Ijikọ Ụwa Ọnụ Ọ̀ Pụrụ Igbo Mkpa Anyị n’Ezie?
Ijikọ Ụwa Ọnụ Ọ̀ Pụrụ Igbo Mkpa Anyị n’Ezie?
“Agbata obi ụwa nile bụ́ nke e nwere taa, dị nnọọ ka ihe ka ọtụtụ n’agbata obi ndị ọzọ, bụ nke na-adịtụghị mma; o nwere ọtụtụ ntụpọ. A dịghị emeso ndị bi na ya n’ụzọ hà nhata; ha enweghị otu ohere ahụ. Ọtụtụ ihe kọrọ ọtụtụ nde mmadụ nke na ha adịghịdị eche na ha so biri n’agbata obi a.”—Akụkọ bụ́ “AGBATA OBI UWA NILE ANYỊ.”
FATIMA, bụ́ onye bi n’otu obodo ukwu dị n’Africa, na-ewere onwe ya dị ka onye nwere ihe ndabara ọma. Ma ọ dịghị ihe ọzọ, o nwere friji. Ma ebe ezinụlọ ya bi bụ nkịkara ụlọ e ji ígwè rụọ n’akụkụ ili atọ e ji nkume mabụl wuo. Dị nnọọ ka ọkara nde ndị ọzọ bi n’obodo ahụ, o bi n’ebe sara mbara a na-eli ozu. Ọbụnakwa ebe ahụ a na-eli ozu adịghịzi aba aba. “Ọtụtụ mmadụ na-akwabata,” ka ọ na-ekpesa, “karịsịa n’ebe a a na-eli ozu.”
Ihe dị ka kilomita 15 site n’ebe Fatima bi, e nwere ebe e wuru usoro ụlọ ndị oké ozu, bụ́ nke ihe nile zuru ezu na ya, na-enwe ụlọ nri ndị magburu onwe ha, na ebe sara mbara a na-akụ golf. Otu bọl golf na-ada ọnụ karịa ụgwọ ọnwa otu onye ná mba Africa a. Ịda ogbenye anọgidewo na-akpa obodo ahụ aka ọjọọ, ma ebe ndị a na-akụ golf—ihe e ji mara ndị oké ozu—bụ ma ihe ọhụrụ ma ihe na-akpasụ iwe. N’agbata obi ụwa nile anyị, ndụ oké ozu na ogbenye ọnụ ntụ na-agakọ n’ụzọ dị ize ndụ.
Wadi Hadhramaut, bụ́ nke gbagọrọ agbagọ gabiga ala mmiri na-adịghị ezokebe na ya bụ́ Yemen nke dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, bụ ụzọ ochie ìgwè ndị njem na-esi na ya agafe bụ́ nke obodo ochie jupụtara. N’anya mbụ i lere ya, ọ ga-eyi ka ọ dịbeghị ihe gbanwere na ndagwurugwu a dịpụrụ adịpụ. Ma otú ọ dị anya mmadụ pụrụ ịghọgbu ya. N’otu obodo dị ya nso bụ́ Saywūn, ebe ngosi ihe mgbe ochie dị na ya enwetawo otu onye gụsịrị akwụkwọ na mahadum ka o nye aka kwadebe ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet bụ́ ebe a ga-edepụta akụ̀ ndị dị na ya. N’agbanyeghị na onye ahụ gụsịrị akwụkwọ bụ nwa agbọghọ obodo ahụ, ọ gụrụ akwụkwọ n’Ohio, U.S.A. N’ụbọchị ndị a, ma ndị mmadụ ma echiche dị iche iche pụrụ ịgazu ụwa dị ka ọ na-adịtụbeghị mbụ.
Puku kilomita ole na ole n’ebe ndịda, na Sahara, ìgwè gwongworo atọ ji nwayọọ nwayọọ na-agba n’otu okporo ụzọ dịpụrụ adịpụ. Mashala, bụ́ otu n’ime ndị ọkwọ ụgbọala ahụ, kọwara na ya bu telivishọn, ígwè ndị e ji eseba ihe na vidio, na ígwè satellite. Ya onwe ya na-enwetakwa ihe ọmụma banyere ihe ndị na-eme n’ụwa site n’ikiri mgbasa akụkọ ụwa America. N’obodo m, “anyị nile nwechara ígwè satellite,” ka ọ kọwara. Ọ bụ nanị ebe ole na
ole n’ụwa ka mgbasa ozi zuru ụwa na-adịghị eru.Nnọgide ndị mmadụ, echiche, akụkọ, ego, na nkà na ụzụ nọgidere na-agazu ụwa nile emewo ka e nwee agbata obi ụwa nile ọhụrụ bụ́ nke pụrụ iweta ọtụtụ abamuru. Ijikọ ụwa ọnụ na-enye aka agbasa ọdịbendị ndị Yemen, ọ na-emekwa ka Mashala kpataruo $3,000 na njem izu atọ. Ma ụdị ego ahụ adịghị eru mmadụ nile. Fatima na ndị agbata obi ya na-ekiri ka mmadụ ole na ole na-anụ ụtọ abamuru nke ijikọ ụwa ọnụ, ebe ha tọrọ n’ogbenye.
