Nduzi nke Karịrị Amamihe E Bu Pụta Ụwa
Nduzi nke Karịrị Amamihe E Bu Pụta Ụwa
“Ọ bụrụ na mmadụ ji aka ya ahọrọ otú ọ ga-esi na-eme omume, ya abụrụkwa na e nweghị ụkpụrụ omume dịnụ nke a ga-eji mara ma nhọrọ ndị ọ na-eme hà dị mma ka hà dị njọ, ọ pụtara na a ga-etirịrị iwu iji na-achịkwa omume ya, ka o wee nwee ike ịdị na-eme omume dị mma.”—DR. DANIEL CALLAHAN.
IHE Maazị Callahan na-atụ ụjọ ya emechaala mee, n’ihi na omume ọjọọ nke na-arịwanye elu n’ọtụtụ ebe n’ụwa emeela ka gọọmenti nye ọtụtụ iwu iji belata mpụ. Ná nnọkọ ezumezu mbụ ndị nne ọnụ na-eru n’okwu na Nigeria nwere, president ndị Nigeria kwupụtara nchegbu ọ na-enwe banyere ihe ga-abụ ọnọdụ nke obodo a n’ọdịnihu. Ihe o bu n’obi abụghị ihe ga-abụ ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ọnọdụ akụnụba nke obodo a, kama ọ bụ “nsogbu ka sie ike”—ya bụ, “otú . . . omume ọma ndị a na-emebu n’ime ezinụlọ, n’ebe ọrụ, n’ime obodo, nakwa n’obodo a dum, si na-ala n’ike n’ike.”
N’otu nnyocha e mere na Britain, bụ́ nke e ji ndị nne dị otu puku, narị asaa na iri atọ na isii mee, a chọpụtara na “ọnọdụ ezinụlọ adịghịzikwa ka ọ dị n’oge ndị nna nna anyị hà n’ihi otú omume ọma si na-ala ala, nakwa n’ihi otú ọnụ ọgụgụ ezinụlọ e nwere nanị nne ma ọ bụ nna na ha si na-amụba.” Na China kwa, omume ọma na-ala n’ike n’ike. Magazin bụ́ Time na-ekwu na ndị nọ na China na-amalite inwe mmekọahụ mgbe ha ka dị obere, ndị ha na ha na-enwe mmekọahụ na-adị ọtụtụ ugbu a karịa ka ọ dịtụrụla. Otu nwanyị bụ́ onye China nke na-eme ọnụ na ya nwere ihe karịrị otu narị mmadụ ya na ha na-enwe mmekọahụ, kwuru, sị, “Ọ bụ m nwe ndụ m, enwekwara m ike ime ihe ọ bụla masịrị m.”
Omume ọma nke na-ala ala emetụtakwala ndị ọchịchị. N’akwụkwọ akụkọ ndị Canada bụ́ Toronto Star, Javed Akbar kwuru, sị: “Ndị mmadụ anaghịzi ewere ndị ọchịchị ha dị ka ndị ha pụrụ igbaso ihe nlereanya ha ma a bịa n’omume.” O kwuru na ndị ọchịchị, ndị nọ n’isi ụlọ ọrụ dị iche iche, na ọbụna ndị ndú okpukpe “yiri ka ha adịghị eme omume kwesịrị ekwesị.”
Gịnị Mere Omume Ọma Ji Na-ala Ala?
E nwere ọtụtụ ihe mere omume ọma ji na-ala ala. Otu n’ime ha bụ na ọtụtụ mmadụ na-ama ama eleghara ụkpụrụ omume ọma ndị e nwere enwe anya. Dị ka ihe atụ, n’otu nnyocha e ji ụmụ akwụkwọ mahadum mee n’ebe ndịda United States, a chọpụtara na ihe ka ọtụtụ n’ime ndị zara ajụjụ ọnụ a gbara ha chere na “ọ bụ mmadụ ka ọ dịịrị ikpebiri onwe ya ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ.”
