Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Emeriri M Ihe Ịma Aka Nke Ijere Chineke ozi

Emeriri M Ihe Ịma Aka Nke Ijere Chineke ozi

Emeriri M Ihe Ịma Aka Nke Ijere Chineke ozi

DỊ KA IVAN MIKITKOV SI KỌỌ

“Ọ bụrụ na ị nọgide n’obodo anyị, ị ga-agaghachi mkpọrọ,” ka onye KGB gwara m. A ka tọhapụsịrị m n’ụlọ mkpọrọ ka m nọsịrị mkpọrọ afọ 12. Ọrịa jisiri mama m na papa m ike, ọ dịkwa mkpa na m ga-anọ ya iji lekọta ha. Gịnị ka m ga-eme?

A MỤRỤ m n’afọ 1928 n’obodo nta bụ́ T̩aul, Moldova. * Mgbe m dị otu afọ, nna m, bụ́ Alexander, gara Ias̩i, Romania, bụ́ ebe ọ nọ hụ Ndị Mmụta Bible, bụ́ aha a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. Mgbe ọ laghachiri T̩aul, ọ kọọrọ ndị ezinụlọ ya na ndị agbata obi ya ihe ndị ọ mụtara n’ọnụ Ndịàmà. N’oge na-adịghị anya, a bịara nwee obere ìgwè Ndị Mmụta Bible na T̩aul.

Abụ m nwa ikpeazụ n’ime ụmụaka anọ—ndị bụ́cha nwoke nwoke. Site n’oge m bụ nwa ọhụrụ, ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, bụ́ ndị setịpụụrụ m ezi ihe nlereanya, gbara m gburugburu. Ka oge na-aga, ọ bịara doo m anya na ijere Jehova ozi ga-eweta mmegide—na ọ ga-abụkwara m ihe ịma aka. Ana m echeta nke ọma mgbe ndị uwe ojii na-abịa ugboro ugboro enyocha ụlọ anyị, na-anwa ịchọta ebe anyị zoro akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Bible. Ihe ndị a adịghị atụ m ụjọ. Site n’ọmụmụ Bible anyị na-enwe, amụtawo m na a kpagbukwara Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst, na ndị na-eso ụzọ ya. N’oge anyị na-enwe nzukọ, a na-echetara anyị mgbe mgbe na ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ịtụ anya mkpagbu.—Jọn 15:20.

E Wusiri M Ike Iguzogide Ọnwụnwa

N’afọ 1934, mgbe m dị nanị afọ isii, a gụrụ otu akwụkwọ ozi n’ọgbakọ anyị dị na T̩aul, na-akọrọ anyị banyere ahụhụ Ndị Kraịst ibe anyị na-ata na Nazi Germany. A gbara anyị ume ka anyị na-etinye ha n’ekpere. Ọ bụ ezie na m ka dị obere n’oge ahụ, echefubeghị m akwụkwọ ozi ahụ.

Afọ anọ mgbe nke a gasịrị, enwetara m ule mbụ nke iguzosi ike n’ezi ihe. N’oge a na-amụ banyere okpukpe n’ụlọ akwụkwọ anyị, onye ụkọchukwu Ọtọdọks na-akụziri anyị ihe nyere m iwu ugboro ugboro ka m nyara obe n’olu m. Mgbe m jụrụ ịnya ya, ọ gwara ụmụaka nile nọ na klas ahụ ka ha gosi ihe olu obe ha iji gosi na ha bụ ezigbo ndị ụka. Ụkọchukwu ahụ atụọ m aka ma jụọ ụmụ klas, sị: “Ùnu chọrọ onye dị ka ya na klas unu? Ndị na-achọghị, ha welie aka elu.”

