Anyị Chọtara Ihe Ka Mma
Anyị Chọtara Ihe Ka Mma
DỊ KA FRANCIS DEL ROSARIO DE PÁEZ SI KỌỌ
N’afọ 1988, mụ na ụmụnne m ndị nwoke na ndị òtù egwú ndị ọzọ, kụrụ egwú n’ihu ọtụtụ puku mmadụ bịara ikiri anyị n’Ogige Madison Square, nke New York City. Ndị mmadụ nwere nnọọ mmasị n’ikiri òtù egwú nke anyị, bụ́ nke m gbaara egwu. Ọganihu anyị nwere bụ n’ihi ihe papa anyị mere afọ ole na ole tupu mgbe ahụ.
NNA m n’onwe ya bụ onye na-akụ egwú, ọ chọpụtakwara na ụmụnne m ndị nwoke asaa tọrọ m nwere nkà nke ịkụ egwú. N’ihi ya, o rere ụlọ anyị ma zụta ngwá egwú na ihe ndị ọzọ a chọrọ ka ha wee nwee ike ihiwe òtù egwú. M ka dị nnọọ obere n’oge ahụ, ebe ọ bụ na a mụrụ m na 1966, nke bụ́ afọ ole na ole tupu mgbe ahụ. N’oge ahụ, ezinụlọ anyị bi n’obodo Higüey nke dị na Dominican Republic.
Egwú mbụ ụmụnne m kụrụ n’ihu ọha bụ n’afọ 1978 n’ụlọ ezumezu Higüey. E mesịa, ha kwagara n’isi obodo, bụ́ Santo Domingo. Ha malitere ịkụ ụdị ọhụrụ nke egwú merengue, n’ihi ya kwa, a bịara mara ha nnọọ ama. * A bịara mara òtù egwú ha dị ka Los Hermanos Rosario (Ụmụ Rosario).
Ebe ọ bụ na ọ dịla anya m chọwara ịbụ onye a ma ama n’ịgba egwú, achọrọ m isonyere ụmụnne m. N’otu oriri e nwere, nwanne m nwoke bụ́ Pepe, onye bụ́ onyeisi òtù egwú ahụ, kpọrọ m ka m bịa gbaa egwú. Ọ gwara ndị nọ ebe ahụ, sị: “Francis bụ otu n’ime ụmụnne m nwanyị ndị obere nakwa nwa ikpeazụ anyị, ọ makwa egwú agba.” Egwú m gbara masịrị ndị nọ ebe ahụ. N’iji ohere a pụtaranụ mee ihe, agwara m Pepe na achọrọ m ịgbawara òtù egwú ha egwú. N’ihi ya, mgbe m dị afọ iri na isii, amalitere m ịgbara òtù egwú Los Hermanos Rosario egwú n’ebe nile a kpọrọ ha ịbịa kụọ egwú.
Ihe Ịga nke Ọma Anyị Nwere n’Ịkụ Egwú
Tupu mgbe ahụ, e nwewo ọtụtụ òtù egwú merengue nke ụmụ nwanyị na-agụ egwú na ha, ma e nwetụbeghị nke nwanyị na-agba egwú na ya n’ihu ọha n’etiti ndị egwú bụ́ ụmụ nwoke ụmụ nwoke. Ana m ahazi ụkwụ egwú m nile nke ọma, na-eji ụzọ ọhụrụ agba ya otú ọ ga-adaba n’egwú merengue nke ụmụnne m na-akụ. Mgbe ụzọ m si agba egwú bịara ghọọ ihe a ma nnọọ ama, a kpọrọ ya a lo Francis Rosario.
Anyị nwere egwú merengue, nke a na-akpọ “Cumandé,” nke ihe ụfọdụ a na-agụ na ya bụ: “Y ahora todo el mundo como Francis Rosario” (Ugbu a onye ọ bụla sowe ụkwụ egwú Francis Rosario). Ozugbo ahụ, ndị mmadụ na-amalite iso ụkwụ egwú m. Mgbe ụfọdụ, ihe ha na-eme bụ ịnọdụ ala ma na-ekiri m kama ịgba egwú n’onwe ha. N’ikpeazụ, ọ bịara bụrụ nanị foto m ka a na-eji eme ka ọhaneze mara na òtù egwú anyị chọrọ ịkụ egwú. Onye ọ bụla hụrụ ya na-ama na òtù egwú Los Hermanos Rosario na-aga ịkụ egwú.
