Ebe Mbụ M Nụrụ Aha ahụ Bụ́ Jehova
Ebe Mbụ M Nụrụ Aha ahụ Bụ́ Jehova
Dị ka Pavol Kovár si kọọ
Ka a na-atụ bọmbụ aghara aghara, anyị jisiri ike gbaba n’otu ụlọ yiri ụlọ bacha. Ka ụda bọmbụ ndị ahụ na-adakwu n’ike n’ike, ụlọ ahụ anyị nọ na ya ana-amakwa jijiji, otu onye mkpọrọ ibe m kpere ekpere n’olu dara ụda, sị: “O Jehova, zọpụta anyị! Biko, zọpụta anyị n’ihi aha nsọ gị!”
IHE ahụ mere na January 8, 1945, mgbe m bụ onye agha e ji eji n’obodo Linz dị n’Austria. Anyị dị ihe dị ka mmadụ narị abụọ na iri ise nọrọ n’ụlọ ahụ, ọ dịghịkwa onye n’ime anyị bọmbụ ahụ gburu. Mgbe anyị pụtara, anyị hụrụ na e bibiela ebe niile. Echefughị m ekpere ahụ sitere n’obi m nụrụ, ọ bụ ezie na amaghị m onye kpere ya. Tupu mụ akọwara gị otú m si mechaa mata onye Jehova bụ, ka m kọtụrụ gị banyere otú e si zụlite m.
A mụrụ m na September 28, 1921, n’ụlọ dịdebere obere obodo bụ́ Krajné, nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ Slovakia, bụ́kwanụ nke dị n’obodo Czechoslovakia n’oge ahụ. Ndị mụrụ m bụ ndị Protestant na-anaghị eji okpukpe ha egwuri egwu. Papa m na-agụ Baịbụl anyị nwere n’ezinụlọ anyị n’ụtụtụ Sunday ọ bụla, mama m na mụ na ụmụnne m atọ na-egekwa ntị nke ọma. N’agbanyeghị nke ahụ, echeghị m na ọ dị mgbe papa m kpọrọ aha ahụ bụ́ Jehova. Ndị obodo anyị anaghị ebi ndụ okomoko, ma ihe anyị nwere juru anyị afọ.
Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ malitere n’afọ 1939, egwu tụrụ ndị mmadụ. Ọtụtụ ndị chetara nke ọma ahụhụ ndị mmadụ tara mgbe a lụrụ Agha Ụwa Mbụ ihe dị ka iri afọ abụọ tupu mgbe ahụ. N’afọ 1942, a sịrị m bịa deba aha n’òtù ndị agha Slovak. Ọ bụ ezie na ihe dị n’akwụkwọ bụ na Slovakia dụnyeere ndị Germany úkwù, n’August 1944, a gbalịrị iweghachi ọchịchị onye kwuo uche ya na Slovakia. Mgbe atụmatụ ahụ kụrụ afọ n’ala, eso m n’ọtụtụ puku ndị agha Slovak e jidere ma bufee n’ógbè ndị Germany na-achị. Emesịrị m nweta onwe m n’obodo Gusen, n’otu obere ụlọ mkpọrọ ya na ajọ ogige ịta ahụhụ Mauthausen gbara, n’ebe dịdebere obodo Linz.