Onye na-ede banyere ọchịchị bụ́ Zbigniew Brzezinski kwuru ihe ọzọ kpatara ya. O dere na ebe uche ụmụ mmadụ taa “kachazi dịrị bụ n’imejụ ọchịchọ ha ozugbo, n’ụwa nke ndị mmadụ n’otu n’otu nakwa n’ozuzu ha na-ewerezi ihe ụtọ dị ka ihe kasị mkpa ná ndụ.” Anyaukwu, mmadụ ikpebiri onwe ya otú ọ ga-esi na-eme omume, na mmadụ ime ihe na-agụ ya agụụ, nwere
ike ịdị na-atọ ndị mmadụ ụtọ ruo n’ókè ụfọdụ. Ma, ihe ndị ahụ hà na-eweta ezigbo obi ụtọ, afọ ojuju, ma na-eme ka mmadụ na ibe ya dị ná mma?Jizọs kwuru, sị: “A na-anwapụta na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya.” (Matiu 11:19) Omume ọma na-ala ala ọ̀ na-eme ka obi na-adịkwu ndị mmadụ ụtọ ma na-erukwu ha ala? Legodị ụfọdụ n’ime ihe ndị ọ kpatarala: o meela ka ọtụtụ mmadụ kwụsị ịtụkwasị ibe ha obi, mee ka obi ghara iru ndị mmadụ ala, tisaa adịm ná mma mmadụ na ibe ya, mee ka ụfọdụ ụmụaka ghara inwe nne ma ọ bụ nna, mee ka ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ na-amụba n’ike n’ike, mee ka ụmụ agbọghọ na-atụrụ ime ọkwa, mee ka ndị mmadụ na-aṅụ ọgwụ ike, meekwa ka ndị mmadụ na-eme ihe ike. O doro anya na ihe ndị a adịghị eweta afọ ojuju na ihe ịga nke ọma, kama ihe ha na-akpata bụ obi ọjọọ, ma na-eme ka mmadụ ghara inwe ihe ịga nke ọma.—Ndị Galeshia 6:7, 8.
Mgbe Jeremaịa, bụ́ onye amụma Chineke, hụrụ ụdị nsogbu ahụ n’oge ya, o kwuru site n’ike mmụọ nsọ, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) N’eziokwu, Chineke ekeghị anyị ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ebe ọ nọ, ma na-ekpebiri onwe anyị ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ihe yiri ka ọ̀ bụ ezi ihe n’anya anyị nwedịrị ike ịbụ ihe ga-egbu anyị. N’Ilu 14:12, Bible kwuru, sị: “Ụzọ dị nke ziri ezi n’ihu mmadụ, ma nsọtụ ya bụ ụzọ nile nke ọnwụ.”
Onye Iro nke Dị n’Ime Anyị!
Gịnị bụ otu ihe mere nduzi ji dị anyị mkpa ma a bịa n’ihe metụtara omume? Ọ bụ n’ihi na obi anyị nwere ike iduhie anyị. Bible na-ekwu na Jeremaịa 17:9, sị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị ngwọta ka ọ bụkwa: ònye ga-amara ya?” Ọ bụrụ na e nwere onye ị maara dị aghụghọ, nke na-adịghịkwa ekwe ngwọta, ị̀ ga-atụkwasị ya obi? Mbanụ! Ma, anyị nile nwere obi nke pụrụ inwe àgwà ndị ahụ. Ọ bụ ya mere Chineke ji jiri ịhụnanya na-adọ anyị aka ná ntị, sị: “Onye na-atụkwasị obi n’obi nke aka ya, onye ahụ bụ onye nzuzu: ma onye na-eje ije n’amamihe, onye ahụ ka a ga-eme ka o wepụga onwe ya.”—Ilu 28:26.
Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a gosiri anyị ihe anyị kwesịrị ime: Kama ịtụkwasị ikike iche echiche anyị bụ́ nke na-ezughị okè obi, ọ dị anyị mkpa ịgbaso amamihe Chineke, ma si otú a zere ịdaba n’ọtụtụ nsogbu. Ọzọkwa, ndị ji obi ha nile chọọ inweta amamihe ahụ dị oké ọnụ ahịa pụrụ inweta ya. “Ọ bụrụ na amamihe kọrọ onye ọ bụla n’ime unu, ka ọ nọgide na-arịọ Chineke, n’ihi na o ji mmesapụ aka na-enye mmadụ nile ihe, n’akọchaghịkwa akọcha.”—Jems 1:5.
Tụkwasị Chineke “Obi Gị Nile”
Ka Bible na-akọwa ụdị onye Onye Okike anyị bụ, o kwuru, sị: “Oké nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ: n’ihi na ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume, Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bụ.” (Deuterọnọmi 32:4) Ee, Jehova dị nnọọ ka nnukwu nkume. Anyị pụrụ ịtụkwasị ya obi kpamkpam na ọ ga-enye anyị nduzi bụ́ ịgba n’ihe metụtara omume na ihe ime mmụọ n’agbanyeghị mgbanwe ndị anyị na-ahụ gburugburu anyị. Ilu 3:5, 6 na-ekwu, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala [ná] nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.”
A sị ka e kwuwe ya, olee onye nwere ike inye anyị nduzi bụ́ ịgba karịa Onye Okike anyị, bụ́ onye na-agụ “ntutu nile nke isi [anyị] ọnụ”? (Matiu 10:30) Ọzọkwa, o gosila na ọ bụ ezigbo enyi anyị, onye hụrụ anyị n’anya ruo n’ókè nke ịdị na-agwa anyị eziokwu mgbe nile—ọbụna mgbe eziokwu ahụ pụrụ isiri anyị ike nnabata.—Abụ Ọma 141:5; Ilu 27:6.
Marakwa na Jehova adịghị amanye anyị ịgbaso nduzi ya. Kama nke ahụ, ọ na-eji ịhụnanya agba anyị ume ịgbaso ya. “Mụ onwe m bụ Jehova, . . . Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso. Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararịị ntị n’ihe nile M nyere n’iwu! udo gị ewee dịworịị ka osimiri, ezi omume gị adịkwa ka mmali mmiri nile nke oké osimiri.” (Aịsaịa 48:17, 18) Ị́ dịghị enwe mmasị ịbịaru Chineke dị otú ahụ nso? Ọzọkwa, o meela ka amamihe ya nwee ike iru anyị aka site n’Okwu ya bụ́ Bible Nsọ, nke e ji ike mmụọ nsọ dee, nke bụ́kwa akwụkwọ a kasị ekesa n’ụwa nile!—2 Timoti 3:16.
Kwee Ka Okwu Chineke Na-enwu Dị Ka Ìhè n’Okporo Ụzọ Gị
Ọ bụ abụ ahụ dere banyere Akwụkwọ Nsọ, sị: “Okwu Gị bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m.” (Abụ Ọma 119:105) Oriọna nke na-enye ụkwụ anyị ìhè na-eme ka anyị na-ahụ ihe ize ndụ ndị dị anyị nso, ebe ìhè nke na-enwu n’okporo ụzọ anyị na-eme ka anyị na-ahụ ihe dị n’okporo ụzọ anyị na-eje ije na ya. N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, Okwu Chineke pụrụ iduzi anyị ná ndụ site n’inyere anyị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha, na ime omume ndị dị mma, n’ihe nile—ya bụ, n’ihe ndị metụtara anyị ugbu a na ndị nke nwere ike imetụta anyị n’ọdịnihu.
