Ezi Ahụ Ike Maka Mmadụ Nile—n’Isi Nso!
Ezi Ahụ Ike Maka Mmadụ Nile—n’Isi Nso!
“ECHICHE nke arịatụghị ọrịa ọzọ . . . na-ewu ewu ugbu a,” ka magazin Germany bụ́ Focus na-akọ. Ma echiche a abụghị ihe ọhụrụ. Mgbe ndụ ụmụ mmadụ malitere, Onye Okike ebughị n’obi ka ihe a kpọrọ mmadụ na-arịa ọrịa ma ọlị. Nzube ya maka ihe a kpọrọ mmadụ abụghị nanị “ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma nke ahụ ike maka mmadụ nile bi n’ụwa.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Onye Okike anyị zubere ka onye ọ bụla nwee ahụ ike zuru okè!
Ya mere, n’ihi gịnị ka anyị nile ji na-arịa ọrịa? Bible na-agwa anyị na Jehova Chineke kere nne na nna nke ihe nile a kpọrọ mmadụ, bụ́ Adam na Iv, ịbụ ndị zuru okè. Mgbe o kesịrị ihe nile, “Chineke wee hụ ihe nile ọ bụla O mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu.” Ọ dịghị mgbe Onye Okike anyị na-ahụ n’anya zubere ka ọrịa na ọnwụ na-emekpa ndụ ụmụ mmadụ ahụ. Ma mgbe Adam na Iv họọrọ ịhapụ ụzọ nke ndụ e nyere ha n’iwu, ha dabara ná mmehie. Ihe mmehie Adam kpatara bụ ọnwụ, bụ́ nke e bufeere ụmụ mmadụ nile.—Jenesis 1:31; Ndị Rom 5:12.
Jehova agbahapụghị nnọọ ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ hapụghịkwa ihe mbụ o zubere maka ha nakwa maka ụwa. N’akụkụ nile nke Bible, ọ na-eme ka a mara nzube ya ime ka ụmụ mmadụ na-erube isi nwetaghachi ọnọdụ ezi ahụ ike ha nwere na mbụ. Mgbe Jisọs Kraịst, bụ́ Ọkpara Chineke, nọ n’ụwa, o gosiri ike Chineke nwere ịgwọ ọrịa. Dị ka ihe atụ, Jisọs gwọrọ ìsì, ntị ochichi, ọrịa ahụ mmiri, àkwụ́kwụ̀, na ahụ mkpọnwụ.—Matiu 4:23, 24; Luk 5:12, 13; 7:22; 14:1-4; Jọn 9:1-7.
N’isi nso Chineke ga-agwa Eze Mesaịa ya, bụ́ Jisọs Kraịst, ka o weghara ihe omume nke ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ. N’ọchịchị ya, amụma Aịsaịa ga-emezu: “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa: a ga-ebupụ ajọ omume nke ndị bi n’ime ya.” (Aịsaịa 33:24) Olee otú nke a ga-esi mee?
Anyị na-arịba ama na onye amụma ahụ dere banyere ndị mmadụ ịbụ ndị ‘e bupụrụ ajọ omume ha.’ N’ihi ya, a ga-ewepụ ihe mbụ ahụ kpatara ọrịa—mmehie ihe a kpọrọ mmadụ ketara eketa. N’ụzọ dị aṅaa? A ga-eji uru nke àjà mgbapụta Jisọs mee ihe n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ Mkpughe 21:3, 4; Matiu, isi 24; 2 Timoti 3:1-5.
na-erube isi nọ, si otú ahụ wepụ ihe butere ọrịa na ọnwụ. A ga-enwe ọnọdụ paradaịs n’akụkụ ọ bụla nke ụwa. Onye Kraịst bụ́ Jọn onyeozi dere, sị: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” Nke ahụ ga-eme n’isi nso!—Inwe Nguzozi
Ka ọ dịgodị, ọtụtụ nde mmadụ na-arịa ọrịa. Ya mere, ọ bụ nnọọ ihe dị otú o kwesịrị na ndị mmadụ na-enwe nchegbu banyere ahụ ike ha nakwa banyere ahụ ike nke ndị ha hụrụ n’anya.
Ndị Kraịst taa na-enwe ekele dị ukwuu maka mgbalị ndị ọrụ ahụ ike na-eme. Ha na-eme ihe ndị ezi uche dị na ha iji gbakee n’ọrịa ma ọ bụ iji nọgide na-enwe ahụ ike. Otú ọ dị, nkwa Bible kwere maka ọdịnihu nke ọrịa na-agaghị adịkwa na ya na-enyere anyị aka ịnọgide na-enwe nguzozi na nke a. Ruo mgbe Eze ahụ bụ́ Mesaịa ga-eweghara ihe omume nke ihe a kpọrọ mmadụ, ahụ ike zuru okè agaghị nnọọ ekwe omume. Dị ka anyị hụworo, ọbụna nchọpụta ndị kasị eju anya enwebeghị ike ime ka nkà mmụta ọgwụ ghọta oroma ahụ kasị chaa achaa dị n’elu osisi oroma—ezi ahụ ike maka onye ọ bụla.
N’oge na-adịghị anya, a ga-enweta ihe mgbaru ọsọ nke “ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ ike dị mma maka mmadụ nile bi n’ụwa.” Ma ọ bụghị site n’aka òtù UN ma ọ bụ Òtù Ahụ Ike Ụwa ma ọ bụ ndị na-ahazi gburugburu ebe obibi ma ọ bụ ndị na-emeziwanye ọnọdụ ọha na eze ma ọ bụ ndị dibịa. Ọ bụ Jisọs Kraịst ga-arụzu nke ahụ. Lee ihe ọṅụ ọ ga-abụ mgbe a ga-emesị mee ka ihe a kpọrọ mmadụ ‘pụọ n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ha nke ebube nke ụmụ Chineke’!—Ndị Rom 8:21.
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Mmadụ nile ga-enwe ezi ahụ ike n’ụwa ọhụrụ Chineke