Chineke Ọ̀ Nabatara Ahịa Ohu?
Echiche nke Bible
Chineke Ọ̀ Nabatara Ahịa Ohu?
NDỊ isi ojii ọsụsọ na-agba bụ́ ndị bu nnukwu akpa ogho ndị na-anyị ajọ arọ n’azụ, chiiri ụkwụ ha n’ala na-agbago àkwà osisi e si abanye n’ụgbọ mmiri. Ndị nlekọta dị obi ọjọọ ji ụtarị akpụkpọ anụ na-apịa ha iji manye ha ịrụ ọrụ. A na-adọkpụrụ ụmụaka na-eti mkpu site n’aka nne ha na-akwa ákwá ma resị ha onye kwekarịsịrị ọnụ ná mgbuka. O yiri ka ọ̀ bụ ọnọdụ ọjọọ ndị a dị egwu ka ị ga-eji anya nke uche gị hụ mgbe i chere banyere ịgba ohu.
N’ụzọ na-emegide onwe ya, a sịrị na ọtụtụ ndị na-azụ ahịa ohu na ndị nwere ndị ohu bụ ndị ji nnọọ okpukpe kpọrọ ihe. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ James Walvin dere, sị: “E nwere ọtụtụ narị ndị ikom dị otú ahụ, ndị Europe na ndị America, bụ́ ndị nyere Onyenwe anyị otuto maka ngọzi ya, na-ekele ya maka ahịa uru na nke na-enweghị ọdachi ha zụrụ n’Africa ka ha na-akwọ ụgbọ ohu ha na-agafe oké osimiri na-aga n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa.”
Ọbụna ụfọdụ ndị ekwusiwo ike na Chineke nabatara ahịa ohu ahụ. Dị ka ihe atụ, n’okwu nke Alexander McCaine gwara Nnọkọ Ezumezu nke Chọọchị Metọdist Protestant na 1842, o kwuru na ọrụ nke ịgba ohu bụ nke “Chineke n’Onwe Ya guzobere.” Ihe McCaine kwuru ò ziri ezi? Chineke ọ̀ kwadoro ịtọrọ ụmụ agbọghọ na idina ha n’ike, ikewa ezinụlọ n’ụzọ obi ịta mmiri, na iti ihe n’ụzọ obi ọjọọ bụ́ ndị ha na ahịa ohu nke oge McCaine na-agakọ? Gịnịkwa banyere ọtụtụ nde ndị a na-amanye ibi na ịrụ ọrụ dị ka ndị ohu n’ọnọdụ ndị jọgburu onwe ha taa? Chineke ọ̀ na-anabata mmeso obi ọjọọ ndị dị otú ahụ?
Ịgba Ohu na Ụmụ Israel
Bible na-ekwu na “mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) Ma eleghị anya, nke a kasị pụta ìhè n’ụdị ịgba ohu mmegbu bụ́ nke ụmụ mmadụ wepụtaworo. Jehova Chineke abụghị onye nhụjuanya nke ịgba ohu ahụ wetaworo na-adịghị emetụ n’obi.
Dị ka ihe atụ, tụlee otu ọnọdụ ụmụ Israel nọrọ na ya. Bible na-agwa anyị na ndị Ijipt “[weere] ofufe siri ike mee ka ndụ ha dị ilu, n’ụrọ, na n’ime brick, na n’ofufe nile ọ bụla n’ọhịa, ofufe ha nile nke ha mere ka ha fee n’ime ha dị ná mkpagbu.” Ụmụ Israel “wee na-eze ume n’ihi ofufe ha, ha wee tie mkpu, ntiku ha tikuru Chineke wee rịgoruo Chineke ntị.” Jehova ò mere omume Ọpụpụ 1:14; 2:23, 24; 6:6-8.
ọ gbasaghị m n’ebe ọnọdụ ha dị? O meghị otú ahụ, “Chineke wee nụ ịsụ ude ha, Chineke wee cheta ọgbụgba ndụ Ya, nke Ya na Abraham na Aịsak na Jekọb gbara.” Ọzọkwa, Jehova gwara ndị ya, sị: “M ga-emekwa ka unu si n’okpuru ibu nile nke ndị Ijipt pụọ, M ga-anapụtakwa unu n’ofufe ha.”—N’ụzọ doro anya, Jehova akwadoghị ‘mmadụ inwe ike n’ahụ mmadụ ibe ya’ site n’ịgba ohu mmegbu. Ma ọ̀ bụ na Chineke emesịghị kwe ka ndị ya na-agba ohu? Ee, o kwere. Otú ọ dị, ịgba ohu nke e nwere n’Israel dị nnọọ iche n’ụdị ịgba ohu mmegbu e nweworo n’akụkọ ihe mere eme nile.
