Ọ̀ Bara Uru Ịbụ Onye Na-eme Udo?
Echiche Nke Bible
Ọ̀ Bara Uru Ịbụ Onye Na-eme Udo?
N’ OZIZI ya a kasị mara amara, Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme udo.” O kwukwara, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, ebe ọ bụ na ha ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5, 9) Ịbụ onye na-eme udo abụghị nanị mmadụ ịnọ n’udo ma ọ bụ inwe ahụ́ iru ala. Onye na-eme udo na-ebute ụzọ n’imeso ndị ọzọ omume enyi ma na-agbasi mbọ ike ịhụ na udo dị.
Okwu Jizọs ndị a e hotara n’elu, hà bara uru n’oge anyị a? Ụfọdụ na-eche na ka mmadụ wee nwee ihe ịga nke ọma n’ụwa anyị a, ọ ga-abụrịrị onye na-amaja ndị ọzọ, onye na-eme ike ike, na ọbụna onye na-eme ihe ike. E mee e megwara, ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya? Ka ọ̀ ka mma ịbụ onye na-eme udo? Ka anyị tụlee ihe atọ mere anyị ji kwesị ichebara okwu Jizọs ahụ bụ́ “obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme udo,” echiche.
▪ OBI GA-ERU ANYỊ ALA Ilu 14:30 na-ekwu na “ndụ nke anụ ahụ́ ka obi a gwọrọ ọrịa ya bụ.” Ọtụtụ ihe ndị dọkịta kwuru na-egosi na iwe na ibu iro pụrụ ịkpatara mmadụ ọrịa strok na nkụchi obi. Ka otu akwụkwọ ahụ́ ike e bipụtara ná nso nso a na-ekwu banyere ndị na-arịa ọrịa obi, o ji iwe ọkụ tụnyere nsí. Akwụkwọ ahụ kwukwara na “mmadụ iwe iwe ọkụ nwere ike ime ka ọ daa ọrịa ọjọọ.” Otú ọ dị, ndị na-achụso udo, pụrụ inwe “obi a gwọrọ ọrịa,” ma ọ bụ obi iru ala, ma rite uru ndị na-esi na ya apụta.
Otu ihe atụ e nwere banyere nke a bụ Jim, bụ́ onye dị afọ 61 nke na-akụzi Bible ugbu a n’otu ógbè a na-asụ asụsụ Vietnamese. Ọ na akọwa, sị: “Mgbe m bụsịrị onye agha ruo afọ isii, sorokwa gaa agha na Vietnam ugboro atọ, abịara m ghọta nnọọ ihe ime ihe ike, iwe, na nkụda mmụọ bụ. Ụdị ndụ m biri n’oge gara aga nyere m nsogbu n’obi ma mee ka m nwee nsogbu nke ehighị ụra. Obere oge, nchekasị, ọrịa afọ, na obi mmafu bịara mee ka ahụ́ gharazie isi m ike.” Gịnị mere ka o nwere onwe ya? Ọ zara, sị: “Ihe zọrọ m bụ iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Ịmụta ihe bụ́ nzube Chineke maka ụwa ọhụrụ nke udo ga-adị na ya nakwa ụzọ m pụrụ isi yikwasị ‘ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ’ emeela ka obi ruo m ala. N’ihi ya, ahụ́ adịkwuola m nnọọ mma.” (Ndị Efesọs 4:22-24; Aịsaịa 65:17; Maịka 4:1-4) Ọtụtụ ndị ọzọ achọpụtakwala n’onwe ha na mmadụ ịbụ onye na-eme udo pụrụ ime ka obi rukwuo ya ala, mee ka ahụ́ sikwuo ya ike, meekwa ka ya na Chineke dịkwuo ná mma.—Ilu 15:13.
