Ọgwụ Igbo Hà Pụrụ Inyere Gị Aka?
Ọgwụ Igbo Hà Pụrụ Inyere Gị Aka?
KEMGBE gboo, e jiwo ọgwụ Igbo mee ihe n’ịgwọ ọrịa. Akwụkwọ bụ́ Ebers Papaịrọs, nke e dere n’Ijipt n’ihe dị ka narị afọ 16 T.O.A., nwere ọtụtụ narị ọgwụ mkpá akwụkwọ na nke mkpọrọgwụ ndị e depụtara na ya, ndị a sịrị e ji agwọ ọrịa dị iche iche. Otú ọ dị, ọ bụ ọnụ ka otu ọgbọ jikarị akọwara ọgbọ ọzọ ọgwụ Igbo ndị e ji agwọ ọrịa.
O yiri ka ọ̀ bụ n’akwụkwọ bụ́ De Materia Medica, nke onye Gris bụụrụ dibịa na narị afọ mbụ, bụ́ Dioscorides dere, ka a gbakwasịrị ụkwụ malite iji mkpá akwụkwọ na mkpọrọgwụ agwọ ọrịa n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa. Ọ ghọrọ akwụkwọ bụ́ isi nke nkà mmụta ọgwụ ruo afọ 1,600 sochirinụ. N’ọtụtụ akụkụ ụwa, ọtụtụ ndị ka na-eji ọgwụ mkpá akwụkwọ na nke mkpọrọgwụ eme ihe. Na Germany, gọọmenti nwere ndokwa ahụ́ ike nke a pụrụ ọbụna ịkwụghachi mmadụ ihe o mefuru n’ịzụ ọgwụ mkpọrọgwụ ndị e depụtaara ya.
Ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ, a na-azọrọ na ọgwụ Igbo adịghị ize ndụ otú ọgwụ Bekee dị, ọ pụtaghị na ha enweghị ihe ize ndụ. Ya mere, ajụjụ bụ: Olee ịdọ aka ná ntị na aro mmadụ kwesịrị iburugasị n’uche mgbe ọ na-eche echiche iji ha mee ihe? È nwekwara ọnọdụ ebe otu usoro ọgwụgwọ pụrụ ịba uru karị? *
Otú Ọgwụ Igbo Pụrụ Isi Nye Aka
E kwuwo na ọgwụ Igbo nwere ọtụtụ ihe ndị na-agwọ ọrịa. E chere na ụfọdụ n’ime ha na-enyere ahụ́ aka ịlụso ọrịa ọgụ. E kwuru na ndị ọzọ na-enye aka n’ịgbari nri, n’ịkụjụ akwara, n’ime ka afọ ghara isi ike, ma ọ bụ n’ime ka akụkụ ahụ́ ndị na-emepụta mmiri ọgwụ ahụ́ na-arụzi ọrụ.
A pụrụ iji mkpá akwụkwọ mere ihe oriri nakwa ihe e ji agwọ ọrịa. Dị ka ihe atụ, akụ́kụ́ ụfọdụ ndị na-eme ka mmadụ na-anyụkarị mamịrị, dị ka parsley, nwekwara potassium buru ibu. Potassium nke dị n’akụ́kụ́ ndị a na-anọchi anya mmiri ahụ́ ndị dị oké mkpa bụ́ ndị so mamịrị pụọ. N’otu aka ahụ, akụ́kụ́
bụ́ Valeriana officinalis, nke e jiworo mee ihe eri ogologo oge dị ka ihe na-akụjụ ahụ́, nwere calcium n’ụba. Calcium ahụ pụrụ ịkwalitekwu nkụjụ akụ́kụ́ ahụ na-akụjụ akwara ozi.Otú A Pụrụ Isi Jiri Ọgwụ Igbo Mee Ihe
A pụrụ iji ọgwụ Igbo mee ihe n’ọtụtụ ụzọ, dị ka ime ya ka tii ṅụọ, isi ya esi ṅụọ, igbunye ya na mmanya ọkụ ṅụọ, nakwa igwe ya egwe ma na-ete n’ahụ́. A na-eme ọgwụ ndị a ga-aṅụ ka tii site n’ịwụnye ha n’efere ma gbanye ha mmiri ọkụ. Ma ndị ọrụ ahụ́ ike na-adọ aka ná ntị na e kwesịghị isi ọgwụ a ga-aṅụ ka tii esi. Iji si na mkpọrọgwụ na ụgbụgbọ osisi nweta ọgwụ e siri esi, a na-esi ha na mmiri ọkụ iji mee ka ihe ndị na-agwọ ọrịa na ha pụta.
