Ọbara Mgbali Elu—Mgbochi na Nchịkwa Ya
Ọbara Mgbali Elu—Mgbochi na Nchịkwa Ya
SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA BRAZIL
EGWU tụrụ Marian! Na mberede, ọbara amalitewo ịgba ya n’imi nke ukwuu. “Echere m na m gaje ịnwụ,” ka o chetara. Onye dọkịta gwara Marian na ọ bụ ọbara mgbali elu kpatara ọbara gbara ya n’imi. “Ma ahụ́ siri m ike,” ka Marian zara. “Ọtụtụ ndị adịghị ama na ha nwere ọbara mgbali elu n’ihi na ha adịghị enwe mgbaàmà ọ bụla,” ka dọkịta ahụ zaghachiri.
Gịnị banyere ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị n’ahụ́ gị? Ụzọ ndụ gị ugbu a ọ̀ pụrụ ịkpata ọbara mgbali elu n’ọdịnihu? Gịnị ka ị pụrụ ime iji mee ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị n’ahụ́ gị dị otú o kwesịrị? *
Ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị n’ahụ́ bụ ike ọbara na-akpa n’ime okpo ọbara. A pụrụ ịtụ ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ site n’iji rọba a pụrụ ịfụnye ikuku na ya mee ihe, bụ́ nke a na-eke gburugburu apata aka ma kwụnye ya ná ngwá na-agụkọ ọ̀tụ̀tụ̀ nrugharị ọbara. Ọ na-agụkọ ihe abụọ. Dị ka ihe atụ: 120/80. A na-akpọ nọmba nke mbụ nrugharị ọbara nke obi ọkụkụ n’ihi na ọ na-egosi ọ̀tụ̀tụ̀ nrugharị ọbara n’oge obi na-eti eti, a na-akpọkwa nọmba nke abụọ nrugharị ọbara nke obi dara jụụ n’ihi na ọ na-egosi ọ̀tụ̀tụ̀ nrụgharị ọbara n’oge obi na-adịghị eti eti. A na-atụ ọ̀tụ̀tụ̀ nrugharị ọbara n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ mercury nke dị na milimita, ndị dọkịta na-agụnye ndị ọrịa ná ndị nwere ọbara mgbali elu mgbe ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị n’ahụ́ ha karịrị 140/90.
Gịnị na-eme ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị laa elu? Were ya na ị na-agba ubi gị mmiri. Site n’ịkpọghe pọmpụ mmiri ma ọ bụ ịpịchilata ọnụ ya, ị na-eme ka ọ̀tụ̀tụ̀ mmiri ahụ ji agbapụta ka ukwuu. Otu ihe ahụ na-eme n’ebe ọbara mgbali elu dị: Ịmụba ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị ma ọ bụ imechilata oghere okpo ọbara na-eme ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị rịa elu. Olee otú ọbara mgbali elu si ewere ọnọdụ? Ọtụtụ ihe so akpata ya.
Ihe Ndị Na-akpata Ya Bụ́ Ndị Ị Na-apụghị Ịchịkwa
Ndị nnyocha achọpụtawo na ọ bụrụ na mmadụ nwere ndị ikwu na-arịa ọbara mgbali elu, ohere o nwere ịrịa ya na-adị ukwuu karị. Ihe ndekọ na-egosi na ụmụ ejima ndị yiri ibe ha na-enwe ọbara mgbali elu karịa ụmụ ejima ndị na-eyighị ibe ha. Otu nnyocha na-ezo aka ná “nchọpụta a chọpụtara mkpụrụ ndụ ihe nketa ndị na-akpata ọbara mgbali elu,” bụ́ ndị ga-egosi ịdị adị nke ihe a na-eketa eketa nke na-akpata ọbara mgbali elu. A chọpụtara na ihe ize ndụ nke ọbara mgbali elu dị oké njọ na-arị elu ka mmadụ na-emewanye okenye nakwa na ọ na-aka adị n’etiti ndị ikom bụ́ ndị isi ojii.