Ọ bụ ezie na agbata obi ụwa nile anyị adịtụghị mma, usoro nke ijikọ ụwa ọnụ bụ nke a na-agaghị agbanwe agbanwe ma eleghị anya. Ndị mmadụ hà ga-agbanyụ TV ha, tụfuo fon ha ndị a na-eji agagharị agagharị, bibie kọmputa ha, ma kwụsị ime njem gaa ala ọzọ? Mba dị iche iche hà ga-anwa ikewapụ onwe ha iche kpam kpam n’ebe akụkụ ndị ọzọ nke ụwa dị, n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa n’ụzọ akụ̀ na ụba? O yikarịrị ihe na-agaghị eme eme. Ọ dịghị onye chọrọ ịtụfu abamuru ndị a na-enweta site n’ijikọ ụwa ọnụ. Gịnịkwanụ banyere nsogbu ndị na-eso ya? Ha na-akpata ụjọ na-arịwanye elu, ha na-emetụtakwa ndụ mmadụ nile. Ka anyị tụlee ná mkpirikpi ole na ole n’ime mmetụta dị oké njọ ndị na-esite n’ijikọ ụwa ọnụ.
Oghere Na-asawanye Mbara
Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla e kesara akụ̀ na ụba ụwa n’ụzọ hà nhata, ma ijikọ ụwa ọnụ n’ụzọ akụ̀ na ụba agbasawanyewo oghere dị n’etiti ndị ọgaranya na ndị ogbenye. N’eziokwu, o yiri ka ụfọdụ mba ndị ka na-emepe emepe hà eritewo uru site ná mwebata e webatara ha n’usoro azụmahịa zụrụ ụwa ọnụ. Ndị ọkachamara na-azọrọ na n’ime afọ iri gara aga, ọnụ ọgụgụ ndị ogbenye ọnụ ntụ nọ n’India esiwo na pasent 39 gbadata na pasent 26 nakwa na Eshia n’ozuzu ya enwewo ọganihu yiri nke ahụ. Otu nnyocha gosiri na ka ọ na-erule 1998, nanị pasent 15 nke ndị bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia na-akpata $1 n’ụbọchị, ma e jiri ya tụnyere pasent 27 e nwere n’afọ iri bu ụzọ. Ka o sina dị, ọnọdụ e nwere gburugburu ụwa adịchaghị mma otú ahụ.
Ná mba Africa ndị dị na ndịda Sahara nakwa n’ógbè ndị ọzọ na-emepechaghị emepe, ego a na-akpata adalatala n’ime afọ 30 gara aga. “Ndị mba ụwa . . . kwere ka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ijeri mmadụ 3—ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara ụmụ mmadụ nile—na-adabere na $2 ma ọ bụ ihe na-erughị ya n’ụbọchị n’ụwa ebe e nwere akụ̀ na ụba na-enweghị atụ,” ka Kofi Annan, bụ́ odeakwụkwọ ukwu nke òtù UN kwuru. Otu n’ime isi ihe na-akpata oghere ukwu a e nwere n’etiti ọha na eze bụ ịchọ ọdịmma onwe onye n’ụzọ ego. “Gburugburu ụwa, ụlọ ahịa ego ndị nkịtị nwe na-eleghara ndị ogbenye ọnụ ntụ anya,” ka Larry Summers, onye bụbu odeakwụkwọ nke ngalaba ndebe akụ̀ nke United States na-akọwa. Ụlọ akụ̀ ndị bụ́ isi adịghị achọ ịga n’ógbè ndị dara ogbenye—n’ihi na ego adịghị n’ebe ahụ.”