Ebe ọ bụ na ụmụ akwụkwọ ahụ na-atụ ụkọchukwu ahụ ụjọ, ha nile weliri aka ha. Ụkọchukwu ahụ ekwuo, sị, “Ị̀ hụlanụ, ọ dịghị onye chọrọ ka gị na ya na-akpa. Si n’ụlọ a pụọ ozugbo.” Ụbọchị ole na ole ka e mesịrị, onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ bịara n’ụlọ anyị. Mgbe ya na ndị mụrụ m kparịtasịrị, ọ jụrụ m ma m chọrọ ịmaliteghachi akwụkwọ. Mụ agwa ya na achọrọ m. Ya ekwuo, sị, “M nọgidehaala bụrụ onyeisi ụlọ akwụkwọ a, ị ga na-aga akwụkwọ, ụkọchukwu ahụ agaghịkwa enwe ike ịkwụsị gị.” Dị nnọọ ka o kwuru, n’ime oge nile nwoke ahụ bụ onyeisi ụlọ akwụkwọ, ụkọchukwu ahụ enyeghị m nsogbu.

Mkpagbu Aka Njọ

N’afọ 1940, obodo anyị bi, bụ́ nke a na-akpọ Bessarabia, bịara sonye na Soviet Union. Na June 13 na 14, 1941, a chụgara ndị nile a ma ama n’ọchịchị ma ọ bụ n’obodo, Siberia. Ndịàmà Jehova esoghị ná ndị a chụgara. Ma, site n’oge ahụ gawa, anyị malitere ijikwu nlezianya na-eme ihe mgbe anyị na-enwe nzukọ na mgbe anyị na-eme nkwusa.

Ná ngwụsị June 1941, Nazi Germany wakporo nnọọ Soviet Union na mberede, bụ́ mba ya na ya bụ enyi tupu mgbe ahụ. N’oge na-adịghị anya, ndị agha Romania wereghachiiri obodo Bessarabia. Nke a mere ka anyị nọrọghachi n’okpuru ọchịchị Romania.

N’obodo nta ndị dị anyị gburugburu, e jidere Ndịàmà jụrụ isonyere ndị agha Romania, a tụkwara ihe ka ọtụtụ n’ime ha mkpọrọ afọ 20 nke ha ga-arụ ọrụ mmanye na ya. A kpọrọ nna m òkù ka ọ bịa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, a nọkwa ebe ahụ tikasịa ya ahụ́ n’ihi na ọ bụ Onyeàmà. Tụkwasị na nke ahụ, e si n’ụlọ akwụkwọ kpụrụ m n’ike gaa chọọchị.

Mgbe e mesịrị, ọnọdụ Agha Ụwa nke Abụọ bịara gbanwee. Na March 1944, ndị Soviet ji ọsọ weghara ebe ugwu Bessarabia. Ka ọ na-erule August, ha ewegharala mba ahụ dum. Adị m nanị ihe dị ka afọ 15 mgbe ahụ.

N’oge na-adịghị anya, e debanyere aha ụmụ nwoke nile ahụ́ dị mma nọ n’obodo anyị ịbụ ndị agha Soviet. Ma Ndịàmà nọgidere na-anọpụ iche. N’ihi ya, a tụrụ ha mkpọrọ afọ iri afọ iri. Na May 1945, Agha Ụwa nke Abụọ biri na Europe mgbe ndị Germany chịliri aka elu. Ma, ọtụtụ Ndịàmà nọ na Moldova nọgidere n’ụlọ mkpọrọ ruo afọ 1949.

Mkpagbu Ndị Anyị Nwetara Mgbe Agha Biri

Mgbe agha biri n’afọ 1945, e nwere oké ọkọchị na Moldova. N’agbanyeghị ọkọchị ahụ, ndị ọchịchị Soviet nọgidere na-anara ndị ọrụ ugbo ihe ka ukwuu n’ime ihe ndị ha na-akọta, n’ọnọdụ ego ụtụ isi. Nke a mere ka e nwee ụnwụ nri dị egwu. Ka ọ na-erule afọ 1947, ahụla m ozu ọtụtụ mmadụ n’okporo ámá ndị dị n’obodo T̩aul. Nwanne m nwoke bụ́ Yefim nwụrụ. Ruokwa ọtụtụ izu, agụụ mere ka ike gwụ m nke na o siiri m ike ịgagharị agagharị. Ma ụnwụ nri ahụ mesịrị kwụsị, anyị bụ́ Ndịàmà fọdụrụ ndụ gakwara n’ihu n’ozi anyị. Ana m ezisa ozi ọma n’obodo anyị, ebe nwanne m nwoke bụ́ Vasile, bụ́ onye ji afọ asaa tọọ m, na-ezisa ozi ọma n’obodo nta ndị dị anyị gburugburu.

