Kpebienụ Ihe Ndị Unu Ga Na-eme, Na-emekwanụ Ihe Unu Kpebiri
Nke 5
Kpebienụ Ihe Ndị Unu Ga Na-eme, Na-emekwanụ Ihe Unu Kpebiri
Gịnị mere nke a ji dị mkpa? Ndị toruru ogo mmadụ nwere ihe ndị ha na-eme mgbe mgbe ná ndụ ha. A na-enwekarị oge e ji arụ ọrụ, oge e ji efe ofufe nakwa oge e ji atụrụ ndụ. Ndị mụrụ ụmụ na-eme ka ihe siere ụmụ ha ike ma ọ bụrụ na ha adịghị akụziri ha ka ha na-ahazi oge ha ahazi, hụkwa na ha na-eme ihe ọ bụla mgbe oge ya ruru. N’aka nke ọzọ, Dr. Laurence Steinberg, bụ́ ọkacha mara n’akparamàgwà ụmụ mmadụ, kwuru na “nnyocha ndị e mere na-egosi na ahụ́ na-eru ụmụaka ala ma ọ bụrụ na ha nwere iwu na ụkpụrụ ndị na-achị ha. Ọ na-emekwa ka ha mụta inwe njide onwe onye na inwe obi ike.”
Ihe mere o ji esi ike: Ihe mmadụ nwere ime na ndụ karịrị akarị. Ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ na-arụ ọrụ ọtụtụ awa nke mere na ọ bụ nanị obere oge ka ha na ụmụ ha na-anọrị mgbe nile. Iji kpebie ihe ndị unu ga na-eme n’ezinụlọ ma na-eme ihe ndị unu kpebiri, unu ga-agbalịsi ike hụ na nwa unu na-eme ihe unu kpebiri, ọbụna mgbe ọ jụrụ ime ya ná mmalite.
Ihe ga-enyere unu aka: Tinyenụ ndụmọdụ dị na Bible n’ọrụ n’ezinụlọ unu, nke na-asị, “ka ihe nile were ọnọdụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa dị ka ndokwa si dị.” (1 Ndị Kọrint 14:40) Dị ka ihe atụ, mgbe ụmụaka dị obere, ọtụtụ nne na nna na-eji amamihe ekpebiri ha oge ha ga na-alakpu ụra kwa ụbọchị. Ma, e kwesịrị ime ka oge ịlakpu ụra bụrụ oge obi ụtọ. Tatiana, onye bi na Gris, nke mụrụ ụmụntakịrị nwanyị abụọ, sịrị: “Mgbe ụmụ m dinaara ala, m na-adịda ha aka, gwakwa ha ihe mụnwa bụ́ nne ha mere mgbe ha gara ụlọ akwụkwọ. Mgbe ahụ, m na-ajụ ha ma hà ga-achọ ịkọrọ m ụfọdụ n’ime ihe ndị ha mere n’ụbọchị ahụ. Ahụ́ na-eru ha ala. Mgbe mgbe, ha na-akọrọ m ihe dị ha n’obi.”
Kostas, bụ́ di Tatiana, na-ewere akwụkwọ gụọrọ ụmụ ha akụkọ. Ọ sịrị: “Ha na-ekwu okwu banyere akụkọ m gụụrụ ha. Mgbe mgbe, nkwurịta okwu ahụ na-eji nke nta nke nta gaa n’ihe ndị dị ha n’obi. Ọ na-esiri ụmụaka ahụ ike ịkọrọ m ihe dị ha n’obi ma ọ bụrụ na m jụọ ha kpọmkwem ihe na-enye ha nsogbu n’obi.” Otú ọ dị, mgbe ụmụaka tolitere, ọ ga-adị mma ka unu gbanwee oge ha ji alakpu ụra otú kwesịrị ekwesị. Ma, ọ bụrụ na unu anọgide na-agakwuru ụmụ unu n’oge ha ji alakpu ụra, ha ga-anọgide na-agwa unu okwu n’oge a.
Ọ bụkwa ihe amamihe dị na ya ma ọ bụrụ na ezinụlọ na-erikọ nri ọnụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ, otu ugboro nri n’ụbọchị. Ka ezinụlọ wee na-eme nke a, ha nwere ike ịgbanwe oge ha ji eri nri mgbe ụfọdụ. Charles, onye mụrụ ụmụntakịrị nwanyị abụọ, sịrị: “Mgbe ụfọdụ anaghị m alọta ọrụ ngwa ngwa. Nwunye m nwere ike nye ụmụaka ahụ ihe ha ga-eji gbado ume. Ma mgbe nile, ọ na-ahụ na onye ọ bụla cheere ruo mgbe anyị nile nwere ike irikọ nri ọnụ dị ka ezinụlọ. Anyị na-akọ ihe ndị anyị mere n’ụbọchị, tụlee otu amaokwu Bible, kwuo banyere nsogbu ndị dịnụ, chịkọọkwa ọchị. Ana m ekwusi ya ike na ihe ndị a anyị na-eme enyerela anyị aka nke ukwuu inwe obi ụtọ n’ezinụlọ anyị.”
Ka nke a wee mara unu ahụ́, unu ekwela ka ịchụ ihe onwunwe gbochie unu ime ihe ezinụlọ unu kpebiri ịdị na-eme. Tinyenụ ndụmọdụ dị na Bible n’ọrụ nke na-asị, “jide ihe ndị ka mkpa n’aka.”—Ndị Filipaị 1:10.
Olee ihe ọzọ ndị mụrụ ụmụ nwere ike ime ka ha na ụmụ ha wee na-ekwurịta okwu nke ọma karị?
[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 25]
“Ma ka ihe nile were ọnọdụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa dị ka ndokwa si dị.”—1 Ndị Kọrint 14:40