M̀ Kwesịrị Ikiri Vidio Egwú?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
M̀ Kwesịrị Ikiri Vidio Egwú?
“Vidio egwú amaka. Ụfọdụ n’ime ha yiri ihe nkiri sinima dị nkenke. Ha na-akọ akụkọ, usoro a na-ejikwa agba ya na-amasị m.”—Casey.
“Ha bụ ụzọ dị mma isi chọta egwú ọhụrụ. Ha na-egosi ihe karịrị egwú 40 kasị mma bụ́ ndị a na-ekirikarị. Ọzọkwa, vidio egwú pụrụ iwepụta isiokwu ndị dị mma maka nkwurịta okwu.”—Josh.
“Ụmụ irighiri ihe ndị a na-egosi na vidio na-amasị m nke ukwuu—onye na-agụ egwú, ụdị uwe o yi, otú o si eme ihe. Ihe ndị a nile na-ejikọta aka eme ka a ghọta ihe okwu abụ ya pụtara.”—Kimberly.
“Ọ na-amasị m ịhụ ihe òtù egwú ndị kasị amasị m na-aga ime na nke ugbu a. Ihe ndị e ji nkà tinye n’egwú na-amasị m. Ụfọdụ vidio na-atọkwa ọchị. Ma ị ghaghị ịkpachara anya.”—Sam.
IKEKWE gị onwe gị na-enwekwa mmasị ikiri vidio egwú. Mgbe mbụ a malitere igosi ha na telivishọn, ha bụ ihe omume ndị a na-etinyeghị ego na nkà dị ukwuu ná mmepụta ha. Ma mgbe vidio egwú gosipụtara na ha abụghị ihe na-ewu nnọọ ewu ruo obere oge nakwa na ha na-aga ahịa, a malitere ime ka ha na-abụwanye ọkpọka, ndị e ji nkà emepụta. Taa, ha bụ akụkụ dị ịrịba ama nke iti egwú ma na-amasị nnọọ ndị na-eto eto. N’ala ụfọdụ, e nwere ụlọ ọrụ TV ndị e wuru maka igosi nanị vidio egwú!
Ma n’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị na-eto eto dị ka Sam, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru n’ebe a, ji na-ekwu na ọ dị mkpa ka a kpachara anya? Ọ̀ ga-abụ na ụfọdụ vidio egwú pụrụ inwe mmetụta ọjọọ n’ahụ́ gị—ikekwe na-emerụ echiche na ụkpụrụ omume ọma gị ma ọ bụ ọbụna na-ebibi mmekọrịta gị na Onye Okike gị? Ajụjụ dị otú ahụ pụrụ iyi ihe gabigara ókè. Ma cheedị echiche, Ọ bụrụ na ị na-aga igwu mmiri n’ọdọ mmiri ma ọ bụ n’oké osimiri ma hụ ebe e dere ịdọ aka ná ntị na-ekwu na igwu mmiri n’ebe ahụ dị ize ndụ, ọ̀ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ileghara ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ anya? Ọ dịghị ma ọlị. N’ihi ya, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịtụle ịdọ aka ná ntị ụfọdụ banyere vidio egwú.
Akụkụ Ndị Dị Ize Ndụ
Ọ dị gị mkpa ịnakwere eziokwu ahụ bụ́ na ihe ị hụrụ ma nụ pụrụ imetụta gị! Bible na-agwa anyị 1 Samuel 16:14-23) Egwú ọ̀ pụkwara inwe mmetụta dị njọ? Akwụkwọ bụ́ Rock and Roll—Its History and Stylistic Development na-ekwu, sị: “Mmadụ apụghị ịsị na ọ na-enwe mmetụta dị ike n’otu akụkụ ma ghara inwe n’akụkụ nke ọzọ. Ọ bụrụ na anyị ekweta na egwú rock enwewo mmetụta dị mma (dị ka o nweworo), anyị aghaghịkwa ịdị njikere ikweta na o nwewo mmetụta dị njọ (dị ka o nweworo). Onye ji nganga kwuo, sị, ‘Aa, ana m ege egwú, ma ọ dịghị emetụta m’ bụ onye iberibe ma ọ bụkwanụ onye na-amaghị nke a na-akọ.”
na eze mbụ nke Izrel, bụ́ Sọl, jiri egwú mee ihe n’ụzọ bara uru—iji mee ka obi dị ya mma. (N’ọtụtụ ebe, Bible na-ekwu banyere mmetụta anya na-enwe n’echiche na mmetụta uche anyị. (Ilu 27:20; 1 Jọn 2:16) Ya mere, site n’itinye ihe nkiri bụ́ ịgba n’egwú, ndị na-emepụta vidio na-etinyekwu nnọọ ihe ná mmetụta egwú na-enwe n’ahụ́ ndị na-ege ya. Olee ụdị ihe nkiri ndị a na-ejikarị eme ihe?