Gịnị banyere ọgwụ ndị a na-egbunye ná mmanya ọkụ? Otu akwụkwọ na-ekwu na ha bụ ‘ọgwụ ndị e ji mmanya ọkụ mee ka ha si na mkpọrọgwụ pụta.’ E nwekwara ndị a na-ete n’ahụ́, nke a pụrụ ịkwadebe n’ụzọ dịgasị iche. A na-ejikarị ha eme ihe n’akụkụ ahụ́ nwere nsogbu ma ọ bụ nke na-egbu mgbu.
N’adịghị ka ọtụtụ vitamin na ọgwụ Bekee, a na-ele ihe ka ukwuu n’ọgwụ Igbo anya dị ka ihe oriri, a na-aṅụkarịkwa ha n’erighị nri. A pụkwara ịṅụ ha n’ụdị a gbanyere na kapsụl, nke pụrụ ịdị mfe ọṅụṅụ ma dịkwa mma n’ọnụ karị. Ọ bụrụ na i kpebie ịṅụ ọgwụ Igbo, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịgbaso ntụziaka onye ọkachamara.
A na-atụkarị aro ka a ṅụọ ọgwụ Igbo maka nsogbu ndị dị ka àzụ̀zụ̀, nri agbarighị nke ọma, afọ isi ike, ehighị ụra nke ọma, na agbọ onunu. Otú ọ dị, a na-ejikwa mkpá akwụkwọ na mkpọrọgwụ eme ihe mgbe ụfọdụ maka ọrịa ndị siri ike karị—ọ bụghị nanị maka ọgwụgwọ kamakwa maka mgbochi. Dị ka ihe atụ, na Germany nakwa n’Austria, a na-eji ahịhịa bụ́ Serenoa repens eme ihe maka ọgwụgwọ mbụ nke ọzịza nke akụkụ ahụ́ bụ́ prostate gland (ebe na-emepụta mmiri ọbara ọcha n’ahụ́ ụmụ nwoke). Ná mba ụfọdụ, nsogbu a na-emesị metụta pasent ndị ikom 50 ruo 60. Otú ọ dị, ọ dị mkpa ka dọkịta chọpụta ihe kpatara ọzịza ahụ iji jide n’aka na ọnọdụ ahụ achọghị ọgwụgwọ siri ike karị, dị ka ọrịa cancer na-achọ.
Ịdọ Aka ná Ntị Ụfọdụ
N’agbanyeghị na a pụrụ ile ọgwụ Igbo anya n’ebe nile dị ka ihe na-adịghị ize ndụ, ọ dịkwa mkpa ịkpachapụ anya. Ya adịla mgbe ị ga-akwụsị ịkpachapụ anya nanị n’ihi na a sịrị na ọgwụ “si n’okike.” Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma banyere mkpá akwụkwọ na-ekwu, sị: “Eziokwu na-enye nsogbu n’obi bụ na ụfọdụ mkpá akwụkwọ na mkpọrọgwụ dị nnọọ ize ndụ. [N’ụzọ dị mwute], ụfọdụ ndị adịghị akwanyere mkpá akwụkwọ na mkpọrọgwụ ọ bụla—ma hà dị ize ndụ ma ọ bụ na ha adịghị—ùgwù kwesịrị ha.” Mmiri ọgwụ ndị dị na ha pụrụ ịgbanwe otú obi si akụ, ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị, na ọ̀tụ̀tụ̀ shuga bụ́ glucose dị n’ahụ́. N’ihi ya, ndị na-arịa ọrịa obi, ọbara mgbali elu, ma ọ bụ ndị nwere nsogbu ndị dị ka ọrịa shuga, kwesịrị ịkpachapụ anya karịsịa.
