Ikiri Ụwa
Ikiri Ụwa
Iji Snow Emere Ntụoyi
A na-eji snow eme ihe dị ka ebe ọhụrụ e si enweta ikike n’oge okpomọkụ, ka akwụkwọ akụkọ Japan bụ́ Asahi Evening News na-akọ. Obodo Bibai nke dị na Hokkaido, n’ebe ugwu Japan, na-enwe oge oké okpomọkụ dị mkpirikpi na nnukwu snow n’oge oyi. Kama ịdị na-ekupụsị snow ahụ, ndị ọrụ na-ekukọba ha n’ụlọ nkwakọba ihe. O ruzie n’oge okpomọkụ, “a na-eme ka ikuku banye n’ime nnukwute ụlọ nkwakọba ihe na-ajụ oyi e kukọjuru snow na ya tupu e mee ka ọ pụtaghachi dị ka ikuku jụrụ oyi, dị ka nke ahụ a na-eji eme ka ihe jụọ oyi na friji,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu. A na-eji ikuku a jụrụ oyi eme ka ụlọ ndị na-eji snow emere ntụoyi na-ajụ oyi, bụ́ ndị e wuru kpọmkwem maka iji snow na-eme ka ha na-ajụ oyi. Uru ọzọkwa bụ na ụlọ nkwakọba ihe ndị ahụ e kujuru snow na ha na-enwe udè dị ukwuu, bụ́ nke na-enye aka eme ka ikuku dị ọcha site n’ịmịkọrọ uzuzu na ísì ndị dị na ya.
Ụkwara Nta Na-egbu Mmadụ nke Na-eguzogide Ọgwụ
“Ụdị ụkwara nta na-egbu mmadụ nke na-eguzogide ọgwụ (MDRTB), bụ́ nke na-agbasanụ, nwere ikike nke ikpochapụ ezinụlọ dum,” ka akwụkwọ akụkọ Johannesburg bụ́ Star na-akọ. “N’ime afọ ole na ole na-abịanụ, ọnụ ọgụgụ ndị na-arịa ya ga-agafe nke ndị na-arịa ụkwara nta (TB) nkịtị” na South Africa. Dị ka Òtù Mba Na-ahụ Maka Ụkwara Nta na South Africa si kwuo, ndị na-arịa TB pụrụ inwe MDRTB ma ha kwụsị ịṅụ ọgwụ ha oké ngwa ngwa ma ọ bụ ọ bụrụ na ha aṅụchighị ya anya. A pụziri ibufe ndị na-arịatụbeghị TB ụdị TB ahụ dị ize ndụ karị bụ́ nke na-eguzogide ọgwụ. Ịgwọ ụdị TB ahụ na-eguzogide ọgwụ na-efu ihe ji okpukpu 20 karịa ihe ọ na-efu iji gwọọ TB nkịtị, a na-enwekwa ihe ịga nke ọma dị ala karị—ọkara nke ndị nile na-arịa ụdị ahụ na-eguzogide ọgwụ na-anwụ. Ntiwapụ nke ọrịa TB na South Africa, ka akụkọ ahụ na-akọ, “na-agbasa n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-enweghị nchịkwa n’agbanyeghị na a na-agwọ TB n’efu.” Ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ndị obodo ahụ nwere TB nke na-amalitebeghị inye ha nsogbu bụ́ nke nje virus HIV pụrụ ịkpalite n’ụzọ dị mfe.
Afọ 49 Ọ̀ Bụ Afọ Ndụ Dị Ize Ndụ?
