Ikiri Ụwa
Ikiri Ụwa
Ụra Na-enyere Anyị Aka Idozi Nsogbu
“Ọtụtụ mmadụ achọpụtala na nsogbu ha na-edozilighị tupu ha alakpuo ụra yiri ka ọ̀ na-aka nnọọ mfe n’ụtụtụ, ka à ga-asị na ụbụrụ ha ji nwayọọ na-arụ ọrụ na ya n’abalị,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Times nke London na-ekwu. Ndị ọkà mmụta sayensị nọ na Germany na-ekwu na ha achọpụtala ihe na-egosi na nke a bụ eziokwu ugbu a, wee bipụta ihe ha chọpụtara n’akwụkwọ bụ́ Nature. Ha kụziiri mmadụ 66 wepụtara onwe ha ka e jiri ha mee nnyocha ụzọ abụọ a pụrụ isi nweta azịza nke otu mgbakọ na mwepụ, ma ha agwaghị ha ụzọ nke atọ dịkwanụ mfe a pụrụ isi nweta ya. E kwere ka ụfọdụ n’ime ndị e ji mee nnyocha ahụ hie ụra, ebe a hapụrụ ndị ọzọ ka ha mụrụ anya n’abalị ma ọ bụ n’ụbọchị. “Ụra rụrụ ọrụ dị egwu,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Daily Telegraph nke London na-akọ, mgbe ọ na-ekwu okwu banyere otu nnyocha ahụ. Ndị rahụrụ ụra “yiri ka ikike ha nwere ịchọpụta ụzọ nke atọ e si enweta azịza nke mgbakọ na mwepụ ahụ ò ji okpukpu abụọ karịa nke ndị mụrụ anya.” Iji jide n’aka na ihe ahụ a chọpụtara abụghị n’ihi na ndị nke ahụ hiri ụra zuru nnọọ ike ma nweta onwe ha, ndị ọkà mmụta sayensị ahụ mere nnyocha ọzọ. E nyere ìgwè abụọ ahụ otu ọrụ ahụ n’ụtụtụ mgbe ha rahụsịrị ụra ma ọ bụkwanụ n’abalị, mgbe ha mụsịrị anya n’ụbọchị. Na nke ugbu a, e nweghị ihe dị iche n’ikike ìgwè abụọ ahụ nwere n’ịchọpụta ya. Nke a na-egosi na “ihe mere ha ji nweta ya abụghị n’ihi na ụbụrụ ha anọghị n’ọrụ kama ọ bụ n’ihi na ụbụrụ ha kpakọrọ onwe ya ọnụ mgbe ha hiri ụra,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Times na-ekwu. N’ihi ya, onye nchọpụta bụ́ Dr. Ullrich Wagner kwuru, sị, “Ụra na-arụ ọrụ dị ka ihe na-enye aka n’ichepụta ihe.”
Ụmụaka na Oké Ịzụ Ihe
Ụmụaka na ndị ntorobịa nọ n’America taa bụ “ọgbọ kasị azụ ihe ndị nwere aha na ọgbọ kasị hụ ihe onwunwe n’anya n’akụkọ ihe mere eme,” ka Juliet Schor, bụ́ ọkà ná mmekọrịta ọhaneze n’ụlọ akwụkwọ Boston College kwuru, bụ́ onye merela nnyocha banyere mmetụta oké ịzụ ihe na-enwe n’ebe ụmụaka nọ. Ihe ndị e ji ama ụmụaka na-enwekarị oké ọchịchọ ịzụ ihe na-agụnye “inwe oké nchegbu maka ọdịdị ahụ́ na uwe, ịbụ onye inweta akụ̀ na ụba na ịbụ onye a ma ama na-echu ụra, ikirikarị TV na iji oge dị ukwuu achọ ihe n’Intanet ma na-egwu egwuregwu vidio,” ka akwụkwọ akụkọ ndị Canada bụ́ Globe and Mail na-ekwu. Prọfesọ Schor chọpụtara na ụmụaka ihe ha chọrọ ịzụ na-echu ụra na-aka eche echiche banyere ịba ọgaranya. “Ha na-anọgidekwa na-akatọ onwe ha ma na-enwe obi ilu ma ha jiri onwe ha tụnyere ndị ha na-ahụ na TV na ndị e ji akpọsa ngwá ahịa.” N’aka nke ọzọ, a chọpụtara na ha ka ụmụaka ndị na-ahụrughị ihe onwunwe n’anya otú ahụ ada mbà n’obi ma na-enwe nchegbu, kara ha arịa ọrịa nchegbu na-akpata, onwe ha anaghị ejuru ha afọ ka ha, ha na ndị mụrụ ha anaghị adịru ná mma ka ha, ka akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru.
