Olee Otú Ekpere Pụrụ Isi Nyere M Aka?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Olee Otú Ekpere Pụrụ Isi Nyere M Aka?
“Ọ bụ ekpere nyeere m aka ime ka ndụ m dịghachi mma.”—Brad. *
ỌTỤTỤ ndị na-eto eto na-ekpe ekpere—ikekwe ọbụna karịa otú i chere. Otu Njụta Echiche Gallup nke e mere ndị gbara afọ 13 ruo 17 na United States kpughere na pasent 56 n’ime ha na-ekpe ekpere tupu ha amalite iri ihe. Nnyocha e mere ndị toruru ogo mmadụ ọhụrụ gosiri na pasent 62 n’ime ha na-ekpe ekpere kwa ụbọchị.
N’agbanyeghị nke ahụ, nye ọtụtụ ndị ntorobịa, ekpere bụ nanị ihe omume na-abaghị uru ma ọ bụ ihe e ji emezu iwu. Ọ bụ ndị ntorobịa ole na ole nwere ihe Bible na-akpọ “mmazu nke Chineke.” (Ndị Kọlọsi 1:9, 10) N’ihi ya, Chineke adịghị oké mkpa ná ndụ ha. Otu nnyocha e mere jụrụ ndị nọ n’afọ iri na ụma ma ọ dịtụwo mgbe ha chigharịkwuuru Chineke maka enyemaka n’ime mkpebi dị mkpa. Otu nwa agbọghọ zara, sị: “Ana m echigharịkwuru Chineke mgbe nile n’ekpere ka o duzie m ịhọrọ ụzọ ndị ziri ezi ná ndụ.” N’agbanyeghị nke ahụ, o kwetara, sị: “Apụghị m icheta mkpebi nke ọ bụla ugbu a.” Ka a sịkwanụ ihe mere ndị ntorobịa na-ejighị enwe obi ike na ekpere nwere ike ọ bụla ma ọ bụ na ọ pụrụ ịrụrụ ha ọrụ!
Ka o sina dị, dị ka Brad, nke e hotara ná mmalite, ọtụtụ puku ndị ntorobịa achọpụtawo n’onwe ha ike ekpere nwere. Gị onwe gị pụkwara ịchọpụta ya! Isiokwu bu nke a ụzọ gosiri ihe mere anyị pụrụ iji nwee obi ike na Chineke ga-anụ ekpere anyị. * Ugbu a ajụjụ bụ, Olee otú ekpere pụrụ isi nyere gị aka? Ka anyị burugodị ụzọ nyochaa otú Chineke si aza ekpere anyị.
Otú Chineke Si Aza Ekpere
N’oge Bible, ụfọdụ ndị ikom nwere okwukwe natara kpọmkwem—ọbụna n’ụzọ ọrụ ebube—azịza nke ekpere ha. Dị ka ihe atụ, mgbe Eze Hezekaịa matara na ọrịa ọ na-arịa gaje igbu ya, ọ rịọsiri Chineke ike ka ọ napụta ya. Chineke zara ya, sị: “Anụwo m ekpere gị, ahụwo m anya mmiri gị: lee, m na-eme ka ahụ gị dị ike.” (2 Ndị Eze 20:1-6) Chineke mekwara ihe maka ndị ikom na ndị inyom ndị ọzọ na-atụ egwu ya.—1 Samuel 1:1-20; Daniel 10:2-12; Ọrụ 4:24-31; 10:1-7.
Otú ọ dị, ntinye aka Chineke abụghị ihe a na-ahụkarị, ọbụna n’oge Bible. Ọtụtụ mgbe karị, Chineke zara ekpere ndị ohu ya, ọ bụghị site Ndị Kọlọsi 1:9, 10) Ee, Chineke nyere aka site n’iwusi ndị ya ike n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ omume—na-enye ha amamihe na ihe ọmụma iji mee mkpebi ndị ezi uche dị na ha. Mgbe ndị Kraịst nọ n’ọnọdụ siri ike, Chineke ewepụghị ọnwụnwa ahụ. Kama, o nyere ha “ọkịka nke ike” ka ha wee nwee ike idi ya!—2 Ndị Kọrint 4:7; 2 Timoti 4:17.
n’ịrụ ọrụ ebube, kama site n’inyere ha aka ka ha “jupụta ná mmazu nke ihe Ọ na-achọ n’ime amamihe na nghọta nile nke Mmụọ Nsọ.” (N’otu aka ahụ taa, ma eleghị anya azịza nye ekpere gị agaghị abụ n’ụzọ dị ịrịba ama. Ma dị ka o mere n’oge gara aga, Chineke pụrụ inye gị mmụọ nsọ ya ma wusie gị ike ịnagide ọnọdụ ọ bụla ị na-eche ihu. (Ndị Galetia 5:22, 23) Iji maa atụ, ka anyị lee ụzọ anọ kpọmkwem ekpere pụrụ isi nyere gị aka.