‘Kpachara anya, maka ndị dị afọ 49,’ ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Asahi Shimbun na-adọ aka ná ntị. A na-ejidekarị ndị ikom nọ n’afọ ndụ a maka igbu ọchụ na ịnwa igbu ọchụ karịa otú a na-ejide ọgbọ ọ bụla ọzọ na Japan. Ndị nọ n’afọ 49 kasịkwa emerụ mmadụ ahụ. Ndị ọzọ na-esote ha bụ ndị nọ n’afọ 47, ha gasịa ndị nọ n’afọ 48 na 45 esochie. Gịnị mere o ji bụrụ ọtụtụ ndị nọ n’afọ ndụ a? Ndị ikom na-akpụdewe afọ ndụ nke 50 eruwo n’oge dị oké mkpa ná ndụ, ka onye Tokyo bụ́ dibịa na-agwọ ọrịa uche na-ekwu. “Ụmụ ha na-aghọ ndị nọọrọ onwe ha, ha aghaghị ilekọta nne na nna ha na-eme agadi, mmekọrịta ha na di ma ọ bụ nwunye ha na-aghọkwa nke na-adịchaghị otú o kwesịrị,” ka ọ na-ekwu. “Ha nọ n’oge mgbe ha na-adịchaghị enwe ike ịchịkwa mmetụta ha, ndị ụfọdụ na-emekwa ihe nanị site ná mkpali ọbụna mgbe ha pụrụ ịhụ ihe ize ndụ dị na ya.” Dị ka akwụkwọ akụkọ ahụ si kwuo, ego a gbaziiri maka iwu ụlọ, ego agụmakwụkwọ, nrụgide n’ebe ọrụ, ịchụ n’ọrụ, na ọrụ ndị a na-ejighị n’aka sokwa na-akpatara ndị ikom nọ n’afọ 40 na ụma ha nchekasị.
Ọ̀ Bụ Nkà na Ụzụ Na-akpata Ichefu Ihe?
Ụfọdụ ndị dọkịta nọ na Japan, United States, na Britain amalitewo ikwu na ọ bụ nkà na ụzụ kọmputa, dị ka obere ngwá electronic a na-eji enweta ihe ọmụma na ngwá kọmputa ndị na-eduzi ndị na-anya ụgbọala ụzọ na-akpatara ndị na-akatabeghị ahụ ichefu ihe nke ukwuu, ka The Sunday Times nke London na-akọ. Ndị dọkịta a na-ekwu na ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ na-eme ka e belata otú e si eji ọgụgụ isi edozi nsogbu, na-eme ka ndị ọrụ, gụnyere ọbụna ndị ka nọ n’afọ ndụ 20 na ụma na 30 na ụma ha, ghara inwe ike icheta aha, okwu ndị e deturu edetu, ma ọ bụ àgbà ndị ha yiri. Dr. David Cantor nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ọnọdụ Uche n’Atlanta, Georgia, U.S.A., na-ekwu, sị: “Ọtụtụ ndị ọkachamara kwenyere na inwe ihe ọmụma gabigara ókè na-eme ka o siere ụfọdụ ndị ike inweta ihe ọmụma ọhụrụ . . . Ndị a na-echefu ihe n’ihi na ọtụtụ ihe na-adọpụ uche ha nke na ha amụtaghịdị ha amụta.” Dr. Takashi Tsukiyama, bụ́ onye Tokyo, na-ekwu na nsogbu ndị a “enweghị ihe jikọtara ha na afọ ndụ kama na ha metụtara ụzọ ndụ [gị], dị ka ejighị ụbụrụ gị eme ihe n’ụzọ zuru ezu.”
