“Ihe Kasị Enye Ndị Mmadụ Ọrụ n’Ụwa”
“Ihe Kasị Enye Ndị Mmadụ Ọrụ n’Ụwa”
Kwa afọ, ihe karịrị narị nde mmadụ isii na-eme njem aga mba ọzọ. Ọtụtụ narị nde ndị ọzọ na-eme njem aga ebe ndị dịgasị iche iche ná mba ha, maka ọrụ ma ọ bụ ntụrụndụ. N’ihi ya, a kọwawo ụlọ ọrụ ndị na-ahụ maka ndị njem—nke gụnyere họtel, ebe ntụrụndụ, ụlọ ọrụ njem ụgbọelu, ụlọ ọrụ na-akwadebe akwụkwọ njem, na ụlọ ọrụ ndị ọzọ na-egbo mkpa ndị njem—dị ka “ihe kasị enye ndị mmadụ ọrụ n’ụwa.”
N’ỤWA nile, a na-enweta puku ijeri dollar anọ kwa afọ site na njem ndị mmadụ na-eme. Ndị na-emere onwe ha njem nwere ike ha agaghị ewere ya na ha so ná ndị na-eme udo n’ụwa, ma, ọ bụ otú ahụ ka Òtù Na-ahụ Maka Ime Njem n’Ụwa, bụ́ nke òtù UN guzobere, si kọwaa ha. N’afọ 2004, Francesco Frangialli, bụ́ odeakwụkwọ ukwu nke òtù ahụ, gwara ndị bịara nzukọ ezumezu nke ndị ọchịchị, bụ́ nke e nwere n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, sị: “A pụghị ịtọsa njikọ dị n’etiti ime njem na udo atọsa. Mmetụta ime njem na-enwe siri nnọọ ike nke na ọ pụrụ ịgbanwe ọnọdụ ndị yiri ihe na-apụghị ịgbanwe agbanwe ma mee ka udo dịrị n’ebe e weere na udo ịdị na ya agatụghị ekwe omume.”
Olee otú ime njem, bụ́ nke na-enwe mmetụta dị ike otú a, si malite? Ime njem ọ̀ na-enwe mmetụta dị mma n’ezie? “Mmetụta ime njem na-enwe” ọ̀ pụrụ iweta udo n’ezie?
Oge A Malitere Inwe Ọganihu n’Ime Njem
Ọganihu e nwere n’oge a n’ihe banyere ime njem malitere karịsịa na narị afọ nke 19. Ka ọganihu e nwere na nkà na ụzụ mere ka ọnụ ọgụgụ ndị na-eriju afọ na Europe nakwa na United States mụbaa, ọtụtụ mmadụ bịara nwewa ma ego ma oge ime njem.
Tụkwasị na nke ahụ, a bịara nwee ọganihu dị ukwuu n’ụzọ ndị e si eme njem. A bịara nwee ụgbọ okporo ígwè ndị siri ike, bụ́ ndị na-ebu ndị mmadụ esi n’otu obodo ukwu aga n’ọzọ, nweekwa nnukwu ụgbọ mmiri ndị na-efe ọsọ, bụ́ ndị na-ebukwa ha esi n’otu mpaghara ụwa aga n’ọzọ. Iji na-egbo mkpa ọtụtụ mmadụ a na-eme njem, a bịara rụọ nnukwu
họtel dị iche iche na nso ọdụ ụgbọ okporo ígwè na ọdụ ụgbọ mmiri.N’afọ 1841, Thomas Cook, bụ́ onye England ji ego achụ nta ego, bịara hụ na a pụrụ ijikọta ihe ndị a nile dị ndị njem mkpa. Ya bụ onye mbụ guzobere ụlọ ọrụ na-ahụ maka njem, bụ́ nke mmadụ ga-aga na ya kwụkọta ma ụgwọ ụgbọ njem, ma nke ebe obibi, ma nke ihe ntụrụndụ ndị na-amasị ya, tupu ya emewe njem ahụ. “N’ihi usoro a Maazi Cook guzobere,” ka William Gladstone, bụ́ onye ọnụ na-eru n’okwu na Britain, kwuru n’afọ ndị 1860, “ọ bịara dịrị ndị nile nọ n’otu ọkwá mfe na nke mbụ ya ịga mba ndị ọzọ. Ha bịakwara nwee ike ịmata ihe ụfọdụ banyere mba ndị a, bụ́ nke mere ka ha gosiwe ụmụ amaala nke mba ndị a obiọma kama ileda ha anya.”
