Iwe A Na-ewe Megide Ụtụ Isi—Ọ̀ Na-arịwanye Elu?
Iwe A Na-ewe Megide Ụtụ Isi—Ọ̀ Na-arịwanye Elu?
“M tasịa ahụhụ kpata ego, a nara m ya.”—Ilu ndị Babilọn, n’ihe dị ka afọ 2300 T.O.A.
“N’ụwa a, ọ dịghị ihe o doro anya na ọ ga-ewerịrị ọnọdụ ma e wezụga ọnwụ na ụtụ isi.”—Onye United States ọnụ na-eru n’okwu, bụ́ Benjamin Franklin, 1789.
REUBEN na-ere ihe n’ụlọ ahịa. Kwa afọ, otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ego ọ tara ahụhụ kpata na-aba n’ụtụ isi. “Adịghị m ahụ ebe ego nile a na-abanye,” ka ọ na-eme mkpesa. “Gọọmenti adịghịzi emere anyị ọtụtụ ihe otú o si emebu n’ihi mbelata ọ na-ebelata ego ọ na-emefu n’ozi ndị ọ na-ejere ọha na eze.”
Otú ọ dị, ma ọ̀ dị gị mma ma ọ bụ na ọ dịghị gị, a ga na-atụ ụtụ isi ka a na-adị ndụ. Onye edemede bụ́ Charles Adams na-ekwu, sị: “Kemgbe [a nọworo] na-enwe mmepeanya, gọọmenti anọwo na-ana ụtụ isi n’ọtụtụ ụzọ maka ego mmadụ kpatara.” Ọtụtụ mgbe, ụtụ isi akpasuwo ndị mmadụ iwe ma kpalie nnupụisi. Ndị Britain oge ochie lụsoro ndị Rom ọgụ, na-ekwu, sị: “Ọ ka mma na e gburu anyị egbu karịa iji ụtụ isi bokwasị anyị n’isi!” Na France, asị a kpọrọ ụtụ isi bụ́ gabelle, bụ́ ụtụ isi a na-atụ maka nnu, so kpalite Mgbanwe Ọchịchị France, bụ́ nke a nọ na ya gbupụgasịa ndị ọnaụtụ isi. Ọgba aghara ndị metụtara ụtụ isi sokwa kpata ọgụ mba United States lụrụ maka nnwere onwe, bụ́ nke ha lụsoro England.
Ọ bụghị ihe ijuanya na a nọgidere na-ewe iwe megide ụtụ isi ruo taa. Ndị ọkachamara na-ekwu na ụtụ isi ndị a na-atụ ná mba ndị ka na-emepe emepe na-abụkarị nke “na-adịghị arụpụta ezi ihe” na nke “a na-ana n’ụzọ na-ezighị ezi.” Dị ka otu onye nchọpụta si kwuo, e nwere otu ala Africa dara ogbenye bụ́ ebe e nwere “ihe karịrị ụtụ isi 300, bụ́ ndị na-adịghị ekwe nnakọta ọbụna mgbe e jiri ndị ọrụ maara nke a na-akọ mee ihe. Ma ọ́ bụghị na e nweghị usoro kwesịrị ekwesị a ga-esi na-anakọta ma na-ahụ maka ha, ọ bụrụ na a dịghị etinye usoro ndị ahụ n’ọrụ, . . . bụ́ nke na-akpata iji ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.” Akụkọ Ụwa BBC na-akọ na n’otu mba dị n’Eshia, “ndị ọchịchị ime obodo nyere iwu ka a na-atụ ọtụtụ ụtụ isi . . . iwu na-akwadoghị—malite n’ụtụ isi maka ugbo unere ruo n’ụtụ isi maka igbu ezì—ma ọ́ bụghị iji nwetakwuoro gọọmenti ime obodo ego ọ bụrụ iji fọjuo akpa nke ha.”
