Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọgụ A Nọworo Na-alụso Ịgba Ohu Eri Ogologo Oge

Ọgụ A Nọworo Na-alụso Ịgba Ohu Eri Ogologo Oge

Ọgụ A Nọworo Na-alụso Ịgba Ohu Eri Ogologo Oge

“Lee ihe ịbụ ohu pụtara: mmadụ ịbụ onye e metọrọ, ya edie ya, ịbụ onye e ji ime ihe ike manye idi mmegbu.”—Euripides, onye Gris na-ede egwuregwu na narị afọ nke ise T.O.A.

ỊGBA ohu malitere mgbe dị anya, akụkọ ya na-adịkarịkwa njọ. Malite n’oge gboo n’Ijipt nakwa na Mesọpotemia, mba ndị dị ike ejiriwo ndị agbata obi ndị na-adịrughị ike ka ha mere ndị ohu. N’ụzọ dị otú a ka otu n’ime akụkụ kasị njọ nke ikpe na-ezighị ezi nke ụmụ mmadụ si malite.

Na narị afọ nke abụọ T.O.A., Ijipt mere ka otu mba dum nke ihe nwere ike iru ọtụtụ nde mmadụ mejupụtara, ghọọ ohu ya. (Ọpụpụ 1:13, 14; 12:37) Mgbe Gris chịrị ókèala Mediterenian, ọtụtụ ezinụlọ nke ndị Gris nwere ma ọ dịkarịa ala otu ohu—dị nnọọ ka ezinụlọ dị otú o kwesịrị n’ala ụfọdụ taa pụrụ inwe ụgbọala. Aristotle bụ́ onye ọkà ihe ọmụma bụ́ onye Gris gosiri izi ezi nke omume a site n’ikwu na e kewara ihe a kpọrọ mmadụ ụzọ abụọ, ndị nna ukwu na ndị ohu, ndị nna ukwu nwere ikike sitere n’ọmụmụ inye iwu, ebe ndị ohu bụ ndị a mụrụ nnọọ irube isi.

Ndị Rom kwalitere ịgba ohu ọbụna karịa ndị Gris. N’oge nke Pọl onyeozi, ma eleghị anya, ọkara nke ndị bi n’obodo Rom—ọtụtụ narị puku mmadụ dị ka ihe àmà na-egosi—bụ ndị ohu. Alaeze Ukwu Rom yikwara ka ọ̀ na-enweta ọkara nde ndị ohu kwa afọ maka iwu ihe ncheta dị iche iche, ịrụ ọrụ n’ebe ndị a na-egwupụta ihe, ịkọ ubi, na ịrụ ọrụ ná nnukwute ụlọ obibi dị iche iche nke ndị aka ji akụ̀. * A na-ejikarị ndị a dọtara n’agha emere ndị ohu, n’ihi ya oké ọchịchọ Rom nwere inwetakwu ndị ohu aghaghị ịbụworị ihe mkpali dị ike mere alaeze ukwu ahụ jiri nọgide na-ebu agha.

Ọ bụ ezie na ịgba ohu kwụsịlatara mgbe Alaeze Ukwu Rom dasịrị, omume ahụ gara n’ihu. Dị ka Ihe Ndekọ Banyere Ala Ndị England (1086 O.A.) si kwuo, ndị ohu mejupụtara pasent 10 nke ndị ọrụ nile e nwere n’England n’oge ụwa na-emepechabeghị anya. A ka nọkwa na-enweta ndị ohu site n’imeri n’agha.

Otú ọ dị, eri oge Kraịst, ọ dịghị kọntinent ahịa ohu kpaworo aka ọjọọ otú ọ kpara Africa. Ọbụna tupu oge Jizọs, ndị Ijipt nọ na-azụ ma na-ere ndị ohu si Etiopia. N’ime oge dị ihe dị ka afọ 1,250, e bugara ndị Africa e mere atụmatụ na ha dị nde 18 na Europe nakwa n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa iji gboo mkpa ọchịchọ a na-achọ ndị ohu n’ebe ndị ahụ. Mgbe ndị mba ọzọ malitere ịchị Kọntinent ndị dị n’America, malite na narị afọ nke 16, e nwere ebe ọhụrụ a chọrọ ndị ohu, n’oge na-adịghịkwa anya, ịzụ ahịa ohu gabiga oké osimiri Atlantic ghọrọ otu n’ime ọrụ achụmnta ego kasị enye ego n’ụwa. Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-agụkọ na n’agbata afọ 1650 na 1850, e si n’Africa buru ihe karịrị nde ndị ohu 12. * E rere ọtụtụ n’ime ha n’ebe ndị a chọrọ ndị ohu.