Were Ozizi Elu Ugwu ahụ dị ka ihe atụ. N’okwu ahụ dị mkpirikpi Jizọs Kraịst kwuru, bụ́ nke e dekọrọ na Matiu isi 5 ruo 7, o kwuru banyere obi ụtọ, ịhụnanya, ịkpọasị, ebere, omume ọma, ekpere, ịchụso akụnụba, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-emetụta ndị bi n’oge anyị a otú ahụ o si metụta ndị biri n’oge ahụ. Okwu ya na-akpali mmasị nke ukwuu nke na “ụzọ o si ezi ihe juru ìgwè mmadụ ahụ anya.” (Matiu 7:28) Í cheghị na ọ ga-adị mma ma i wepụtatụ oge gụọ Ozizi Elu Ugwu ahụ n’onwe gị? Ikekwe, ọ ga-amasịkwa gị onwe gị.
‘Nọgide Na-achọ’ Enyemaka Chineke
Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ naghị adịcha mfe ime ihe dị mma n’anya Chineke. N’ezie, Bible ji mgbalị anyị na-eme ịghara ime mmehie tụnyere agha. (Ndị Rom 7:21-24) Ma, site n’enyemaka Chineke, anyị pụrụ imeri n’agha ahụ. Jizọs kwuru, sị: “Nọgidenụ na-arịọ, a ga-enyekwa unu; nọgidenụ na-achọ, unu ga-achọtakwa . . . N’ihi na onye ọ bụla na-arịọ na-anata, onye ọ bụla na-achọkwa na-achọta.” (Luk 11:9, 10) N’eziokwu, Jehova agaghị ahapụ onye ọ bụla nke ji obi ya nile agbalị ije ije n’ụzọ ahụ dị warara nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi.—Matiu 7:13, 14.
Were Frank dị ka ihe atụ, bụ́ onye ise siga ririla ahụ́ mgbe ya na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Bible. Mgbe ọ gụsịrị 2 Ndị Kọrint 7:1 ma kpebiekwa na omume ya bụ ‘mmerụ nke anụ ahụ́’ n’anya Chineke, Frank kpebiri ịkwụsị ise siga. Ma, ime ihe ahụ o kpebiri ime adịghịrị ya mfe. O nwedịrị oge o sekpuuru ala na-achọgharị ma ọ̀ ga-ahụ isi siga o sere ese, ka ọ mụnyeghachi ya ọkụ see!
Àgwà a na-adịghị mma mere ka o doo Ndị Rom 6:16) N’ihi ya, o ji obi ya nile kpee ekpere maka enyemaka, soro Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè ya na-akpachi anya, ma si otú a merie àgwà ọjọọ ya ahụ.—Ndị Hibru 10:24, 25.
Frank anya na siga eriela ya nnọọ ahụ́. (Na-egbo Mkpa Ime Mmụọ Gị
Ahụmahụ Frank bụ nanị otu n’ime ọtụtụ ahụmahụ ndị na-egosi na nduzi Bible na-enye n’ihe metụtara omume na mmekọrịta mmadụ na Chineke bụ nnọọ ezigbo ya, nakwa na Bible na-akpali anyị ịgbaso nduzi ndị ahụ. Ka a sịkwa ihe mere Jizọs ji kwuo, sị: “Ọ bụghị nanị n’achịcha ka mmadụ ga-esi dị ndụ, kama ọ bụ n’okwu ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova apụta.”—Matiu 4:4.
Mgbe ọ bụla anyị nakweere eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa sitere n’aka Chineke ma mee ihe kwekọrọ na ya, ọ na-abara anyị uru n’ọtụtụ ụzọ—ọ na-eme ka anyị na-echezi echiche echezi, na-eme ka obi ruo anyị ala, na-eme ka anyị na Chineke dị ná mma, na-emekwa ka anyị nwee ezi ahụ́ ike. Abụ Ọma 19:7, 8 na-ekwu, sị: “Iwu Jehova zuru okè, na-eweghachi [ma ọ bụ na-atụte] mkpụrụ obi. . . . Ụkpụrụ nile Jehova tọrọ ziri ezi, na-eme ka obi ṅụrịa ọṅụ: ihe Jehova nyere n’iwu na-enwu enwu, na-enye anya ìhè [ka mmadụ wee nwee olileanya ma nwee ike ịhụ nzube Chineke nke ọma].”