Ka Ndịàmà bịara na-ejikwu ịnụ ọkụ n’obi eje ozi ha, ndị ọchịchị malitere ilebakwuru ha anya. Ọrụ nkwusa anyị, nakwa ọjụjụ anyị jụrụ itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’agha, mere ka gọọmenti Soviet malite inyocha ụlọ anyị maka akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ma na-ejide anyị. N’afọ 1949, a chụgara ụfọdụ Ndịàmà nọ n’ọgbakọ ndị dị anyị nso Siberia. N’ihi ya, anyị onwe anyị fọdụrụnụ maliteghachiri ịgbasi mbọ ike ijikwu nlezianya na-eje ozi anyị.

Ka ọ dị mgbe ahụ, amalitere m ịrịa ọrịa ọjọọ bụ́ nke ji nke nta nke nta na-aka njọ. Ndị dọkịta mesịrị kwuo na m nwere ọrịa ọkpụkpụ. N’afọ 1950 kwa, a bịara kee m bandeeji n’ụkwụ.

Ịchụga Anyị Siberia

N’April 1, 1951, ka bandeeji ka nọ m n’ụkwụ, e jidere mụ na ndị ezinụlọ anyị nile, a chụgakwara anyị na Ndịàmà ndị ọzọ Siberia. * N’ihi enweghị oge iji mee nkwadebe, nanị ihe anyị jisiri ike weta bụ obere nri. Ọ dịghịkwa anya nri ahụ agwụ.

N’ikpeazụ, ka anyị nọsịrị ihe dị ka izu abụọ n’ụgbọ okporo ígwè ahụ, anyị rutere Asino, bụ́ nke dị n’ógbè Tomsk. Mgbe anyị ruru ebe ahụ, a chịpụtara anyị ka ehi. Ọ bụ ezie na oyi na-atụ ebe ahụ enweghị atụ, obi dị anyị ụtọ ịpụta ebe ikuku ndụ ga-ekusatụ anyị. N’ọnwa May, bụ́ mgbe ice dị ebe ahụ malitere ịgbaze, e ji ụgbọ mmiri buru anyị gaa Torba, bụ́ obodo dị 100 kilomita site n’ebe ahụ, bụ́ ebe e nwere ogige a na-egbu osisi na ya, bụ́ nke dị n’ọhịa apịtị nke Siberia. N’ebe a, anyị malitere ịrụ ọrụ mmanye—nke a gwara anyị na anyị ga-arụgide ruo mgbe ebighị ebi.

Ọ bụ ezie na ịrụ ọrụ mmanye n’ogige a na-egbu osisi na ịnọ n’ụlọ mkpọrọ abụghị otu, a nọkwa na-eche anyị nche mgbe nile. N’abalị, ndị ezinụlọ anyị nile na-arahụ n’ime otu nkebi nke ụgbọ okporo ígwè. N’oge okpomọkụ nke afọ ahụ, anyị rụtara ụlọ—ndị otu ọkara ha dị n’ime ala, ọkara ha nke ọzọ apụta n’elu—iji chebe onwe anyị n’oge oyi na-abịanụ.

N’ihi bandeeji ahụ e kere m n’ụkwụ, a gụpụrụ m iso na-arụ ọrụ n’ime ọhịa ma kenye m ọrụ imepụta ntú. Ọrụ a nyere m ohere iso ná ndị na-ezo ezo emepụtaghachi magazin Ụlọ Nche na akwụkwọ ndị ọzọ dabeere na Bible. E nwere ka a na-esi esi n’ebe ọdịda anyanwụ Europe, bụ́ nke dị ọtụtụ puku kilomita site n’ebe anyị bi, ezobata ha.

