Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Mgbe Mụ na Onye Na-abụghị Nwoke Ma Ọ Bụ Nwanyị Ibe M Nwere Ike Ịmalite Kpawa?

Olee Mgbe Mụ na Onye Na-abụghị Nwoke Ma Ọ Bụ Nwanyị Ibe M Nwere Ike Ịmalite Kpawa?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Mgbe Mụ na Onye Na-abụghị Nwoke Ma Ọ Bụ Nwanyị Ibe M Nwere Ike Ịmalite Kpawa?

“N’ụlọ akwụkwọ, ọ na-adị ka ị bụghị mmadụ ma ọ bụrụ na ọ dịghị onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị gị na ya na-akpa—ụdị onye ọ sọrọ ya ya bụrụ!”—Brittany.

“Ọtụtụ ụmụ nwoke na-agwa m ka mụ na ha mewe enyi. E nwekwara ọtụtụ ụmụ nwoke mara mma mụ na ha nwere ike ime enyi.”—Whitney.

Ọ bụrụ na ị hụ nwa okoro na nwa agbọghọ ebe ha jidere onwe ha aka na-aga na paseeji ụlọ akwụkwọ n’oge a na-anaghị amụ ihe, olee otú ọ na-adị gị?

□ Anaghị m achọ ịma

□ Ọ na-adịtụ m ka m bụrụ ha

□ Ọ na-adị m nnọọ ka m bụrụ ha

Ọ bụrụ na gị na ndị enyi gị nọ na-ekiri fim, gị elee anya hụ na onye nke ọ bụla n’ime ha na enyi ya nwoke ma ọ bụ enyi ya nwanyị nọ, ma o nweghị onye gị na ya nọ, olee otú ọ na-adị gị?

□ Anaghị m achọ ịma

□ Ọ na-adịtụ m ka m bụrụ ha

□ Ọ na-adị m nnọọ ka m bụrụ ha

Ọ bụrụ na ezigbo enyi gị enwee mmasị n’ebe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya nọ, ya na onye ahụ amalite ịkpa, olee otú ọ na-adị gị?

□ Anaghị m achọ ịma

□ Ọ na-adịtụ m ka m bụrụ ha

□ Ọ na-adị m nnọọ ka m bụrụ ha

Ọ bụrụ na ihe ị zara banyere ajụjụ ndị ahụ a jụrụ n’elu bụ, “ọ na-adịtụ m ka m bụrụ ha,” ma ọ bụ “ọ na-adị m nnọọ ka m bụrụ ha,” ghọta na ọ bụghị nanị gị zara otú ahụ. Ná mba ebe e ji mmadụ iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya na-akpa mara, ọtụtụ ndị ntorobịa ga-aza ihe ahụ ị zara. Otu nwa agbọghọ dị afọ 14 nke aha ya bụ Yvette kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, i nwere ike iche na o nwere ihe na-efunahụ gị n’ihi na ụmụ agbọghọ ibe gị nwechara enyi nwoke, ma gị onwe gị enweghị.”

Ọchịchọ mmadụ na-enwe iso onye o weere dị ka onye pụrụ iche—nakwa onye weere ya otú ahụ—na-akpa, pụrụ isi nnọọ ike. Otu nwa okoro dị afọ iri na ụma kwuru, sị: “Chi na-eji na-abọ, ọ ga na-agụsikwu gị agụụ ike inwe enyi nwanyị, ọ naghịkwa ekwe odidi!” Ụfọdụ ndị na-amalitedị ime enyi mgbe ha ka dị obere. Dị ka ihe atụ, ná nnyocha ndị na-ebipụta magazin bụ́ Time ji ndị dị afọ 13 mee, ha chọpụtara na otu onye n’ime mmadụ anọ ọ bụla n’ime ha enweelarị ‘ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha ha na ha na-akpa.’ Ì chere na ha etoruola inwe ya? Gị onwe gị, ì toruola inwe ya? Iji zaa ajụjụ a, ọ dị mkpa ka anyị buru ụzọ lebara otu ajụjụ ka sie ike anya.

Gịnị Bụ na Nwoke na Nwanyị Na-akpa?

▪ Gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-eso eme mkpapụ mgbe nile.

