ ọzọ, ha amachaghịkwa otú e si eso onye ntị chiri nke kpuru ìsì ekwurịta okwu. Amatara m na ọgbakọ anyị na-ahụ n’anya ma nwee omume enyi, ma ná mmalite apụghị m isoro ha na-ekwurịta okwu ihu na ihu. Nke a wutere m. Ọtụtụ mgbe m na-enwe nkụda mmụọ, owu na-amakwa m. Otú ọ dị, omume obiọma nke nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị ime mmụọ na-emetụ m n’obi ma kwalite mmụọ m. Bill gbakwara m ume ịnọgide n’ozi m na ikpegara Jehova ekpere ka o mee ka ndị nti chiri batakwuo n’ọgbakọ.

Ekpebiri m inweta nkịta nduzi ka m wee na-emere onwe m ihe karị. Nkịta ahụ nyekwaara m aka ịkwụsị inwe mmetụta nke ịbụ onye e kewapụrụ iche. Ọ bụrụ na Bill agaa ọrụ, ana m enwe ike iji ụkwụ gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze iji sonyere ìgwè zukọrọnụ iji kere òkè n’ozi ndị Kraịst. N’ime ọtụtụ afọ enwewo m nkịta nduzi anọ, nke ọ bụla adịwokwa ka onye òtù ezinụlọ m.

Ọ bụ ezie na nkịta nduzi nyeere m aka, ọ gụsiri m agụụ ike isorokwu ndị mmadụ na-enwe mmekọrịta. Ka oge na-aga, Jehova gọziri mgbalị ndị anyị na-eme ịzụlite mmasị n’ọmụmụ Bible n’etiti ndị ntị chiri. Mmasị ahụ tolitere ruo n’ókè nke na e guzobere ọgbakọ asụsụ ogbi na Washington, D.C. N’ikpeazụ, apụrụ m iso onye nke ọ bụla n’ime ndị nọ n’ọgbakọ kwurịta okwu!

Bill bịara ruo eruo ije ozi dị ka okenye, a họpụtakwara ya ịbụ onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ asụsụ ogbi. Enwetara m obi ụtọ dị ukwuu n’iduziri ndị ọzọ ntị chiri nakwa ndị ntị chiri bụ́ ndị kpuru ìsì ọmụmụ Bible, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha na-ejere Jehova ozi ugbu a n’ikwesị ntụkwasị obi. Akụzikwaara m ụmụnna nwanyị na-anụ ihe asụsụ ogbi ka ha wee nwee ike ịdịkwu irè n’ozi n’etiti ndị ntị chiri.

Oge Ule

Na 1992 enwere m oké ịda mbà n’obi n’ihi mmeso ọjọọ e mesoro m mgbe m bụ onye ntorobịa. Ruo ọtụtụ afọ, ọ fọrọ nke nta ka m ghara imeli ihe ọ bụla. Enweghị m ike ime ihe ọ bụla—ọ bụghị n’ihi ntị chiri m ma ọ bụ ìsì m kpuru—kama ọ bụ n’ihi oké mkpasasị uche m. Ọtụtụ mgbe echeghị m na m ga-enwe ike ịga nzukọ ma ọ bụ ịga ozi, m na-arịọkwa Jehova ka o nye m ume iji nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe. N’ihi ya, adịghị m ahapụkebe ịga nzukọ, anọgidere m na-ejechi ozi anya n’afọ ndị ahụ m nwere nkụda mmụọ.—Matiu 6:33.

Na 1994 anyị kwagara Vancouver, British Columbia, Canada, iji nye aka guzobe ọgbakọ asụsụ ogbi ọzọ. Nkwaga ahụ anyị kwagara n’ebe ahụ adịghị mfe. Ahapụrụ m obodo m maara nke ọma na ọtụtụ ezi ndị enyi. Ọ bụ ezie na m ka na-enwe ịda mbà n’obi na nchegbu, ọṅụ nke ịhụ ka e guzobere ọgbakọ ọhụrụ na Vancouver mere ka àjà nile a chụrụ bụrụ nke bara uru. Enwetara m ezi ndị enyi n’ọgbakọ ọhụrụ ahụ, nke mere na ọ bịara dịzie ka ụlọ anyị.

Ịbụ Ndị Nna Anyị Na-ahụ n’Anya Gọziri

Na 1999 mụ na di m na Ndịàmà abụọ ọzọ gara Haiti nọrọ ruo izu isii iji nye aka n’ozi n’etiti ndị ntị chiri. N’isoro alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova dị n’ebe ahụ rụkọọ ọrụ, anyị kụziiri ndị nọ n’ọgbakọ ahụ asụsụ ogbi ma soro ha mee nkwusa n’ókèala a na-arụbeghị ọrụ nke ọma bụ́ nke ndị ntị chiri nọ. N’ime izu ole na ole, a maliteere ihe karịrị mmadụ 30 ntị chiri nwere mmasị ọmụmụ Bible! Alọtara m na-enwe ume ime mmụọ ọhụrụ ma malite ozi oge nile dị ka ọsụ ụzọ na September 1999. Site n’enyemaka Jehova, ezigbo di m, na ọgbakọ na-enye nkwado, oké ịda mbà n’obi anapụbeghị m ọṅụ.

N’ime ọtụtụ afọ, ahụwo m na Jehova nwere ọmịiko hie nne. (Jemes 5:11) Ọ na-elekọta ndị ya nile—ma karịsịa ndị nwere mkpa pụrụ iche. Site ná nzukọ ya, enwewo m ike inweta New World Translation of the Holy Scriptures nakwa ọtụtụ akwụkwọ ndị ọzọ e ji amụ Bible bụ́ ndị e bipụtara ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì. M na-enweta ọṅụ ná mgbakọ ndị a na-asụ asụsụ ogbi. Ọgbakọ na-eji ịhụnanya akwado m site n’imetụ m aka n’aka ka ha na-atụgharị ihe a na-ekwu ka m wee soro n’ụzọ zuru ezu ná nzukọ nile. N’agbanyeghị nkwarụ abụọ m nwere, enwetawo m nchebe n’etiti ndị Jehova. Ọ bụghị nanị na m na-anata ihe kama apụkwara m inye ihe, nke a na-enyekwa m nnukwu ọṅụ.—Ọrụ 20:35.

Ana m atụ anya inwetaghachi ike ịnụ ihe na ịhụ ụzọ n’ụwa ọhụrụ nke Jehova. Ka ọ dịgodị, abụghị m otu n’ime ndị owu kasị ama n’ụwa, ma enwere m ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke ọtụtụ nde ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ mejupụtara. N’ihe a nile, ekele dịrị Jehova, bụ́ onye kweworo nkwa na ya agaghị aha m aka ma ọlị, na ya agaghị ahapụkwa m ma ọlị. Ee, n’agbanyeghị ihe ịma aka ahụ nile, apụrụ m ikwu, sị: “Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka; m gaghị atụ egwu.”—Ndị Hibru 13:5, 6.

[Foto dị na peeji nke 15]

Imetụ m aka n’aka ka a na-atụgharịrị m ihe a na-ekwu

[Foto dị na peeji nke 15]

Mụ na di m, bụ́ Bill, taa