Otu Nza Merụrụ Ahụ́ Enweta Ebe Obibi Ọhụrụ
Otu Nza Merụrụ Ahụ́ Enweta Ebe Obibi Ọhụrụ
“ÀNYỊ na-achọ ọrụ anyị ga-arụ?” Ihe a ka m kwuru mgbe nwunye m ji otu obere nza si n’akwụ́ ya dapụ, lọta n’ụlọ anyị. Mgbe m lerukwuru nnụnụ ahụ ahụ́ na-ama jijiji anya, abịara m metere ya ebere. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bịara dị m ka nnụnụ a ahụ́ na-esighị ike agaghị anya. *
Na mbụ, anyị na-adị adụtụ nnụnụ a osisi n’ahụ́ iji mee ka o rie nri a kwọriri akwọri. Ma, ka ọ na-erule echi ya, obere nza ahụ maliteziri ibe ákwá mgbe nile ka e nye ya nri. A pụdịrị ịnọ na steepụ dị ná mpụta ụlọ anyị anụ olu ákwá ya, n’agbanyeghị na ọnụ ụzọ ụlọ anyị nwere ibo ụzọ abụọ ibo ụzọ abụọ!
Ábụ́bà ya mere ka o doo anyị anya na nza a bụ nne. Ka oge na-aga, o nwetara ike ma malite ife efe. Ma, mgbalị nile anyị mere ka ọ laghachi ebe o si enweghị isi! ‘Ikekwe ọ ga-abụ na obi akabeghị ya isi n’ụlọ anyị pụọ,’ ka anyị chere. N’ihi ya, anyị zụtara keeji nnụnụ ma malite ịzụ ya. Anyị gụrụ ya “Spatzi,” bụ́ ụzọ dị ụtọ e si akpọpụta okwu German nke pụtara “nza.”
Otu ụbọchị, anyị siri osikapa, bụ́ nke yiri ka ọ̀ bụ otu n’ime nri ndị kasị atọ Spatzi ụtọ. Ebe ọ bụ na ọ ka dị ọkụ, nwunye m dọbara ya otu ebe ma wụsara Spatzi mkpụrụ akụ́kụ́ ụfọdụ kama ịwụsara ya osikapa ahụ. Gịnị ka obere nnụnụ anyị a mere? O hulatara isi ya ma jiri ọnụ ya kpapụsịa mkpụrụ akụ́kụ́ ndị ahụ n’elu tebụl! Nke a tụrụ mụ na nwunye m n’anya, anyị eleritakwa ibe anyị anya ma dapụ n’ọchị. Ozugbo ahụ, anyị wụsaara Spatzi obere osikapa jụrụla oyi, o yikwara ka obi ọ dị ya mma mgbe ọ hụrụ ya!
Ilekọta obere nnụnụ a mara mma na-echetara anyị ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya. Ọ gwara ha, sị: “Ọ̀ bụ na a dịghị ere nza abụọ otu mkpụrụ ego nke ga-azụta nanị ihe dị nta? Ma o nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala Nna unu aghara ịma.” Mgbe ahụ Jizọs gwara ha, sị: “Unu atụla egwu: Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.”—Matiu 10:29-31.
Lee nnọọ ihe nkasi obi ọ bụ ịmara na Jehova na-ahụ ahụhụ nile anyị na-ata ma na-echeta ntachi obi anyị na-enwe. (Aịsaịa 63:9; Ndị Hibru 6:10) Ee, ọmịiko anyị nwere n’ebe obere nnụnụ nọ adịtụghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere ịhụnanya Jehova Chineke nwere n’ebe ndị na-ejere ya ozi nọ!—Ọ bụ onye ọzọ dere ya.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 2 Mgbe ụfọdụ, mmadụ pụrụ ibute ọrịa ma ọ bụ daa iwu obodo ma ọ bụrụ na ọ na-azụ nnụnụ na-arịa ọrịa ma ọ bụkwanụ nke merụrụ ahụ́.