Otú ọ dị, mmetụta ọjọọ mkpá akwụkwọ na mkpọrọgwụ na-enwekarị agwụla ndị na-egosi na ahụ́ anabataghị ha. Ha na-agụnye isi ọwụwa, ajụ obubu, agbọ onunu, ma ọ bụ ihe ịgha n’ahụ́. A na-ekwukwa na ha na-eme ka ọrịa ka njọ ruo nwa oge site n’ịkpata ihe mgbaàmà ndị yiri àzụ̀zụ̀ ma ọ bụ mgbaàmà ndị ọzọ. Onye na-aṅụ ha pụrụ iyi ka ọrịa ya ọ kara njọ tupu ọ malitezie ịgbake. A na-azọrọkarị na ọ bụ ihe ndị na-adịghị mma, nke ọgwụ ahụ na-ewepụsị n’ahụ́ n’oge ndị mbụ a malitere ịṅụ ya, na-akpata mmetụta a.
Ebe ọ bụ na n’oge ụfọdụ, ndị mmadụ na-anwụ n’ihi ihe ndị metụtara ọgwụ mkpá akwụkwọ na nke mkpọrọgwụ ụfọdụ, ọ dị mkpa ka mmadụ kpachapụ anya ma jide n’aka na ihe ọ na-eme doro ya anya. Dị ka ihe atụ, akụ́kụ́ bụ́ ephedra, nke e jikarị eme ihe maka mfelata nke ahụ́, pụkwara ime ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị n’ahụ́ laa elu. E kwuwo na ọgwụ ndị e si n’ephedra mepụta gburu ihe karịrị 100 mmadụ na United States, ọ bụ ezie na ọkà n’ịkọwa ọrịa na San Francisco, bụ́ Steven Karch, na-ekwu, sị: “Nanị ndị m maara [ṅụrụ ephedra] ma nwụọ bụ ndị ọrịa nke na-emetụta akwara obi na-ekesa ọbara jisiri ike ma ọ bụkwanụ ndị ṅụbigara ya ókè.”
Dr. Logan Chamberlain, bụ́ onye dere otu akwụkwọ banyere mkpá akwụkwọ, na-ekwu, sị: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkọ nile e nwetara n’afọ ndị na-adịbeghị anya banyere mmetụta ọjọọ mkpá akwụkwọ na mkpọrọgwụ na-enwe, bụ n’ihi na ndị mmadụ agbasoghị ntụziaka. . . . Aro ndị a tụrụ maka ụzọ isi jiri ọgwụ ndị a tụkwasịrị obi mee ihe anaghị adị ize ndụ, ọbụnakwa ha anaghị achọ ka mmadụ jiri ha mee ihe otú ọ bụla o si chọọ. Echela na ị pụrụ iji ha mee ihe otú o si masị gị ọ gwụla ma ọ bụ dibịa mkpọrọgwụ a zụrụ azụ gwara gị mee otú ahụ.”
Dibịa mkpọrọgwụ bụ́ Linda Page na-enye ndụmọdụ a: “Ọbụna mgbe ọrịa ji mmadụ aka ọjọọ, o kwesịrị ịṅụ ya ókè kwesịrịnụ, ọ bụghị ịṅụbiga ya ókè. Ihe pụrụ ịka mma ma ọ bụrụ na i nyekwuo
onwe gị oge ma jiri nwayọọ na-agwọ onwe gị. Ọ na-ewe oge iji nweghachi ahụ́ ike.”Otu akwụkwọ banyere mkpá akwụkwọ na-akọwa na mkpá akwụkwọ na mkpọrọgwụ ụfọdụ nwere ihe ndị na-echebe mmadụ ma ọ ṅụbiga ha ókè. Dị ka ihe atụ, otu mkpá akwụkwọ e ji eme ka ahụ́ doo mmadụ na-eme ka mmadụ gbọwa agbọ ma ọ bụrụ na ọ ṅụbiga ya ókè. Otú ọ dị, ọnọdụ a, bụ́ nke na-adịghị otú ahụ n’ebe mkpá akwụkwọ nile dị, adịghị akagbu mkpa ọ dị ịṅụ ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-adịghị ize ndụ.
Ma, ọtụtụ ndị kweere na ka ọgwụ Igbo wee rụọ ọrụ nke ọma, a ghaghị ịṅụ ha otú kwesịrịnụ. Mgbe ụfọdụ, nanị ụzọ a pụrụ isi mee otú ahụ bụ ịṅụ nke a kwadebere akwadebe. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị n’ihe banyere akụ́kụ́ bụ́ ginko biloba, nke e jiworo mee ihe eri oge n’ime ka ikike ncheta na otú ọbara si erugharị n’ahụ́ ka mma, ebe ọ bụ na ọ dị mkpa inweta ọtụtụ ùkwù mkpá akwụkwọ ya iji nweta ọgwụ a ga-aṅụ otu ugbo bụ́ nke ga-arụ ọrụ nke ọma.
Ngwakọta nke Pụrụ Ịdị Ize Ndụ
Ọgwụ Igbo pụrụ imetụta ọgwụ Bekee n’ụzọ dịgasị iche. Dị ka ihe atụ, ha pụrụ ime ka ike ọgwụ rịa elu ma ọ bụ belata, mee ka ọ pụọ n’ahụ́ ọkụ ọkụ karị, ma ọ bụkwanụ mee ka ohere e nwere na ọ ga-akpata mmetụta ọjọọ rịa elu. Ahịhịa bụ́ St. John’s wort, nke a na-atụkarị aro ka ndị nwere ịda mbà n’obi na-adịghị oké njọ na-aṅụ na Germany, na-eme ka ọtụtụ ọgwụ pụọ n’ahụ́ ngwa ngwa okpukpu abụọ karịa otú ha gaara esi apụ, wee si otú ahụ na-ebelata ike ha. Ya mere, ọ bụrụ na ị ṅụrụ ọgwụ Bekee dọkịta depụtaara gị, gụnyere ọgwụ mgbochi ime, kọọrọ dọkịta gị tupu ị ṅụọ ọgwụ Igbo.
Otu akwụkwọ nke na-ekwu banyere ihe ndị na-agwọ ọrịa dị na mkpá akwụkwọ na mkpọrọgwụ, na-ekwu, sị: “Mmanya na-aba n’anya, wii wii, koken, ọgwụ ndị ọzọ na-akpasasị uche na ụtaba pụrụ ịkpata mmetụta ndị na-etinye ndụ mmadụ n’ihe ize ndụ ma ọ bụrụ na a gwakọta ha na ụfọdụ ọgwụ mkpá akwụkwọ ma ọ bụ nke mkpọrọgwụ. . . . Ezi uche ga-achọ ka i zere [ihe ọṅụṅụ ndị dị otú ahụ], karịsịa mgbe ị na-arịa ọrịa.” Ọzọkwa, ụmụ nwanyị dị ime na ndị na-enye nwa ara kwesịrị iburu ndụmọdụ ahụ n’uche. N’ezie, a bịa n’ihe banyere ụtaba na ọgwụ ndị na-eri ahụ́, Ndị Kraịst na-enweta nchebe n’irube isi n’iwu Bible bụ́ “sachapụ onwe [unu] mmerụ ọ bụla nke anụ ahụ́ na mmụọ.”—2 Ndị Kọrint 7:1.
