Olee Mgbe Mmadụ Nwere Ike Ime Ihe Ike Iji Chebe Onwe Ya?
Echiche Baịbụl
Olee Mgbe Mmadụ Nwere Ike Ime Ihe Ike Iji Chebe Onwe Ya?
KA E were ya na otu mkpọtụ kpọtere gị na mberede n’etiti abalị. Gị anụ ụda ụkwụ. Mmadụ awabatala n’ụlọ gị. Ka obi na-akụ gị kpum kpum, ụjọ ana-atụkwa gị, ị nọ na-eche ihe ị ga-eme.
Ihe a nwere ike ime onye ọ bụla. Mpụ—ọbụna ụdị a na-eme ihe ike na ya—abụghịzi ihe na-eme naanị ná mba ụfọdụ ma ọ bụ n’obodo ndị mepere emepe. N’ihi ụjọ nke a kpatarala, ọtụtụ mmadụ na-agbalị ichebe onwe ha site n’ịzụrụ ngwá ọgụ ma ọ bụ ịmụ otú e si alụ ọgụ ụkwụ na aka. Ụfọdụ gọọmenti etiela iwu ndị nyere ụmụ amaala ha ikike inwe ngwá ọgụ ndị nwere ike igbu mmadụ, bụ́ ndị ha ga-eji na-echebe onwe ha. Ma, gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ya? Ọ̀ dị mgbe mmadụ nwere ike ime ihe ike iji chebe onwe ya ma ọ bụ ezinụlọ ya?
Chineke Kpọrọ Ime Ihe Ike Asị
Baịbụl katọrọ ihe ike na ndị na-eme ya. Ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru banyere Jehova Chineke, sị: “Mkpụrụ obi ya kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.” (Abụ Ọma 11:5) Chineke mara mba dị iche iche ikpe n’oge ochie, gụnyere ndị ya, n’ihi ihe ike ha na-eme na ọbara ha na-akwafu. (Joel 3:19; Maịka 6:12; Nehọm 3:1) Ọbụna igbu mmadụ n’amaghị ama n’ihi akpacharaghị anya bụ mpụ n’Iwu e nyere ụmụ Izrel.—Diuterọnọmi 22:8.
Baịbụl na-agba ndị mmadụ ume ka ha ghara ime ihe ọ bụla nwere ike ịkpata ọgụ site n’ịdị na-eme udo kwa ụbọchị. Ihe na-akpatakarị ọgụ bụ mmadụ abụọ iji iwe agwa ibe ha okwu. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na nkụ adịghị, ọkụ na-anyụ, ọ bụrụkwa na e nweghị onye nkwutọ, Ilu 26:20) Mmadụ ịnọ jụụ na-emekarị ka iwe belata ma na-egbochi ọgụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.”—Ndị Rom 12:18.
esemokwu na-akwụsị.” (Mgbe E Menyere Gị Egwu
Na ị bụ onye na-achọ udo apụtaghị na o nwetụghị mgbe a ga-emeso gị ihe ike. Kemgbe ụwa, a na-emeso ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Chineke ihe ike. (Jenesis 4:8; Job 1:14, 15, 17) Ọ bụrụ na onye o ji égbè ezu ohi abịa na nke mmadụ, gịnị ka onye ahụ kwesịrị ime? Jizọs kwuru, sị: “Emegwarala onye bụ́ ajọ mmadụ ihe o mere gị.” (Matiu 5:39) O kwukwara, sị: “Onye naara gị uwe elu gị, ajụla inye ya ọbụna uwe ime gị.” (Luk 6:29) Jizọs akwadoghị mmadụ iji ngwá ọgụ echebe ihe onwunwe ya. Ọ bụrụ na onye o ji égbè ezu ohi abịa na nke mmadụ, onye ahụ ọ bịara na nke ya mara ihe, ọ gaghị ajụ inye ya ihe ndị bara uru o nwere. O doro anya na ndụ dị nnọọ mkpa karịa ihe onwunwe!
