Ihe Mberede Ụgbọala—Ị̀ Nọ Ná Nchebe?
Ihe Mberede Ụgbọala—Ị̀ Nọ Ná Nchebe?
“A maara m dị ka onye na-akwọ ụgbọala nke ọma, ya mere ọ dịghị m mkpa ichegbuwa onwe m banyere inwe ihe mberede ụgbọala.” “Ọ bụ nanị ndị na-eto eto bụ́ ndị na-akwọ ụgbọala ara ara na-enwe ihe mberede.” Ọtụtụ ndị na-eche na ha agaghị enwe ihe mberede ụgbọala ma ọlị. Ọ̀ bụ otú ahụ ka i chere? A bịa n’ihe banyere inwe ihe mberede ụgbọala, à gụpụrụ gị?
NDEKỌ ọnụ ọgụgụ na-egosi na ọ bụrụ na i bi ná mba mepere emepe, o yikarịrị nnọọ ka ị ga-enwe mmerụ ahụ́ n’ihe mberede ụgbọala ma ọ dịkarịa ala otu ugbo n’oge ndụ gị. Ihe mberede ndị dị otú ahụ na-egbu ọtụtụ ndị. Gburugburu ụwa, a na-enwezi ihe karịrị ọkara nde ndị na-anwụ n’ihe mberede okporo ụzọ kwa afọ. Ikekwe, ọtụtụ n’ime ndị nwụrụnụ n’afọ gara aga chere na ọ gaghị eme ha. Gịnị ka ị pụrụ ime iji belata ihe ize ndụ nke gị? Mgbochi bụ isi ihe dị mkpa. Tụlee otú ị pụrụ isi gbochie ihe mberede ndị iro ụra na mmetụta nke ịka nká na-akpata.
Ọkwọ Ụgbọala nke Na-ero Ụra
Ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu na ọkwọ ụgbọala nke na-ero ụra pụrụ ịdị ize ndụ dị ka ọkwọ ụgbọala nke ṅụbigara mmanya ókè. Ihe ndekọ na-egosi na iro ụra na-akpata ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ihe mberede. Akụkọ bụ́ Fleet Maintenance & Safety Report kwuru na nso nso a na n’ime otu afọ, 1 n’ime ndị ọkwọ ụgbọala 12 ọ bụla na Norway kọrọ na ụra buuru ha ka ha na-akwọ ụgbọala. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Star nke Johannesburg, South Africa si kwuo, ike ọgwụgwụ nke ndị ọkwọ ụgbọala na-akpata ihe ruru otu ụzọ n’ụzọ atọ nke nsọkọta isi ụgbọala nile a na-enwe ná mba ahụ. Akụkọ sitere ná mba ndị ọzọ na-ekpughe na ike ọgwụgwụ na-emetụta ndị ọkwọ ụgbọala n’ebe nile. Gịnị mere e ji enwe ọtụtụ ndị ọkwọ ụgbọala na-ero ụra?
Ndụ gbalụ gbalụ a na-ebi taa na-eso akpata nsogbu ahụ. Magazin bụ́ Newsweek kọrọ na nso nso a na ndị America pụrụ ịdị “na-ehi ụra n’abalị ọ bụla ihe ji otu awa na ọkara dị ala karịa ka [ha] na-ehibu ná mmalite nke narị afọ ọhụrụ a—o yikwara ka nsogbu ahụ ọ̀ ga-aka njọ.” N’ihi gịnị? Magazin ahụ hotara ọkachamara n’ihe banyere ụra, bụ́ Terry Young, dị ka onye kwuru, sị: “Ndị mmadụ elewo ụra anya dị ka ihe ha pụrụ ịnapụ onwe ha. A na-ewere mmadụ dị ka onye na-enwe ọganihu ma ọ bụrụ na ọ na-arụsi ọrụ ike n’ehighị nnukwu ụra.”
