Ihe Isi Ike Ndị Dị n’Ịbụ Nne
Ihe Isi Ike Ndị Dị n’Ịbụ Nne
Ịbụ nne bụ ahụmahụ siri ike ma na-akpali akpali. Ndị nne na-enwe oge ndị dị oké ọnụ ahịa bụ́ ndị ha na-agaghị eji agbanwere ihe ọ bụla ọzọ. Ma, mgbe ụfọdụ, ọ na-adị ụfọdụ n’ime ha ka hà gaje inwe ịda mbà n’obi. Helen jiri ndụ ya dị ka nne tụnyere ọsọ a na-awụfe ọtụtụ ihe mgbochi. Ọ dịkwa ka a na-enwekwu ihe isi ike ndị ka ukwuu ka oge na-aga.
Ndị nne pụrụ ịchụ oge ha na-ejighị ọrụ n’aka na ihe ka ukwuu n’oge ha na ndị ọzọ na-eji akpakọrịta n’àjà iji hụ na e lekọtara ụmụ ha nke ọma. “Aghaghị m ịnọ ya mgbe ọ bụla a chọrọ m,” ka Esther, bụ́ nne ji ụmụ ise kwuru. “Ewerewo m ịsa ahụ́ ọkụ ọkụ gbanwere imeda obi saa ahụ́, ma were nri e siri ọkụ ọkụ gbanwere nri a kwọrọ aka sie. Ọ dị njem ndị m kwesịrị ime bụ́ ndị m na-emebeghị, ọtụtụ ebe m na-ahụbeghị, ọtụtụ ihe m na-emebeghị. Ma ihe ndị a agaalarị, ọ bụghịzi ha ka a na-ekwu!”
N’ezie, ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị nne ga-ekwukwa banyere oge ọṅụ pụrụ iche ha na-enwe mgbe ha na-azụlite ụmụ ha. Esther na-ekwu, sị: “Ọnụ ọchị a na-amụmụrụ gị site n’oge ruo n’oge, ekele na-enye obi ụtọ bụ́ ‘Mama, i meela,’ na ibi ọma na-ekpo ọkụ *
—ihe ndị a bụ ihe nkwali na-eme ka ị nọgide na-aga n’ihu.”Nne Amalite Ịga Ọrụ
Ihe isi ike bụ́ isi nke meworo ka ịbụ nne dị mgbagwoju anya bụ na ọtụtụ n’ime ha na-ebu ibu ọrụ ezinụlọ ma na-arụzu ihe dị ukwuu a chọrọ ha n’aka n’ebe ọrụ ha, bụ́ nke ha na-eme iji nye aka kwado ezinụlọ ha n’ụzọ ego. Ọtụtụ n’ime ndị nne a na-arụ ọrụ ego, ọ bụghị n’ihi na ọ masịrị ha, kama n’ihi mkpa. Ha maara na ọ bụrụ na ha anọrọ n’ụlọ, ọtụtụ ihe ga-akọ ezinụlọ ha, karịsịakwa, ụmụ ha. Ụgwọ ọnwa ha—ndị na-adịkarị ala karịa nke ndị ikom ha na ha na-arụ otu ọrụ—dị oké mkpa.
Dị ka ihe atụ, na São Paulo, Brazil, pasent 42 nke ndị ọrụ bụ ndị inyom. Otu akwụkwọ akụkọ n’ebe ahụ kpọrọ ndị nne ji oge ha nile azụ ụmụ “ndị dị ụkọ.” N’ime ime obodo dị iche iche nke Africa, a na-ahụkarị ndị nne bu ùkwù nkụ n’isi ma kwọrọ nwa n’azụ.
Ebe Ọrụ Na-achọ Ihe Dị Ukwuu n’Aka Mmadụ
Tụkwasị n’ihe isi ike ndị ahụ, ndị a na-arụrụ ọrụ pụrụ ịchọ ka ndị nne na-etinye ọtụtụ awa n’ọrụ. Ọ bụghịkwa nanị ihe ndị a ka a na-achọ n’aka ha. Mgbe e were Maria, bụ́ onye bi na Gris, n’ọrụ, onye ọ na-arụrụ ọrụ gwara ya ka ọ bịanye aka n’akwụkwọ bụ́ ebe o kwere nkwa na ya agaghị atụrụ ime ruo afọ atọ. Ọ bụrụ na ọ tụrụ ime, ọ ghaghị ịkwụ ego iti aka n’obi. Maria bịanyere aka n’akwụkwọ ahụ. Ma mgbe ihe dị ka otu afọ na ọkara gasịrị, ọ tụụrụ ime. Mgbe ahụ, onye ọ na-arụrụ ọrụ jiri akwụkwọ ahụ gosi Maria, bụ́ onye gara ụlọikpe iji maa ụkpụrụ ụlọ ọrụ ya na-agbaso aka ma na-echezi ihe ga-esi na ya pụta.