E Jide M Ma Tụọ M Mkpọrọ

N’afọ 1953, e wepụrụ bandeeji ahụ e kere m n’ụkwụ. Ma, ka ọ dị mgbe ahụ, n’agbanyeghị na m gbalịrị ịkpachara anya, ndị KGB bịara mata banyere ọrụ ime mmụọ m na-arụ, nke gụnyere imepụtaghachi akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. N’ihi ya, e mesịrị tụọ mụ na Ndịàmà ndị ọzọ mkpọrọ afọ 12. Otú ọ dị, mgbe a na-ekpe anyị ikpe, anyị nile gbara àmà dị mma banyere Chineke anyị, bụ́ Jehova, nakwa banyere nzube ịhụnanya ya maka ihe a kpọrọ mmadụ.

Ka e mesịrị, a kpọgara anyị bụ́ ndị mkpọrọ n’ogige ụlọ mkpọrọ dịgasị iche iche bụ́ ndị dị nso na Irkutsk, ihe dị ka ọtụtụ narị kilomita n’ebe ime ime ọwụwa anyanwụ. E guzobere ogige ndị a dị ka ebe a ga na-ata ndị e weere na ha bụ ndị iro nke mba Soviet ahụhụ. Malite n’April 8, 1954, ruo mbido afọ 1960, a kpọchiri m n’ogige ọrụ mmanye 12 ndị dị otú ahụ. Mgbe e mesịrị, a kpọgara m ebe dị ihe karịrị kilomita 3,000 n’ebe ọdịda anyanwụ, nke bụ́ ná nnukwu ogige ọrụ mmanye Mordovia nke nwere ọtụtụ ụlọ mkpọrọ, bụ́ ebe dị ihe dị ka kilomita 400 site n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Moscow. N’ebe a, e nwere m ihe ùgwù nke iso Ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi si n’ọtụtụ akụkụ Soviet Union nọkọọ.

Ndị Soviet bịara chọpụta na mgbe a hapụrụ Ndịàmà ka ha na ndị mkpọrọ ndị ọzọ na-abụghị Ndịàmà na-anọkọ, na ụfọdụ n’ime ha na-aghọkwa Ndịàmà. N’ihi ya, ná nnukwu ogige ọrụ mmanye Mordovia ahụ, bụ́ nke nwere ọtụtụ ụlọ mkpọrọ a rụrụ n’ebe ruru nnọọ kilomita 30 ma ọ bụ karịa, ha gbalịrị ịhụ na e debere anyị ebe anyị na ndị mkpọrọ ndị ọzọ na-agaghị na-akpachi anya. Ihe karịrị Ndịàmà 400 ka e kpokọtara ọnụ n’ụlọ mkpọrọ nke anyị. E nwekwara otu narị ụmụnna nwanyị Ndị Kraịst ma ọ bụ karị bụ́ ndị nọ kilomita ole na ole n’ụlọ mkpọrọ ọzọ dị ná nnukwu ogige ahụ.

N’ụlọ mkpọrọ nke anyị, ana m agbasi mbọ ike n’inye aka na-ahazi maka nzukọ Ndị Kraịst nakwa idepụtaghachi akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, bụ́ ndị e zobatara n’ogige ahụ. Ndị na-elekọta ogige ahụ bịara nnọọ mara banyere ya. Oge na-adịghị anya ka e mesịrị, n’August 1961, a tụrụ m mkpọrọ otu afọ n’Ụlọ Mkpọrọ Vladimir nwere aha ọjọọ, bụ́ nke e wuru n’oge ndị eze Russia, nke dị kilomita 200 site n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Moscow. Onye United States ahụ na-anya ụgbọelu, bụ́ Francis Gary Powers, bụ́ onye a gbaturu ụgbọelu ya na May 1, 1960, mgbe ọ nyaara ụgbọelu e ji eme nledo na-agafe na Russia, nọkwa mkpọrọ ebe ahụ ruo February 1962.