E kwuwo na ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị mmadụ nwere mkpa nke ihi ụra ruo site n’agbata awa isii na ọkara na awa itoolu kwa abalị. Ọ bụrụ na ndị mmadụ echuo onwe ha ụra, ha na-amalite “iji ụra ụgwọ.” Otu akụkọ nke Òtù AAA Na-ahụ Maka Ịdị Nchebe nke Okporo Ụzọ na-ekwu, sị: “Ọbụna ihiru ụra ihe ji minit 30 ma ọ bụ 40 dị ala karịa ihe a chọrọ kwa abalị n’ime izu pụrụ ịkpata iji ụra ụgwọ ruo awa 3 ma ọ bụ 4 ka ọ na-erule ngwụsị izu, bụ́ nke zuru ime ka ọ̀tụ̀tụ̀ nke iro ụra n’ụbọchị rịa elu.”
Mgbe ụfọdụ, e nwere ike ị gaghị ehi ezigbo ụra n’abalị. Nsogbu ehighị ụra nke ọma, ilekọta nwatakịrị na-arịa ọrịa, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ị na-apụghị ịchịkwa nwere ike ichu gị ụra. N’echi ya, ị pụrụ nnọọ ịhụ onwe gị ka ị na-ero ụra mgbe ị na-akwọ ụgbọala. Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na nke a emee?
Ihe ngwọta ndị a ma ama bụ́ ndị dị ka ịṅụ caffeine, imeghe windo, ịta chịngọm, ma ọ bụ iri ihe na-afụtụ ose nwere ike ghara ime ka ị mụrụ anya. Ọ dịghị nke ọ bụla
n’ime ihe ngwọta ndị a nke na-edozi ihe bụ́ nsogbu ahụ kpọmkwem. Ihe dị gị mkpa bụ ihi ụra. Ya mere, gịnị ma ị nwalee ihi obere ụra? Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times tụrụ aro, sị: “Obere ụra ehihie nke na-enye ume ọhụrụ ekwesịghị ịkarị minit 30; ọ gafee otú ahụ, ahụ́ gị ga-abanye n’oké ụra, bụ́ nke ọ na-esi ike isi na ya teta.” Ihi obere ụra pụrụ igbu gị oge iru ebe ị na-aga, ma ọ pụrụ ịgbatịkwu ndụ gị.Ụzọ ndụ gị pụrụ imekwu ka ị bụrụ onye nwere ike ịdị na-ero ụra mgbe ị na-akwọ ụgbọala. Ị̀ na-anọ ogologo oge n’Intanet, ka ị̀ na-amụ anya ruo ime ime abalị na-ekiri telivishọn? Ị̀ na-aga nnọkọ ntụrụndụ ndị na-adịru isi isi ụtụtụ? Ekwela ka ihe ndị dị otú ahụ chuo gị ụra. Onye amamihe bụ́ Eze Solomọn mere ka uru ọbụna ‘otu njuaka izu ike’ bara pụta ìhè.—Eklisiastis 4:6.
Ha Nwere Ahụmahụ Ma Mee Agadi Karị
Ndị ọkwọ ụgbọala metụrụla agadi na-abụkarị ndị ka nwee ahụmahụ n’okporo ụzọ. Ọzọkwa, ha adịghị emekarị ihe ndị dị ize ndụ, ha na-amakwa ihe ndị ha na-agaghị emeli. Otú ọ dị, ihe ize ndụ nke nsọkọta isi ụgbọala pụrụ ịdabara ndị ọkwọ ụgbọala metụrụla agadi. N’ezie, ha pụrụ ịghọkwu ndị ga-enwe ụdị ihe mberede ahụ ka ha na-akawanye nká. Magazin United States bụ́ Car & Travel kọrọ, sị: “Ndị gafeworo afọ 70 mejupụtara pasent 9 nke ndị bi ná mba a, ma mejupụta pasent 13 nke ndị na-anwụ n’ihe mberede okporo ụzọ.” N’ụzọ dị mwute, ọnụ ọgụgụ mkpọkasị nke ụgbọala bụ́ nke ndị ọkwọ ụgbọala metụworo agadi na-enwe na-arịwanye elu.