Ihe Ndị Na-akpata Ya Bụ́ Ndị Ị Pụrụ Ịchịkwa
Kpachapụ anya maka ihe oriri gị! Nnu pụrụ ime ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị n’ahụ́ rịa elu n’ebe ụfọdụ ndị nọ, karịsịa ndị
na-arịa ọrịa shuga, ndị na-arịa ọbara mgbali elu dị oké njọ, ndị agadi, na ndị isi ojii ụfọdụ. Abụba gabigara ókè n’ọbara pụrụ ime ka cholesterol jupụta n’ime okpo ọbara (nsụchi akwara), si otú ahụ na-ebelata oghere ha ma na-amụba ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị n’ahụ́. Ndị ji ihe karịrị pasent 30 karịa otú ahụ́ ha kwesịrị ịdịru n’arọ pụrụ ịrịa ọbara mgbali elu karị. Nnyocha ndị e mere na-enye echiche na ịdị na-eriwanye ihe ndị na-enye potassium na calcium pụrụ ibelata ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị n’ahụ́.A na-ejikọ ise siga na ihe ize ndụ ka ukwuu nke nsụchi akwara, ọrịa shuga, nkụchi obi, na strok. Ebe ọ dị otú ahụ, ise siga na ọbara mgbali elu bụ ihe ndị dị ize ndụ pụrụ ijikọ aka kpata ọrịa obi. Ọ bụ ezie na ihe àmà e nwere dị iche, caffeine—nke na-adị na kọfị, tii, na coke—nchekasị nakwa ndọlị pụkwara ime ka ọbara mgbali elu ka njọ. Tụkwasị na nke a, ndị ọkà mmụta sayensị maara na aṅụrụma na enweghị mmega ahụ́ pụrụ ime ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị n’ahụ́ rịa elu.
Ụzọ Ndụ Na-akwalite Ahụ́ Ike
Ọ ga-abụ ihie ụzọ mmadụ ikwe ka o nwee ọbara mgbali elu tupu ya emee ihe ndị kwesịrịnụ. Ụzọ ndụ na-akwalite ahụ́ ike kwesịrị ịbụ ihe a ga-amalite ichebara echiche ngwa ngwa ná ndụ. Ịkpachara anya ugbu a ga-eme ka e nwee ndụ ka mma n’ọdịnihu.
Nkwekọrịta nke Atọ nke Ndị Dọkịta Brazil Mere Banyere Ọbara Mgbali Elu kọwara mgbanwe ụzọ ndụ ndị na-ebelata ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị n’akwara. Ha bụ ihe nduzi na-enye aka nye ndị nwere ọbara mgbali elu ma ọ bụ ndị nke ha dị otú o kwesịrị.
Nye ndị bubigara ibu ókè, ndị nnyocha na-atụ aro iri nri ndị nwere obere calorie otú kwesịrịnụ, na-ezere nri ndị a na-akwadebe ọkụ ọkụ na nri ndị a sị na ha “na-ebelata ibu n’obere oge,” ma nọgide na-enwe usoro mmega ahụ́ dị otú o kwesịrị. Banyere nnu, ha tụrụ aro iri ihe na-akarịghị gram isii ma ọ bụ otu obere ngaji kwa ụbọchị. * N’ime ya eme, nke ahụ pụtara ibelata n’ụzọ dị ukwuu nnu e ji esi nri, nakwa ibelata iri ihe ndị e tinyere ná mkpọ̀, anụ e wuru ewu jụrụ oyi (salami, ham, ngwọngwọ, na ndị ọzọ), nakwa nri ndị e ji anwụrụ ọkụ chekwaa. A pụkwara ibelata iri nnu site n’izere itinyetụkwu nnu mgbe a na-eri nri nakwa site n’inyocha akwụkwọ a mapawara ná nri ndị e tinyere ná mkpọ̀ iji hụ ókè nnu e tinyere na ha hà.
Nkwekọrịta Ndị Dọkịta Brazil ahụ tụkwara aro ịdị na-eriwanye ihe ndị na-enye potassium n’ihi na ọ pụrụ “igbochi ọbara mgbali elu.” Ebe ọ dị otú ahụ, nri na-edozi ahụ́ kwesịrị ịgụnye “nri ndị soldium dị obere na ha na ndị potassium juru na ha,” dị ka àgwà, akwụkwọ nri ndị na-acha nnọọ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, unere, egusi, karọt, beet, tomato, na oroma. Ọ dịkwa mkpa ịṅụru mmanya na-aba n’anya n’ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị. Ndị nnyocha ụfọdụ na-egosi na ndị ikom na-arịa ọbara mgbali elu kwesịrị *
ịṅụ ihe na-akarịghị otu shọtụ mmanya ọkụ n’ụbọchị; ndị inyom ma ọ bụ ndị ahụ́ ha dị fere fere ekwesịghịkwa ịṅụ ihe karịrị ọkara shọtụ.Nkwekọrịta Ndị Dọkịta Brazil ahụ kwubiri na imega ahụ́ mgbe nile belatara ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị n’ahụ́ ma si otú ahụ belata ohere nke ịrịa ọbara mgbali elu. Mmega ahụ́ dị otú o kwesịrị, dị ka ije ije, ịgba ígwè, na igwu mmiri, minit 30 ruo 45, ugboro atọ ruo ise n’izu, bara uru. * Ihe ndị ọzọ e jikọtara ha na ụzọ ndụ na-akwalitekwu ahụ́ ike gụnyere ịkwụsị ise siga, ịchịkwa abụba ndị dị n’ọbara (cholesterol na triglyceride) na ọrịa shuga, iri ihe ndị na-enye calcium na magnesium n’ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị, na ịchịkwa ndọlị na nchekasị. Ọgwụ ụfọdụ pụrụ ime ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị n’ahụ́ rịa elu, dị ka ọgwụ ndị a na-ekuru n’imi maka azụ̀zụ̀, ọgwụ ndị na-egbochi acid bụ́ ndị soldium jupụtara na ha, ọgwụ ndị na-achịkwa agụụ iri nri, na ọgwụ ndị na-akwụsị ahụ́ mgbu bụ́ ndị nwere caffeine bụ́ ndị a na-aṅụ maka oké isi ọwụwa.