Mgbe m nọ n’Ụlọ Mkpọrọ Vladimir, e nyere m nanị nri ga-enwe ike idebe m ndụ. Ịnọ agụụ abụghịrị m nsogbu n’ihi na enweela m ahụmahụ yiri ya mgbe m ka na-eto eto, ma oké oyi dị n’oge oyi nke afọ 1961/1962 ekweghị m odidi. Paịpụ okpomọkụ si abata n’ọnụ ụlọ mkpọrọ m mebiri, ebe ahụ bịakwara jụbiga oyi ókè. Otu dọkịta hụrụ ọnọdụ ọjọọ m nọ na ya ma mee ndokwa ka a kpọga m n’ọnụ ụlọ mkpọrọ ọnọdụ ya dịtụ mma n’izu ndị oyi ahụ kasị njọ.

E Nyeere M Aka Imeri Ihe Ịma Aka Ahụ

Mmadụ nọọ mkpọrọ ruo ọtụtụ ọnwa, echiche ọjọọ pụrụ ime ka o nwee nkụda mmụọ. Nke a bụkwa ihe ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ na-enwe olileanya na ọ ga-eme. Otú ọ dị, ekpechiri m ekpere anya, mmụọ Jehova na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị m na-echeta, wusikwara m ike.

Ọ bụ mgbe m nọ n’Ụlọ Mkpọrọ Vladimir ka m kasị ghọta ihe Pọl onyeozi dere banyere ịbụ ndị ‘a na-akpagide n’ụzọ nile, ma a kpagideghị ha ruo n’ókè nke enweghị ike imegharị ahụ́’ na ịbụ ndị na-enwe “mgbagwoju anya, ma ọ bụghị n’enwetụghị ụzọ mgbapụ.” (2 Ndị Kọrint 4:8-10) Ka otu afọ gasịrị, a kpọghachiri m n’ogige ọrụ mmanye Mordovia. Ọ bụ n’ogige a ka m nọ nọzuo mkpọrọ afọ 12 ahụ, n’April 8, 1966. Mgbe a tọhapụrụ m, a kọwara m dị ka “onye na-enweghị mmekwata.” Nke a bụ ihe àmà gosiri m na ekwesịwo m ntụkwasị obi nye Jehova.

A jụwo m ọtụtụ ugboro otú anyị si enweta ma na-emepụtaghachi akwụkwọ ndị e ji amụ Bible mgbe anyị nọ n’ogige ụlọ mkpọrọ ndị Soviet, n’agbanyeghị mgbalị ha na-eme igbochi anyị ime otú ahụ. Ọ bụ ihe nzuzo nanị mmadụ ole na ole matarala, ka otu onye Latvia nọrọ mkpọrọ afọ anọ n’ogige ụlọ mkpọrọ ụmụ nwanyị dị na Potma, n’ihi ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, kwuru. “Ndịàmà nwere nnọọ ka ha na-esi enweta akwụkwọ ha mgbe nile,” ka o dere mgbe a tọhapụsịrị ya n’afọ 1966. “Ọ na-adị ka à ga-asị na ndị mmụọ ozi na-abịa n’abalị atụdata ya,” ka o kwuru. N’ezie, ọ bụ nanị site n’enyemaka Chineke ka anyị ji rụzuo ọrụ anyị!

Oge M Nwetụụrụ Onwe M

Ka a tọhapụsịrị m, ndị na-edu ndú n’ọrụ nkwusa ahụ gwara m ka m kwaga n’ebe ọdịda anyanwụ Ukraine, bụ́ nke dị nso na Moldova, iji nyere ụmụnna anyị ndị Moldova aka. Ma, ebe m bụ onye si mkpọrọ pụta, nke ndị KGB ka na-enyo enyo, ọ dịghị oké ihe m pụrụ ime n’ọrụ ahụ. Ka m nọsịrị afọ abụọ a nọ na ya na-eyi egwu ịtụghachi m mkpọrọ, akwagara m obodo Kazakhstan nke nọ n’okpuru Soviet, bụ́ ebe ndị ọchịchị na-adịkebeghị enyocha akwụkwọ ndị na-egosi ebe onye si bịa. E mesịa, n’afọ 1969, bụ́ mgbe ọrịa jisiri ndị mụrụ m ike, akwagara m Ukraine iji lekọta ha. Ọ bụ n’ebe a, n’obodo Artyomosk, bụ́ nke dị n’ebe ugwu nke obodo ukwu bụ́ Donetsk, ka onye KGB yiri egwu ịtụghachi m mkpọrọ, dị ka m kọrọ ná mmalite isiokwu a.