Tụlee ihe Myrtle, bụ́ onye dị afọ 80 kwuru. * Ọ malitere ịkwọ ụgbọala ihe karịrị afọ 60 gara aga, o nwetụbeghịkwa ihe mberede ụgbọala. Ma, dịkwa ka ọtụtụ ndị ọzọ, ọ na-enwe mmetụta nke ịka nká—mmetụta ndị pụrụ ime ka ohere o nwere inwe ihe mberede ka ukwuu. Ọ gwara Teta! na nso nso a, sị: “Ka ị na-akakwu nká, ihe ọ bụla ná ndụ [gụnyere ịkwọ ụgbọala] na-aghọ ihe ịma aka.”
Gịnị ka o meworo iji belata ihe ize ndụ nke inwe ihe mberede ụgbọala? “N’ọtụtụ afọ ndị gafeworonụ, emewo m mgbanwe n’ihi afọ ndụ m,” ka Myrtle na-ekwu. Dị ka ihe atụ, o belatawo oge ọ na-etinye n’ịkwọ ụgbọala, karịsịa n’abalị. Obere mgbanwe a na-enyere ya aka ịnọgide na-abụ onye na-enweghị ihe mberede, n’akwụsịghịkwanụ ịkwọ ụgbọala.
N’agbanyeghị otú o siruru ike nnakwere, ịka nká na-akpa onye ọ bụla aka ọjọọ. (Eklisiastis 12:1-7) Nsogbu ahụ́ ike dị iche iche na-ebilite, anyị adịchaghịkwa adị gara gara, anyị adịghịkwa ahụchazi ụzọ—bụ́ ihe ndị pụrụ ime ka ịkwọ ụgbọala n’ụzọ dị nchebe bụrụ ihe tara akpụ. Otú ọ dị, ime agadi n’onwe ya adịghị eme ka mmadụ gharazie iru eru ịkwọ ụgbọala. Ihe dị mkpa bụ otú mmadụ na-akwọru ụgbọala nke ọma. Ịmata mgbanwe ndị e nwere n’ikike ọkpụkpụ aka anyị na ime mgbanwe ndị kwesịrị ekwesị n’ihe ndị anyị na-eme mgbe nile pụrụ ime ka otú anyị si akwọ ụgbọala ka mma.
E nwere ike ị gaghị achọpụta ya, ma ọhụhụ ụzọ gị na-agbanwe. Ka ị na-akawanye nká, ókè anya gị na-ahụru ihe na-ebelata, akụkụ anya gị nke a na-akpọ retina na-achọkwu ìhè. Otu akwụkwọ nta aha ya bụ The Older and Wiser Driver na-ekwu, sị: “Ọkwọ ụgbọala dị afọ 60 chọrọ ìhè ruru okpukpu atọ iji hụ ụzọ dị ka onye nọ n’afọ iri na ụma, ọ ga-ewekwa anya ya ogologo oge ji okpukpu abụọ karịa oge ọ ga-ewe anya onye nọ n’afọ iri na ụma iji mee mgbanwe site n’ìhè gaa n’ọchịchịrị.” Mgbanwe ndị a a na-enwe n’anya anyị pụrụ ime ka ịkwọ ụgbọala n’abalị taa akpụ.