Onye Agha E Ji Eji
E kenyere anyị ọrụ n’ebe a na-emepụta ụgbọelu n’ebe na-adịghị anya site n’obodo Sankt Georgen an der Gusen. N’ebe ahụ, m rụrụ ọrụ n’ebe a na-akwọ
osisi. Nri a na-enye anyị ebughị ibu, na January 1945 kwa, e gbubilatakwuru nri anyị, ebe ọ bụ na a na-emerizi ndị agha Nazi aghara aghara. Naanị nri dị ọkụ a na-enye anyị bụ obere ofe. Kwa ụtụtụ, ndị mkpọrọ na-esi n’ogige ndị mkpọrọ anyị nke ka ukwuu dị na Mauthausen abịa. Ndị nche na-etigbukarị ndị mkpọrọ ike na-adịghị ịrụ ọrụ. Mgbe e mesịrị, ndị mkpọrọ ibe ha ga-ebuba ozu ha n’ụgbọala ndị ga-ebuga ha n’ebe a ga-akpọ ha ọkụ.N’agbanyeghị ahụhụ anyị nọ na ya, anyị nwere olileanya na agha ahụ ga-ebi n’oge na-adịghị anya. Na May 5, 1945, ọnwa anọ ka a tụsịrị bọmbụ ahụ m kwuru okwu ya ná mmalite, oké ọgba aghara kpọtere m n’ụra, m wee gbapụta n’èzí. Ọ dịkwaghị ndị nche ụlọ mkpọrọ m hụrụ, a hụrụ m ebe e kposara égbè ha, ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọ mkpọrọ ahụ ghekwa oghe. Anyị nweziri ike ilefe anya n’ala ahịhịa dị ebe ahụ ma hụ ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ nke ọzọ. Ndị mkpọrọ a tọhapụrụ atọhapụ si ebe ahụ na-ekwopụta ka aṅụ. Ma, ndị mkpọrọ ahụ nweere onwe ha bọọrọ onwe ha ọ́bọ̀. Ígwè mmadụ e gburu n’ụbọchị ahụ ekwebeghị m nchefu.
Ndị mkpọrọ ahụ nọ na-abọrọ onwe ha ọ́bọ̀ site n’ịkụgbu ndị kapo, bụ́ ndị mkpọrọ dụnyeere ndị nche ụlọ mkpọrọ úkwù. Mgbe mgbe, ndị kapo na-adị obi ọjọọ karịadị ndị nche ndị Nazi. Eji m anya m hụ ka otu onye mkpọrọ ji osisi kụgbuo otu onye kapo, nọrọ na-eti, sị: “Ọ bụ ya gburu papa m. Mụ na papa m enwerechaala onwe anyị enwere ebe a, nwanne ụnyaahụ a gara aga, ya egbuo ya!” Ná mgbede ụbọchị ahụ, ozu ndị kapo na nke ndị mkpọrọ ndị ọzọ—ọtụtụ narị mmadụ—juru n’ala ahịhịa ahụ. Ka e mesịrị, tupu anyị alawa, anyị gagharịrị n’ogige ụlọ mkpọrọ ahụ, hụchaa ihe dị iche iche e ji egbu mmadụ—karịsịa ebe ahụ e ji gas egbu ndị mkpọrọ—na ebe a na-akpọ ndị mkpọrọ ọkụ.
Otú M Si Mata Ezi Chineke Ahụ
Alọtara m n’ọgwụgwụ ọnwa May 1945. Ka ọ dịgodị, ọ bụghị naanị na ndị mụrụ m amụtala aha Chineke, bụ́ aha ahụ m nụrụ nke mbụ ya n’ebe ahụ yiri ụlọ bacha, kama ha aghọọla Ndịàmà Jehova. Obere oge m lọtachara, ahụrụ m Oľga, bụ́ nwata nwaanyị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, n’ime otu afọ kwa, mụ na ya lụrụ. Ịnụ ọkụ n’obi o nwere maka eziokwu Baịbụl mere ka m nọgide na-amụ banyere Jehova. N’otu n’ime mgbakọ ikpeazụ ndị anyị nwere tupu ndị ọchịchị Kọmunist na-achịzi obodo anyị mgbe ahụ amachibido ọrụ nkwusa anyị iwu n’afọ 1949, e mere mụ ma Oľga na mmadụ iri ise ndị ọzọ baptizim n’Osimiri Váh nke dị na Piešťany. Ka oge na-aga, anyị mụrụ ụmụ nwaanyị abụọ, bụ́ Oľga na Vlasta.
Ján Sebín, bụ́ Onyeàmà nke nyere aka n’ịhazigharị ọrụ nkwusa mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, na-abịa n’ụlọ anyị mgbe niile, mụ na ya na-ekwusakọkwa ozi ọma mgbe niile. N’agbanyeghị na mmegide si n’aka ndị Kọmunist nọ na-aka njọ, anyị nọgidere na-ekwusa ozi ọma. Anyị na-eji akọ agwa ndị mmadụ banyere eziokwu Baịbụl, n’oge na-adịghịkwa anya, anyị nwetara ọtụtụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl. Mgbe Ján hapụrụ ógbè anyị, mụ na nwunye m gara n’ihu n’iduzi ọmụmụ ihe ndị ahụ. Ka e mesịrị, anyị na-ahụkarị ndị ahụ anyị hụrụ n’anya na ụmụ ha nakwa ụmụ ụmụ ha ma anyị gaa mgbakọ. Nke ahụ mere anyị nnọọ obi ụtọ!