N’ọnọdụ ndị na-adịghị njọ otú ahụ, ndị were mmadụ n’ọrụ pụrụ ịrụgide ndị nne ịlọghachi ọrụ ngwa ngwa o kwere mee mgbe ha mụsịrị nwa. Dị ka ọ na-adịkarị, a dịghị ebelata awa ha na-etinye n’ọrụ mgbe ha lọghachisịrị. N’ihi ya, ọ dịghị mgbanwe ọ bụla a na-emere ha maka ibu ọrụ ndị ha nwere ugbu a n’ebe obere nwatakịrị nọ. Ha enweghị ike iwere oge ezumike buru ibu n’akpataghị ihe isi ike n’ụzọ ego. Ndị nne nwekwara ike ịdị na-eche nsogbu nke enweghị ebe ndị dị mma a na-elekọta ụmụaka na enyemaka ego na-ezughị ezu nke gọọmenti na-enye.
N’aka nke ọzọ, ndị nne ụfọdụ na-arụ ọrụ, ọ bụghị n’ihi mkpa ego, kama iji nwee afọ ojuju onwe onye. Sandra kpebiri ịmaliteghachi ọrụ mgbe ọ bụla ọ mụsịrị nke ọ bụla n’ime ụmụ ya abụọ. Ọ na-echeta na n’ịbụ onye nanị ya na nwa ọhụrụ nọ n’ụlọ, ya “na-eguzo mgbe ụfọdụ n’akụkụ windo na-elepụ anya ma na-eche ihe ndị ọzọ na-eme.” Ụfọdụ ndị nne na-achọ izere nchekasị nke ndụ ezinụlọ site n’ịga ọrụ. Akwụkwọ akụkọ Britain bụ́ Daily Telegraph kọrọ, sị: “Ụfọdụ ndị nne na nna na-achọ ịnọtụkwu n’ebe ọrụ dịtụ jụụ site n’ịrụkwu ọrụ ruo awa ụfọdụ. Nke a na-akpata ajọ ihe na-ekote ọzọ, na-ebelatakwu oge ha na-ewepụta soro ụmụ ha nọkọọ bụ́ ndị na-enwewanye àgwà ọ̀ gbasara m, na-achọwanye okwu ma na-akpawanye àgwà ọjọọ.”
Ime Ọtụtụ Ihe n’Otu Oge
Imezu ihe a chọrọ n’ebe ọrụ nakwa n’ebe obibi adịghị mfe. N’ikwu echiche ọtụtụ ndị, otu nne si Netherlands, kwuru, sị: “Ike na-agwụkasị m ahụ́. Ọbụna m na-eteta ụra n’ike ọgwụgwụ. Mgbe m si ọrụ lọta, ike na-agwụkasị m ahụ́. Ụmụ m ekwuwelarị, sị: ‘Ike na-agwụ mama anyị mgbe nile,’ nke ahụ na-emekwa ka m nwee obi amamikpe. Achọghị m ịhapụ ịga ọrụ, ma achọkwara m ịbụ nne nwere
omume enyi bụ́ onye na-emezu ihe nile a chọrọ ya n’aka. Ma abụghị m onye nlereanya n’imezu ihe nile, bụ́ ihe m chọrọ ịbụ.”Ọ bụ otu n’ime ọtụtụ nde ndị nne na-arụ ọrụ bụ́ ndị nwere echiche bụ́ na iwepụta ‘oge bara uru’ soro ụmụaka nọkọọ pụrụ ịkwụ ụgwọ maka ọtụtụ oge ha na-adịghị anọ ya—bụ́kwa ndị chọpụtaworo na echiche ahụ erijughị afọ. Ọtụtụ ndị nne taa na-ekwu na ịgwakọta nrụgide nile nke ọrụ na ibu ibu ọrụ nile nke ebe obibi na-eme ka ha na-arụgbu onwe ha n’ọrụ, na-adọlịgbu onwe ha, ma bụrụ ndị a na-akwụ ụgwọ dị ala.
