Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Akwụkwọ Magburu Onwe Ya E Ji Akụzi Ihe!”

“Akwụkwọ Magburu Onwe Ya E Ji Akụzi Ihe!”

“Akwụkwọ Magburu Onwe Ya E Ji Akụzi Ihe!”

Nke ahụ bụ ihe otu onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova, bụ́ onye nọ na Panama, dere banyere akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, nke bụ́ akwụkwọ nwere ihe osise ndị mara mma, nke dị peeji 224, nke e jikwa amụ Bible ugbu a n’ebe nile. O dere, sị: “Otú o si akọwa ihe n’ụzọ dị mfe ma doo anya, nakwa n’ụzọ ga-eme ka i kwenye n’ihe ọ na-ekwu, dị nnọọ ịtụnanya. Ụzọ pụrụ iche e si dee okwu ntụaka na ihe odide ntụkwasị ndị dị na ya na-akpali mmadụ imekwu nnyocha ozugbo.”

Otu Onyeàmà Jehova nọ na Missouri, U.S.A., dere, sị: “Ụzọ dị mfe e si dee ya masịrị m. Ụzọ e si hazie isiakwụkwọ ndị dị n’ime ya bụ ụzọ kasị mma m hụtụrụla.” Ozugbo o nwetara akwụkwọ Bible Na-akụzi, o wegaara ya otu nwanyị gbalịrị ịmụ Bible n’oge gara aga ma mechaa nwee nkụda mmụọ.

Onyeàmà ahụ dere, sị: “Mgbe ọ na-agụchabeghị isiakwụkwọ nke mbụ, ọ kpọrọ m ma gwa m na ihe ọ na-agụ atọgbuola ya.” Nwanyị ahụ sịrị na ọ dị ya ka ọ̀ bụ ya ka e deere akwụkwọ ahụ nakwa na ya chọrọ ka a maliteghachi ịmụrụ ya Bible. Onyeàmà ahụ kwuru na mgbe ha mụchara isi nke mbụ ruo isi nke iri, ụdị ọṅụ nwanyị ahụ nwere n’ihi ihe ọ na-amụta ka mma ka mmadụ bịa jiri anya ya hụ ya.

Ọ bụ ezie na o ruchabeghị afọ abụọ e wepụtara akwụkwọ Bible Na-akụzi, e bipụtala ya ihe karịrị nde iri ise n’ihe karịrị otu narị asụsụ na iri ise. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.