Ọdịiche dị ukwuu e nwere n’etiti ihe ndị ọgaranya na ihe ndị ogbenye na-akpata na-ekewa
ndị mmadụ nakwa ọbụna mba dị iche iche. N’oge na-adịghị anya gara aga, akụ̀ na ụba nke nwoke kasị baa ọgaranya na United States karịrị ngụkọta nke ihe karịrị nke 100 nde ndị America ibe ya. Ijikọ ụwa ọnụ akwalitewokwa uto nke ụlọ ọrụ ndị nwere alaka n’ọtụtụ mba bụ́ ndị ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ha na-achịkwazi ahịa ụwa ma a bịa ná ngwá ahịa ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, na 1998, ọ bụ nanị ụlọ ọrụ 10 nọ na-achịkwa pasent 86 nke achụmnta ego nzirịta ozi telifon nke na-enye ijeri $262. Ikike na mmetụta nke ụlọ ọrụ ndị a nwere alaka n’ọtụtụ mba nwere n’ụzọ akụ̀ na ụba na-akarịkarị nke gọọmenti, dịkwa ka Òtù Mba Nile Na-ahụ Maka Mgbaghara si kwuo, “ha adịghị eji ihe ndị ruuru mmadụ na ihe ndị ruuru ndị ọrụ akpọro ihe.”O doro anya ihe mere òtù ndị na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ ji enwe nchegbu banyere ndọkọju nke akụ̀ na ụba ụwa n’aka mmadụ ole na ole nwere ihe ndabara ọma. Ọ̀ ga-amasị gị ibi n’agbata obi ebe pasent 20 nke ndị kasị baa ọgaranya na-akpata ihe ji okpukpu 74 karịa nke ndị kasị daa ogbenye? N’ihi telivishọn kwa, pasent 20 nke ihe a kpọrọ mmadụ dara ogbenye maara nnọọ nke ọma otú ndị ibe ha bara ọgaranya si ebi ndụ, n’agbanyeghị na ọ na-esi ike ha ịhụ ohere ha ga-eji mee ka ọnọdụ ha ka mma. N’ụzọ doro anya, ahaghị nhata dị otú ahụ n’agbata obi ụwa nile na-akpata ọgba aghara na obi nkoropụ.
Ijikọ Ụwa Ọnụ n’Ụzọ Ọdịbendị
Akụkụ ọzọ na-akpata nchegbu bụ enweghị nkwekọ nke ọdịbendị na mgbasa nke àgwà iji ihe onwunwe kpọrọ ihe gabiga ókè. Mgbanwerịta echiche bụ akụkụ dị mkpa nke ijikọ ụwa ọnụ, ọ dịghịkwa ihe na-egosipụta nke a karịa ka Intanet na-eme. N’ụzọ dị mwute, a dịghị eji Intanet eme ihe nanị iji gbasaa ihe ọmụma bara uru, ọdịbendị, na azụmahịa. Ebe ụfọdụ a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet na-akwalite ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, ịkpa ókè agbụrụ, ma ọ bụ ịgba chaa chaa. Ụfọdụ na-enye ọbụna ntụziaka a kapịrị ọnụ banyere otú e si emepụta bọmbụ n’ụlọ. Dị ka Thomas L. Friedman si kwuo, “n’Intanet, ọ dị nnọọ mfe inweta ihe ọmụma pụrụ ime ka mmadụ banye ná nsogbu. Ị pụrụ ịwabanye n’ụlọ ịṅụ mmanya nke ndị na-akwado ọchịchị Nazi ma ọ bụ ebe onye na-emepụta ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ dokọjuru ha, . . . ọ dịghịkwa onye nọ ebe ahụ ịkwụsị ma ọ bụ iduzi gị.”
Telivishọn na film nwekwara mmetụta dị ukwuu n’otú ụmụ mmadụ si eche echiche. Vidio ndị a na-egosi na telivishọn n’ụwa na-esitekarị na Hollywood, bụ́ ụlọ ọrụ bụ́ isi na-emepụta ihe nkiri na-emeghị eme. Ihe nnukwute ụlọ ọrụ a na-emepụta ihe ntụrụndụ na-egosi dị ka ihe ndị dị mma, na-akwalitekarị ịhụ ihe onwunwe n’anya, ime ihe ike, ma ọ bụ omume rụrụ arụ. Ha pụrụ ịbụ ndị na-ekwekọtụghị n’ọdịbendị nke ọtụtụ mba nke ụwa. Ka o sina dị, ndị ọchịchị, ndị ọkà nkụzi, na ndị nne na nna anọgidewo na-ahụta na ha apụghị igbochi ihe ahụ na-emenụ.