Mgbe ndị inyom na-ahapụ ụmụ ha ruo ọtụtụ awa, ụmụ ha adịghị enweta ihe dị ha mkpa karịsịa—oge na nlebara anya nke nne ha. Fernanda A. Lima, bụ́ ọkà mmụta n’akparamàgwà ụmụaka, nke si Brazil, kwuru na ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịrụ ọrụ nne na-arụ nke ọma dị ka nne. “Afọ abụọ mbụ nke ndụ nwatakịrị bụ oge na-akasị ata akpụ,” ka ọ na-ekwu. “Nwatakịrị ahụ ka dị nnọọ obere ịghọta ihe mere na mama ya anọghị ya.” Onye ọzọ pụrụ ime ka mkpa nwatakịrị nwere maka nne ya belata ma ọ pụghị iweghara ọnọdụ nne ya. “Nwa ọhụrụ ahụ na-aghọta na ya adịghị enweta nlekọta ịhụnanya nke nne ya,” ka Lima na-ekwu.
Kathy, bụ́ nne na-arụ ọrụ oge nile nke nwere obere nwa nwanyị, kwuru, sị: ‘Ana m enwe ajọ obi amamikpe, dị ka a ga-asị na m na-agbahapụ ya [n’ebe a na-elekọta ụmụaka]. Ọ na-agbawa obi ịghọta na ị na-atụfu ohere i nwere ịhụ ka nwa gị na-eto, ọ na-akpatakwa nnọọ obi erughị ala iche na ọ hụrụ ndị ahụ na-elekọta ụmụaka n’anya karịa gị.’ Otu nwanyị na-arụ ọrụ n’ime ụgbọelu na Mexico kwetara, sị: “Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, nwa gị agakwaghị ama onye ị bụ, ọ gakwaghị akwanyere gị ùgwù nanị n’ihi na ọ bụghị gị na-azụlite ya. Ha maara na ị bụ nne ha, ma na mberede, ha na-ahọrọ ịnọnyere nwanyị nke na-elekọta ha.”
N’aka nke ọzọ, ndị nne bụ́ ndị na-anọ n’ụlọ mgbe nile iji lekọta ụmụ ha na-ekwu na ha aghaghị ịnagide ịbụ ndị ọha mmadụ, bụ́ ndị nwere àgwà nke itobiga ọrụ a na-akwụ ụgwọ na ya ókè, ledara anya ma na-ewetu ala. N’ebe ụfọdụ, a dịghịzi ele ịbụ odozi akụ̀ na-adịghị aga ọrụ anya dị ka ọnọdụ na-enye ùgwù, n’ihi ya a na-arụgide ndị inyom inwe ọrụ nke ha, ọbụna ma ọ bụrụ na ego ha ga-akpatakwu adịghị mkpa.
Ndị A Hapụrụ Ịdọlị n’Onwe Ha
Ihe ọzọ na-akpatakwu ihe isi ike nke ịbụ nne bụ nke a: N’ịbụ onye ike gwụrụ n’ihi ọrụ ụbọchị zuru ezu, nne na-alọta, ọ bụghị iji zuru ike, kama iji gaa n’ihu n’ọrụ ụlọ ọ na-arụ kwa ụbọchị. A ka na-elekarị ndị nne anya, ma hà na-arụ ọrụ ego ma ọ bụ na ha adịghị arụ, dị ka ndị bụ́ isi ọrụ ha bụ ilekọta ụlọ na ụmụaka.