“Nnukwute Nsogbu Ahụ Ike nke Ọha”
Dị ka ihe ndekọ gọọmenti na-egosi, igbu onwe onye bụ ihe nke asatọ kasị akpata ọnwụ n’etiti ndị America. Ihe karịrị ndị America 30,000 na-egbu onwe ha kwa afọ, kwa afọ kwa, ihe karịrị mmadụ 650,000 na-anwa igbu onwe ha. E nwere ihe karịrị mmadụ atọ na-egbu onwe ha maka igbu ọchụ
abụọ ọ bụla, ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi bụ́ Reuters na-ekwu. Ma ụlọ ọrụ gọọmenti ma ndị ndị mmadụ nwe n’onwe ha na-ezo aka n’igbu onwe onye dị ka “nnukwute nsogbu ahụ ike ọha.” David Satcher, bụ́ dọkịta ukwu nke United States, kwuru sị: “Ọ bụ mmadụ ole na ole na-agbanahụ ịbụ ndị ọdachi igbu onwe onye metụtara n’oge ndụ ha.” Ụfọdụ n’ime ihe ndị na-akpata igbu onwe onye gụnyere “ịda mbà n’obi, mmetụta nke enweghị olileanya na amaghị ihe a ga-eme, na ịṅụbiga mmanya ókè nakwa ịṅụ ọgwụ ọjọọ,” ka Reuters na-akọ.Amaghị Bible
Ọ bụ ezie na a nọwo na-akwanyere Bible ùgwù kemgbe ụwa na United States, otu nnyocha e mere na nso nso a chọpụtara na ọ bụ nanị pasent 16 nke ndị nọ ebe ahụ bụ́ ndị sịrị na ha bụ ndị Kraịst kwuru na ha na-agụ Bible kwa ụbọchị. Dị ka a kọrọ n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Sun Herald nke Biloxi, Mississippi, U.S.A., nnyocha ọzọ e mere gosiri na ọ bụ nanị mmadụ 2 n’ime mmadụ 10 maara onye ziri Ozizi Elu Ugwu ahụ. Ọzọkwa, ndị a jụrụ ajụjụ pụrụ nanị ihota nanị atọ ma ọ bụ anọ n’ime Iwu Iri ahụ.
Mmiri Grape na Ọgwụ
Iji mmiri grape aṅụ ọgwụ ndị dọkịta depụtaara mmadụ pụrụ ịmụba “ihe ize ndụ nke ihe ndị ọgwụ na-akpata, n’ọnọdụ ole na ole kwa, [kpata] mmetụta ndị dị njọ,” ka UC Berkeley Wellness Letter na-akọ. Ọgwụ ndị bụ́ isi nke a metụtara na-agụnye ọgwụ ụfọdụ e ji ebelata ọ̀tụ̀tụ̀ cholesterol, ọgwụ ndị e ji agwọ ọbara mgbali elu bụ́ ndị a mara dị ka ndị na-egbochi ngagharị nke calcium, na ọgwụ ụfọdụ ndị na-akụjụ ahụ. Otú ọ dị, n’ụzọ na-adọrọ mmasị, ọ bụghị mmadụ nile ka ngwakọta a na-enwe mmetụta na-adịghị mma n’ahụ ha, ọ bụghịkwa mmiri grape nile na-akpata nsogbu. “Ọ bụrụ na ị ṅụọ mmiri grape mgbe ị ṅụsịrị ọgwụ,” ka Wellness Letter na-ekwu, “gakwuru onye na-enye gị ọgwụ ma jụọ mmetụta ọ pụrụ inwe.”
Ọ̀ Bụ Ikike Ncheta Ihe Dị Ka nke Enyí?
Ndị nchọpụta na-arụ ọrụ n’Ogige Ntụrụndụ Gọọmenti nke Amboseli nke dị na Kenya achọpụtawo na otu n’ime isi ihe so na-eme ka ìgwè enyí na-alanarị na-adabere n’ikike ncheta ihe nke nne enyí kasị mee okenye. “Ndị mere okenye n’ime ìgwè enyí ndị bụ́ nne, bụ́ ndị nne dị afọ 55 ma ọ dịkarịa ala, na-aka amata ndị bụ́ ndị enyi ha na ndị bụ́ ndị ha na-amabughị karịa . . . ndị dị afọ 35,” ka Science News na-akọ. Site n’icheta ihe ahụ a kpọrọ ube ha ji ezirịta ozi, ma ọ bụ ụda ndị dị ala, nne enyí ndị meworo okenye na-amata ube ndị ha na-adịghị anụbu ma mee ka ìgwè enyí ndị ahụ nọkọta ọnụ iji chebe onwe ha. Akụkọ ahụ na-ekwu na “nne enyí na-amatakarị ihe ruru 100 enyí site n’ube ha.” N’ihi ya, mgbe ndị na-achụ nta n’ụzọ iwu na-akwadoghị gburu otu enyí nke mere okenye karị, nke a pụtara mfu nke nnukwute isi iyi nke ihe ọmụma nye ìgwè enyí ahụ dum.