Mgbe m sonyesịịrị òtù egwú nke ụmụnne m, ha bịara kpọbatakwuo ndị egwú ọzọ n’òtù egwú ahụ, gụnyere ụmụnne atọ a na-akpọ ụmụ Páez. Otu n’ime ha a na-akpọ Roberto, bụ́ onye na-afụ opi, mesịrị lụọ m. Ihe ịga nke ọma anyị nwere malitere ịbara ụmụ Páez uru. Òtù egwú Los Hermanos Rosario malitere inweta ọtụtụ akwụkwọ ịkpọ òkù maka ịkụ egwú ụlọ ọrụ telivishọn dị na
Santo Domingo ga na-egosi, nakwa nke ịga kụọ egwú ná mba ndị ọzọ.N’afọ 1988, anyị gara United States na Canada ịkụ egwú. Otu n’ime egwú ndị anyị kụrụ bụ nke ahụ m kwuburu na anyị kụrụ n’Ogige Madison Square. Ọtụtụ n’ime òtù egwú merengue a kasị mara ama kụkwara egwú n’ebe ahụ, ọ bụkwa òtù egwú nke anyị ka ndị mmadụ kasị nwee mmasị na ya. Mgbe anyị kụsịrị egwú ahụ, ndị na-ahazi egwú bịara mewezie ndokwa ka anyị bụrụ ndị ikpeazụ ga na-akụ egwú n’ebe ọ bụla a haziri ihe ngosi ịkụ egwú n’ihu ọha, bụ́ nke a kpọrọ anyị na ya. Ka ọ dị mgbe ahụ, egwú m na-agba bịara na-amasịkwu ndị mmadụ, ndị na-enwe mmasị n’egwú Los Hermanos Rosario, nọgidekwara na-amụba. Ndị na-azụ kaseti egwú anyị bịakwara na-amụba n’ike n’ike.
Anyị mere njem gaa ọtụtụ mba, dị ka Colombia, Ecuador, Panama, Puerto Rico, Curaçao, Spen, Germany, na ọtụtụ mba ndị ọzọ. N’oge na-adịghị anya, anyị bịara ghọọ otu n’ime òtù egwú ndị mmadụ kasị nwee mmasị na ha ná mba ndị dị na Latin America. Egwú m na-agba, ọgbọ egwú m na-apụta na ya, ejiji m, na ihe ntecha ndị m na-ete bịachara ghọọ ihe ndị kasị mkpa ná ndụ m.
Mgbe m na-alụbeghị di, anaara m ekwu na ọ bụrụ na nwoke enwee mmasị ịlụ m ma o nweghị mmasị n’ịgba egwú, aga m ahapụ ya tupu m hapụ ịgba egwú. Otú ọ dị, otú m si ele ihe ndị kasị mkpa ná ndụ m anya na-aga ịgbanwe.
Ịghọta Mkpa Ihe Ime Mmụọ Dị
Mgbanwe a malitere mgbe anyị gara Canary Islands n’afọ 1991. Mụ na Roberto ka lụrụ di na nwunye ọhụrụ. Nwanne ya nwoke bụ́ Freddy, bụ́ onye sokwa n’òtù egwú ahụ, amalitelarị iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, ọ na-enwekwa akwụkwọ ha mgbe nile.
Otu ụbọchị, ahụrụ m akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala n’ụlọ Freddy, amalitekwara m ịgụ akwụkwọ ahụ. Isiakwụkwọ bụ́ “‘Hell’—Ọ̀ Dị Adị N’ezie?” dọọrọ mmasị m. Ihe mekwaranụ o ji dọrọ mmasị m bụ n’ihi na mama anyị kwuru na onye mere ihe ọjọọ ga-ere ọkụ na hel. N’ihi ya, ụjọ ịga ebe ahụ nọ na-atụ m.
