Agha Nuklia—À Ka Na-atụ Egwu Ya?
Agha Nuklia—À Ka Na-atụ Egwu Ya?
Site n’aka onye edemede Teta! na Japan
“Onye ọ bụla nke na-eche echiche na-atụ egwu agha nuklia, mba ọ bụla e ji nkà na ụzụ mara na-ejikerekwa maka ya. Onye ọ bụla maara na ọ bụ ịwị ara, mba ọ bụla nwekwara ihe ngọpụ mere ha ji ejikere maka ya.”—Carl Sagan, onye na-enyocha mbara igwe.
N’AUGUST 6, 1945, otu ụgbọ agha America tụrụ bọmbụ atọm na Hiroshima, Japan, n’otu ntabi anya kwa, ọ tara isi imerime mmadụ, bibiekwa ihe onwunwe dị ukwuu. Nke a bụ bọmbụ atọm mbụ e jitụworo lụọ agha. Bọmbụ ahụ bibiri square kilomita 13 nke obodo ahụ kpam kpam, bụ́ nke mmadụ 343,000 bi na ya. O bibiri ihe karịrị ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke ihe ndị e wuru n’obodo ahụ, ya dịkarịa ala, mmadụ 70,000 nwụrụ, mmadụ 69,000 merụkwara ahụ́. Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, a tụrụ bọmbụ atọm nke abụọ, nke ugbu a bụ na Nagasaki, o gbukwara mmadụ 39,000, mmadụ 25,000 merụkwara ahụ́. O bibiri ihe karịrị ọkara nke ihe ndị e wuru n’obodo ahụ. Ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụla ọzọ e jiworo ngwá agha dị ike otú ahụ mee ihe n’akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ụwa agbanwewo. Ọ banyewo n’ọgbọ nuklia. N’ime afọ ole na ole, United States, ebe bụbu Soviet Union, Great Britain, France, na China kpụpụtara bọmbụ hydrogen bụ́ nke na-ebibi nnọọ ihe karị.
Agha Nzuzo ahụ—esemokwu ahụ dịịrị n’etiti mba ndị nọ n’okpuru ọchịchị Kọmunist na mba ndị na-anọghị na ya—mere ka a malite ịkpụpụta ngwá agha nuklia ndị bụ́ ọkpọka na ngwá ndị e ji agbapụ ha. Egwu jidere ụwa ka a kpụpụtawara bọmbụ nuklia ndị pụrụ isi n’otu kọntinent gaa n’ọzọ, bụ́ ndị ga-eru ebe dị ihe karịrị kilomita 5,600 n’ime minit ole na ole kama iwe ọtụtụ awa. A rụnyere bọmbụ nuklia n’ụgbọ agha okpuru mmiri dị iche iche bụ́ nke zuru ịtụ n’ebe 192 dịgasị iche iche. E meburu atụmatụ na bọmbụ dị n’ebe a na-akwakọba ngwá agha nuklia ruru 50,000! N’oge Agha Nzuzo ahụ, ihe a kpọrọ mmadụ bịara nọrọ n’ọnụ ọnụ nke ihe ụfọdụ ndị kpọrọ Amagedọn nke Nuklia—agha nke na-enweghị onye mmeri.
Njedebe nke Agha Nzuzo Ahụ
N’afọ ndị 1970, e mere ka Agha Nzuzo ahụ belata “dị ka nkwekọrịta e nwere ná [Mkparịta Ụka Banyere Mbelata nke Ngwá Agha Ndị Na-aga Kpọmkwem n’Ebe A Tụrụ Aka], nke Mbụ na nke Abụọ, na-egosi,” ka akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica na-akọwa, “bụ́ ndị mba abụọ ahụ bụ́ dike nọ na ya kpaa ókè n’ọnụ ọgụgụ mgbọ ogbunigwe na-ebibi bọmbụ nuklia nakwa bọmbụ nuklia ndị na-aga kpọmkwem n’ebe a tụrụ aka, bụ́ ndị ha ga-enwe.” E mesịa, ná ngwụsị nke afọ ndị 1980, Agha Nzuzo ahụ belatara, o mesịkwara bie.
“Njedebe nke Agha Nzuzo ahụ mere ka e nwewa olileanya na mpi mba United States na Russia na-asọ banyere onye ga-aka ibe ya nwee ngwá agha nuklia nakwa esemokwu dị n’etiti ha, abịawala ná njedebe,” ka otu akụkọ si n’aka òtù Carnegie Endowment for International Peace na-ekwu. N’ihi mgbalị ndị a na-eme ịchịsa ngwá agha nuklia, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, a tọtuwo ọtụtụ narị ngwá agha nuklia ndị e gwunyegasịrị n’ebe a ga-anọ gbapụ ha. N’afọ 1991, Soviet Union na United States bịanyere aka ná Nkwekọrịta Maka Mbelata na Ịkpa Ókè ná Ngwá Agha Ndị Na-aga Kpọmkwem n’Ebe A Tụrụ Aka, bụ́ nke, na nke mbụ ya n’akụkọ ihe mere eme, manyere mba abụọ ndị a bụ́ dike ná ngwá agha nuklia ọ bụghị nanị ịkpa ókè n’ọnụ ọgụgụ bọmbụ ndị na-aga kpọmkwem n’ebe a tụrụ aka bụ́ ndị ha gwunyegasịrị n’ebe a ga-anọ gbapụ ha, kamakwa ibelata ha ka mba nke ọ bụla n’ime ha nwee ya 6,000. Ná ngwụsị nke afọ 2001, mba abụọ ahụ kwuru na ha erubewo isi ná nkwekọrịta ahụ site n’ibelata bọmbụ nuklia ha ndị na-aga kpọmkwem n’ebe a tụrụ aka, dị ka ha kwekọrịtara. Ọzọkwa, n’afọ 2002, a bịanyere aka ná Nkwekọrịta nke
Moscow, bụ́ nke kwuru na ha ga-ebelatakwu ọnụ ọgụgụ ahụ gaa n’agbata 1,700 na 2,200 n’ime afọ iri na-abịanụ.Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe ndị ahụ e mere, “ugbu a abụghị oge inwe àgwà ọ gbasaghị m ma a bịa n’egwu nke agha nuklia,” ka Odeakwụkwọ Ukwu nke òtù UN bụ́ Kofi Annan kwuru. Ọ gbakwụnyere, sị: “Agha nuklia ka bụ nnọọ ihe na-eyi egwu, na ihe nwere nnọọ ike ịda ná mmalite narị afọ nke 21.” N’ụzọ dị mwute, ọdachi nuklia—nke dị nnọọ njọ karịa nke ahụ mere na Hiroshima na Nagasaki—ka bụ ihe na-emenye egwu ruo taa. Olee ndị na-eyi egwu ahụ? Nke ka mkpa, à pụrụ izere ya?