Ihe Kasị Egbu Mmadụ
“Mmanya na-aba n’anya na-egbu ndị ntorobịa dị 55,000 kwa afọ,” ka akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta kwa ụbọchị nke France bụ́ Le Figaro na-akọ. Dị ka Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) si kwuo, mmanya na-aba n’anya bụ ihe kasị egbu ndị ikom Europe dị afọ 15-29, ọ bụkwa isi ihe so na-akpata ọnwụ nke pasent 25 nke ndị nile na-anwụnụ. Nke a na-agụnye ndị na-anwụ n’ihi “ịṅụbiga mmanya ókè, ihe ọghọm ụgbọala, igbu onwe onye, na igbu mmadụ,” ka akwụkwọ ahụ na-ekwu. Ọnọdụ ahụ kasị njọ ná mba ụfọdụ dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, bụ́ ebe “otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụmụ okorobịa ga-anwụ n’oge na-adịghị anya n’ihi ịdị na-aṅụbiga mmanya na-aba n’anya ókè.” N’otu nnọkọ nkwurịta okwu e nwere na Stockholm, Sweden, Dr. Gro Harlem Brundtland, bụ́ onyeisi ukwu nke WHO, katọrọ orire ndị na-emepụta mmanya na-aba n’anya na-ere ya n’eleghị anya n’azụ, bụ́ nke na-eme ka o sikwuoro ndị ntorobịa ike inwe “echiche kwesịrị ekwesị nke dịkwa mma banyere mmanya na-aba n’anya.”
Ụzọ Isi Nwee Obi Ụtọ
“Isi ihe na-eme ka ndụ bụrụ nke na-eju afọ abụghị ego buru ibu mmadụ nwere n’ụlọ akụ̀. N’ezie, ịba ọgaranya, ịbụ onye a ma ama na ịbụ onye ọnụ na-eru n’okwu bụ ma eleghị anya ihe ikpeazụ na-eweta afọ ojuju,” dị ka nnyocha ọhụrụ ndị ọkà n’akparamàgwà mmadụ mere na-egosi. Kennon Sheldon na Mahadum Missouri-Columbia, nke dị na United States, na-ekwu, sị: “N’ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ, ọtụtụ mkpọsa ngwá ahịa na-atụ aro na anyị kwesịrị ịbụ ndị mara mma, ndị a ma ama na ndị bara ọgaranya. Ọ pụrụ ime ka achụmnta ego gị na-aga nke ọma, ma ndị a ghọgburu iche otú ahụ abụghị ha bụ ndị kasị nwee obi ụtọ.” Dị ka a kọrọ n’akwụkwọ akụkọ London bụ́ The Independent, nnyocha e nyochara ụmụ akwụkwọ mahadum karịrị 700 gosiri na dị ka ụmụ akwụkwọ ahụ si kwuo, “ùgwù onwe onye” na “ịkpa ndị ọzọ nso” bụ isi ihe ndị kasị eme ka ha na-enwe obi ụtọ. Ugboro ole a kpọtụrụ ego aha dị ka ihe na-eweta obi ụtọ kasị ala. A kagbuwo echiche ahụ bụ́ na “ ‘ndị na-eche na ego apụghị ịzụta obi ụtọ amaghị ebe a pụrụ ịzụta ya,’ ” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu.