Ịzụ Fụlawa Ga-adị Gị Mma n’Ahụ́
Ịzụ Fụlawa Ga-adị Gị Mma n’Ahụ́
Ị̀ NA-ENWE mmasị n’ịzụ fụlawa? Ọ pụrụ ịbara gị uru karịrị nanị obi ụtọ ọ ga-enye gị. Ndị nchọpụta ahụwo ihe àmà na-egosi na “ịzụ fụlawa na-adị mma n’ahụ́. Ọ na-eme ka nchegbu kwụsịlata, na-ebelata ọbara mgbali elu, ọbụnakwa na-enyere mmadụ aka ịdịte ndụ aka,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Independent nke London na-akọ.
“Mgbe ị rụsịrị ọrụ siri ike n’ụbọchị, ọ na-abụ ihe na-enye ahụ́ efe ịlọta ụlọ ma na-akpagharị n’ubi fụlawa gị,” ka onye edemede bụ́ Gay Search na-ekwu. Ọ bụghị nanị na ịzụ fụlawa bara uru ma na-atọ ụtọ kamakwa ọ pụrụ ịbụ ụzọ dị mma isi na-emega ahụ́ karịa ịga n’ụlọ egwuregwu. N’ụzọ dị aṅaa? Dị ka Gay Search si kwuo, “ọrụ ndị dị ka igwu ala na iji reeki na-ekpokọta ahịhịa, bụ ụzọ ndị dị mma isi na-emega ahụ́ mgbe nile, ọ na-agbarikwa calorie n’ahụ́ karịa ka ịgba ígwè si agbari.”
Ịzụ fụlawa na-abara ndị agadi uru karịsịa. Ịnọ na-eche ka fụlawa ọhụrụ pulite ma ọ bụ ka ọ mịpụta okooko na-enyere ha aka ịtụ anya na echi ga-adị mma. Ọzọkwa, “ubi fụlawa na-arụ ọrụ ka ọgwụ ahụ́ mgbu na nke obi nkoropụ” a na-enwe n’oge agadi, ka Dr. Brigid Boardman kwuru, bụ́ onye so n’òtù Royal Horticultural Society, bụ́ òtù na-ahụ maka ihe ọkụkụ. Ndị agadi na-enwekarị nkụda mmụọ n’ihi na ha apụghị imere onwe ha ọtụtụ n’ime ihe ndị na-akpa ha. Ma, dị ka Dr. Boardman si kwuo, “anyị na-egbo mkpa nke ịbụ ndị na-emere onwe anyị ihe site n’iji aka anyị na-ekwu ụdị fụlawa anyị ga-adụ, otú ubi fụlawa anyị ga-adị, na otú anyị ga-esi elekọta ya. Ọzọkwa, mkpa nke ilekọta ihe na-abụ nke e si otú a gboo.”
Ahụ́ na-erukarị ndị na-arịa ọrịa uche ala mgbe ha na-arụ ọrụ n’ebe mara mma ma dị jụụ. Ọzọkwa, ịzụrụ ndị ọzọ fụlawa ma ọ bụ ịkọrọ ha nri pụrụ inyere ndị ọrịa dị otú ahụ aka inwetaghachi obi ike na ùgwù onwe onye.
Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ndị na-azụ fụlawa ka ihe ọkụkụ na-abara uru. Prọfesọ Roger Ulrich nke Mahadum Texas ji ìgwè mmadụ e tinyere n’ọnọdụ mere ka ha nwee nchegbu, mee nnyocha. Ọ chọpụtara na ndị a kpọgara n’ebe ihe ọkụkụ na osisi gbara gburugburu, gbakere ngwa ngwa karịa ndị a na-akpọgaghị n’ebe ndị ahụ—a chọpụtara nke a site n’ịtụle otú obi ha si na-akụ. Nnyocha yiri nke ahụ gosiri na ndị nọ n’ụlọ ọgwụ na-agbake mgbe a wasịrị ha ahụ́, ritere uru site n’ịnọ n’ọnụ ụlọ ndị ha nọ na ha na-ahụ osisi ma ha lepụ anya. E jiri ha tụnyere ndị ọzọ a wara ahụ́, ha “gbakere ngwa ngwa karịa ha, hapụ ụlọ ọgwụ ngwa ngwa karịa ha, ha aṅụrughị ọgwụ ahụ́ mgbu ka ha, ha emerughịkwa mkpesa ka ha.”