Iwu Chineke kwuru na ịtọrọ na ire mmadụ nwere ntaramahụhụ nke ọnwụ. Ọzọkwa, Jehova nyere ụkpụrụ nduzi dị iche iche iji chebe ndị ohu. Dị ka ihe atụ, a ga-atọhapụ ohu nke nna ya ukwu merụrụ nnukwu ahụ ka o nwere onwe ya. Ọ bụrụ na ohu anwụọ n’ihi na nna ya ukwu tiri ya ihe, a pụrụ inye nna ya ukwu ahụ ntaramahụhụ ọnwụ. Ndị inyom a dọtara n’agha pụrụ ịghọ ndị ohu, ma ọ bụ a pụrụ ịlụrụ ha dị ka nwunye. Ma a gaghị eji ha mee ihe nanị iji mejuo ọchịchọ mmekọahụ. Ọ ghaghị ịbụ ihe e ji maka ya nye Iwu ahụ mere ka ụmụ Israel nwere obi ziri ezi jiri nkwanye ùgwù na obiọma na-emeso ndị ohu ihe, dị ka a ga-asị na ha bụ ndị ọrụ e goro ego.—Ọpụpụ 20:10; 21:12, 16, 26, 27; Levitikọs 22:10, 11; Deuterọnọmi 21:10-14.
Ndị Juu ụfọdụ ji aka ha ghọọ ohu ndị Juu ibe ha iji kwụghachi ụgwọ ha ji. Omume a chebere ndị mmadụ pụọ n’ịnọ agụụ ma mee n’ezie ka ọtụtụ ndị si n’ịda ogbenye nwere onwe ha. Ọzọkwa, n’oge ndị dị mkpa na kalenda ndị Juu, a na-atọhapụ ndị ohu ma ọ bụrụ na ha achọọ. * (Ọpụpụ 21:2; Levitikọs 25:10; Deuterọnọmi 15:12) N’ikwu okwu banyere iwu ndị a metụtara ndị ohu, onye Juu bụ́ ọkà mmụta bụ́ Moses Mielziner kwuru na “ọ dịghị mgbe ọ bụla ohu ga-akwụsị ịbụ mmadụ, a na-ele ya anya dị ka onye nwere ihe ụfọdụ ruuru ya dị ka mmadụ, bụ́ ndị ọbụna nna ya ukwu na-enweghị ikike nke ịnapụ ya.” Lee ka nke a si dị nnọọ iche n’usoro ịgba ohu mmegbu bụ́ nke mebiworo akụkọ ihe mere eme!
Ịgba Ohu na Ndị Kraịst
Ịgba ohu bụ akụkụ nke usoro akụ̀ na ụba nke Alaeze Ukwu Rom, bụ́ nke ndị Kraịst narị afọ mbụ biri ndụ n’okpuru ya. N’ihi ya, ụfọdụ ndị Kraịst bụ ohu, ndị ọzọ nwekwara ndị ohu. (1 Ndị Kọrint 7:21, 22) Ma nke a ọ̀ pụtara na ndị na-eso ụzọ Jisọs bụ ndị na-emegbu ndị ohu ha? Ọ dịghị ma ọlị! N’agbanyeghị ihe iwu ndị Rom kwere ka ọ dịrị, anyị pụrụ inwe obi ike na ndị Kraịst emegbughị ndị nọ n’okpuru ha. Ọbụna Pọl onyeozi gbara Faịlimọn ume imeso ohu ya bụ́ Ọnisimọs, bụ́ onye ghọworo onye Kraịst, dị ka “nwanna.” *—Faịlimọn 10-17.
Bible ekwughị ihe ọ bụla na-egosi na ndị mmadụ iji mmadụ ibe ha mere ohu bụ akụkụ nke nzube mbụ nke Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ọzọkwa, ọ dịghị amụma Bible ọ bụla na-ezo aka na ụmụ mmadụ ga-abụ ndị nwe mmadụ ibe ha site n’ịgba ohu n’ụwa ọhụrụ nke Chineke. Kama nke ahụ, na Paradaịs ahụ na-abịanụ, ndị ezi omume “ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.”—Maịka 4:4.
N’ụzọ doro anya, Bible adịghị anabata imeso ndị ọzọ n’ụzọ obi ọjọọ n’ụdị ya ọ bụla. Kama nke ahụ, ọ na-akwado nkwanye ùgwù na ịhà nhata n’etiti ndị mmadụ. (Ọrụ 10:34, 35) Ọ na-agba ụmụ mmadụ ume imeso ndị ọzọ dị ka ha ga-achọ ka e mesoo ha. (Luk 6:31) Ọzọkwa, Bible na-agba ndị Kraịst ume iji obi umeala na-ele ndị ọzọ anya dị ka ndị ka ha mma, n’agbanyeghị ọnọdụ ha nọ na ya. (Ndị Filipaị 2:3) Ụkpụrụ ndị a ekwekọtụghị n’ụdị ịgba ohu mmegbu nke ọtụtụ mba nwere, karịsịa n’ime narị afọ ndị na-adịbeghị anya.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 11 Eziokwu ahụ bụ́ na e mere ndokwa ikwe ka ụfọdụ na nna ha ukwu nọrọ, na-egosi n’ụzọ doro anya na ịgba ohu nke ụmụ Israel abụghị nke mmegbu.
^ par. 13 N’ụzọ yiri nke ahụ, ụfọdụ ndị Kraịst taa bụ ndị were mmadụ n’ọrụ; ndị ọzọ bụ ndị e were n’ọrụ. Dị nnọọ ka onye Kraịst were mmadụ n’ọrụ na-agaghị emegbu ndị na-arụ ọrụ n’okpuru ya, ndị na-eso ụzọ Jisọs na narị afọ mbụ ga-emesowo ndị na-ejere ha ozi dị ka ụkpụrụ ndị Kraịst si dị.—Matiu 7:12.