Ozi Pụrụ Iche
Ka ọ na-erule afọ 1953, a tụọla ọtụtụ Ndịàmà na-eduzi ọrụ nkwusa mkpọrọ. N’ihi ya, a gwara m ka m nye aka na-ekwusa ozi ọma n’ebe dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri ise site n’ụlọ
anyị. Kwa izu abụọ, m mechie ọrụ n’ehihie Saturday, m na-abanye ụgbọ okporo ígwè site na Nové Mesto nad Váhom gawa Martin, nke dị n’ebe ugwu nke etiti Slovakia. M na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl n’ebe ahụ ruo n’abalị Saturday nakwa n’ụbọchị Sunday, malite n’ụtụtụ ruo ná mgbede. Ná mgbede Sunday, m na-abanye ụgbọ okporo ígwè laghachi Nové Mesto. M na-erutekarị n’etiti abalị, m na-anọkwa n’ụlọ otu di na nwunye merela agadi ruo ụtụtụ echi ya. M na-esi ebe ahụ agawa ọrụ, m na-alaghachikwurukwa ezinụlọ m na Krajné, n’abalị Monday. Oľga na-elekọta ụmụ anyị ná ngwụsị izu ndị ahụ m na-anọghị n’ụlọ.N’afọ 1956, enyeziri m ọrụ ịbụ onye nlekọta sekit, bụ́ ọrụ gụnyere ileta ọgbakọ ndị dị n’ógbè anyị iji wusie ha ike n’ụzọ ime mmụọ. Ebe ọ bụ na a tụọla ọtụtụ ndị na-arụbu ọrụ a mkpọrọ, ahụrụ m na ọ dị mkpa ka m nara ọrụ a. Obi siri mụ na nwunye m ike na Jehova ga-enyere ezinụlọ anyị aka.
Iwu ndị Kọmunist kwuru na nwa amaala ọ bụla ga-enwerịrị ọrụ. Gọọmenti na-ele ndị na-enweghị ọrụ anya dị ka ndị na-abaghị uru, a na-atụkwa ha mkpọrọ. N’ihi ya, anọgidere m na-arụ ọrụ ego m. M na-eji ngwụsị izu abụọ n’ọnwa ọ bụla anọnyere ezinụlọ m, soro ha mee ihe ndị metụtara ofufe Chineke na ihe ndị ọzọ; ma m na-eji ngwụsị izu abụọ ndị nke ọzọ eleta otu n’ime ọgbakọ isii nọ anyị nso, bú ndị nọ na sekit anyị.
Otú Anyị Si Na-ebi Akwụkwọ Mgbe A Machibidoro Ọrụ Anyị Iwu
Ọ bụ ndị nlekọta sekit ka ọ dị n’aka ịhụ na ọgbakọ nke ọ bụla nọ na sekit ha nwetara akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Na mbụ, a na-eji aka ma ọ bụ ígwè typewriter edepụtaghachi ihe ka ọtụtụ na magazin anyị. Ka e mesịrị, anyị na-enwetazi fim Ụlọ Nche ma zigara ha ọgbakọ dị iche iche. A na-ejizi akwụkwọ e ji asa foto asapụta magazin ndị ahụ. Ebe ọ bụ na ịzụ ụdị akwụkwọ ahụ n’ebe o buru ibu nwere ike ime ka e nyowe mmadụ enyowe, ndị na-aga azụta ha aghaghị inwe obi ike ma dị akọ.