“Ọdịbendị ndị United States na-amasị anyị,” ka otu onye bi na Havana, Cuba, gwara onye ọbịa si n’Ebe Ugwu America. “[Anyị] maara ndị ọkà na-emere unu ihe nkiri na Hollywood.” Ọdịbendị Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa na-akwalitekwa nri onye ọ dị ngwa ngwa na mmanya ọtọ bịrị bịrị. Otu onye Malaysia na-achụ ntá ego kwuru, sị: “Ihe ọ bụla sitere n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, karịsịa America, ndị ebe a na-enwe mmasị na ya. . . . Ha na-achọ iri ya, ha na-achọ ịbụ ya.” Onyeisi nke otu Kọleji dị na Havana kwuru n’ụzọ dị mwute, sị: “Cuba abụghịzi obodo nọpurụ iche. E nweghịzi obodo nọpụrụ iche. E nwere nanị otu ụwa.”
Ọdịbendị Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa bụ́ nke
na-agbasa ebe ọ bụla na-emetụta olileanya na ọchịchọ ndị mmadụ. Akwụkwọ bụ́ Human Development Report 1998 kwuru na “‘mmadụ ịchọ inwe ọtụtụ ihe onwunwe dị ka onye agbata obi ya,’ esiwo na mmadụ ịgbalị ịdị na-eri ihe onye agbata obi ya na-eri gaa n’ịgbaso ụzọ ndụ nke ndị ọgaranya na ndị a ma ama bụ́ ndị a na-egosi n’ihe nkiri vidio na telivishọn.” N’ụzọ doro anya, ọnụ ọgụgụ bara ụba nke ihe a kpọrọ mmadụ agaghị ebi ụdị ndụ ahụ ma ọlị.Ijikọ Ụwa Ọnụ Ọ̀ Bụ Ihe Ngwọta?
Dị nnọọ ka ọtụtụ ihe omume nke ụmụ mmadụ, ijikọ ụwa ọnụ abụwo nke bara uru na nke na-emebi ihe. O wetaworo ụfọdụ ndị abamuru n’ụzọ akụ̀ na ụba, o wetawo ọgbọ nke usoro mgbasa ozi zuru ụwa ọnụ. Ka o sina dị, ọ na-abara ndị ọgaranya na ndị dị ike uru kama ịbara ndị ogbenye na ndị nọ n’ụkọ uru. Ma ndị omempụ ma nje virus ndị na-akpata ọrịa ejiriwo abamuru nke ijikọ ụwa ọnụ mee ihe n’ụzọ dị irè karịa gọọmenti.—Lee igbe ndị dị na peeji nke 20 na 21.
Ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu, ijikọ ụwa ọnụ emewo ka nsogbu ndị dịlarị adị n’ụwa anyị na-ezughị okè bukwuo ibu. Kama iweta ihe ngwọta nye ihe isi ike ndị e nwere n’ụwa, ọ ghọwo akụkụ nke nsogbu ahụ. Nkewa n’ihi ọkwa adịwo njọ karị, obi nkoropụ arịwokwa elu. Gọọmenti dị iche iche gburugburu ụwa na-adọga inweta abamuru nke ijikọ ụwa ọnụ ka ha na-echebe ụmụ amaala ha pụọ n’ihe ndị na-adịghị mma ọ na-akpata. Hà ga-enwe ihe ịga nke ọma? Ijikọ ụwa ọnụ nke e ji ọmịiko na ichebara ụmụ mmadụ echiche mara ọ̀ pụrụ ịbụ ihe ngwọta ya? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 20, 21]
IME KA MPỤ NA IYI ỌHA EGWU ZUO ỤWA ỌNỤ
N’ụzọ dị mwute, a pụrụ iji ihe ndị e ji akwalite azụmahịa mee ihe n’ụzọ dị mfe n’ịkwalite mpụ. “Ka ụlọ ọrụ achụmnta ego ndị nwere alaka n’ọtụtụ mba meworo mgbalị ijikọ akụ̀ na ụba ụwa, otú ahụkwa ka ‘ndị omempụ nọ n’ọtụtụ mba’—òtù ndị omempụ a haziri ahazi—dịworo ngwa n’iji ya mee ihe maka ọdịmma ha,” ka akwụkwọ bụ́ Human Development Report 1999 na-akọ. Olee otú mpụ a haziri ahazi siworo rite uru site n’ijikọ ụwa ọnụ?