Henry dị afọ 72, ọ kwọwokwa ụgbọala ruo afọ 50 n’enweghị ihe mberede. Ka ọtụtụ afọ nọ na-agafe, ọ malitere ịchọpụta na ọkụ ụgbọala ndị na-abịa n’ihu n’abalị na-achachi ya anya, na-eme ka ịkwọ ụgbọala taa akpụ. Mgbe e nyochasịrị ya anya, ọ
chọpụtara na ọ dị ya mkpa inweta ugegbe anya ọhụrụ bụ́ nke a rụrụ ibelata ọkụ ịchachi mmadụ anya n’abalị. “Ịkwọ ụgbọala n’abalị abụghịzi ihe na-ata akpụ,” ka Henry na-ekwu. N’ebe ọ nọ, obere mgbanwe a mere ka ihe ka nnọọ mma. N’ebe ndị ọzọ nọ, dị ka Myrtle, ihe ngwọta ya pụrụ ịbụ ịkwụsị ịkwọ ụgbọala kpam kpam n’abalị.Ịka nká na-emetụtakwa ókè mmadụ na-emeghachiru omume n’oge. Ndị agadi pụrụ ịma ihe ma nwee uche karịa ndị na-emebeghị agadi. Otú ọ dị, ka mmadụ na-akawanye nká, otú ahụ ka ọ na-ewekwu ya oge ịghọta ihe ma meghachi omume. Nke a na-eme ka ịkwọ ụgbọala bụrụ ihe ịma aka karị, ebe ọ bụ na ọnọdụ okporo ụzọ na-agbanwe mgbe nile. A ghaghị ịchọpụta mgbanwe ndị a ngwa ngwa ma ọ bụrụ na a ga-emeghachi omume kwesịrịnụ n’oge.
Magazin bụ́ Car & Travel na-akọ na “ihe kasị akpata mkpọkasị ụgbọala ndị na-akpata ọnwụ n’etiti ndị agadi na-akwọ ụgbọala bụ na ọkwọ ụgbọala ahụ bụ́ onye meworo agadi gbakpunyere ná ngwá na-achịkwa ndị na-eji okporo ụzọ eme ihe.” N’ihi gịnị? Otu akụkọ a gara n’ihu ikwu, sị: “O yiri ka ihe bụ́ nsogbu . . . ò metụtara ọnọdụ ebe ọkwọ ụgbọala metụrụla agadi na-aghaghị ịtụle ihe ọmụma dịgasị iche iche n’aka ekpe nakwa n’aka nri tupu ọ̀ banye n’ebe ụzọ gaferịtara ibe ha.”
Olee otú ị pụrụ isi mee ihe n’iburu n’uche na ị dịchaghịzi gara gara? Kpachara anya mgbe ị na-eru ebe ụzọ gaferịtara ibe ha. Zụlite àgwà nke ile okporo ụzọ anya ugboro abụọ tupu ị gafee. Kpachara anya karịsịa mgbe ị na-atụgharị ụgbọala gị. Ịtụgharị ugboala n’ebe ụzọ gaferịtara ibe ha pụrụ ịkpata ọnwụ, karịsịa ma ọ bụrụ na ụzọ ị na-abanye ga-eme ka ị gafee ahịrị ụzọ ụgbọala ndị na-abịa n’ihu si agbafe.
Na United States, pasent 40 nke ihe mberede ndị na-akpata ọnwụ ndị ndị ọkwọ ụgbọala gafeworo afọ ndụ 75 na-enwe n’ebe ụzọ gaferịtara ibe ha bụ ndị metụtara ntụgharị gaa n’aka ekpe. Òtù AAA Na-ahụ Maka Ịdị Nchebe nke Okporo Ụzọ na-atụrụ ndị ọkwọ ụgbọala nọ ná mba ahụ aro, sị: “Mgbe ụfọdụ, ị pụrụ ịtụgharị gaa n’aka nri ugboro atọ iji zere ịtụgharị otu ugbo gaa n’aka ekpe.” Ị pụrụ iji ụkpụrụ ahụ mee ihe n’ikwekọ n’ọnọdụ ndị e nwere n’ebe i bi. Site n’ime obere atụmatụ tupu oge eruo, ị pụrụ izere ebe ndị ụzọ gaferịtara ibe ha bụ́ ndị dị ize ndụ ma na-eweta ihe ịma aka.