Gị na ya ọ̀ na-akpa? □ Ee □ Ee e

▪ Ọtụtụ ugboro n’ụbọchị, ị na-eji ekwe ntị gị ezigara onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị ozi ma ọ bụ na-akpọ ya na fon.

Gị na ya ọ̀ na-akpa? □ Ee □ Ee e

▪ Gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-eme enyi na nzuzo. Ndị mụrụ gị amaghị maka ya. Ị gwabeghịkwa ha n’ihi na ị maara na ha mata, ha agaghị ekwe ka gị na ya mewe enyi.

Gị na ya ọ̀ na-akpa? □ Ee □ Ee e

▪ Mgbe ọ bụla gị na ndị enyi gị zukọtara, gị na otu onye ahụ nke na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-anọkarị.

Gị na ya ọ̀ na-akpa? □ Ee □ Ee e

Ikekwe, o sighịrị gị ike ịza ajụjụ nke mbụ ahụ, ma, o nwere ike ịbụ na i bu ụzọ chee ya echee tupu gị azaa ajụjụ ndị nke ọzọ. Gịnị kpọmkwem bụ na nwoke na nwanyị na-akpa? N’isiokwu a, anyị ga-akọwa ya dị ka mmadụ ịdị na-anwụrụ onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya, onye ahụ ana-anwụkwara ya. Ọ sọ ya ya bụrụ mgbe ha nọ n’ebe e nwere ìgwè mmadụ ma ọ bụ mgbe nanị ha abụọ nọ, ọ sọ ya ya bụrụ na fon ma ọ bụ mgbe ha na-ahụ onwe ha ihu na ihu, ọ sọkwa ya ya bụrụ n’ihu ọha ma ọ bụ na nzuzo, ọ bụrụhaala na nwoke na nwanyị na-anwụrụ ibe ha, ọ pụtara na ha abụọ na-akpa.

Ma ajụjụ bụ, ì toruola inwe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị gị na ya ga na-akpa? Ịtụle ajụjụ atọ ga-enyere gị aka ịma.

Gịnị Ka I Bu n’Obi Na-eme Ya?

N’ọtụtụ mba, a na-ewere mmadụ iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya na-akpa dị ka ụzọ ya na onye ahụ ga-esi matakwuo onwe ha nke ọma. Ma e kwesịrị inwe ezigbo ihe mere mmadụ ga-eji soro onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya na-akpa—o kwesịrị ịbụ iji nyere nwa okorobịa na nwa agbọghọbịa aka ịmata ma hà ga-ebili dị ka di na nwunye. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

Bible ji okwu bụ́ “ntoju ntorobịa” kọwaa oge agụụ mmekọahụ na-eji esi ike ná ndụ. (1 Ndị Kọrint 7:36) Ọ bụrụ na ị nọgide soro otu onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-akpa n’oge ị ka nọ ná “ntoju ntorobịa,” o nwere ike ime ka agụụ mmekọahụ gụsiwe gị ike, meekwa ka ị taa ahụhụ tupu gị achọpụta amamihe dị n’ihe ahụ e dere ná Ndị Galeshịa 6:7, bụ́ ebe na-ekwu, sị: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke a ka ọ ga-aghọrọkwa.”

N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị enyi gị na-eso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha akpa n’agbanyeghị na ha achọghị ịlụ ha. Ha nwere ike iwere enyi ha nwoke ma ọ bụ nwanyị nanị dị ka onye ha ga na-eji akpa nganga n’ihu ọha. Iji obi mmadụ egwuri egwu otú ahụ bụ ihe ọjọọ jọgburu onwe ya, ọ bụghịkwa ihe iju anya na mmekọrịta dị otú ahụ anaghị adịte aka. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Heather kwuru, sị: “Ọtụtụ n’ime ndị ntorobịa nwere enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwanyị na-agbasa n’ime otu izu ma ọ bụ abụọ. Ha na-abịa lewe mmekọrịta ha na mmadụ ibe ha anya dị ka ihe na-anaghị adịte aka—a pụkwara ikwu na nke a na-akwadebe ha maka ịgba alụkwaghịm kama ịkwadebe ha maka ịrapagidesi ike n’ahụ́ di ma ọ bụ nwunye ha.”