N’ezie, ọ bụrụ na ị na-arịa ọbara mgbali elu, dọkịta gị nọ n’ọnọdụ kasị mma inye gị ndụmọdụ banyere ihe oriri na àgwà gị, dị ka mkpa gị si dị. Otú ọ dị, otú ọ sọrọ ọnọdụ gị ya dịrị, ịmalite na nwata na-ebi ndụ na-akwalite ahụ́ ike na-abakarị uru, ọ bụghị nanị nye ndị na-arịa ọbara mgbali elu kama nye ndị òtù nile nke ezinụlọ. Marian, bụ́ onye a kpọrọ aha ná mmalite nke isiokwu a, mere mgbanwe n’ụzọ ndụ ya. Ka ọ dị ugbu a, ọ na-aṅụ ọgwụ ma na-ebi ndụ dị otú o kwesịrị n’agbanyeghị nsogbu ahụ́ ike ya. Gịnị banyere gị? Ka ị na-echere oge mgbe mmadụ nile ga-adị ndụ n’ahụ́ ike na mgbe ‘onye obibi ya na-agaghị asị, Ana m arịa ọrịa,’ na-achịkwa ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị n’ahụ́ gị!—Aịsaịa 33:24.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Teta! adịghị akwalite ụdị ọgwụgwụ ọ bụla, ebe ọ matara na nke a bụ ihe mmadụ na-ekpebiri onwe ya.
^ par. 15 Gaa hụ dọkịta gị iji mara ọ̀tụ̀tụ̀ sodium na potassium ahụ́ gị chọrọ kwa ụbọchị ma ọ bụrụ na ị na-arịa ọbara mgbali elu, ọrịa obi, ọrịa imeju, ma ọ bụ ọrịa akụrụ ma na-aṅụ ọgwụ.
^ par. 16 Ịṅụ otu shọtụ mmanya ọkụ yiri ịṅụ shọtụ abụọ nke mmanya ndị dị ka whisky na vodka, shọtụ 8 nke wine ma ọ bụ shọtụ 24 nke biya.
^ par. 17 Soro dọkịta gị kwurịta mkpa ọ dị inwe usoro mmega ahụ́ onwe onye.
[Igbe dị na peeji nke 30]
ỊLỤSO ỌBARA MGBALI ELU ỌGỤ
1. Ihe Ndị Pụrụ Inye Aka Chịkwaa Ọbara Mgbali Elu
• Belata ịdị arọ nke ahụ́ gị
• Belata iri nnu
• Mụbaa iri nri ndị potassium juru na ha
• Belata ịṅụ mmanya ndị na-aba n’anya
• Na-enwe mmega ahụ́ mgbe nile
2. Ihe Ndị Ọzọ Pụrụ Inye Aka Chịkwaa Ọ̀tụ̀tụ̀ Ọbara Ji Erugharị n’Ahụ́
• Ihe ndị na-enye calcium na magnesium
• Nri akwụkwọ nri nwere fiber n’ụba
• Usoro ọgwụgwọ na-akwụsị nchekasị
3. Ihe Ndị Ọzọ Yiri Ha
• Kwụsị ise siga
• Chịkwaa ọ̀tụ̀tụ̀ cholesterol
• Chịkwaa ọrịa shuga
• Zere ọgwụ ndị pụrụ ime ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị n’ahụ́ gị rịa elu
[Ebe E Si Nweta Foto]
E nwetara ya site ná Nkwekọrịta nke Atọ nke Ndị Dọkịta Brazil Mere Banyere Ọbara Mgbali Elu—Revista Brasileira de Clínica & Terapêutica.
[Foto ndị dị na peeji nke 31]
Imega ahụ́ mgbe nile na nri na-edozi ahụ́ na-enye aka igbochi na ịchịkwa ọbara mgbali elu