A bịa n’ihe banyere mkpá akwụkwọ na mkpọrọgwụ n’onwe ha, otu akwụkwọ na-enye ịdọ aka ná ntị a: “Ọ bụrụ na i bute ime mgbe ị na-aṅụ ọgwụ mkpá akwụkwọ ma ọ bụ nke mkpọrọgwụ, gwa dọkịta gị ma kwụsị ịṅụ ọgwụ ahụ ruo mgbe gị na ya kwurịtara ya. Gbalịa icheta ókè ị ṅụruru ya na ogologo oge ị ṅụworo ya.”
“Ihe ize ndụ dị na mmadụ iji aka ya enye onwe ya ọgwụ [mkpá akwụkwọ na nke mkpọrọgwụ] n’anataghị ntụziaka onye ọkachamara, dị ọtụtụ,” ka otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma banyere mkpá akwụkwọ na-ekwu. N’igbe ya na isiokwu a so, bụ́ “Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Mmadụ Iji Aka Ya Enye Onwe Ya Ọgwụ,” ị ga-ahụ ebe e depụtara ihe ize ndụ ndị pụrụ ịdị na mmadụ iji aka ya enye onwe ya ọgwụ Igbo.
Dị ka ọ dị n’ọgwụ nile e ji eme ihe maka ahụ́ ike, e kwesịrị iji nlezianya, ihe ọmụma nakwa, n’ezie, imeru ihe n’ókè na-eji ọgwụ Igbo eme ihe—chetakwa na ka ọ dị ugbu a, e nweghị ọgwụgwọ ọ bụla dịnụ maka ọrịa ụfọdụ. Ezi Ndị Kraịst na-elepụ anya n’oge a ga-ewepụ kpam kpam ihe na-akpata ọrịa na ọnwụ—ezughị okè anyị ketara n’aka nne na nna anyị mbụ—n’okpuru ịchịisi dị mma nke Alaeze Chineke.—Ndị Rom 5:12; Mkpughe 21:3, 4.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Teta! abụghị akwụkwọ ahụ́ ike, n’ihi ya kwa, ọ dịghị atụ aro otu ụdị ọgwụ ma ọ bụ ihe oriri kpọmkwem, ma ọ̀ bụ ọgwụ Igbo ma ọ bụ ụdị ọzọ. Ihe ọmụma dị n’isiokwu a bụ nanị iji mee ka ọha mmadụ mara banyere ha. Ndị na-agụ ya aghaghị ime mkpebi n’onwe ha n’ihe banyere ahụ́ ike na ọgwụ.
[Igbe dị na peeji nke 28]
Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Mmadụ Iji Aka Ya Enye Onwe Ya Ọgwụ
Ihe ndị na-esonụ bụ ihe ize ndụ ndị dị na mmadụ iji aka ya enye onwe ya ọgwụ Igbo n’enwetaghị enyemaka nke onye ọkachamara.
E nwere ike ị gaghị ama n’ezie ihe na-arịa gị.
Usoro i ji enye onwe gị ọgwụ nwere ike ghara ikwekọ n’ọrịa gị, ọbụna ma a sị na ị chọpụtawo ihe na-arịa gị.
Usoro i ji enye onwe gị ọgwụ pụrụ ime ka e gbuo oge n’inye gị ọgwụgwọ ndị ka sie ike, bụkwa nke dị mkpa ma kwesị ekwesị.
Ọgwụ ndị i ji aka gị enye onwe gị pụrụ ịgbarụ ọgwụ ndị dọkịta depụtaara gị—dị ka ihe atụ, ọgwụ ndị a na-aṅụ maka ihe ndị ahụ́ na-anabataghị, ma ọ bụ ndị a na-aṅụ maka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị n’ahụ́.
Ọgwụ i ji aka gị enye onwe gị nwere ike ịgwọ ọrịa na-esighị ike i nwere, ma mee ka nsogbu ọzọ ka njọ, dị ka ọbara mgbali elu.
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ebe e si nweta ya: Rodale’s Illustrated Encyclopedia of Herbs