Štefan Hučko bịara nwee nnọọ mmasị n’ọrụ a, ọ na-arụtakwa ya nke ọma. Dị ka ihe atụ: N’otu oge, Štefan gaghachiri ịzụ akwụkwọ foto n’otu ụlọ ahịa na-ere ya n’obodo dị anya site n’obodo ya ma tụgharịa ịlawa n’ihi na ọ dịghị nke ha nwere. Otú ọ dị, ọ hụziri otu nwata nwaanyị nwere obiọma nke na-ere ahịa ebe ahụ bụ́ onye kwerela ya nkwa ịtụrụ ya ọda akwụkwọ. Ka Štefan na-achọ ịgakwuru ya, ọ hụrụ otu onye uwe ojii ka ọ na-abata n’ụlọ ahịa ahụ. N’otu mgbe ahụ, nwata nwaanyị ahụ hụrụ Štefan ma jiri obi ụtọ tipụ, sị: “Nna Anyị Ukwu! Ọ dabarala gị. Anyị enwetala akwụkwọ foto ahụ ị chọrọ.”
Štefan chere echiche ngwa ngwa ma zaa ya, sị: “Nne, ewela iwe, ọ ga-abụrịrị na o nwere onye i chere na m bụ. Ihe m chọrọ bụ naanị otu fim foto.”
Mgbe Štefan laghachiri n’ụgbọala ya, ọ nọ na-eche otú ọ ga-esi hapụ akwụkwọ foto ndị ahụ ọ bịara ịzụ lawa. N’ihi ya, ka e mesịrị, o yipụrụ kootu ya ma kpupụ okpu ya, gbanwetụkwa ọdịdị ya ma banyeghachi n’ụlọ ahịa ahụ, gakwurukwa nnọọ nwata nwaanyị ahụ na-ere ihe n’ebe ahụ. Ọ kọwaara nwata nwaanyị ahụ, sị: “Abịara m ebe a n’izu gara aga, i kwekwara m nkwa na ị ga-atụrụ m ọda akwụkwọ foto. Ùnu enwetala ya?”
Ọ zara ya, sị: “Eenụ, anyị enwetala ya. Ma, Nna Anyị Ukwu, ị̀ makwa na naanị nkeji ole na ole gara aga, otu nwoke yichara gị nnọọ bịara ebe a? Amaghị m na mmadụ na-esi otú a eyi ibe ya—ọ dị nnọọ ka gị na ya ùnu bụ́ ejima!” Štefan mere ngwa ngwa zụrụ úkwù akwụkwọ foto ahụ ma lawa, kelee Jehova maka ime ka o ruo ya aka.
N’afọ ndị 1980, anyị malitere iji ígwè mimeograph na obere ígwè obibi akwụkwọ na-ebipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ụlọ ndị dị n’okpuru ala na n’ebe ndị ọzọ siri ike nchọta. Ka oge na-aga, ole a na-ebipụta nke ọ bụla na magazin anyị—nakwa akwụkwọ ukwu na akwụkwọ
nta—bịara ruo ọnụ ọgụgụ Ndịàmà e nwere, ọbụnadị karịa ya.Nleta Ndị Na-erughị M Ahụ́ Ala
Otu ụbọchị n’agbata afọ 1960 na 1969, a gwara m ka m wụchaa n’ihu ngalaba na-ahụ maka okwu agha n’ụlọ ọrụ m na-arụrụ ọrụ. Ụmụ nwoke atọ yi uwe ndị nkịtị gbara m ajụjụ ọnụ, na-ajụ m, sị: “Olee mgbe gị na Ndịàmà Jehova bidoro mekọwa ihe? Oleekwa ndị gị na ha na-eso enwe nzukọ?” Mgbe m na-azaghị ha kpọmkwem ihe ha jụrụ m, ha gwara m na a ga-akpọtụrụ ma e mesịa. Nke ahụ bụ mgbe mbụ mụ na ndị uwe ojii nzuzo zutere.
Obere oge ka nke ahụ gasịrị, e si n’ebe ọrụ m kpọga m n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. A tọgbọọrọ m otu ibe akwụkwọ ọ na-enweghị ihe e dere na ya ma gwa m detuo aha Ndịàmà ibe m. Mgbe nwoke nyere m akwụkwọ ahụ lọghachiri mgbe ihe dị ka otu awa gasịrị, ọ dịbeghị ihe m dere n’akwụkwọ ahụ, agwakwara m ya na enweghị m ike ide aha ọ bụla. N’izu sochiri ya, otu ihe ahụ mekwara. Ma na nke ugbu a, a kụrụ m ihe, ka m sikwa ebe ahụ na-ala, a gbagidere m ụkwụ gbapụta m na paseeji.