Dị ka otu nnyocha si gosi, ihe dị ka pasent 57 nke vidio egwú rock na-egosi ime ihe ike. Ihe dị ka pasent 76 na-egosi mmekọahụ. Nnyocha ọzọ e mere n’oge na-adịbeghị anya gosiri na pasent 75 nke vidio ndị na-akọ akụkọ na-egosikwa mmekọahụ, ihe karịkwara ọkara na-egosi ime ihe ike, bụ́ nke a na-emesokarị ndị inyom. N’ihi ihe ndị ahụ e kwuru, ikiri ụdị vidio ndị dị otú ahụ ọ̀ ga-emerụ gị ahụ́ n’ezie? Otu magazin na-ekwu na “nnyocha 37 e ji mee nnwale gosiri na ikiri vidio egwú pụrụ, n’ezie, imetụta àgwà nke ndị nọ n’oge uto n’ihe banyere inwe mmekọahụ na nwata ma ọ bụ nke dị ize ndụ.” Ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ka ndị oti egwú na-agbalị ime ihe na-awụ akpata oyi n’ahụ́ karịa ndị buru ha ụzọ na ndị ọgbọ ha, vidio egwú na-abụwanye ndị a na-egosi ihe ndị dị njọ na ha.
Otu ọkachamara n’ihe banyere agụmakwụkwọ kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị na-arụ ụka na mmetụta nke ihe ha na-anụ—ma na-ahụ na vidio egwú—adịghị iche ná mmetụta ndị egwú nwere n’ahụ́ ọgbọ ndị gara aga . . . Ma o yiri ka ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị na-eti egwú taa hà na-eji asọghị anya ewere okwu rere ure na omume jọgburu onwe ya dị ka ihe ndị a na-anabata bụ́ ndị ga-eme ka egwú ha gaa ahịa.” Magazin bụ́ Chicago na-ekwu banyere ndị na-ekiri otu chanel vidio egwú, sị: “Ihe ha na-anọgide na-ekiri bụ ọtụtụ ihe na-akpali nnọọ agụụ mmekọahụ, bụ́ ndị a na-agbachaghị ihe nile n’anwụ na ha.”
Magazin Chicago na-akọwakwa otu vidio egwú bụ́ nke ‘otu nwa okorobịa nọdụrụ ala n’elu kọbọd dị n’ụlọ nri ma tụlaa nnọọ isi ya azụ. Otu ihe gbunyere ya nnukwute ọnyá ọbara sọchiri n’olu, isi ya dapụkwara.” A kọrọ na vidio ọzọ gosiri otu nwoke na-adọkasị uwe ya n’ụzọ na-adịghị mma ile anya, bụ́kwa ebe ọ nọ na-adọkapụsị anụ ahụ́ ya. E gosikwara ihe ndị ọzọ na-awụ nnọọ akpata oyi n’ahụ́ nke na a pụghị ịkọ banyere ha.
Ugbu a, ụfọdụ pụrụ ileghara ihe ndị a anya, na-azọrọ na vidio ndị ahụ a kọwara n’ebe a jọbigara njọ ókè nakwa na ihe ka ọtụtụ n’ime ha adịrughị njọ otú ahụ. Ụfọdụ pụrụ ọbụna ịrụ ụka na ha adịghị ahụ vidio egwú dị ka ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́ ma ọ bụ ndị na-adịghị mma. Ọ̀ bụ na nke ahụ adịghị nnọọ egosi na nnọgide ndị dị otú ahụ nọgidere na-ekiri vidio ndị dị otú ahụ emewo ka ọ gharazie imetụta ha? Casey, bụ́ nwa okorobịa ahụ e hotara ihe o kwuru ná mmalite, na-ekweta, sị: “Ọ bụrụ na ị kparaghị ihe ị na-ekiri ókè, ihe jọgburu onwe ya nye gị na mbụ na-emesị ghọọ ihe na-enweghị ihe ọ bụ. N’amaghị ama, ị ga na-atụ anya ihe karịrị nke i lere ele ma na-anabata ihe ndị na-awụbu gị akpata oyi n’ahụ́.”