▪ ANYỊ NA NDỊ ỌZỌ GA-ADỊKWU NÁ MMA Ọ bụrụ na anyị na-eme udo, anyị na ndị ọzọ ga-adịkwu Ndị Efesọs 4:31) Ndị mmadụ na-agbakarịrị ndị na-eme ike ike ọsọ, n’ihi ya kwa, ndị a na-eme ike ike na-anọ nanị ha n’enweghị ndị enyi ha pụrụ ịtụkwasị obi. Ilu 15:18 na-ekwu, sị: “Onye ọnụma na-akpali iseokwu, ma onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ na-eme ka ịlụ ọgụ dị jụụ.”
ná mma. Bible kwuru na o kwesịrị ekwesị “ka e wepụ iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị . . . , tinyere ihe ọjọọ nile.” (Andy, bụ́ Onye Kraịst dị afọ 42, bụrụkwa okenye ọgbakọ na New York City, tolitere n’ebe a na-eme ihe ike ike na ya. O kwuru, sị: “Mgbe m dị afọ asatọ, a malitere ịkụziri m otú e si eti ọkpọ. Eleghị m ndị mụ na ha tiri ọkpọ anya dị ka ndị mmadụ. Kama, ihe obi m na-agwa m bụ, ‘ma ị́ kụgbughị ya, ya akụgbuo gị.’ N’oge na-adịghị anya, m banyere n’òtù ọjọọ. Anyị lụrụ ọgụ ọtụtụ ugboro n’okporo ámá ma kpaa nnọọ aghara. O nweela oge ndị a tụgidere m égbè n’isi na oge ndị e ji mma yie m egwu. Obi anaghị eru m ala ma mụ na ọtụtụ n’ime ndị enyi m nọrọ, m na-atụkwa ha ụjọ.”
Gịnị mere ka Andy malite ịchụso udo? O kwuru, sị: “Otu ụbọchị, m gara nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova. Achọpụtakwara m ozugbo m rutere na ndị nọ ebe ahụ hụrịtara ibe ha n’anya. Kemgbe ahụ, mkpakọrịta mụ na ndị a hụrụ udo n’anya enyerela m aka ịmalite inwe obi iru ala, o meekwala ka m kwụsị iche echiche otú m sibu eche. Emetela m ọtụtụ ezigbo ndị enyi.”
▪ ANYỊ GA-ENWE OLILEANYA MAKA ỌDỊNIHU Ihe kachasị mkpa mere anyị ga-eji bụrụ ndị na-eme udo bụ nke a: Ọ na-egosi na anyị na-akwado ma na-akwanyere uche Onye Okike anyị ùgwù. Okwu Chineke n’onwe ya, bụ́ Bible, na-agba anyị ume, sị: “Na-achọsi udo ike, gbasookwa ya.” (Abụ Ọma 34:14) Ọ bụrụ na mmadụ ekweta na Jehova Chineke dị adị, na-amụtakwa ma na-erube isi n’ihe ndị na-enye ndụ ọ na-akụzi, nke a ga-eme ka onye ahụ na Chineke bụrụ enyi. Mgbe anyị na Ya bịara nwee mmekọrịta chiri anya otú ahụ, anyị ga-enweta “udo nke Chineke.” Nke a bụ udo kachasịnụ mmadụ pụrụ inwe n’agbanyeghị nsogbu ndị ọ pụrụ inwe ná ndụ.—Ndị Filipaị 4:6, 7.
Ọzọkwa, ọ bụrụ na anyị na-eme udo, anyị na-egosi Jehova ụdị mmadụ anyị chọrọ ịbụ. Anyị pụrụ igosi Chineke ugbu a na anyị ga-ebili n’ime ụwa ọhụrụ ya o kwere ná nkwa, nke udo ga-adị n’ime ya. Mgbe o wepụsịrị ndị ọjọọ ma mee ka ndị dị nwayọọ n’obi “keta ụwa” dị ka Jizọs kwuru, anyị pụrụ ịnọ ya ma jiri anya anyị hụ ya. Lee nnukwu ngọzi nke a bụ!—Abụ Ọma 37:10, 11; Ilu 2:20-22.
N’ezie, uru okwu Jizọs ahụ bụ́ “obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme udo” bara doro nnọọ anya. Anyị pụrụ inwe obi iru ala, ezigbo ndị enyi, na olileanya siri ike maka ọdịnihu. Anyị pụrụ inwe ngọzi ndị a ma ọ bụrụ na anyị emee ike anyị nile iji ‘bụrụ ndị ha na mmadụ nile na-adị n’udo.’—Ndị Rom 12:18.
[Foto ndị dị na peeji nke 26]
“Ahụ́ adịkwuola m nnọọ mma.”—Jim
[Foto ndị dị na peeji nke 27]
“Emetela m ọtụtụ ezigbo ndị enyi.”—Andy