Ọganihu Dị Ukwuu O Nwere na Narị Afọ nke 20
Ọ bụ ihe dị mwute ikwu na mmata ime njem mere ka ọtụtụ mmadụ mata ndị nọ ná mba ọzọ egbochighị agha ụwa abụọ ịda n’ime ọkara mbụ nke narị afọ nke 20. Ma, kama ime ka ndị mmadụ kwụsị ime njem, mgbanwe agha ahụ mere ka e nwee ná mmekọrịta ọhaneze na ọganihu o mere ka e nwee na nkà na ụzụ bịara mee ka imerime mmadụ mewekwuo njem.
Njem ụgbọelu bịara gawakwuo ngwa ngwa ma dịkwuo ọnụ ala, a bịakwa rụọ ọtụtụ okporo ụzọ awara awara ndị si n’otu mpaghara ụwa gaa n’ọzọ, ụgbọala ejukwa ebe nile. Ka ọ na-erule ihe dị ka afọ 1950, njem ntụrụndụ na nke nleta bịara ghọọ ihe e ji mara ndị Europe na ndị United States, ọ fọkwara obere ka ọ bụrụ na aka onye ọ bụla nọ ná mba ndị ahụ ruru na ya. Tụkwasị na nke ahụ, ọtụtụ nde ezinụlọ bịara nwee telivishọn ma bụrụ ndị ebe ndị mara mma a na-egosi na TV dọọrọ mmasị ha. Nke a mekwara ka ọtụtụ mmadụ nwekwuo agụụ ime njem.
Ná mmalite afọ ndị 1960, ọnụ ọgụgụ ndị na-eme njem aga mba ọzọ kwa afọ bịara ruo iri nde asaa. Ka ọ na-erule ihe dị ka afọ 1995, ọnụ ọgụgụ ahụ mụbara nnọọ ruo ihe karịrị narị nde ise! A bịara nwee ebe ntụrụndụ n’ebe nile n’ụwa iji na-egbo mkpa ndị njem si mba ọzọ na nke ndị bụ́ ụmụ amaala. Nke a bịara baara ụlọ ọrụ ndị na-adịchaghị ahụ maka ime njem uru, ebe ọ bụ na ihe ndị njem na-eri ma na-aṅụ anaghị adị obere, e nweekwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha na-emefuru ego.
Taa, njem ndị mmadụ na-eme so n’ihe na-enye ihe karịrị mba 125 ego. Ka Òtù Na-ahụ Maka Ime Njem n’Ụwa, bụ́ nke òtù UN guzobere, na-eme ka uru ime njem bara pụta ìhè, o wepụtara akụkọ n’afọ 2004 bụ́ nke ọ chọrọ ka a kọọrọ ọhaneze. N’akụkọ ahụ, òtù ahụ kwuru na ime njem pụrụ ime ka ịda ogbenye kwụsịlata site n’ime ka e nwee obere ụlọ ọrụ na ndị nke gbagotetụrụ, bụ́ ndị ga na-egbo mkpa ndị njem. Ka ọ na-eme ka ndị mmadụ nwee ọrụ ọhụrụ ha ga na-arụ, ọ pụrụ ime ka ndị mmadụ “mara banyere gburugburu ebe obibi, ọdịbendị, na mmekọrịta mmadụ na ibe ya.”
Ma ị pụrụ ịjụ, sị: ‘Olee otú ime njem pụrụ isi mee ihe ndị dị otú ahụ? Oleekwa otú ọ pụrụ isi baara gburugburu ebe obibi uru?’
Ịkpọsa Ihe Ndị E Kere Eke Ahịa Iji Chebe Ha
Ná mmalite afọ ndị 1980, ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na ndị na-eme fim bịara nwewa nnọọ mmasị n’ichekwa oké ọhịa na coral ndị dị n’oké osimiri, nakwa ụmụ anụmanụ ndị bi na ha. Ihe ndị ha kọrọ banyere ha nakwa foto ha ndị ha na-egosi na TV bịara mee ka ndị mmadụ nwewekwuo mmasị ịga leta ihe okike ndị a dị ebube. Ụmụ obere ụlọ ọrụ ndị e mepere iji na-egbo mkpa ndị ọkà mmụta sayensị na nke ndị a na-eme fim bịara bukwuo ibu iji na-egbo mkpa nke ndị na-abịa eleta ihe ndị e kere eke.