Ka ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị nne na-arụkwu ọrụ ruo ọtụtụ awa, ndị nna adịkarịghị enyere ha aka n’ụlọ. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Sunday Times nke London kwuru, sị: “Britain bụ mba nke ndị nna na-adịghị anọ n’ụlọ, dị ka nnyocha ọhụrụ e mere si gosi, bụ́ nke mere ka ọ pụta ìhè na ndị ikom na-ewepụta ihe na-erughị minit 15 kwa ụbọchị iji soro
ụmụ ha nọkọọ. . . . Ọtụtụ ndị ikom adịchaghị anụ ụtọ isoro ezinụlọ ha nọkọọ. . . . Ná ntụnyere, nne bụ́ onye Britain nke na-arụ ọrụ na-ewepụta minit 90 kwa ụbọchị isoro ụmụ ya nọkọọ.”Ụfọdụ ndị bụ́ di na-eme mkpesa na ọ na-esiri nwunye ha ike inye ndị ọzọ ọrụ n’ihi na ha na-esi ọnwụ ka e mee ihe ọ bụla kpọmkwem otú ha na-esi eme ya. “Ma ọ bụghị ya, ị gaghị emeta ya,” ka ndị di ahụ kwuru. O doro anya na iji rite uru ná nkwado nke di ya, odozi akụ̀ na-adịghị aga ọrụ nke ike gwụrụ pụrụ ịdị njikere ime mgbanwe ụfọdụ n’ihe banyere ụzọ e si arụ ụfọdụ ọrụ ụlọ. N’aka nke ọzọ,
di ya ekwesịghị iwere omume ahụ dị ka ihe ngọpụ iji ghara ime ihe ọ bụla.Iwetakwu Ihe Isi Ike
Ọdịnala ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike pụkwara iwetakwu ihe isi ike. Na Japan, a na-atụ anya ka ndị nne zụlite ụmụ yiri ndị ha na ha bụ ọgbọ. Ọ bụrụ na ụmụaka ndị ọzọ na-aga ihe ọmụmụ ịpị ngwá egwú piano ma ọ bụ ise ihe, onye bụ́ nne na-ewe ya dị ka ibu ọrụ dịịrị ya ime ka ụmụ ya meekwa otu ihe ahụ. Ụlọ akwụkwọ na-arụgide ndị mụrụ ụmụ ime ka ụmụ ha sonye n’ihe omume ndị a na-eme ma a gbasaa akwụkwọ bụ́ ndị ụmụaka ndị ọzọ na-eme. Ịgbapụ iche pụrụ ịkpata mmechuihu site n’aka ụmụaka, ndị nkụzi, nne na nna ndị ọzọ, na ndị ikwu. Otu ihe ahụ na-emekwa n’ala ndị ọzọ.
Mkpọsa ngwá ahịa na ọchịchọ ịzụ ihe onwunwe pụrụ ime ka ụmụaka chọọ ka a zụọrọ ha ihe ụfọdụ. Ná mba ndị mepere emepe, ndị nne pụrụ iche na ha kwesịrị inye ụmụ ha ihe ọ bụla ha chọrọ n’ihi na ha na-ahụ ka ndị nne ndị ọzọ na-enye ihe ndị ahụ. Ọ bụrụ na ha apụghị ime otú ahụ, ha pụrụ iche na ha adaala.
Ntụle a a na-atụle ịbụ nne nke oge a ekwesịghị ikpuchi omume obi ike nke ọtụtụ nde ndị nne na-arụsi ọrụ ike ma na-achụ onwe ha n’àjà, bụ́ ndị na-eme ihe ha nwere ike ime iji mezuo otu n’ime nzube ndị kasị zie ezie—ịzụlite ọgbọ na-abịa n’ihu nke ezinụlọ mmadụ. Nke a bụ ihe ùgwù. Bible na-ekwu, sị: “Ụmụ bụ ngọzi na onyinye sitere n’aka ONYENWE ANYỊ.” (Abụ Ọma 127:3, Contemporary English Version) Miriam, bụ́ nne ji ụmụ abụọ, na-ekwuchitere nnọọ ndị nne dị otú ahụ mgbe ọ sịrị: “N’agbanyeghị ihe ịma aka ndị dị na ya, ịbụ nne nwere ọṅụ nke ya na-enweghị atụ. Ọ na-enye anyị bụ́ ndị nne afọ ojuju mgbe anyị hụrụ ka ụmụ anyị na-anabata ọzụzụ na ịdọ aka ná ntị a na-enye ha ma ghọọ ndị bara uru n’obodo.”
Gịnị pụrụ inyere ndị nne aka inwetakwu ọṅụ n’onyinye ha? Isiokwu na-esonụ ga-atụ aro ụfọdụ bara uru.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Isiokwu ndị a lekwasịrị anya n’ebe ndị nne lụrụ di nọ. N’ọdịnihu, Teta! ga-atụle ihe ịma aka dị iche iche ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ na ndị na-alụghị di na-eche ihu.