Gịnị pụrụ isi na ya pụta? Ikike i nwere ime mkpebi ndị ezi uche dị na ha pụrụ ibelata nke ukwuu. Ebe ọ bụ na a pụrụ imetụta uche anyị nnọọ ngwa ngwa n’ụzọ dị njọ, Bible na-agba anyị ume ‘ichebe ezi amamihe na ikike iche echiche.’ (Ilu 3:21; 5:2, NW) Ihe ọjọọ ọzọ pụrụ isi na ya pụta pụrụ ịbụ mmebi nke ọbụbụenyi gị na Jehova Chineke. Nke ahụ ọ́ bụghị ihe kasị oké ọnụ ahịa i nwere? N’ihi ya, ọ dị gị mkpa ichebe ọbụbụenyi ahụ site n’ime ihe ụfọdụ iji zere ụdị ntụrụndụ ọ bụla na-ekwesịghị ekwesị. Olee otú ị pụrụ isi mee otú ahụ?
Ichebe Onwe Gị
Nke mbụ, biko kweta na ọ dị njọ ikiri ihe ndị Bible katọrọ n’ụzọ doro anya. (Abụ Ọma 11:5; Ndị Galeshia 5:19-21; Mkpughe 21:8) Mgbe vidio na-akwalite ihe ndị ‘na-ekwesịghị ndị nsọ,’ ị ghaghị ikpebisi ike ịkwụsị ikiri ya. (Ndị Efesọs 5:3, 4) N’eziokwu, ịgbanwe chanel—ma ọ bụ ịgbanyụ TV—nwere ike ghara ịdị mfe mgbe a na-egosi vidio na-adọrọ mmasị. N’ihi ya, ọ pụrụ ịdị gị mkpa ikpe ekpere dị ka ọbụ abụ ahụ mere, bụ́ onye dere, sị: “Mee ka anya m abụọ si n’ile ihe efu gabiga.”—Abụ Ọma 119:37.
Dị ka o kwesịrị, vidio ndị jọgburu onwe ha dị ka ndị ahụ anyị kọwara na mbụ pụrụ ịwụ gị akpata oyi n’ahụ́. Otú ọ dị, ụfọdụ vidio yiri ka hà na-eji ụzọ na-apụtachaghị ìhè egosi ihe. Ihe omume na-egosi mmekọahụ pụrụ ịdịru nwa oge. A pụrụ iji nkà webata okwu abụ ya na ihe omume ya iji kwalite echiche na-adịghị enye Chineke nsọpụrụ n’ekwughị ihe hoo haa ma ọ bụ n’egosighị ihe n’ụzọ pụtara nnọọ ìhè. Ka o sina dị, ọ bụrụ na ị na-enwetụ obi amamikpe n’ihi ikiri otu vidio kpọmkwem, ọ pụrụ ịbụ na n’ụzọ ụfọdụ, ọ bụghị nke na-ewuli elu ma ọ bụ na o kwesịghị Ndị Kraịst. Oleezi otú ị pụrụ isi kpebie ihe ị ga-ekiri na ihe ị ga-ezere mgbe ọ na-edoghị anya ma ò kwesịrị ekwesị ma ọ bụ na o kwesịghị ekwesị?
Otú ọ dị, ma ị̀ ga-ekiri vidio egwú ma ọ bụ na ị gaghị ekiri bụ mkpebi dịịrị gị nakwa nke dịịrị ndị mụrụ gị, bụ́ ndị nwere ibu ọrụ nke ikpebi ihe ị pụrụ ikiri na ihe ị na-apụghị ikiri. (Ndị Efesọs 6:1, 2) Ma ọ bụrụ na ndị mụrụ gị ekwe ka ị na-ekiri vidio egwú, ọ bụghị nanị ihe i chere na o kwesịrị ekwesị ga na-eduzi gị. Ndị Hibru 5:14 na-agba anyị ume ‘ịzụ ikike nghọta anyị ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.’ A na-azụ ikike nghọta anyị site n’ịmụ ụkpụrụ dị iche iche nke Bible, bụ́ ndị na-egosi anyị ụzọ isi kpebie ihe ziri ezi na ihe ọjọọ n’anya Jehova. Site n’ịtụgharị uche n’ụkpụrụ ndị dị otú ahụ nke Bible, ị ga-enwe ike ịmata ihe ga-etinye ahụ́ ike ime mmụọ gị n’ihe ize ndụ, ọbụna mgbe a na-enweghị ụkpụrụ Bible ọ bụla ga-eduzi gị kpọmkwem.
Ya mere, olee kpọmkwem ụkpụrụ Bible ndị pụrụ iduzi gị n’ihe banyere ikiri vidio egwú? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-abịa n’ihu.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]
“Onye ji nganga kwuo, sị, ‘Aa, ana m ege egwú, ma ọ dịghị emetụta m’ bụ onye iberibe ma ọ bụkwanụ onye na-amaghị nke a na-akọ”
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Ị̀ pụrụ n’ezie ikiri ihe na-adịghị ewuli elu ma ghara ịbụ onye o metụtara?