Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Gwa Ya Mmetụta M Na-enwe n’Ebe Ọ Nọ?

Olee Otú M Pụrụ Isi Gwa Ya Mmetụta M Na-enwe n’Ebe Ọ Nọ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Gwa Ya Mmetụta M Na-enwe n’Ebe Ọ Nọ?

“M ga-achọ ka a zaa m ajụjụ a, Ònye kwesịrị ikwu na ya hụrụ ibe ya n’anya—onye nke nwoke ka ọ̀ bụ onye nke nwanyị?”—Laura. *

Ọ BỤ onye ị ka matara ọhụrụ ma ọ bụ ikekwe ọ dịtụla anya ị maara ya—ọ ga-amasịkwa gị ka gị na ya ghara ịbụ nanị enyi nkịtị. Obi siri gị ike na o nwere mmetụta dị otú ahụ n’ebe ị nọ ma ụjọ ma ọ bụkwanụ ihere adịghị ekwe ya kwupụta ya ekwupụta. N’ihi ya, gị ana-eche ma ọ̀ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ma i buru ụzọ gwa ya. *

Tupu anyị agaa n’ihu, ka anyị buru ụzọ chee echiche banyere mmetụta nke ndị nọ gị gburugburu—ndị nọ n’ezinụlọ gị na ndị nọ n’obodo unu. Dị ka ihe atụ, omenala obodo unu ọ̀ na-ekwu na ọ bụ ọrụ dịrị ndị mụrụ gị ịchọtara gị di? * N’ezie, ị pụrụ iche na mbedo na alụmdi na nwunye bụ okwu dịrị onwe onye. N’agbanyeghị nke ahụ, Ndị Kraịst na-agbalị izere ịkpasu ndị ọzọ iwe n’ụzọ na-enweghị isi. Ha na-achọkwa ichebara mmetụta nke ndị ezinụlọ na nke ndị ọzọ ha hụrụ n’anya echiche.

Otú ọ dị, n’ọtụtụ mba taa, ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị bụ́ nwoke na nwanyị ịhụ onwe ha ma malite mbedo tupu ha ekpebie ma hà ga-alụ onwe ha. Ọ̀ ga-abụ ihe na-ezighị ezi ma onye nke nwanyị buru ụzọ kwupụta ịhụnanya o nwere n’ebe onye nke nwoke nọ? N’ebe a kwa, a pụrụ ichebara ihe bụ́ mmetụta nke ndị ezinụlọ na ndị obodo echiche. Omume ahụ ọ̀ ga-awụ ọtụtụ ndị akpata oyi n’ahụ́ ma ọ bụ wee ha iwe?

Gịnị ọzọ ka Bible nwere ikwu n’ajụjụ ahụ bụ́ ma ò kwesịrị ekwesị ka nwanyị buru ụzọ gwa nwoke na ya hụrụ ya n’anya? N’oge Bible, otu nwanyị na-atụ egwu Chineke aha ya bụ Rut gakwuuru otu nwoke aha ya bụ Boaz maka okwu alụmdi na nwunye. Jehova Chineke gọzikwara mgbalị ya! (Rut 3:1-13) N’ezie, Rut abụghị obere nwa; ọ bụ nwanyị di ya nwụrụ, o dokwara anya na o toruola ịlụ di. O jighịkwa Boaz na-egwuri egwu ma ọ bụ chọọ nanị ime mfegharị. Kama nke ahụ, ọ gbasochiri iwu Chineke nyere banyere alụmdi na nwunye anya.—Deuterọnọmi 25:5-10.

Ikekwe i toruola ịlụ di, e nweekwa otu nwa okorobịa i nwere mmasị n’ebe ọ nọ. Otú o sina dị, ịgwa onye ọ pụrụ ịbụ na ọ hụrughị gị n’anya otú ị hụruru ya n’anya, mmetụta ị na-enwe n’ebe ọ nọ bụ ihe chọrọ nlezianya na ihe dị ize ndụ. Ọ dị ka iwere obi gị tinye n’aka onye ọzọ. Ọ̀ ga-ejizi ya ejizi ka ọ̀ ga-atụ ya n’ala? Ụzọ kasị mma isi zere mmechuihu na-enweghị isi ma ọ bụ obi mgbawa bụ ịgbaso ụkpụrụ Bible.