[Igbe dị na peeji nke 6]
“Ụbọchị Ndị Nne”
Ogbenye ọnụ ntụ, agụghị akwụkwọ, ndị di na-adịghị eji ihe akpọrọ ihe, iti ihe mgbe nile, na ntiwapụ nke ọrịa AIDS na-eti ndị nne ihe otiti n’ebe ndịda Africa. N’otu Ụbọchị Ndị Nne e nwere n’oge na-adịbeghị anya, akwụkwọ akụkọ South Africa, bụ́ The Citizen, kọrọ, sị: “Ọtụtụ puku ndị inyom ga-abụ ndị di ha ga-eti ihe ma ọ bụ metọọ, ụfọdụ ga-anwụkwa n’Ụbọchị Ndị Nne.” Kwa afọ, nsogbu ndị dị otú ahụ na-eme ka ọtụtụ puku ndị nne bụ́ ndị South Africa gbahapụ ụmụ ọhụrụ ha. N’ime afọ abụọ na-adịbeghị anya, e nwere mmụba dị pasent 25 n’ụmụ ọhụrụ a gbahapụrụ agbahapụ. Ọbụna nke ka njọ bụ ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị inyom na-egbu onwe ha. N’oge na-adịbeghị anya, otu nwanyị si n’ógbè dara ogbenye ku ụmụ ya atọ kwụchiere ụgbọ okporo ígwè ụzọ. Ha nile nwụrụ. Iji nweta ihe e ji ebi ndụ, ndị nne ụfọdụ na-agbazi akwụna ma na-ere ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ na-agba ụmụ ha ndị inyom ume ime otú ahụ.
Site na Hong Kong, a kọrọ na “ụfọdụ ndị nne bụ́ ndị na-eto eto na-egbu nwa ha mụrụ ọhụrụ ma ọ bụ tụnye nwa ọhụrụ ahụ n’ime arịa mkpofu ihe, ebe ọ bụ na ha apụghị ịnagide nrụgide ọ na-eweta.” Akwụkwọ akụkọ bụ́ South China Morning Post kwuru na ụfọdụ ndị inyom na-eto eto lụrụla di na Hong Kong “na-enwezi nnọọ nrụgide [nke na] ha pụrụ inwe nsogbu mmetụta uche ruo n’ókè nke igbu onwe ha.”
[Igbe dị na peeji nke 7]
Ịbụ Nne n’Ala Dịgasị Iche Iche
Oge dị nnọọ nta
❖ Otu nnyocha e mere na Hong Kong gosiri na pasent 60 nke ndị nne na-aga ọrụ adịghị ewepụta ihe ha weere dị ka oge zuru ezu iji soro ụmụ ha nọkọọ. N’ime izu kwa, pasent 20 nke ụmụaka rurula afọ atọ bụ́ ndị nne na nna ha na-aga ọrụ, adịghị ebi n’ụlọ ha, ha na nne na nna ha ochie na-ebikarị.
❖ Ndị inyom nọ na Mexico na-etinye ihe dị ka afọ 13 nke ndụ ha n’ilekọta ma ọ dịghị ihe ọzọ otu nwa na-erubeghị afọ ise.
Ndị nne na ọrụ
❖ Na Ireland, pasent 60 nke ndị inyom na-anọ n’ụlọ iji lekọta ụmụaka. Na Gris, Ịtali, na Spen, ihe dị ka pasent 40 nke ndị inyom na-eme otu ihe ahụ.
Inye aka n’ụlọ
❖ Na Japan, pasent 80 nke ndị odozi akụ̀ na-adịghị aga ọrụ kwuru na ọ dị ha ka ya bụrụ na onye òtù ezinụlọ ha na-enyere ha aka n’ọrụ ụlọ, karịsịa mgbe ha na-arịa ọrịa.
❖ Na Netherlands ndị ikom na-ewepụta ihe dị ka awa 2 n’ụbọchị iji soro ụmụ ha nọkọọ ma na-etinye minit 42 n’ọrụ ụlọ. Ndị inyom na-ewepụta ihe dị ka awa 3 soro ụmụ ha nọkọọ ma na-etinye 1 awa na minit 42 n’ọrụ ụlọ.
Ndị nne nwere nchekasị
❖ Na Germany ihe karịrị pasent 70 nke ndị nne na-enwe nchekasị. Ihe dị ka pasent 51 na-eme mkpesa banyere nsogbu ọkpụkpụ azụ. Ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ atọ na-enwekarị ike ọgwụgwụ na nkụda mmụọ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 30 na-enwe isi ọwụwa ma ọ bụ oké isi ọwụwa.
Ndị nne a na-eti ihe
❖ Na Hong Kong pasent 4 nke ndị inyom e nyochara kwuru na e tiwo ha ihe mgbe ha dị ime.
❖ Otu nnyocha magazin bụ́ Focus mere na Germany gosiri na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1 nne n’ime ndị nne 6 kwetara na nwa ya etiwo ya ihe ma ọ dịkarịa ala otu ugboro.
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Ịbụ nne pụrụ ịdị na-akpata oké nchekasị, n’ihi na ọtụtụ ndị inyom aghaghị ịrụzu ihe a chọrọ ha n’aka n’ebe ọrụ nakwa n’ime ezinụlọ