Ọ bịara bụrụ nnọọ na ọ bụ nanị mmaja ka onye KGB ahụ na-amaja m. O nweghị ihe akaebe zuru ezu o ji n’aka iji mee m ihe ọ bụla. Ebe m kpebisiri ike ịnọgide n’ozi m dị ka Onye Kraịst, ya abịakwa bụrụ na ebe ọ sọkwara m gaa, anya ndị KGB ka ga-anọkwa n’ahụ́ m, anọgidere m na-elekọta ndị mụrụ m. Ma papa m ma mama m nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova ruo mgbe ha nwụrụ. Papa m nwụrụ na November 1969, ebe mama m dịgidere ndụ ruo February 1976.

Adị m afọ 40 mgbe m kwagaghachiri Ukraine. Mgbe ahụ m nọ na-elekọta ndị mụrụ m, mụ na otu nwa agbọghọ aha ya bụ Maria nọ n’otu ọgbakọ. Ọ dị nanị afọ asatọ mgbe e si Moldova chụga ya na ndị mụrụ ya Siberia ná mmalite April 1951, dị ka e mere ezinụlọ anyị. Maria kwuru na otú m si abụ abụ na-atọ ya ụtọ. Otú ahụ ka anyị si malite, n’agbanyeghịkwa na anyị abụọ anaghị enwe ohere n’ihi ozi anyị, anyị jisiri ike wepụta oge iji mara onwe anyị nke ọma. Ka ọ na-erule afọ 1970, emewo m ka o kwere ka m lụwa ya.

Ọ dịghị anya, a mụọ nwa anyị nwanyị bụ́, Lidia. E mesịa, na 1983, mgbe Lidia dị afọ iri, otu onye bụ́bu Onyeàmà bịara rara m nye n’aka ndị ọrụ KGB. Tupu mgbe ahụ, ejeela m ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri n’ebe ọwụwa anyanwụ Ukraine nile. Ndị na-emegide ọrụ Ndị Kraịst anyị nwetara ndị bịara gbaa akaebe ụgha megide m n’oge a na-ekpe m ikpe, a tụkwara m mkpọrọ afọ ise.

N’ụlọ mkpọrọ ahụ, e debere m n’ebe Ndịàmà na-anọghị. N’agbanyeghị na mụ na Ndịàmà anọghị ruo afọ ole na ole, ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ igbochi m ịgakwuru Jehova, ọ nọgidekwara na-agba m ume. Tụkwasị na nke ahụ, e nwetara m ohere iji gbaara ndị mkpọrọ ndị ọzọ àmà. N’ikpeazụ, ka m nọsịrị mkpọrọ nanị afọ anọ, a tọhapụrụ m, mụ na nwunye m na nwa m nwanyị, bụ́ ndị nọgidekwara na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova, bikọtakwara ọzọ.

Ịlaghachi Moldova

Anyị nọrọ otu afọ ọzọ na Ukraine ma mesịa lọghachi Moldova, bụ́ ebe a chọrọ enyemaka nke ụmụnna ndị tozuru okè ma nwee ahụmahụ. Ka ọ na-erule oge a, ndị isi ọchịchị Soviet bịara nyetụ ndị mmadụ nnwere onwe ịga ebe ọ bụla ha chọrọ. Anyị rutere Bălţi na 1988, bụ́ ebe Maria biiri afọ 37 gara aga tupu a chụpụ ha. N’afọ ahụ bụ́ 1988, e nwere ihe dị ka Ndịàmà 375 n’obodo a bụ́ obodo nke abụọ kasị buo ibu na Moldova; ugbu a, e nwere ihe karịrị nnọọ Ndịàmà 1,500 na ya! Ọ bụ ezie na anyị bi na Moldova, m ka nọkwa na-eje ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na Ukraine.