Enyemaka n’Ime Mkpebi
Karen na otu nwa okorobịa yiri ka o nwere ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị dị elu nọ na-eyi oge. “Ọ ga-agwa m mgbe nile na ya chọrọ ịbụ okenye n’ọgbakọ,” ka Karen na-ekwu. Ihe a dachara nnọọ ka ihe dị mma. Ma “o kwukwara ọtụtụ ugboro banyere achụmnta ego ọ na-amalite na ihe nile ọ ga-enwe ike ịzụtara m. Amalitere m inwe obi abụọ ma ọ̀ na-ekwu eziokwu.” Karen kpere ekpere banyere ya. “Arịọrọ m Jehova ka o mepee anya m ma gosi m ihe ọ dị mkpa ka m mara banyere ya.”
Mgbe ụfọdụ ikpe ekpere n’onwe ya na-aba uru, ebe ọ pụrụ inyere gị aka ịkwụsịtụ ma tụgharịa uche dabere n’ụzọ Jehova si ele ihe anya. Ma okwu ndụmọdụ bara uru dịkwa Karen mkpa. Ọ̀ ga-anata azịza n’ụzọ ọrụ ebube? Tụlee otu ihe ndekọ dị na Bible banyere Eze Devid. Mgbe ọ nụrụ na enyi ya ọ tụkwasịrị obi bụ́ Ahitofel na-adụ nwa ya na-agba ya mgba okpuru bụ́ Absalọm ọdụ, Devid kpere ekpere, sị: “Biko, Jehova, mee ka ịdụ ọdụ Ahitofel ghọọ ihe nzuzu.” (2 Samuel 15:31) Ma Devid mekwara ihe n’ikwekọ n’ekpere ya. O zipụrụ enyi ya bụ́ Hushaị, sị: “Ị ga-emebikwara m ịdụ ọdụ Ahitofel.” (2 Samuel 15:34) N’ụzọ yiri nke ahụ, Karen mere ihe kwekọrọ n’ekpere ya site n’isoro onye Kraịst bụ́ okenye tozuru òkè nke maara enyi ya nwoke ahụ kwurịta okwu. O kwughachikwara ihe ahụ na-atụ Karen egwu: Enyi ya nwoke enwewo ntakịrị ọganihu ime mmụọ.
Karen kwuru, sị: “Ọnọdụ ahụ mere nnọọ ka m hụ ike ekpere nwere.” N’ụzọ dị mwute, onye ahụ bụbu enyi ya nwoke chụsoro akụ̀ na ụba ma kwụsị ijere Chineke ozi. “A sị na m lụrụ ya,” ka Karen na-ekwu, “ọ pụrụ ịbụ nanị m gaara na-abịa nzukọ ndị Kraịst.” Ekpere nyeere Karen aka ime mkpebi dị mma.
Enyemaka n’Ịchịkwa Mmetụta Uche Gị
“Mmụọ nile nke onwe ya ka onye nzuzu na-eme ka ọ pụta ìhè,” ka Bible na-ekwu n’Ilu 29:11, “ma onye maara ihe na-egbochi mmụọ ya, na-emekwa ka ọ dajụọ.” Nsogbu bụ na ọtụtụ ndị taa na-enwe oké nrụgide mmetụta uche, ọtụtụ mgbekwa bụrụ ndị na-adịghị achịkwa mmụọ ha—ọdachi na-esikwa na ya apụta mgbe ụfọdụ. Brian na-eto eto na-echeta, sị: “Mụ na otu onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ na-enwe nsogbu. Otu ụbọchị, ọ mịpụtara mmà.” Gịnị ka ị gaara eme? Brian kpere ekpere. Ọ na-ekwu, sị: “Jehova nyeere m aka ịnọ jụụ, site n’ịgwa ya okwu, emere m ka ọ gbanwee obi ya. Ọ tọgbọrọ mmà ahụ wee pụọ.” Ịchịkwa mmetụta uche ya nyeere Brian aka izere iwe iwe, ma eleghị anya ọ bụ nke a zọpụtara ndụ ya.
Ọ pụrụ ịbụ na a gaghị eji mmà yie gị egwu ọtụtụ mgbe. Ma a ga-enwe ọtụtụ ọnọdụ ná ndụ gị bụ́ mgbe ọ ga-adị mkpa ka ị chịkwaa mmetụta uche gị. Ekpere pụrụ inyere gị aka ịnọ jụụ.
Enyemaka Ịnagide Nchekasị
Barbara na-echeta mgbe ọ na-agabiga “oge ihe isi ike” afọ ole na ole gara aga. Ọ na-ekwu, sị: “Ọrụ m, ezinụlọ m, ndị enyi m—o yighị ka e nwere ihe na-aga aga. Amaghị m ihe m ga-eme.” Site ná mkpali, Barbara kpere ekpere maka enyemaka. Ma e nwere otu nsogbu dịnụ. “Amaghị m ihe m ga-arịọ Jehova,” ka o kwuru. “N’ikpeazụ, arịọrọ m maka udo nke uche. N’abalị ọ bụla, arịọrọ m ya ka o nyere m aka ka m ghara ịdị na-echegbu onwe m banyere ihe nile.”