Jiri Ezi Uche Na-eme Ihe

Ọ dị mfe mmadụ imikpu onwe ya n’ịmụ anya arọ nrọ banyere onye ọ hụrụ n’anya. Ọbụna ị pụrụ iji anya nke uche gị na-ahụ ụbọchị agbamakwụkwọ unu na oge unu gbasịrị akwụkwọ. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na ụdị nrọ a pụrụ ịdị ụtọ, ha bụ echiche efu. Ha pụrụ ime ka i nwee ọchịchọ dị ukwuu bụ́ ndị ọ na-adịghị ụzọ ị pụrụ isi mejụọ ha. Dị ka Bible na-ekwu, “nchere a na-echere ogologo mgbe dị anya na-eme ka obi na-arịa ọrịa.” (Ilu 13:12) Ịmụ anya arọ nrọ pụkwara ime ka ị ghara ime ezi mkpebi. Otú ọ dị, Ilu 14:15 na-ekwu, sị: “Onye nwere ezi uche na-aghọta ije ụkwụ ya.” Ezi uche pụtara iche echiche nke ọma na ime mkpebi dị mma. Olee otú ị pụrụ isi jiri ezi uche mee ihe mgbe ị hụrụ mmadụ n’anya?

Nke mbụ, gbalịa iji “ihe ọmụma arụ ọrụ.” (Ilu 13:16) Dị ka otu nwa agbọghọ si kwuo ya, “ị pụghị ịhụ mmadụ n’anya n’ezie ma ọ bụrụ na ị maghị onye ọ bụ.” Tupu i nye onye ọ bụla obi gị, lekwasị anya n’ihe ọ na-eme na otú o si ekwu okwu. Hụ otú o si emeso ndị mmadụ. “Jụọ ndị enyi ya banyere ya, jụọ ndị toworo eto bụ́ ndị maara ya nke ọma,” ka otu nwa okorobịa tụrụ n’aro. Ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst ọ nọ na ya hà ‘na-akọ akụkọ ọma banyere ya’? (Ọrụ 16:2) Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Isabel na-atụkwa aro na “unu ịdị na-eme mkpapụ n’ìgwè na ịmata ndị ezinụlọ ya pụrụ ịba nnọọ uru.” Unu ịnọ n’ebe e nwere ìgwè mmadụ na-enye gị ohere ileru ya anya n’enweghị oké nrụgide.

Ịmata mmadụ n’ụzọ dị otú a na-ewe oge na ndidi. Ma, ọ ga-eme ka i nwee ike ịhụ àgwà ya ndị ga-eme ka ị gaa n’ihu ma ọ bụkwanụ ka ị gbanwee obi gị. Ilu 20:11 na-ekwu, sị: “Ọbụna nwata [ma ọ bụ nwa okorobịa] na-eme ka a mata ya site n’omume ya nile, ma ọrụ ya [ọ̀] dị ọcha, ma ò zikwara ezi.” Ee, n’ikpeazụ, omume ya ga-egosi ụdị onye ọ bụ.

Ya mere, jiri amamihe guzogide ọnwụnwa nke ịga n’ihu ma jiri ọsọ kwupụta mmetụta gị. Ọ bụrụ na i jiri ọsọ gwa ya ma ya ekwere, ị pụrụ imesị chọpụta na ihe agaghị adabara gị na ya ma ị lụọ ya. * Ebe ị gwarala ya mmetụta gị, gị ịkwụsị mmekọrịta ahụ pụrụ ịgbawa nwa okorobịa ahụ obi—ikekwe n’ụzọ dị ukwuu.