Nwoke na nwanyị ịdị na-akpa nanị iji kporie ndụ pụrụ imesị kpatara ha obi mgbawa. Were Eric dị ka ihe atụ. Mgbe ọ dị afọ 18, obi dị ya ụtọ na ya na otu nwa agbọghọ na-akpa, o chekwara na ọ bụ nanị enyi ka ha na-eme. Ma o mechara chọpụta na onye nke nwanyị eweghị ya na ọ bụ enyi nkịtị ka ha na-eme. Eric kwuru, sị: “Ịgwa gị eziokwu, o juru m nnọọ anya otú o si malite ịnwụrụ m ozugbo. N’ime obi m, eweere m ya na ọ bụ nanị enyi ka anyị na-eme!”

N’ezie, mmadụ iso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya na-anọkọ n’ìgwè n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị adịghị njọ. Ma mgbe a bịara n’ihe metụtara inwe onye nke gị na ya ga na-akpa, ọ kasị mma ichere ruo mgbe ị gaferela ntoju ntorobịa ma toruo ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Ihe a ka nwa agbọghọ aha ya bụ Chelsea mesịrị ghọta. O kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ana m eche na inwe enyi nwoke kwesịrị ịbụ ihe a na-eme iji kporie ndụ, ma ọ bụghị ikpori ndụ ma ọ bụrụ na otu onye na-ewere ya na ha ga-emesị lụọ ma onye nke ọzọ adịghị ewere ya otú ahụ.”

Afọ Ole Ka Ị Dị?

▪ Afọ ole ka i chere na mmadụ ga-adị ya abụrụ na o toruola inwe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya ya na ya ga na-akpa? ․․․․․․․․․․

▪ Ugbu a, jụọ mama gị ma ọ bụ papa gị ma ọ bụkwanụ ha abụọ otu ajụjụ ahụ, ma detuo ihe ha zara. ․․․․․․․․․․

Afọ ole i denyere n’ajụjụ nke abụọ nwere ike ịkarị nke i denyere na nke mbụ. O nwekwara ike ọ gaghị akarị ya! I nwere ike iso ná ndị ntorobịa ji amamihe ahapụ inwe enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwanyị ruo mgbe ha toruru ịmata onwe ha nke ọma. Nke ahụ bụ ihe otu nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst nke aha ya bụ Sondra kpebiri ime, n’agbanyeghị na o ruola afọ ole iwu obodo ha kwuru na mmadụ ga-eru tupu ya alụọ di. Sondra chere, sị: “Mgbe gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-akpa, ị chọrọ ka onye ahụ mara ụdị onye ị bụ. Ma, ọ bụrụ na ị maghị ụdị onye ị bụ, olee otú ị ga-esi tụwa anya na onye ọzọ ga-amata ụdị onye ị bụ?”

Otu nwa agbọghọ a na-akpọ Danielle, nke dị afọ 17, chekwara otú ahụ. O kwuru, sị: “Ụdị onye m gaara achọ ịlụ n’afọ abụọ gara aga dị nnọọ iche n’ụdị onye m ga-achọ ịlụ ugbu a. Ọbụna ka ọ dị ugbu a, amabeghị m ụdị onye m ga-achọ ịlụ. Mgbe m chere na mụ amatala ihe m chọrọ ruo afọ ole na ole, mgbe ahụ ka m ga-amalite ichewe echiche inwe nwoke mụ na ya ga na-akpa.”

Ị̀ Dịla Njikere Ịlụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye?

Ebe ọ bụ na inwe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị gị na ya ga na-akpa bụ ihe na-eduga n’alụmdi na nwunye, ị kwesịrị ịjụ onwe gị ma ị̀ ga-ebuli ibu dị n’ịbụ di ma ọ bụ nwunye—ma ọ bụ ọbụna ibu dị n’ịbụ nne ma ọ bụ nna. Olee otú ị ga-esi mara ma ị dị njikere maka nke ahụ? Tụlee ihe ndị na-esonụ.

Mmekọrịta gị na ndị mmadụ Olee otú i si emeso ndị mụrụ gị na ụmụnne gị ihe? Ọ̀ na-esiri gị ike mgbe nile ijide onwe gị n’ebe ha nọ, ikekwe na-eji olu ike ma ọ bụ njakịrị agwa ha ihe ị chọrọ ịgwa ha? Gịnị ka ha ga-ekwu ma a jụọ ha otú i si emeso ha ihe? Otú i si emeso ndị ezinụlọ gị ihe na-egosi otú ị ga-esi mesoo di ma ọ bụ nwunye gị.—Ndị Efesọs 4:31, 32.