Mgbe izu ole na ole gasịrị, ka anyị ka nọ na Canary Islands, ime pụrụ m. Mgbe ha kpọgara m n’ụlọ ọgwụ, agwara m Roberto ka ọ gwa Freddy ka o nye m akwụkwọ ahụ m hụrụ n’ụlọ ya. Achọrọ m ịgụ ya ka m nọ na-agbake. Enwere m nnọọ mmasị n’akwụkwọ ahụ. Otu n’ime ihe ndị m mụtara na ya bụ na hel nke e kwuru okwu ya na Bible bụ ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ, nakwa na ọ batatụbeghị Chineke n’obi imekpọ mmadụ ọ bụla ọnụ. (Jeremaịa 7:31) Obi tọrọ m ụtọ na Bible kwuru na ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.—Eklisiastis 9:5, 10.
Mgbe anyị lọghachiri na Dominican Republic, Freddy gwara otu n’ime Ndịàmà Jehova ka ọ bịa na nke anyị. Ọ kọọrọ anyị banyere olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs n’elu ala, bụ́ nke e kwuru banyere ya na Bible. Nke a kpalikwara nnọọ mmasị di m. (Abụ Ọma 37:29; Luk 23:43) Anyị gwara ya ka o duziwere anyị ọmụmụ Bible.
Ime Mgbanwe n’Ihe Ndị M Ji Akpọrọ Ihe Nakwa n’Ihe Ndị M Na-ebute Ụzọ
Ka m na-enwetakwu ihe ọmụma Bible, echiche m nwere banyere ọrụ m, bụ́ nke m nwere mmasị dị ukwuu na ya, malitere ịgbanwe. Ụkpụrụ Bible malitere ịkpụzi echiche m. (Ndị Rom 12:2) Ana m ajụ onwe m, sị: ‘Olee otú m ga-esi na-agba ụdị egwú a ebe a mmadụ nile a na-ekiri m? Nke a abụghị ihe m chọrọ.’ Ekpekuru m Chineke ekpere, sị, “Biko, napụta m n’ọnọdụ a.” Agwara m di m mmetụta m na-enwe, ya onwe ya nwekwara mmetụta yiri nke ahụ. Ọ gwara m, sị, “Nke m, nwee ndidi. Ị pụtahaala n’òtù egwú a, aga m apụta.”
Abịara m tụrụ ime ọzọ, ebe ọ na-ekwechaghị m ịgba egwú, o mere ka m nwee ohere ịgachikwu nzukọ Ndị Kraịst anya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nzukọ ndị a wusikwuru m ike, dị ka o wusiri Roberto, bụ́ onye sokwa m na-aga ha, na-eme ka anyị ghọta uru dị ukwuu iso ndị Jehova na-ezukọta bara. Anyị bịara ghọta na iji nọgide na-enwe ọganihu n’eziokwu Bible, ntụziaka na agbamume a na-enweta ná nzukọ Ndị Kraịst dị anyị mkpa. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ọbụna mgbe anyị gara ịkụ egwú ná mba ọzọ, mụ na Roberto na-achọ ebe Ụlọ Nzukọ Alaeze dị, ma na-aga ọmụmụ ihe.
Mgbe m mụsịrị nwa, amaliteghachiri m ọrụ, ma obi m adịghịzi na ya. Nke a bịara pụta ìhè, ndị nta akụkọ amalitekwa ịkatọ m. Ọtụtụ mgbe, ha na-ajụ m, sị, “Gịnị mere ị naghịzi agba egwú otú i sibu agba?” Anọgidere m na-ekpeku Jehova ekpere ka ọ napụta m n’ọnọdụ a, ka mụ na ụmụnne m wee ghara inwe nsogbu. Eso m ná ndị nwe òtù egwú ahụ, achọghịkwa m ka mụ na ha see okwu.