Olee otú ekpere ahụ si nyere ya aka? Ọ na-ekwu, sị: “Ụbọchị ole na ole ka e mesịrị, Ndị Filipaị 4:6, 7.
aghọtara m na ọ bụ ezie na nsogbu m ka dị, ha adịghịzi echegbu m ma ọ bụ na-enye m nsogbu.” Bible na-ekwe nkwa, sị: “Meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.”—Enyemaka Iji Bịarukwuo Chineke Nso
Tụlee ahụmahụ nke otu onye ntorobịa aha ya bụ Paul. “Mụ na ụfọdụ ndị ikwu m ka malitere ibi,” ka ọ na-ekwu. “Otu abalị, enwere m oké ịda mbà n’obi. Ọ dịbeghị anya m gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu, agụụ ịhụ ndị enyi m nile na-agụkwa m. Anya mmiri rujuru m anya n’abalị ahụ ka m chetara oge ndị ahụ magburu onwe ha anyị nọkọrọ ọnụ.” Gịnị ka Paul ga-eme? Na nke mbụ ya, o kpesiri ekpere ike. Ọ na-ekwu sị: “Emeghere m obi m, rịọkwa Jehova ume na udo nke uche.”
Gịnị si na ya pụta? Paul na-echeta, sị: “N’ụtụtụ echi ya, ebiliri m ma nwee ahụ iru ala karịa otú m nwetụworo ná ndụ m. Esi m n’ịbụ onye obi na-ajọ njọ nke ukwuu gaa n’inwe ‘udo nke Chineke nke kachasị uche nile.’” Ugbu a obi ya dị jụụ, Paul pụrụ ile ihe anya site n’ọnọdụ mmetụta uche dị mma. N’oge na-adịghịkwa anya, ọ ghọtara na e kwuwerị, ‘oge ndị ahụ magburu onwe ha’ adịchaghị mma otú ahụ. (Eklisiastis 7:10) N’ezie, “ndị enyi” ahụ gụsiri ya agụụ ike ịhụ enwechaghị ezi mmetụta n’ezie n’ebe ọ nọ.
Karịsịa, Paul n’onwe ya bịara hụ nlekọta Jehova. O nwere mmetụta nke eziokwu dị n’ihe ndị ahụ e kwuru na Jemes 4:8, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” Nye Paul, nke a bụ oge oké mgbanwe. A kpaliri ya idote Jehova n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ya na ịrara ndụ ya nye ya.
Gwa Chineke Okwu!
Ahụmahụ ndị a dị mma bụ ihe mmesi obi ike na ekpere pụrụ inyere gị aka. Otú ọ dị, nke ahụ bụ eziokwu ma ọ bụrụ na i ji ịmara Chineke kpọrọ ihe, na-eme ihe ka gị na ya bụrụ enyi. N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị ntorobịa na-egbu oge ime nke a. A zụlitere Carissa n’ezinụlọ ndị Kraịst. Ma ọ na-ekweta, sị: “Echere m na ọ bụ nanị n’afọ ole na ole gara aga ka m ghọtara n’ụzọ zuru ezu oké mkpa mmekọrịta pụrụ iche nke anyị na Jehova dị.” A zụlitere Brad, onye e hotara ná mmalite, dị ka onye Kraịst, ma ọ dapụrụ n’ezi ofufe ruo ọtụtụ afọ. “Ọ bụ nanị mgbe m ghọtara ihe funahụrụ m,” ka ọ na-ekwu, “ka m chigharịkwuuru Jehova. Ugbu a amatala m otú ndụ pụrụ isi bụrụ nke ịhụnanya na-adịghị na ya nakwa nke tọgbọrọ chakoo ma ọ bụrụ na mmekọrịta dị otú ahụ adịghị.”
Otú ọ dị, echela ruo mgbe i nwere oké nsogbu tupu ị bịaruo Chineke nso. Malite ịgwa ya okwu ugbu a—mgbe nile! (Luk 11:9-13) ‘Wụsịa obi gị n’ihu ya dị ka mmiri.’ (Abụ Ọma 62:8) Ị ga-achọpụta n’oge na-adịghị anya na ekpere pụrụ inyere gị aka n’ezie!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.
^ par. 6 Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Chineke Ọ̀ Ga-anụ Ekpere M?” ná mbipụta Teta! nke July 8, 2001.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 16]
Ekpere Pụrụ Inyere Gị Aka
● Ime mkpebi ndị ka mma
● Ịnọ jụụ n’oge nrụgide
● Inwere onwe gị pụọ ná nchekasị
● Ịbịarukwu Chineke nso