Mmetụta Àgwà Gị Na-enwe

Ọ pụrụ ịbụ na nwa okorobịa a na-elekwa gị onwe gị anya! Ị̀ na-eme ka a hụ gị n’ụzọ ga-eme ka àgwà nsọpụrụ Chineke i nwere pụta ìhè? “Achọpụtawo m na ọtụtụ ụmụ agbọghọ adịghị eji ejiji n’ụzọ kwesịrị ekwesị,” ka Isabel na-ekwu. “Ọ bụrụ na ị chọrọ ka onye ji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe hụ gị, ị ghaghị ịdị na-eji ejiji n’ụzọ kwesịrị ekwesị.” N’agbanyeghị ụdị ejiji ndị na-ewu ewu n’ụwa, iji ‘uwe a haziri nke ọma na-achọ onwe gị mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè,’ ga-aka eme ka ị dọrọ mmasị nwoke nke na-atụ egwu Chineke.—1 Timoti 2:9.

Bible na-agbakwa Ndị Kraịst na-eto eto ume ka ha bụrụ “ihe nlereanya . . . n’ikwu okwu.” (1 Timoti 4:12) Otú i si ekwu okwu na-ekpughe ọtụtụ ihe banyere gị. Gịnị ka ị kwesịrị ime mgbe ohere dapụtara ka gị na nwa okorobịa a kparịta ụka? Ọ bụrụ na ihere na-eme ya, ahụ́ nwere ike ghara iru ya ala. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Abbie na-ekwu, sị, “Ọ pụrụ ịbụ na ị ghaghị ịmalite mkparịta ụka ahụ iji hụ otú ọ ga-esi emeghachi omume.”

N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụrụ na ị na-akọ banyere onwe gị na-akwụsịghị akwụsị, ọ pụrụ ikwubi na ị na-eche nanị banyere onwe gị nakwa na ị machaghị ihe. Bible na-atụ aro ka anyị “na-elekwasị anya, ọ bụghị n’igosi mmasị onwe onye nanị n’ihe metụtara [gị], kamakwa n’igosi mmasị onwe onye n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ.” (Ndị Filipaị 2:4) Ịjụ ya ajụjụ ole na ole kwesịrị ekwesị banyere onwe ya ma ọ bụ ihe ndị na-amasị ya pụrụ inyere ya aka iso gị kwurịtatụ okwu.

Nke a abụghị oge iji “ire aghụghọ” na “egbugbere ọnụ okwu ụgha” na-aja ya mma efu. (Abụ Ọma 120:2) Nwoke nwere ezi uche ga-achọpụta na eziokwu adịghị n’okwu dị otú ahụ. N’otu mgbe ahụ, zere ịgwa ya ihe ụfọdụ nanị n’ihi na i chere na ọ chọrọ ịnụ ha. Otú ahụ ka ọ dị karịsịa ma ọ bụrụ na mkparịta ụka unu abawala ime, unu amalitekwa ikwurịta banyere ihe ndị dị ka ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị onye nke ọ bụla n’ime unu setịpụrụ. Na-eme ihe mgbe nile otú i si eme site n’ịdị na-eme ihe n’eziokwu ma na-ekwu eziokwu. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka ị pụrụ ịmata ma ùnu nwere otu ihe mgbaru ọsọ.

Ọ Bụrụ na O Gosighị Mmasị

Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na n’agbanyeghị mgbalị dị otú ahụ i ji ezi uche mee, o gosighị mmasị ịhụnanya ọ bụla n’ebe ị nọ? Ikekwe, ọtụtụ izu—ma ọ bụ ọnwa—agafewo ma ọ nọgide n’egosighị mmasị ọ bụla n’ebe ị nọ. Ì kwesịrị iwere ya nnọọ na ọ bụ ihere na-eme ya? Ị pụrụ ịjụ onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ n’ezie na ọ bụ onye ihere nke otú ahụ, ọ̀ dị njikere ịlụ nwanyị? Ọ bụrụ na mụ alụọ ya, ọ̀ ga-eduli ndú dị ka onyeisi ezinụlọ, ka ọ̀ ga-atụwa anya ka m mewe ya?’ (1 Ndị Kọrint 11:3) Ajụjụ ọzọ a ga-echebara echiche bụ, ‘Ọ̀ na-eme ihere n’ezie ka ọ̀ bụ nnọọ na o nweghị mmasị ịhụnanya n’ebe m nọ?’ Nke ikpeazụ a ga-abụ ihe siri nnọọ ike ikweta. Ma ịnakwere eziokwu ahụ pụrụ ime ka ị ghara inwe mmechuihu nke ịgwa onye na-ahụrughị gị n’anya otú ị hụruru ya n’anya, mmetụta ị na-enwe n’ebe ọ nọ.