Mgbe m tụụrụ ime ọzọ, agwara m Rafa, bụ́ onye na-eduzi òtù egwú ahụ mgbe nwanne m nwoke, bụ́ Pepe, nwụsịrị, na achọrọ m ka mụ na ụmụ m na-anọkwu, na agaghị m alọghachi n’ọrụ a. Ọ gwara m ka m mee ihe ọ bụla m chere kaara m mma. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ụmụnne m ndị nwoke megidere m maka Bible m na-amụ. Enwere m nnọọ ekele maka nke a.
Ndụ Ọhụrụ nke Ijere Jehova Ozi
N’afọ 1993, mgbe m nọsịrị afọ iri n’òtù egwú ahụ, akwụsịrị m ịgba egwú ma rara ndụ kpamkpam nye Jehova. Aghọrọ m onye nkwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke, e mekwara anyị baptizim n’afọ 1994, mgbe Roberto pụtasịrịla n’òtù egwú ahụ. (Matiu 24:14) Ma Freddy ma nwanne Roberto ọzọ, bụ́ Julio, nakwa Manuel Pérez, bụ́ onye ọzọ so n’òtù egwú ahụ, ghọchara Ndịàmà. Ruo taa, ha nile na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi.
Ọtụtụ ndị amaghị ihe mere m ji hapụ ịgba egwú, ebe ọ bụ na m nwere mmasị na ya hie nne. Ụfọdụ chere na ọ dị ihe mụ na ya na-alụ, dị ka otu onye a ma ama nke na-emepụta ihe nkiri a na-egosi na telivishọn ná mba anyị chekwara. “Dị ka ndị ọzọ na-eme ihe nkiri, ọ ga-emesị nweta onwe ya ma lọghachi n’ọrụ a,” ka o kwuru. Ma ọ dịtụghị mgbe m lọghachiri na ya. Ekpebisiri m ike iji onwe m jeere Jehova ozi otú m nwere ike.
Anyị nwere ụmụ atọ ugbu a: Katty, Roberto, na Obed. Anyị na-agbalị ịkụziri ha na ihe kasị mkpa ná ndụ bụ ihe ime mmụọ, ọ bụghị akụ̀ na ụba. Anyị nọ n’ọnọdụ dị mma ịdọ ha aka ná ntị banyere mmetụta na-eduhie eduhie ụwa na-enwe n’ahụ́ mmadụ na inye ha ezigbo nduzi ná ndụ. Ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị na-enwe kwa izu anọwo nnọọ na-abara anyị uru, na-enyere anyị aka ịdị n’otu n’ụwa nke ọtụtụ ezinụlọ nọ na ya na-etisasị.
Anyị agbalịwo ịkụziri ụmụ anyị ile Jehova anya dị ka onye dị adị n’ezie nke ha pụrụ ịtụkwasị obi. (Ilu 3:5, 6; Ndị Hibru 11:27) Anyị akụziwokwara ha mkpa ọ dị ịga nzukọ Ndị Kraịst na ikere òkè na ha. Ịhụ ụmụ anyị ka ha na-etolite ma na-eji eziokwu Bible akpọrọ ihe bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa. Kemgbe afọ abụọ gara aga, anọgidewo m na-eje ozi dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka, bụ́ ihe Ndịàmà Jehova na-akpọ ndị na-eji awa iri ise ma ọ bụ karịa kwa ọnwa akọrọ ndị ọzọ ihe ha kweere. Kemgbe ọtụtụ afọ ugbu a, di m anọwo na-eje ozi dị ka okenye n’ọgbakọ Ndị Kraịst.
M ka na-ewere ụzọ e si agba egwú merengue dị ka ụzọ dị mma e si agba egwú. Ma, ọ dị mwute ikwu na ihe ka ukwuu n’egwú merengue a ma ama taa dị iche n’otú ọ dịbu n’oge gara aga. E lee ya anya n’ozuzu, ọ bụbu egwú dị mma. Ka ọ dị ugbu a, anyị aghaghị ịhọ ya ahọ iji chọta nke dị mma.