Njem ịga leta ihe ndị e kere eke ejirila nke nta nke nta ghọọ ihe na-ewu ewu, na-eme ka ụdị njem a bụrụ nke ndị mmadụ kasị eme. N’ezie, ịgba ndị mmadụ ume inwe mmasị n’ihe ndị dị ebube e kere
eke abawo uru dị ukwuu. Odeakụkọ bụ́ Martha S. Honey kọwara, sị: “Njem a na-aga n’ọtụtụ mba iji leta ihe ndị e kere eke aghọọla ihe kasị enye ha ego mba ndị ọzọ. Ọ ka unere enye ndị Costa Rica ego, kara kọfị enye ndị Tanzania na ndị Kenya, karakwa ákwà na ọla enye ndị India.”N’ihi ya, njem emewo ka e nwee ezigbo ihe na-akpali ndị mmadụ ichekwa osisi na ụmụ anụmanụ. Honey kwuru, sị: “Na Kenya, a na-ekwu na a na-enweta ihe dị ka puku dollar asaa kwa afọ n’aka ndị njem n’isi otu ọdụm, na-enwetakwa ihe dị ka narị puku dollar isii na puku iri kwa afọ n’isi ìgwè enyí.” A na-ekwu na a na-enweta ihe dị ka narị nde dollar atọ na iri nde isii kwa afọ n’aka ndị na-abịa eleta coral ndị dị n’oké osimiri Hawaii!
Otú E Si Ama na Njem Bụ Iji Leta Ihe Ndị E Kere Eke
Akwụkwọ si n’aka Ngalaba Mba Ndị Dị n’Otu nke Na-ahụ Maka Gburugburu Ebe Obibi, nke aha ya bụ Ecotourism: Principles, Practices and Policies for Sustainability, na-ekwu, sị: “Ọ naghịzi ara ọtụtụ ụlọ ọrụ ndị na-ahụ maka ime njem ahụ́ ikwu n’akwụkwọ ha banyere ‘njem a na-eme iji leta ihe ndị e kere eke,’ ndị ọchịchị ekwuwokwa banyere ya ọtụtụ mgbe iji mee ka ndị mmadụ na-abịa eleta obodo ha, ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha na-agba mbọ imezu ihe ndị bụ́ isi [ụdị njem a] chọrọ.” Olee otú ị pụrụ isi mara ma njem ị na-achọ ime ọ̀ bụ nke ịga leta ihe ndị e kere eke n’ezie?
Megan Epler Wood, bụ́ onye dere akwụkwọ ahụ e kwuru banyere ya, kwuru na ihe ndị na-esonụ bụ ihe mmadụ ga-eji ama na ọ bụ nnọọ njem ịga leta ihe ndị e kere eke ka a na-ahaziri ya: Tupu ị gawa njem ahụ, ụlọ ọrụ na-ahazi maka ya ga-eme ka ị mara banyere ọdịbendị nke obodo ị na-achọ ịga na otú obodo ahụ dị, tinyere ụdị ejiji na àgwà ndị obodo ahụ na-anabata; ọ ga-eme ndokwa ka a kọwaara gị nke ọma banyere otú ala ebe ahụ dị, otú ndị ebe ahụ si eme ihe, na ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha, meekwa ndokwa maka ohere nke iso ụmụ amaala obodo ahụ nọkọọ, n’abụghị n’ebe ị ga-aga ịzụ ihe; ọ ga-ahụ na a kwụzuru ụgwọ ị ga-eji abanye n’ogige ntụrụndụ nile ị chọrọ ịga na ha; ọ ga-ahụkwa na e nyere gị ụlọ n’ebe dị nnọọ mma.
Ihe Ụdị Njem A Rụzuworo
N’ụdị njem a, ọ bụchaghị nanị ebe ndị e nwere ihe okike ndị mara mma ka a na-aga eleta. A kọwawo ya dị ka mmadụ “ịkpachapụ nnọọ anya gaa ebe ndị e nwere ihe okike ndị mara mma iji ghọta ọdịbendị nke ndị ebe ahụ na akụkọ banyere ụmụ anụmanụ na osisi ndị dị na ya, na-elezi anya ịhụ na o gbughị ihe ndị ahụ e kere eke, ma n’otu mgbe ahụ, na-eme ka ndị obodo ahụ nwee ihe ha ga na-eme iji na-akpata ego, nke ga-eme ka nchekwa ha na-echekwa ihe ndị ahụ e kere eke na-abara ha uru.”
Njem a na-eme ịga leta ihe ndị e kere eke ọ̀ rụzuwo ihe ndị a? Martin Wikelski, nke Mahadum Princeton, kwuru, sị: “[Ụdị njem a] bụ otu n’ime ihe ndị bụ́ isi na-echekwa [Agwaetiti] Galapagos.” Na Rwanda, bụ́ nke dị n’Africa, ọbịbịa ndị mmadụ na-abịa eleta ihe okike ndị dị n’ebe ahụ bụ ya mere ọzọdimgba ndị na-ebi n’ugwu ka ji dịrị n’obodo ahụ. Nke a bụ n’ihi na ọbịbịa ndị mmadụ na-abịa ebe
ahụ mere ka ndị obodo ahụ nwee ihe ọzọ ha na-eme iji na-akpata ego, nke na-abụghị igbu anụmanụ ndị a. Ná mba ndị ọzọ dị n’Africa, ọ bụ ego ndị a na-enweta n’aka ndị njem mere ogige ntụrụndụ dị iche iche ka ji dịgide.N’ụwa nile, njem a na-eme iji leta ihe ndị e kere eke esorowo mee ka e nwee ọganihu n’ichebe gburugburu ebe obibi nakwa ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na njem ndị mmadụ na-eme emewo ka ọtụtụ ndị nwee ego. Ma, ime njem ọ̀ na-enwe mmetụta dị mma mgbe nile? Olee ihe ime njem n’ụwa ga-adị ka ya n’ọdịnihu?