Ndị Ji Aka Ha Amachibido Onwe Ha Iwu Ịgba Chaa Chaa
“A na-ekwu na ndị ịgba chaa chaa riri ahụ́ na France nọ n’agbata mmadụ 300,000 na 500,000,” ka akwụkwọ akụkọ ndị France a na-ebipụta kwa ụbọchị bụ́ Le Figaro na-ekwu. Ma ọtụtụ ndị ịgba chaa chaa ririla ahụ́ anọgidewo na-achọpụta na ọ dị mkpa ka ha kwụsị ya. Akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu na mmadụ 28,000 na France ejirila aka ha machibido onwe ha iwu ịgba ụdị chaa chaa nke iwu kwadoro site n’ịgwa ndị uwe ojii ka ha gbochie ha ịga n’ebe a na-agba chaa chaa ruo, ọ dịkarịa ala, afọ ise. Ndị uwe ojii nọ na France na-ekwu na, kwa afọ, ihe dị n’agbata mmadụ 2,000 na 3,000 na-arịọ ha ụdị arịrịọ a, nakwa na ọnụ ọgụgụ ha amụbaala okpukpu isii n’ime afọ iri. Ọtụtụ ndị ịgba chaa chaa ririla ahụ́ ga-achọ ka e lewe ọnọdụ ha anya “dị ka ihe na-etinye ahụ́ ike ọhaneze ná nsogbu, dị ka a na-ele ise siga, ịṅụ mmanya na-aba n’anya, na ịṅụ ọgwụ ike,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu.
Ginger Na-eme Ka Ọrịa Ụmụ Nwanyị Dị Ime Na-arịakarị n’Ụtụtụ Belata
“Ginger na-eme ka ọrịa ụmụ nwanyị dị ime na-arịakarị n’ụtụtụ n’ọnwa ndị mbụ nke afọ ime ha belata,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Australian na-ekwu. Ná nnyocha Mahadum nke South Australia mere, a chọpụtara na ọ bụrụ na ụmụ nwanyị tụụrụ ime ọhụrụ na-ata ginger ruru otu gram n’ụbọchị, ọ ga-ebelata ọrịa a ha na-arịakarị n’ụtụtụ. Ginger bụ ọgwụ ọdịnala e ji agwọ ọrịa a n’ọtụtụ ebe. Ma, ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtaghị ka o si arụ ọrụ. Ná nnyocha ahụ, a chọpụtara na ginger na-arụ nnọọ ọrụ otú ọgwụ vitamin B ụdị nke 6 a na-aṅụ n’ụbọchị, bụ́kwa ihe ọzọ a na-ekwukarị ka a ṅụọ maka ọrịa a, si arụ ọrụ.