Otú Ijere Jehova Ozi Si Kara Mma
E nwere ọtụtụ ihe a pụrụ inweta n’ụwa, ma mmadụ aghaghị ilezi anya iji mata ihe ya na ya so. Otú a ka ọ dị n’ọrụ ịkụ egwú, bụ́ nke ọ na-abụ e lee ya anya elu elu, ya eyie ihe na-adọrọ adọrọ na ihe na-enweghị nsogbu. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị. Ọtụtụ ndị na-akụ egwú na-aṅụ ọgwụ ike ma na-eme omume rụrụ arụ. Mmadụ ịkụ egwú na ịgba ya agba n’ihu ọha na-eme ka ya na ndị na-adịghị eche maka echi na ndị na-enwetụghị akọ na uche, na-akpakọrịta.—1 Ndị Kọrint 15:33.
Anyị abịala ghọta na ihe kasị mma mmadụ ọ bụla pụrụ ime bụ ijere Jehova ozi. Ana m echeta ụbọchị m lọtara na họtel ka anyị kụsịrị egwú n’otu n’ime ihe ngosi ndị kasị ukwuu anyị gatụrụla, ma nwewa mmetụta nke ịbụ onye tọgbọ chakoo. Ugbu a ka m bịara chọpụta na ihe kpatara ya bụ n’ihi na anyị anaghị egbo mkpa kasịnụ anyị nwere, nke bụ́ mkpa ime mmụọ anyị.—Matiu 5:3.
Ihe dị anyị mkpa ná ndụ ugbu a bụ ime ihe ga-atọ Onye Okike anyị ụtọ, karịsịa site n’ikwusa nakwa site n’ịkụzi ozi ọma nke Alaeze ya. (Matiu 24:14; Ọrụ 20:35) Ime nke a na-eme ka ezinụlọ anyị nwee obi ụtọ na afọ ojuju. Anyị nwere ekele n’ezie iso ná ndị Chineke nakwa inwe ezigbo ndị enyi—ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị anyị na ha nọ n’otu okwukwe—bụ́ ndị anyị na ha nwekọrọ olileanya ahụ magburu onwe ya nke bụ́ ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke.—Mak 10:29, 30; 2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4.
Anyị nwetara nnọọ ezigbo ego site n’ịkụ egwú. Ma site n’ịbịa mara Chineke anyị, bụ́ Jehova, anyị achọtawo akụ̀ ime mmụọ ndị dị nnọọ oké ọnụ ahịa karịa ụdị akụ̀ na ụba ọ bụla. Obi dị anyị nnọọ ụtọ ijere Chineke nke nzube ozi, Chineke onye obi ụtọ, bụ́ onye na-agba anyị ume ịtụkwasị ya obi! (Abụ Ọma 37:3) Anyị kwenyesiri nnọọ ike na anyị achọtawo ihe dị nnọọ mma karịa ịbụ onye a ma ama na ịbụ onye nwere akụ̀ na ụba, ekpere anyị bụkwa ka Jehova nyere anyị na ezinụlọ anyị aka ime uche ya ruo mgbe ebighị.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Merengue bụ ụdị egwú a na-agba agba. Mgbe egwú a pụtara ọhụrụ, ndị na-akụ ya anaghị adị ọtụtụ. Ha na-eji ngwá egwú a na-akpọ accordion, guiro (ụbọ akwara), na tambora (obere ịgbà nwere isi abụọ) akụ ya. Ka oge na-aga, ìgwè ndị egwú dịtụ ọtụtụ (bụ́kwa ndị a maara na Dominican Republic dị ka orquestas) pụtara. Ka ọ dị ugbu a, ọtụtụ ìgwè ndị na-akụ egwú merengue na-eji piano, opi ike, opi nkịtị, na ịgba, tinyekwara ngwá egwú ndị ọzọ akụ ya.
[Foto dị na peeji nke 23]
Ebe mụ na ndị ọzọ so n’òtù egwú anyị nọ mgbe m ka malitere ịgba egwú amalite
[Foto dị na peeji nke 23]
Ebe anyị na-akụ egwú na New York City, ihe dị ka afọ 1990
[Foto dị na peeji nke 25]
Ebe anyị nọ n’ihu Ụlọ Nzukọ Alaeze
[Foto dị na peeji nke 25]
Foto nke dị n’ime: Ebe anyị nọ na-enwe ọmụmụ Bible ezinụlọ