Ya bụrụkwanụ na onye o ji égbè ezu ohi bịara na nke mmadụ bịara igbu onye ahụ egbu? Otu n’ime iwu ndị Chineke nyere Izrel oge ochie mere ka okwu a dokwuo anya. Ọ bụrụ na e jide onye ohi n’ehihie ma gbuo ya, ikpe igbu ọchụ ga-ama onye gburu ya. O nwere ike ịbụ na ihe kpatara ya bụ na a naghị ama onye zuru ohi ikpe ọnwụ, e nwekwara ike ịhụ onye ahụ ma nye ya ntaramahụhụ kwesịrị ya. Ma, ọ bụrụ na onye nwe ụlọ egbuo onye wabatara na nke ya n’abalị, e nwere ike ịgbaghara ya n’ihi na ọ ga-esiri ya ike ịhụ ihe onye ahụ na-eme na ịmata kpọmkwem ihe ọ chọrọ ime. Onye ahụ nwe ụlọ nwere ike ikpebi na ya na ezinụlọ ya nọ n’ihe ize ndụ, n’ihi ya kwa, mee ihe iji chebe ezinụlọ ya.—Ọpụpụ 22:2, 3.
Baịbụl si otú a gosi na mmadụ nwere ike ime ihe iji chebe onwe ya na ndị ezinụlọ ya ma e mesoo ha ihe ike. O nwere ike ịkụpụ onye chọrọ ịkụ ya ọkpọ aka, ijichi onye ahụ, ma ọ bụ ọbụna ịkụ onye ahụ ọkpọ iji kụgharịa ya anya ma ọ bụ iji mee ka ike gharazie ịdị ya imerụ ya ahụ́. Ihe o bu n’obi mee ihe ahụ o mere bụ ịkwụsị ihe ike ahụ. Ebe ọ dị otú ahụ, ọ bụrụ na e merụọ ome ihe ike ahụ ahụ́ ma ọ bụ gbuo ya n’ọnọdụ ahụ, ọ nwụrụ n’ọghọm, a maghị ụma gbuo ya.
Ụzọ Kasị Mma Mmadụ Ga-esi Chebe Onwe Ya
O doro anya na e nwere mgbe ọ na-agaghị adị njọ mmadụ ime ihe ike iji chebe onwe ya. Ọ bụghị ihe ọjọọ mmadụ ichebe onwe ya na ndị ọ hụrụ n’anya mgbe a na-achọ imerụ ha ahụ́ ma ọ bụ igbu ha. Ya bụrụ na ọ dịghị otú anyị ga-esi gbapụ, ọ dịghị iwu Baịbụl kwuru na anyị enweghị ike ime ihe ọ bụla iji chebe onwe anyị. Ma, ihe amamihe dị na ya ime bụ ime ihe niile anyị nwere ike ime iji zere ihe ọ bụla nwere ike ịkpata ime ihe ike.—Ilu 16:32.
Baịbụl gbara anyị ume ka anyị “chọọ udo, chụsookwa ya” n’ihe niile anyị na-eme ná ndụ. (1 Pita 3:11) Nke a bụ nnọọ ihe ga-enyere anyị aka ime ka anyị na ndị ọzọ dịrị n’udo.
Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?
▪ Olee ihe mere anyị kwesịrị iji zere ime ihe ike?—Abụ Ọma 11:5.
▪ Olee ihe amamihe dị na ya ime ma a bịa n’ichebe ihe onwunwe anyị?—Ilu 16:32; Luk 12:15.
▪ Olee ihe anyị kwesịrị ime ka esemokwu ghara ịpụta ma kpata mmerụ ahụ́?—Ndị Rom 12:18.
[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 13]
Baịbụl gosiri na mmadụ nwere ike ime ihe iji chebe onwe ya ma ọ bụ ezinụlọ ya mgbe a chọrọ imeso ha ihe ike