Otú gị na ego si aga Olee otú gị na ego si aga? Ị̀ na-ejikarị ụgwọ? Ị̀ ga-anọgideli n’ọrụ i nwetara? Ọ bụrụ na ị naghị anọgideli na ya, gịnị kpatara ya? Ọ̀ bụ n’ihi otú ọrụ ahụ dị, ka ọ bụ n’ihi onye were gị n’ọrụ, ka ọ bụkwanụ n’ihi àgwà ụfọdụ na-adịghị mma ị na-akpa? Ọ bụrụ na ị naghị egboli mkpa ego nke gị, oleenụ otú ị ga-esi egboli nke ezinụlọ?—1 Timoti 5:8.

Otú i jiruru ofufe Chineke kpọrọ ihe Ọ bụrụ na ị bụ Onyeàmà Jehova, olee otú i jiruru ofufe Chineke kpọrọ ihe? Ị̀ na-ewepụta oge iji gụọ Bible, iji gaa ozi ọma, na iji gaa ọmụmụ ihe n’echeghị ka a gwa gị agwa? Ọ bụrụ na ị naghị eji ofufe Chineke akpọrọ ihe, olee otú ị ga-esi gbaa onye ga-abụ di ma ọ bụ nwunye gị ume ime otú ahụ?—2 Ndị Kọrint 13:5.

Ihe ndị a bụ nanị ole na ole n’ime ihe ndị i kwesịrị ịtụle ma ọ bụrụ na ị na-eche echiche inweta onye ị ga-alụ nakwa ịlụ onye ahụ. Ka ọ dịgodị, i nwere ike iso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-emekọ ihe n’ìgwè n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na i mesịa kpebie iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị kpawa, n’oge ahụ, ọ ga-abụ na ị ghọtakwuola onwe gị nke ọma, matakwa ihe ị chọrọ n’aka onye ga-abụ di ma ọ bụ nwunye gị.

Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ

Ị chọọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ peeji nke 13-26 nke akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị pụrụ ịhụ isiokwu ndị ọzọ dị n’usoro isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” n’ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet nke adres ya bụ www.watchtower.org/ype

IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Olee oge kwesịrị ekwesị i nwere ike iso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị nọrịa?

▪ Olee àgwà i kwesịrị ịgbalịsi ike na-akpa iji ruo eruo ịbụ ezigbo di ma ọ bụ nwunye?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 16]

Ihe Ụfọdụ n’Ime Ndị Ntorobịa Ibe Gị Kwuru

“Mgbe ụfọdụ, m hụ ebe nwoke na nwanyị na-akpa—ọbụna ma a sị na ha bụ di na nwunye—ọ na-adị m ka m bụrụ ha. Ma, nwoke na nwanyị ịkpa abụghị ihe a na-eme nanị iji nwee obi ụtọ. Ọ bụrụ na ọ bụ ihe i bu n’obi eme ya, i ji obi mmadụ egwuri egwu. Echere m na ihe mere mmadụ ga-eji soro onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya na-akpa bụ iji mata ma onye ahụ ọ̀ bụ ụdị onye ọ chọrọ ịlụ.”—Blaine, ọ dị afọ 17.

“Echeghị m na nwanyị kwesịrị iso ụmụ nwoke na-akpa nanị iji mara ihe ọ ga-adị ka ya mgbe onye ọ hụrụ n’anya bịara ịlụ ya. Nanị ihe nke ahụ ga-eme bụ ibutere ha obi mgbawa.”—Chelsea, ọ dị afọ 17.

“Echere m nnọọ na i kwesịrị itoru ogo ịlụ di ma ọ bụ nwunye tupu ị malite iso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-akpa. Ma ọ́ bụghị ya, ọ ga-adị ka ebe ị ka nọ n’ụlọ akwụkwọ na-achọ inweta ọrụ ị ga na-arụ site n’ụtụtụ ruo abalị, ọ bụghịkwanụ na i bu n’obi ịrụ ọrụ ahụ ma e nye gị ya. ”—Sondra, ọ dị afọ 21.