Ka ọ na-erule March 1991, bụ́ mgbe nzukọ anyị nwetara nkwado iwu na Soviet Union, ọtụtụ puku mmadụ bịara nwee ndakpọ olileanya n’ihi ọdịda Ọchịchị Kọmunist dara. Ọtụtụ mmadụ bịara nọrọ ná mgbagwoju anya, ha enweghịkwa ezi olileanya maka ọdịnihu. N’ihi ya, mgbe Moldova ghọrọ mba nweere onwe ya, ndị agbata obi anyị—na ọbụna ụfọdụ n’ime ndị kpagbuburu anyị—bịara nwee nnọọ mmasị n’ozi Bible. Mgbe a chụpụsịrị anyị n’afọ 1951, ọ bụ nanị Ndịàmà ole na ole fọdụrụ na Moldova, ma ugbu a, n’ime ihe dị ka mmadụ 4,200,000 bi n’obere mba a, e nwere ihe karịrị nnọọ Ndịàmà 18,000. Ahụmahụ ndị magburu onwe ha anyị nwetaworo emeela nnọọ ka anyị chefuo ahụhụ ndị anyị tara n’oge gara aga!

N’ihe dị ka afọ 1995, akwụsịrị m ije ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị n’ihi ọrịa. Ọ na-enwe mgbe ọrịa m na-eme ka m nwee nkụda mmụọ. Ma, abịala m ghọta na Jehova maara ihe dị anyị mkpa iji bụrụ ndị a gbara ume. Ọ na-enye anyị agbamume dị anyị mkpa n’oge. Ọ bụrụ na mụ enwee ohere ibighachi ndụ m ọzọ, m̀ ga-ahọrọ ibi ya n’ụzọ ọzọ? Ee e. Kama nke ahụ, ọ na-adị m ka ya bụrụ na m nwekwuru obi ike n’ozi m nakwa na m rụsikwuru ọrụ ike ma gbasikwuo ike.

Aga m asị na Jehova agọziwo m nakwa na ndị ohu ya nile bụ ndị a gọziri agọzi, n’agbanyeghị ọnọdụ ha nọ na ya. Anyị nwere olileanya doro anya, okwukwe nọ n’ọrụ, na ihe mmesi obi ike bụ́ na, n’oge na-adịghị anya, onye ọ bụla ga-enwe ezi ahụ́ ike n’ime ụwa ọhụrụ nke Jehova ga-eweta.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Anyị ga-eji Moldova, bụ́ aha e ji mara obodo a ugbu a mee ihe n’isiokwu a kama iji aha ndị mbụ ya bụ́ Moldavia ma ọ bụ Moldavian Soviet Socialist Republic.

^ par. 21 Ná ngwụsị izu abụọ mbụ nke April 1951, ndị Soviet kpara nnọọ nkata wee jide ihe karịrị Ndịàmà Jehova 7,000 na ndị ezinụlọ ha bi n’ebe ọdịda anyanwụ Soviet Union ma buru ha n’ụgbọ okporo ígwè buga Siberia, bụ́ nke dị ọtụtụ puku kilomita n’ebe ọwụwa anyanwụ.

[Foto dị na peeji nke 24, 25]

Ụlọ anyị mgbe anyị nọ n’ebe a chụgara anyị na Torba, Siberia, 1953. Papa m na mama m (n’aka ekpe), na nwanne m nwoke bụ́ Vasile na nwa ya nwoke (n’aka nri)

[Foto dị na peeji nke 25]

Mgbe m nọ n’ogige ụlọ mkpọrọ na 1955

[Foto dị na peeji nke 27]

Ụmụnna nwanyị Ndị Kraịst nọ na Siberia, mgbe Maria (n’aka ekpe nke ahịrị nke ala) dị ihe dị ka afọ 20

[Foto dị na peeji nke 27]

Anyị na nwa anyị nwanyị, bụ́ Lidia

[Foto dị na peeji nke 27]

N’ụbọchị agbamakwụkwọ anyị, na 1970

[Foto dị na peeji nke 27]

Mụ na Maria taa