Ị pụrụ iche na ị hụwo ihe àmà na-egosi na ọ hụrụ gị n’anya. Gị ana-eche na ọ bụ nanị na ọ na-egbu oge ikwupụta ya nakwa na ọ ga-ekwupụta ya ma ọ bụrụ na ị gwatụkwuo ya okwu. Ọ pụrụ ịbụ eziokwu. Ma ọ bụrụ na i kpebie iburu ụzọ gwa ya mmetụta ị na-enwe n’ebe ọ nọ, ị ghaghị ịghọta na nke ahụ dị ize ndụ. I kwesịrị ichesi echiche ike, ọ bụghị nanị banyere ihe ị ga-ekwu, kamakwa ihe ga-abụ oge kwesịrị ekwesị ikwu ya.

Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ikpebi na igosi ya na i nwere mmasị n’ihu ọ na-enye gị ga-adị mma karịa ighewe ọnụ oghe gwa ya na ị “hụrụ ya n’anya.” N’ọnọdụ kwesịrị ekwesị ma dị ntụsara ahụ́, ị pụrụ ịgwa ya nanị na ọ ga-amasị gị ịmatakwu ya. Echegbula onwe gị ma o yie ka okwu agachaghị gị were were n’ọnụ. Ezi mmetụta nke kpaliri gị ikwu okwu ahụ pụrụ igosipụta ihe dị ukwuu karịa okwu ahụ n’onwe ya. Chetakwa, nanị ihe i kwupụtara bụ ọchịchọ i nwere ka unu malite mbedo, ị gwaghị ya ka ọ lụwa gị. N’agbanyeghị nke ahụ, nke a pụrụ iju ya anya, ya mere, nye ya ohere ka o chebara ihe ị gwara ya echiche.

Ọ bụrụ n’ezie na ị matala nwa okorobịa a ma chọpụta n’onwe gị na ọ dị obiọma ma na-echebara ndị ọzọ echiche, ọ dịghị gị mkpa ịtụwa ụjọ na ọ ga-eji obi ọjọọ meghachi omume ma ọ bụ weda gị ala. Ma olee otú i kwesịrị isi meghachi omume ma ọ bụrụ na ihe ọ zara gị bụ ee e, nke o ji obiọma kwuo n’ụzọ siri ike? Oleekwa otú nwa okorobịa kwesịrị isi mee omume n’ọnọdụ dị otú ahụ? Isiokwu na-abịa n’ihu ga-atụle ajụjụ ndị a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.

^ par. 4 Ọ bụ ezie na isiokwu a bụ maka ụmụ agbọghọ, ụmụ okorobịa na ndị ọzọ na-eche echiche ịmalite mbedo ga-ahụkwa na ndụmọdụ a dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ga-abara ha uru.

^ par. 5 Ịchọtara mmadụ di ma ọ bụ nwunye adịchaghị eme ka a ghara inwe alụmdi na nwunye obi ụtọ. Di ka ihe atụ, n’oge Bible, Aịzik na Ribeka banyere n’ụdị alụmdi na nwunye a, n’agbanyeghị nke ahụ, Aịzik bịara “hụ ya n’anya.” (Jenesis 24:67) Gịnị ka anyị na-amụta na nke a? Adịla ngwa ileghara omenala obodo anya ma ọ bụrụhaala na o megideghị iwu Chineke.—Ọrụ 5:29.

^ par. 13 Isiakwụkwọ nke 28 ruo 31 nke akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, pụrụ inyere gị aka ịchọpụta ma mmadụ ọ̀ ga-abụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ekwesị.

[Foto dị na peeji nke 30]

Ịhụ otú o si eme omume pụrụ ime ka ị gbanwee obi gị n’ebe ọ nọ

[Foto dị na peeji nke 30]

Ọ bụrụ na i nwere mmasị ịhụnanya n’ebe mmadụ nọ, kọọrọ ya ndị toworo eto ji ihe akpọrọ ihe bụ́ ndị maara ya nke ọma