Mmịnye Ọbara Na-eme Ka Ọnụ Ọgụgụ Ndị Na-anwụ Na-amụba
N’otu nnyocha e mere bụ́ nke e bipụtara n’akwụkwọ bụ́ JAMA (Akwụkwọ nke Òtù Na-ahụ Maka Ọgwụ na Ahụ́ Ike n’America), a chọpụtara na ndị na-arịa ọrịa obi bụ́ ndị a mịnyere ọbara ugboro ugboro yiri ka hà ga-anwụ ngwa ma e jiri ha tụnyere ndị a na-amịnyeghị ọbara. Akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “Mgbe a tụlesịrị mkpụrụ ndụ ndị ahụ a mịnyere ọbara nakwa ihe ndị mere ha n’oge a na-awa ha ahụ́, dị ka ọbara gbara ha n’ahụ́ na ụzọ ndị e si wapuo ha ahụ́, ọ ka yikwara ka hà ga-anwụ ngwa ma e jiri ha tụnyere ndị a na-amịnyeghị ọbara.” Ndị dọkịta mere nnyocha ahụ chịkọtara ihe ndị ha chọpụtara site n’ikwu, sị: “Anyị na-adọ aka ná ntị megide ịdị na-amịnye ndị ọrịa obi ahụ́ gbasitụrụ ike ọbara nanị iji hụ na ọbara ha gbagotere ruo otú a chọrọ.”
Nkewa E Nwere n’Etiti Ndị Anglịkan
Philip Jensen, bụ́ onyeisi ndị ụkọchukwu Anglịkan nọ na katidral nke Sydney, bụrụkwa otu n’ime ndị ụkọchukwu a ma ama n’Australia, katọrọ Achịbishọp nke Canterbury na nso nso a dị ka “akwụna okpukpe nke ji aghụghọ eri ụgwọ ọnwa,” ka akwụkwọ akụkọ ndị Australia bụ́ The Age na-akọ. Jensen katọrọ onye ndú chọọchị ya maka ịkwado echiche nke onye ọ bụla mere otú ọ masịrị ya n’ihe banyere idina ụdị onwe. Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru, sị: “Olu ndị Chọọchị Anglịkan n’ụwa nile na-agba iche iche ma a bịa n’ihe metụtara idina ụdị onwe. Nke a mere ka ọtụtụ ngalaba Anglịkan ndị e nwere n’Africa na Eshia na-ewesa ndị nke Canada iwe n’ihi ịgọzi ndị nwoke na-alụ ndị nwoke ibe ha nakwa ndị nke United States n’ihi ichi nwoke o doro anya na ọ na-edina nwoke ibe ya bishọp.”
Ijeri Ụmụaka Na-ahụju Anya
Dị ka Òtù Mba Ndị Dị n’Otu nke Na-ahụ Maka Ụmụaka (UNICEF) si kwuo, ihe karịrị ọkara ụmụaka bi n’ụwa—ihe karịrị otu ijeri ụmụaka—bụ ndị ụwa na-atụ n’ọnụ, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times na-ekwu. Agha, ọrịa AIDS, na ịda ogbenye emebisịwo ọganihu ndị e nwetụrụ n’ime afọ 15 gara aga. Kemgbe afọ 1990, agha—nke 55 n’ime ha bụ agha obodo—atawo isi ihe dị ka nde mmadụ 3.6, nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara n’ime ha bụ ụmụaka. N’ọtụtụ n’ime agha ndị a, ndị na-alụso gọọmenti ọgụ na-atọrọ ụmụaka, dinaa ha n’ike, ma ọ bụ were ha mere ndị agha. Ọtụtụ mmadụ adịghị eri nri na-edozi ahụ́; ọtụtụ mgbe, a dịghị enwe ebe a na-aga anata ọgwụ. N’afọ 2003, ọnụ ọgụgụ ụmụaka ghọrọ ụmụ mgbei n’ihi ọrịa AIDS ruru nde 15. Ihe karịrị nde ụmụaka abụọ ka e ji na-akpa ego site n’ịkwanye ha ịgba akwụna. Akụkọ ahụ kwukwara na ebe ego a na-emefu n’ihe gbasara agha rurula ijeri dollar 956, ego a ga-emefu iji chụọ ịda ogbenye bụ nanị ihe dị n’agbata ijeri dollar 40 na ijeri dollar 70.