Ọgụ A Lụsoro Ịgba Ohu

Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ma ndị mmadụ ma mba dị iche iche alụwo ọgụ iji nwere onwe ha pụọ n’agbụ. Na narị afọ mbụ tupu Kraịst, Spartacus du ndị agha nke ihe mejupụtara ya bụ ndị ohu 70,000 nke Rom wee lụọ ọgụ maka nnwere onwe bụ́ nke kụrụ afọ n’ala. Ọgba aghara nke ndị ohu nọ na Haiti kpaliri n’ihe dị ka narị afọ abụọ gara aga nwere ihe ịga nke ọma karị, na-akpata nguzobe nke gọọmentị kwụụrụ onwe ya na 1804.

N’ezie, ịgba ohu dịtere aka karị na United States. E nwere ndị ohu, ndị lụsiri ọgụ ike ime ka ha na ndị ha hụrụ n’anya nwere onwe ha. E nwekwara ndị na-abụghị ndị ohu bụ́ ndị ji obi eziokwu lụọ ọgụ megide ịgba ohu site n’ịkwado ka a machibido ya iwu ma ọ bụ site n’inyere ndị ohu gbara ọsọ aka. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ka bụ nnọọ na narị afọ nke 19 ka e mesịrị machibido omume ahụ iwu ná mba ahụ dum. Gịnịkwanụ banyere taa?

Ọgụ Ndị ahụ Hà Abụrụwo n’Efu?

“Ọ dịghị onye ga-anọ n’ohu ma ọ bụ ghara inwere onwe ya; a ga-amachibido ịgba ohu na ahịa ohu n’ụdị ha nile iwu,” ka Nkwupụta Ụwa Nile Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na-ekwu. Ebumnobi ahụ, bụ́ nke e ji ịnụ ọkụ n’obi kpọsaa na 1948, bụ n’ezie nke magburu onwe ya. Ọtụtụ ndị nwere ezi obi etinyewo oge ha, ume ha, na ihe onwunwe ha n’imezu ebumnobi ahụ. Otú ọ dị, inwe ihe ịga nke ọma adịghị mfe.

Dị ka isiokwu bu ụzọ na-egosi, ọtụtụ nde mmadụ ka na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na nkịtị n’ọnọdụ ndị jọgburu onwe ha, a zụtawokwa ma ọ bụ ree ọtụtụ n’ime ha n’ụzọ megidere ọchịchọ ha. N’agbanyeghị mgbalị ndị e ji ezi nzube obi mee iji machibido ịgba ohu iwu—na ịbịanye aka ná nkwekọrịta mba nile iji machibido ya iwu—nnwere onwe maka mmadụ nile ka bụ ihe mgbaru ọsọ aka na-apụghị iru. Ọnọdụ akụ̀ na ụba ụwa emewo ka ịzụ ahịa ohu na nzuzo na-enye ego buru ibu karị. N’ụzọ dị iche n’ebumnobi ahụ, o yiri ka ịgba ohu ọ na-ejisikwu akụkụ ụfọdụ nke ihe a kpọrọ mmadụ aka ike karị. Ọnọdụ ahụ ọ̀ bụ nke olileanya na-adịghị na ya? Ka anyị lee.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Otu akwụkwọ oge ochie na-enye echiche na ụfọdụ ndị Rom bụ́ ndị aka ji akụ̀ pụrụ inweworị ihe ruru ndị ohu 20,000.

^ par. 7 Ụfọdụ ndị ụkọchukwu na-enweghị ụkpụrụ zọọrọ na Chineke kwadoro ịzụ ahịa mmadụ e ji obi ọjọọ na-azụ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị ka nwere echiche a na-ezighị ezi bụ́ na Bible na-akwado obi ọjọọ dị otú ahụ, bụ́ nke ọ na-adịghị akwado. Biko lee isiokwu bụ́ “Echiche nke Bible: Chineke Ọ̀ Nabatara Ahịa Ohu?” nke dị ná mbipụta Teta! nke September 8, 2001.

[Foto ndị dị na peeji nke 18, 19]

Ndị e ji ụgbọ mmiri e ji ebu ndị ohu bute site n’Africa (n’elu) nwere mgbe a na-ere ha n’ebe ndị a chọrọ ndị ohu n’America

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Godo-Foto

Archivo General de las Indias