Òtù ahịa ọgwụ ọjọọ dị iche iche achọpụtawo ọtụtụ ohere ha pụrụ iji tinye uru ego ha nke ruru ọtụtụ ijeri dollar n’ụlọ akụ̀. Mwepụ e wepụrụ nchịkwa nke ụlọ ọrụ na-ahụ maka mbupụ na mbubata ngwá ahịa n’ọtụtụ ebe nakwa ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị na-eme njem, na-emekwa ka ọ dịrị nnọọ òtù ahịa ọgwụ ọjọọ mfe iburu ọgwụ ọjọọ site n’otu mba ma ọ bụ kọntinent gaa n’ọzọ. N’ụzọ na-akpali mmasị, n’afọ ndị 1990, mmepụta nke ọgwụ cocaine mụbara okpukpu abụọ, mmepụta nke ọgwụ opium mụbakwara okpukpu atọ. Òtù Mafia ndị si n’ọtụtụ mba amalitewokwa ahịa na-aga aga n’ịgba akwụna. Kwa afọ, ha na-eji ụgbọ mmiri ebuga ihe dị ka ndị inyom na ụmụ agbọghọ 500,000 n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe maka nzube a—n’ụzọ megidere ọchịchọ nke ihe ka ọtụtụ n’ime ha.
Òtù ndị omekome, dịkwa ka ụlọ ọrụ ndị nwere alaka n’ọtụtụ mba, ejikọwo ike ha n’afọ ndị na-adịbeghị anya. Ọtụtụ n’ime ha na-arụ ọrụ n’ụwa nile, e mekwara atụmatụ na ngụkọta nke uru ha na-erite n’otu afọ ruru puku ijeri $1.5—ihe karịrị ngụkọta ego France na-akpata n’afọ.
Intanet aghọwokwa ngwá ọrụ bara uru nye ndị ọkà kọmputa na-adịghị akwụwa aka ọtọ. Na 1995, otu onye na-eji kọmputa enweta ihe na kọmputa ndị ọzọ zuuru ihe ọmụma a sịrị na o ruru $1 nde nakwa nọmba kaadị ndị mmadụ ji azụrụ ihe n’aka dị 20,000. “Izu ohi site n’iji nkà na ụzụ ọhụrụ eme ihe adịchaghị ize ndụ, a na-eritekwa uru na ya karị,” ka José Antonio Soler, bụ́ onye Spen na-arụ ọrụ n’ụlọ akụ̀ kwuru.
Ndị na-eyi ọha egwu na-ejikwa ngwá ọrụ ndị e ji ejikọ ụwa ọnụ eme ihe. N’ihi mgbasa a na-agbasaru akụkọ n’ebe nile n’ụwa, ịkọ banyere ntọrọ a tọọrọ ndị na-eme njem nleta ole na ole si n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, nke weere ọnọdụ n’ebe dịpụrụ adịpụ nke ụwa, pụrụ inye aka mee ka a kpọsaa ozugbo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iwe ọ bụla metụtara ọchịchị.
“NDỊ NJEM” A NA-ACHỌGHỊ
Ọrịa nakwa ụmụ mmadụ pụrụ ime njem gazuo ụwa nile, ụfọdụ n’ime ha na-egbukwa egbu. “Mmụba dị egwu a na-enwe ná ngagharị zuru ụwa ọnụ nke ndị mmadụ, ngwá ahịa, na echiche dị iche iche bụ isi ihe na-akpata mgbasa zuru ụwa ọnụ nke ọrịa,” ka Prọfesọ Jonathan M. Mann, bụ́ ọkachamara n’ọrịa ndị na-agbasa ngwa ngwa, na-ekwu. “Ụwa aghọkwuola ngwa ngwa ebe a pụrụ inwe ntiwapụ, nke kasịkwa njọ, mgbasa sara mbara na ọbụna mgbasa zuru ụwa ọnụ nke ọrịa na-efe efe ma ndị ọhụrụ ma ndị ochie.”