Jehova na-eji Okwu ya enyere anyị aka imezi àgwà anyị ma bie ndụ kasị mma ugbu a. Ọ bụghị nanị nke ahụ, ọ na-ejikwa ya eme ka anyị mara ihe ga-eme n’ọdịnihu. (Aịsaịa 42:9) Dị ka isiokwu na-esonụ na-egosi, ọdịnihu ga-adịrị ndị nile nabatara nduzi Chineke mma.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 4, 5]
Ihe Na-eduzi Omume Gị Otú Compass Si Eduzi Ụgbọelu
Ụmụ mmadụ nwere otu onyinye dị oké ọnụ ahịa—ya bụ, akọnuche. Ọ bụ ya mere mba na agbụrụ ọ bụla, tinyekwara ndị biri ndụ n’oge ọ bụla, ji nwee iwu ndị yiri ibe ha bụ́ ndị na-achịkwa omume ha. (Ndị Rom 2:14, 15) Ma, akọnuche abụghị ihe nduzi a pụrụ ịtụkwasị obi mgbe nile; nkwenkwe okpukpe ụgha, nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ, ịkpọasị, na ọchịchọ ọjọọ nwere ike imetụta ya. (Jeremaịa 17:9; Ndị Kọlọsi 2:8) N’ihi ya, dị nnọọ ka o si dị onye na-anya ụgbọelu mkpa ịdị na-enyocha ngwá ọrụ na-eduzi ya, ọ dị anyị mkpa ịdị na-enyocha ma na-emezi omume anyị na ọnọdụ ime mmụọ anyị mgbe ọ bụla ọ dị mkpa, ma mee ka o kwekọọ n’ụkpụrụ ezi omume nke “onye na-enye anyị iwu,” bụ́ Jehova Chineke. (Aịsaịa 33:22) Ụkpụrụ omume nke Chineke, bụ́ nke zuru okè, adịghị ka ụkpụrụ omume nke ụmụ mmadụ, bụ́ nke pụrụ ịgbanwe site n’otu ọgbọ ruo n’ọzọ. Kama nke ahụ, ụkpụrụ omume nke Chineke na-adịru ebighị ebi. Jehova kwuru, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova, agbanweghị.”—Malakaị 3:6.
[Igbe dị na peeji nke 7]
Ihe Nduzi Maka Inwe Ihe Ịga nke Ọma na Obi Ụtọ
IHE GA-EME KA I NWETA OBI ỤTỌ
“Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha.”—MATIU 5:3.
“A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”—ỌRỤ 20:35.
“Obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya!”—LUK 11:28.
IHE GA-EME KA A TỤKWASỊ GỊ OBI
“Ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu.”—NDỊ EFESỌS 4:25.
“Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi.”—NDỊ EFESỌS 4:28.
“Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ nile, ka ihe ndina alụmdi na nwunye bụrụkwa ihe na-enweghị mmerụ.”—NDỊ HIBRU 13:4.
IHE GA-EME KA GỊ NA NDỊ MMADỤ DỊ NÁ MMA
“Ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.”—MATIU 7:12.
“Ka [di] sikwa otú ahụ hụ nwunye ya n’anya dị ka o si hụ onwe ya n’anya; . . . nwunye kwesịrị inwe nkwanye ùgwù miri emi maka di ya.”— NDỊ EFESỌS 5:33.
“Nọgidenụ . . . na-agbaghara ibe unu kpam kpam.”—NDỊ KỌLỌSI 3:13.
IHE GA-EME KA I ZERE NAKWA KA I DOZIE NSOGBU
“Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi onye ọ bụla n’ọnọdụ ihe ọjọọ.”—NDỊ ROM 12:17.
“Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. . . . Ọ dịghị agụkọ ihe ọjọọ.” —1 NDỊ KỌRINT 13:4, 5.
“Ka anyanwụ ghara ịda n’ebe unu nọ n’ọnọdụ mkpasu iwe.”—NDỊ EFESỌS 4:26.