Ka nke ahụ gasịrị, ọ dịghị onye nyere m nsogbu ruo otu afọ. Ndị uwe ojii ziteziri otu nwoke ka ọ bịa leta m. Mụ na ya nọrọ n’otu ogige ịta ahụhụ ndị Nazi dị ka ndị mkpọrọ. Ọ gwara m, sị: “Anyị ahụla na ọ dị anyị mkpa ịgbanwe otú anyị si emeso unu ihe. Ọ na-abụ anyị tinye otu Onyeàmà n’ụlọ mkpọrọ, Ndịàmà ise apụta.” Ihe gọọmenti chọrọ ime bụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ịchịkwa ọrụ anyị ruo n’ókè ụfọdụ. Ma, ekpebisiri m ike na ọ dịghị ihe ga-eme ka m gwa ha ihe ọ bụla ga-enyere ha aka ime otú ahụ.
Ruo ọtụtụ afọ, eso m ná ndị ndị uwe ojii letara ugboro ugboro otú ahụ. Mgbe ụfọdụ, ha mesoro anyị ihe ka ndị enyi, ma n’oge ndị ọzọ, ha na-atụ otu n’ime anyị mkpọrọ. Ekelere m Chineke na ọ dịghị mgbe ha tụbara m n’ụlọ mkpọrọ, ma ndị uwe ojii nọgidere na-enye m nsogbu ruo n’afọ 1989, bụ́ afọ ọchịchị Kọmunist dara na Czechoslovakia.
Izu ole na ole ọchịchị Kọmunist dasịrị, otu onyeisi ndị uwe ojii nzuzo n’obodo Bratislava letara m. Ọ rịọrọ m mgbaghara ma sị m: “A sị na ọ dị m n’aka, o nwedịghị mgbe anyị gaara enyewe unu nsogbu.” O sizi n’ụgbọala ya bupụta akpa abụọ mkpụrụ osisi a gbara ná mkpọ dị na ha ma bunye m ha.
Jehova Bụ Ụlọ Elu Siri Ike
Ọ bụ ezie na a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu n’iri afọ anọ mbụ m ji bụrụ Onyeàmà, ndụ m biri juru m afọ ma na-enye m obi ụtọ. Ihe ndị anyị gabigara n’afọ ndị ahụ mere ka ụmụnna anyị kwesịrị ntụkwasị obi dịkwuo n’otu. Anyị mụtara iji ọbụbụenyi anyị kpọrọ ihe, mụtakwa ịdabere n’ebe ibe anyị nọ dị ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi.
Na March 2003, nwunye m m hụrụ n’anya, bụ́ Oľga, nwụnahụrụ m, nke ahụ gbawakwara m obi. Ọ bụụrụ m enyi m tụkwasịrị obi n’oge niile anyị biri dị ka di na nwunye. Anyị abụọ ji nnọọ ọrụ n’aka n’ozi Ndị Kraịst n’afọ ndị ahụ. Ugbu a, m ka na-eje ozi dị ka okenye Ndị Kraịst n’ọgbakọ anyị ma ka na-achọgharị ndị obi ha ziri ezi m ga-akụziri eziokwu Baịbụl. Aha ahụ bụ́ Jehova, bụ́ nke m nụrụ nke mbụ ya n’Agha Ụwa nke Abụọ mgbe m nọ n’ụlọ ahụ yiri bacha, ka bụụrụ m ụlọ elu siri ike. *—Ilu 18:10.
[Ihe odide ala ala peeji]
^ par. 33 Nwanna Pavol Kovár nwụrụ na July 14, 2007, ka a na-akwado ibipụta isiokwu a. Ọ gbara afọ iri asatọ na ise.
[Foto dị na peeji nke 26]
Na 1942 mgbe m nọ n’òtù ndị agha Slovak
[Foto dị na peeji nke 26]
E mesịrị tụọ m mkpọrọ na Gusen (bụ́ nke dị n’azụ m)
[Ebe E Si Nweta Ya]
© ČTK
[Foto dị na peeji nke 26]
Nna m na-agụrụ anyị Baịbụl kwa ụtụtụ Sunday
[Foto dị na peeji nke 27]
Ụbọchị agbamakwụkwọ anyị n’afọ 1946
[Foto dị na peeji nke 29]
Mụ na Oľga obere oge tupu ya anwụọ