[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]
Aro Ndị A Tụụrụ Ndị Na-eme Njem Aga Mba Ọzọ *
Tupu ị gawa
1. Depụta ihe ndị dị mkpa—ihe ụfọdụ banyere paspọt gị, nọmba kaadị ị ga-eji azụ ihe n’aka, nọmba tiketi ụgbọelu gị, na ihe ndị e dere n’akwụkwọ ị ga-eji adọrọ ego ná mba ị na-aga. Debe otu n’ime ihe ndị ahụ i depụtara n’ụlọ, ma jiri nke ọzọ gawa.
2. Hụ na paspọt gị agafebeghị oge ya nakwa na visa gị abụghị nke adịgboroja; gbaa ọgwụ mgbochi ọrịa ọ bụla a chọrọ gị n’aka.
3. Jide n’aka na ị kwụzuru ụgwọ inshọransị maka ahụ́ ike gị, ebe ọ bụ na ọrịa mberede ma ọ bụ ego ụgbọ nke isi mba ofesi lọta pụrụ ifu gị ọtụtụ puku naira. Ọ bụrụ na ọ dị ọrịa ị na-arịa, nata dọkịta gị akwụkwọ ozi nke kọwara ọrịa ahụ na ọgwụ ọ bụla ị na-aṅụ maka ya. (Ihe Ịrịba Ama: Ọ pụrụ ịbụ ihe megidere iwu iji ọgwụ ụfọdụ banye ná mba ụfọdụ. Iji mara otú a na-eme ná mba ị na-achọ ịga, gaa na nke kasị dị gị nso n’ime ụlọ ọrụ nke ndị na-anọchite anya mba ahụ iji jụọ ase.)
Mgbe ị na-eme njem
1. Ejila ihe ọ bụla ị na-agaghị edinwu ma o funahụ gị aga.
2. Debe paspọt gị na ihe ndị ọzọ bara uru n’uwe i yi n’ahụ́. Etinyela ha n’akpa ị na-ebu ebu ma ọ bụ n’akpa uwe gị nke a pụrụ ịhụ ihe dị na ya. Ekwela ka nanị otu onye òtù ezinụlọ gị jide akwụkwọ nile metụtara njem ahụ.
3. Ọ bụrụ na i tinyere wọlet gị n’akpa uwe gị, iji eriri rọba kee ya pụrụ ime ka o sikwuoro onye aka n’akpa ike izuru ya.
4. Na-edekọ ihe ndị i ji kaadị e ji azụ ihe n’aka zụọ, hụkwa na ị zụfeghị ego ole i mere atụmatụ imefu. Ná mba ụfọdụ, a pụrụ ịkpọchi gị ma ị zụfee ego ole e depụtara na kaadị i ji azụ ihe n’aka.
5. Kpachara anya banyere ise ndị agha ma ọ bụ ụlọ ndị agha foto, ma ọ bụkwanụ ise ụlọ ọrụ ụfọdụ foto, dị ka ọdụ ụgbọ mmiri, ụlọ ndị dị n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè, ma ọ bụ ndị dị n’ọdụ ụgbọelu. Ụfọdụ mba pụrụ iwere ya na ị bịara iledo ha.
6. Anatala onye ị na-amaghị nke ọma ngwugwu ọ chọrọ ka i nye mmadụ.
Mgbe ị na-azụ ihe ndị ị ga-eji na-echeta njem ahụ
1. Cheta na n’ọtụtụ mba, iwu machibidoro ịtụbata ọdụ́ enyí, okpokoro mbe mmiri, akụ́kụ́, ajị anụ, na ihe ndị ọzọ, ọbụna ma a sị na ha dị nnọọ obere.
2. Kpachara anya banyere ịzụ ihe ọwụwa ndị na-egbuke egbuke, ebe ọ bụ na ụfọdụ n’ime ha pụrụ ibunye gị ọrịa ma ọ bụrụ na otú e si mee ha adịghị mma.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 27 Ebe e si nweta ihe ndị a e dere n’elu bụ na Department of State Publication 10542.
[Foto dị na peeji nke 5]
Njem ịga leta ihe ndị e kere eke ejirila nke nta nke nta ghọọ ihe na-ewu ewu