[Igbe dị na peeji nke 18]

IHE NDỊ MỤRỤ ỤMỤ KWESỊRỊ IBURU N’UCHE

Tupu unu ana-ama ihe na-emenụ, ụmụ unu ga-amaliterịrị iso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha kpawa. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Phillip kwuru, sị: “Ana m anọrọ onwe m, ụmụ agbọghọ abịa na-arịọ m ka mụ na ha kpawa. Mụ anọrọzie na-eche, sị, ‘Gịnị ka m ga-eme ugbu a.’ Ọ na-esiri m ike ịjụ n’ihi na ụfọdụ n’ime ha mara ezigbo mma.”

Ihe kasị mma unu kwesịrị ime dị ka ndị nne na nna bụ iso ụmụ unu ndị na-eto eto kwurịta banyere iso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha na-akpa. Gịnị ma gị na ha kwurịta ihe ndị e dere n’isiokwu a? Chọpụta ihe bụ́ echiche nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwanyị banyere nsogbu ndị ọ na-enwe n’ụlọ akwụkwọ na ọbụna n’ọgbakọ. Mgbe ụfọdụ, unu nwere ike ikwurịta ya mgbe unu na-enwe nkwurịta okwu nkịtị, dị ka ihe atụ, “mgbe [unu] na-anọdụ n’ụlọ [unu], na mgbe [unu] na-eje ije n’ụzọ.” (Deuterọnọmi 6:6, 7) Mgbe ọ bụla ọ sọrọ ya ya bụrụ, cheta na ị ‘ga-adị ngwa n’ịnụ ihe, ghara ịdị ngwa n’ikwu okwu.’—Jems 1:19.

Ọ bụrụ na nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwanyị egosi na ya nwere mmasị n’ebe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya nọ, obi efula gị. Otu nwatakịrị nwanyị dị afọ iri na ụma kwuru, sị: “Mgbe papa m chọpụtara na m nwere enyi nwoke, o were ezigbo iwe. Ọ nwara imenye m ụjọ site n’ịjụ m ọtụtụ ajụjụ iji gosi m na etorubeghị m ịlụ di. Ajụjụ ndị ahụ bụ ụdị ọ ga-abụ a jụọ gị mgbe ị na-etorubeghị ịlụ di, ya adị gị ka gị na onye ahụ kpatekwuo aka ka i wee gosi ndị mụrụ gị na ihe ha na-eche abụghị eziokwu.”

Ọ bụrụ na ụmụ unu ndị ka na-eto eto achọpụta na unu adịghị enwe mmasị iso ha kwurịta banyere nwoke na nwanyị ịkpa, ihe ọjọọ nwere ike isi na ya pụta: Ha nwere ike soro ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha na-akpa na nzuzo. Otu nwatakịrị nwanyị kwuru, sị: “Mgbe ndị mụrụ ụmụ wesoro ụmụ ha iwe n’ihi na ha na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha na-akpa, nke a na-eme ka ha soro onye ahụ kpawazie na nzuzo otú ndị mụrụ ha na-agatụghị achọpụta. Ọ naghị eme ka ha kwụsị ya. Ọ na-eme ka ha mewekwuo ya na nzuzo.”

Ọ ga-aka abara unu uru ma unu jiri obi ọcha soro ụmụ unu kwurịta banyere iso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha na-akpa. Otu nwa agbọghọ dị afọ 20 kwuru, sị: “Ndị mụrụ m na-eso m mgbe nile ekwurịta ihe banyere iso nwoke na-akpa, ha na-emekwa ya n’ezoghị ọnụ. Ọ na-adị ha mkpa ịma onye m nwere mmasị n’ebe ọ nọ, echekwara m na nke ahụ dị mma! Papa m na-eso onye ahụ kwurịta okwu. Ọ bụrụ na ọ dị ihe na-adịghị mma ha chọpụtara, ha na-akọrọ m. Ọtụtụ mgbe, ana m ekpebi na enweghịzi m mmasị n’ebe onye ahụ nọ ọbụna tupu ya eruo n’ókè nke mụ na ya ịkpawa.”

[Foto dị na peeji nke 17]

Iso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-anọkọ n’ìgwè n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị pụrụ ịbara gị uru