Oge Ikpeazụ Gasịa Gịnị Emezie?
Oge Ikpeazụ Gasịa Gịnị Emezie?
ỤJỌ na-atụ ụfọdụ ndị ma ha cheta okwu ahụ bụ́ ‘oge ikpeazụ.’ (2 Timoti 3:1) Naanị ihe na-abata ha n’obi bụ oge dị oké egwu. Oleezi ihe mere ọtụtụ ndị jirila na-atụ anya ya kemgbe ụwa? Ọ bụ n’ihi na e nwekwara ihe ọma ndị ga-esochi oge ikpeazụ ahụ.
Dị ka ihe atụ, Sir Isaac Newton kweere na oge ikpeazụ gasịa, a ga-enwe udo na ihe ịga nke ọma zuru ụwa ọnụ n’oge Ọchịchị Puku Afọ nke Alaeze Chineke. O kwuru na amụma ahụ dị na Maịka 4:3, nakwa nke dị n’Aịzaya 2:4, ga-emezu n’oge ahụ: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi. Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha.”
Mgbe Jizọs na-ekwu banyere oge ikpeazụ, ọ gbara ụmụazụ ya ume ka ọ ghara ịtụ ha ụjọ. Mgbe ọ gwachara ha banyere ihe isi ike, nchegbu, na ụjọ a ga-enwe n’oge oké mkpagbu ahụ, o kwuru, sị: “Mgbe ihe ndị a niile malitere ime, guzonụ kwem ma welie isi unu elu, n’ihi na nnapụta unu na-eru nso.” (Luk 21:28) Nnapụta site na gịnị?
Ihe Chineke Kwere Nkwa Ya
Agha, ọgụ ime obodo, mpụ, ime ihe ike, na agụụ so n’ọtụtụ ihe ndị na-enye ụmụ mmadụ nsogbu taa ma na-eme ka ọtụtụ nde mmadụ na-anọ n’ụjọ mgbe niile. Ò nweela nke metụtara gị n’ihe ndị a? Ya bụrụ na o nweela, lee ihe Chineke kwere nkwa ya:
“N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ . . . Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—Abụ Ọma 37:10, 11.
“Ndị m ga-ebikwa n’ebe obibi nke udo dị nakwa n’ụlọ nke ha ga-ebi n’obi iru ala zuru ezu nakwa n’ebe izu ike nke nsogbu na-adịghị.”—Aịzaya 32:18.
“[Jehova] na-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa. Ọ na-agbaji ụta, na-egbujisịkwa ube; ọ na-agbakwa ụgbọ agha ọkụ.”—Abụ Ọma 46:9.
“Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.”—Maịka 4:4.
“Ọka ga-ejupụta n’elu ụwa; ọ ga-ejubiga ókè n’elu ugwu dị iche iche.”—Abụ Ọma 72:16.
“Ma onye na-ege m ntị ga-ebi n’obi iru ala, ụjọ ọdachi agaghịkwa enye ya nsogbu.”—Ilu 1:33.
A sịgodị na anyị bi n’ebe ihe na-anaghị esichara ndị mmadụ ike, anyị agaghị
agbanahụli ọrịa na ọnwụ. A ga-ewepụkwara anyị ihe ndị a n’ụwa ọhụrụ Chineke. Anyị nweziri ike ịtụ anya ịhụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ. Legodị ihe e kwuru n’okpuru ebe a:“Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”—Aịzaya 33:24.
“[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”—Mkpughe 21:4.
“Dị ka onye iro ikpeazụ, a ga-eme ka ọnwụ ghara ịdị irè.”—1 Ndị Kọrịnt 15:26.
“Oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu [Jizọs] wee pụta.”—Jọn 5:28, 29.
Pita onyeozi si otú a chịkọta ihe a niile n’ụzọ magburu onwe ya mgbe o dere, sị: “E nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ anyị na-echere dị ka nkwa ya si dị, ezi omume ga-ebikwa n’ime ha.” (2 Pita 3:13) Ka ezi omume wee nwee ike ịdị ebe niile n’ụwa, ọ ga-adị mkpa ka e wepụ onye ọ bụla ga-akpata nsogbu n’ụwa. Ọ ga-adịkwa mkpa ka e wepụ mba ndị e nwere taa, bụ́ ndị na-akpata nnọọ nsogbu ma na-akwafu ọbara site n’iche naanị maka onwe ha. A ga-eji ọchịchị Alaeze Chineke nke dị n’aka Kraịst dochie anya ọchịchị niile e nwere n’ụwa. A gwara anyị okwu ndị a na-emesi obi ike banyere ọchịchị ahụ: “Mgbasa ịchịisi ya na udo ya ga-agbasa agaghị enwe ọgwụgwụ, n’elu ocheeze Devid nakwa n’alaeze ya iji mee ka o guzosie ike nakwa iji jiri ikpe ziri ezi na ezi omume mee ka ọ dịgide, malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. Ekworo Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-emezu ihe a.”—Aịzaya 9:7.
I nwere ike ịtụ anya ihe ndị a, n’ihi na Baịbụl na-emesi anyị obi ike na “ọ bụ uche [Chineke] ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Egbula oge. Mụta ihe ga-eme ka i nweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Malite site n’ịkpọtụrụ ndị bipụtara magazin a ma rịọ ha ka ha malite ịmụrụ gị Baịbụl n’ụlọ gị na-anaghị gị ego.
[Foto ndị dị na peeji nke 8 na 9]
I nwere ike ịtụ anya ịdị ndụ ebighị ebi n’udo na n’ezigbo ahụ́ ike n’ime Paradaịs na-abịa n’ụwa ebe a