Ọ dịghị ihe na-egosipụta ajọ ọnọdụ ọhụrụ a n’ụzọ dị nnọọ egwu karịa ọrịa AIDS na-agbasazu ebe nile, bụ́ nke na-egbu ugbu a ihe dị ka nde mmadụ atọ kwa afọ. Ná mba ụfọdụ nke Africa, ndị ọrụ ahụ́ ike na-atụ egwu na ọrịa ahụ ga-emesị gbuo ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ nile. “N’agbanyeghị narị afọ iri e nweworo ọrịa ndị na-agbasa ngwa ngwa, agha na ụnwụ nri na ya, ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụla n’akụkọ ihe mere eme a hụrụ ụbara ọnụ ọgụgụ dị otú a nke ndị ntorobịa na-anwụnụ,” ka Ihe Omume E Jikọrọ Ọnụ nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka HIV⁄AIDS na-akọ.
Ụmụ nje na nje virus dị iche iche abụghị nanị “ndị njem” zuru ụwa ọnụ a na-achọghị. Ụmụ anụmanụ, akụ́kụ́, na ụmụ ahụhụ ahapụwo ebe ha na-ebibu ma nubanye na kọntinent ndị ọzọ. Otu ụdị nke agwọ nwere nsí ọjọọ bụ́ ndị si n’Australia, na-amịbanyezi n’Àgwàetiti ndị nke Pacific, ihe àmà na-egosi na ha na-eme nke a site n’izoba n’ime ụgbọelu. O kpochapụworị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nnụnụ ọhịa nile dị na Guam. Ahịhịa mmiri bụ́ hyacinth nke sitere n’Ebe Ndịda America agbasaruwo mba okpomọkụ 50, bụ́ ebe ọ na-asụchi ọwà mmiri ma na-ebibi ebe ndị a na-azụ azụ̀. “Mwakpo nke ‘ụdị akụ́kụ́ na ụdị ụmụ anụmanụ si ná mba ọzọ’ na-akpata na-efu ụwa ma eleghị anya ọtụtụ narị ijeri dollar kwa afọ, na-agbasakwa ọrịa ma na-akpata mbibi dị ukwuu ná njikọ nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha,” ka magazin bụ́ International Herald Tribune na-akọ.
[Foto]
IZOBATA EGO
N’ime ụgbọ mmiri a kwanyejuru ihe ụmụaka ji egwuri egwu
ỊZỤ AHỊA IWU ỌGWỤ COCAINE
A hụrụ ọgwụ cocaine ọnụ ego ya ruru $4,000,000 n’ime otu nnukwu ụgbọala a na-eji aga njem ntụrụndụ bụ́ nke e jichiri n’ebe e si abanye ókèala mba
IJI NJE EYI ỌHA EGWU
Ndị soja na-achọ anthrax na Capitol Hill, Washington, D.C.
BỌMBỤ
Bọmbụ e tinyere n’ime ụgbọala agbawaa n’Izrel
MGBASA ZURU ỤWA ỌNỤ NKE ỌRỊA AIDS
Ntiwapụ nke ọrịa AIDS dị nnọọ egwu na South Africa nke na ụlọ ọgwụ ụfọdụ nke gọọmenti na-ajụ ịnabata ndị mmadụ
MWAKPO NKE ỤMỤ ANỤMANỤ
Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na agwọ ndị na-anọ n’osisi ndị na-acha nchara nchara ekpochapụwo nnụnụ ọhịa ndị dị na Guam
AHỊHỊA MMIRI BỤ́ HYACINTH
Akụ̀kụ̀ a na-asụchi ọwà mmiri na ikpere osimiri n’ihe dị ka mba 50
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Izobata ego na ịzụ ahịa iwu ọgwụ cocaine: James R. Tourtellotte na Todd Reeves/Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Mbupụ na Ntụbata Ngwá Ahịa na United States; iji nje eyi ọha egwu: AP Photo/Kenneth Lambert; bọs na-agba ọkụ: AP Photo/HO/Ndị Agha Nchebe nke Izrel; nwatakịrị: AP Photo/Themba Hadebe; agwọ: Foto T. H. Fritts sere, USGS; ahịhịa mmiri bụ́ hyacinth: Ndị ọrụ CDFA, Ngalaba Na-ahụ Maka Nri na Ọrụ Ubi na California, Alaka Na-achịkwa Ụmụ Ahụhụ
[Foto ndị dị na peeji nke 19]
Ijikọ ụwa n’ụzọ akụ̀ na ụba agbasawanyewo oghere dị n’etiti ndị bara ọgaranya na ndị ogbenye
[Ebe E Si Nweta Foto]
UN PHOTO 148048/ J. P. Laffont–SYGMA
[Foto ndị dị na peeji nke 22]
A na-eji Intanet eme ihe n’ịkwalite iyi ọha egwu