Oghere e nwere n’etiti ndị ọgaranya na ndị ogbenye na-akpalitekwu iwe. Otu magazin òtù UN na-ebipụta bụ́ Africa Recovery na-ekwu, sị: “Otu n’ime ihe ndị na-akpata ọtụtụ ọdịiche e nwere n’ọnọdụ akụ̀ na ụba nke mba ndị mepere emepe na mba ndị ka na-emepe emepe bụ na mba ndị mepere emepe na-enye ndị ọrụ ugbo ego enyemaka, ebe mba ndị ka na-emepe emepe na-ana ndị ọrụ ugbo ụtụ isi. . . . Nnyocha Ụlọ Akụ̀ Ụwa mere na-enye echiche na nanị ego enyemaka mba United States na-enye ndị ọrụ ugbo kwa afọ na-eji ihe dị ka [nde] $250 ebelata ihe Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa na-akpata kwa afọ site n’ibupụ ogho ná mba ndị ọzọ.” N’ihi ya, ndị ọrụ ugbo nọ n’ala ndị ka na-emepe emepe pụrụ iwe iwe mgbe ndị ọchịchị ha seere ụtụ isi n’elu ego ha na-akpata bụ́ nke dị mbụ dịrị ntakịrị. Otu onye ọrụ ugbo nọ n’otu ala Eshia na-ekwu, sị: “Mgbe ọ bụla [ndị ọrụ gọọmenti] bịara ebe a, ha ga-anarịrị anyị ego.”
E were ụdị iwe ahụ n’oge na-adịbeghị anya na South Africa mgbe gọọmenti kwuru ka ndị ọrụ ugbo na-atụ ụtụ isi maka ala. Ndị ọrụ ugbo ahụ yiri egwu na ha ga-agba gọọmenti akwụkwọ
n’ụlọikpe. Ụtụ isi ahụ “ga-eme ka ego kọọ ndị ọrụ ugbo ma mee ka e nwekwuo ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị ọrụ ugbo na-enweghị ọrụ,” ka otu onye na-ekwuchitere ndị ọrụ ugbo kwuru. Mgbe ụfọdụ, iwe a na-ewe megide ịtụ ụtụ isi ka na-akpatakwa ime ihe ike. Akụkọ Ụwa BBC na-akọ, sị: “E gburu ndị ọrụ ugbo abụọ [bụ́ ndị Eshia] n’afọ gara aga mgbe ndị uwe ojii wabatara n’ime otu obodo ebe ndị ọrụ ugbo, bụ́ ndị nwere nanị ntakịrị ugbo, nọ na-eme ngagharị iwe n’ihi ụtụ isi gabigara ókè a na-ana ha.”Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ndị ogbenye na-ewe iwe megide ịtụ ụtụ isi. Otu nnyocha e mere na South Africa kpughere na ọtụtụ ndị ọgaranya na-atụ ụtụ isi “adịghị njikere ịtụkwu ụtụ isi—ọbụna ma ọ bụrụ na gọọmenti agaghị enwe ike imeziwanye ihe n’ozi ndị dị mkpa ọ na-ejere ha.” Ndị a ma ama n’ụwa n’ịkụ egwú, n’ime ihe ngosi, n’egwuregwu, nakwa na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, abụwo ndị e ji mere isi akụkọ n’akwụkwọ akụkọ n’ihi izere ịtụ ụtụ isi. Akwụkwọ bụ́ The Decline (and Fall?) of the Income Tax na-ekwu, sị: “N’ụzọ dị mwute, ndị isi gọọmenti anyị, ndị president anyị, esetịpụbeghịkwa ezi ihe nlereanya n’ịkpali ụmụ amaala bụ́ ndị nkịtị irube isi n’iwu ụtụ isi.”
Ma eleghị anya, gị onwe gị kwa na-eche na ụtụ isi a na-ana gabigara ókè, bụrụ nke a na-ana n’ụzọ na-ezighị ezi, na nke na-agwụ ike. Oleezi otú i kwesịrị isi na-ele ịtụ ụtụ isi anya? Ọ̀ dị uru ha bara n’ezie? N’ihi gịnị ka usoro ụtụ isi na-ejikarị adị mgbagwoju anya ma yie nke a na-ana n’ụzọ na-ezighị ezi? Isiokwu ndị na-esonụ na-aza ajụjụ ndị a.
[Foto dị na peeji nke 4]
N’ala ndị ka na-emepe emepe, ndị ogbenye pụrụ ịdị na-atụ ụtụ isi karịa ndị ọzọ
[Ebe E Si Nweta Foto]
Godo-Foto