Mkpebi Ị Ga-echebara Echiche
Gịnị pụrụ inyere gị aka ịchọpụta ókè ị na-akwọru ụgbọala nke ọma? Ikekwe ị pụrụ ịrịọ enyi gị ị na-akwanyere ùgwù ma ọ bụ onye òtù ezinụlọ gị ka o sonyere gị mgbe ị na-akwọ ụgbọala ma lee nkà gị. E mesịa, gee ntị nke ọma n’ihe ọ bụla ha pụrụ ikwu. Ị pụkwara ikpebi ịnata ọzụzụ maka ịkwọ ụgbọala n’ụzọ dị nchebe. Ọtụtụ ụlọ ọrụ ndị na-enye ọzụzụ banyere ịkwọ ụgbọala na-enye ọzụzụ ndị e mere karịsịa maka ndị agadi. Inwe ọnọdụ abụọ ma ọ bụ karị bụ́ ndị ọ fọrọ nke nta ka i nwee ajọ ihe mberede pụrụ ịbụ ihe àmà na nkà ịkwọ ụgbọala gị adịghịzi mma otú ọ dịbu.
N’ikwu eziokwu, ọ dị ebe ọ ga-eru ya akara gị mma ịkwụsị ịkwọ ụgbọala. Nke a pụrụ ịbụ mkpebi dị mwute omume. Myrtle, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ, maara na otu ụbọchị n’oge na-adịghị anya, ọ ghaghị ịkwụsị ịkwọ ụgbọala. Ka ụbọchị ahụ na-eru nso, ọ maliteworị ime ka ndị ọzọ na-ebu ya mgbe mgbe. Olee mmetụta ọ na-enwe banyere inyefe onye ọzọ ọrụ nke ịkwọ ụgbọala ya? “Ọ bụ ihe dị mma ịnụ ụtọ nke ịbụ onye e bu ebu n’enweghị nchekasị nke ịkwọ ụgbọala na-eweta,” ka o kwuru.
Mgbe ị tụlesịworo ya nke ọma, ị pụrụ iche otú ahụ. Ịga ịzụ ihe, ịga ozi, na ime njem gaa n’ebe e yiri agba na nzukọ pụrụ ịdị ụtọ karị ma gị na enyi gị soro. Ikekwe enyi gị pụrụ ibute gị n’ụgbọala gị. Ime njem otú ahụ pụrụ ịdị nchebe ma dị ụtọ karịa ime ya nanị gị. Iji usoro njem ọha na eze eme ihe, n’ebe e nwere ya, pụrụ ịbụ nhọrọ ọzọ dị mma. Cheta na uru ị bara adịghị adabere n’ikike i nwere ịkwọ ụgbọala. Ọ bụ àgwà ọma ndị i nwere na-eme ka ị bụrụ onye bara uru n’ezie n’anya ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị—nakwa n’anya Chineke.—Ilu 12:2; Ndị Rom 14:18.
Ma ì meela agadi ma i mebeghị, ma ị̀ bụ ọkwọ ụgbọala nwere ahụmahụ ma ọ bụ na ị bụghị, ihe ize ndụ nke ihe mberede ụgbọala pụrụ ịdabara gị. Ghọta ibu ọrụ siri ike nke dị n’ịkwọ ụgbọala. Kpachara anya iji belata ohere ndị i nwere ịbụ onye ụgbọala ya kpọkara. Site n’ime otú ahụ, ị pụrụ ichebe onwe gị na ndị ọzọ n’ọtụtụ njem ndị ị ka ga-eme n’ọdịnihu.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 13 A gbanwewo aha ndị dị n’isiokwu a.
[Foto dị na peeji nke 12]
Jide n’aka na i hiri ụra nke ọma n’abalị
[Foto dị na peeji nke 13]
Obere ụra pụrụ igbutụ oge, ma ọ pụrụ ịzọpụta ndụ
[Foto dị na peeji nke 13]
Ndị ọkwọ ụgbọala metụworo agadị na-aka enwe ahụmahụ ma ha na-eche ihe ịma aka ndị pụrụ iche ihu
[Foto dị na peeji nke 14]
Uru dị n’inwe onye ga-eso gị eme njem