Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Nwere Ike Isi Nwee Obi Ụtọ n’Ife Chineke Ofufe?

Olee Otú M Nwere Ike Isi Nwee Obi Ụtọ n’Ife Chineke Ofufe?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Olee Otú M Nwere Ike Isi Nwee Obi Ụtọ n’Ife Chineke Ofufe?

Josh, onye dị afọ 16, makpu n’àkwà ya. Mama ya guzo n’ọnụ ụzọ. Mama ya weliri olu kwuo, sị, “Joshua, tetanụ! Ị manụ na taa bụ ụbọchị ọmụmụ ihe anyị!” A na-azụ Josh ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ezinụlọ ha na-agachikwa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova anya. Ma, ruo oge ụfọdụ ugbu a, Josh anaghịzi achọ ịga ọmụmụ ihe.

O kpesaara mama ya sị, “Mama, ọ̀ bụdị iwu na m ga-aga?”

Mama ya asị, “Kwụsị ime mkpesa, jikere. Achọghị m ịga n’azụ oge taa!” Mama ya atụgharịa pụwa.

Mgbe mama ya nọ ebe ọ ka nwere ike ịnụ ihe Josh na-ekwu, Josh kwuru, sị, “Mama chere ka m gwa gị. Ihe a bụrụ okpukpe gị, ọ pụtaghị na ọ bụ nke m.” Ọ maara na mama ya nụrụ ihe o kwuru, n’ihi na ọ nụghịzi ụda ụkwụ mama ya. Ma, mama ya gbachiri ya nkịtị, gawakwa ebe ọ na-aga.

Josh tawaziri onwe ya ụta. O bughị n’obi ịkpasu mama ya iwe. Ma, ọ chọghị ịrịọ ya mgbaghara. Naanị ihe o nwere ike ime bụ . . .

Josh mara ọsụ, si n’àkwà ya bilie ma malite ijikere. Ọ gwaziri onwe ya okwu otú mama ya ga-anụ ya, sị: “M ga-emecha kpebiere onwe m ihe m ga-eme. Adịghị m ka ndị ọzọ na-abịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. O nwedịrị ike m chọghị ịbụ Onye Kraịst!”

Ò NWETỤLA mgbe ọ dị gị otú a ọ dị Josh? Ọ̀ na-adị gị mgbe ụfọdụ ka ịrụ ọrụ Ndị Kraịst ọ̀ na-atọ ndị ọzọ ụtọ, ebe ị na-arụ ya iji mezuo iwu? Dị ka ihe atụ:

▪ Ị̀ na-ele ịmụ Baịbụl anya otú i si ele ihe omume e nyere gị n’ụlọ akwụkwọ ka i mee n’ụlọ?

▪ Ọ̀ na-agwụ gị ike ije ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ?

▪ Ị̀ na-achọpụtakarị na nzukọ Ndị Kraịst na-agwụ gị ike?

Ọ bụrụ na o nwere nke ọ bụla n’ime ajụjụ ndị a ị zara ee, ike agwụla gị. Ọ dị naanị ihe ole na ole ị ga-eme ka ife Chineke malite ịtọ gị ụtọ. Ka anyị hụ ihe ndị ahụ ị ga-eme.

Ihe Ịma Aka nke 1: Ịmụ Baịbụl

Ihe mere o ji esi ike. O nwere ike ịbụ na i chere na “ịmụ ihe anaghị agara gị.” Ọ naghị ewe oge uche gị apụọ—ọ na-esiri gị ike ịnọ ọdụ otu ebe na-ege ntị! E wezụga nke ahụ, akwụkwọ ị na-agụ maka ụlọ akwụkwọ ó zubeghị?

Ihe mere i kwesịrị iji mee ya. Ọ bụghị naanị na e si n’ike mmụọ nsọ Chineke dee Baịbụl, kamakwa, “ọ bara uru iji ya zie ihe, na iji ya nyere ndị mmadụ aka, na iji ya gbazie ha ma gosi ha otú ha ga-esi bie ndụ.” (2 Timoti 3:16, Contemporary English Version) Ịmụ Baịbụl na ịtụgharị uche n’ihe ị na-agụ nwere ike ime ka ị mata ihe ndị ị na-amabughị. Buru nke a n’uche, a naghị agba aka ahụ nwata ezé. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụta otu egwuregwu nke ọma, ị ga-amarịrị iwu ndị na-achịkwa ya ma na-egwuchi egwuregwu ahụ anya. Ị chọọ ịgbasi ike, ị ga na-emega ahụ́. Ị chọọ ịmụ banyere Onye kere gị, ị ga-amụ Okwu Chineke.

Ihe ụfọdụ ndị ọgbọ gị kwuru. “Mgbe m banyere n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ọ bịara dị m mkpa ikpebi otú m ga-esi bie ndụ m. Ụmụaka ibe m na-eme ọtụtụ ihe ọjọọ, ọ dịkwa m mkpa ikpebi ihe ụfọdụ: ‘Ọ̀ bụ ihe ahụ ka m chọrọ ime? Ihe ndị mụrụ m na-akụziri m hà bụ eziokwu n’ezie?’ Abịara m hụ na ọ dị m mkpa ịchọpụta nke a n’onwe m.”—Tshedza.

“O nwebeghị mgbe m na-ekweghị na ihe m na-amụ bụ eziokwu, ma ọ dị m mkpa ịhụ na o doro m anya na ọ bụ ya. Emere m ka ọ bụrụ okpukpe nke m—kama ịbụ naanị okpukpe ezinụlọ anyị.”—Nelisa.

Ihe i nwere ike ime. Meere onwe gị atụmatụ otú ị ga na-esi amụ ihe. Ọ bụ gịnwa ga-ahọrọ isiokwu ndị ị ga-amụ banyere ha. Olee ebe ị ga-amalite? Ọ́ gaghị adị mma ma i jiri Baịbụl nyochaa ihe ndị i kweere, ikekwe jiri akwụkwọ dị ka Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? mee nke ahụ. *

Otú i nwere ike isi mee ya. Iji malitegodị, kanye akara n’isiokwu abụọ ma ọ bụ atọ ndị dabeere na Baịbụl bụ́ ndị dị n’okpuru ebe a bụ́ ndị ị ga-achọ ịmụ banyere ha—ma ọ bụkwanụ, ị chọọ, gị edepụta isiokwu ndị nke gị.

□ Chineke ọ̀ dị adị?

□ Olee otú m nwere ike isi jide n’aka na ọ bụ mmụọ nsọ Chineke gwara ndị dere Baịbụl ihe ndị ha dere?

□ Olee ihe mere m ga-eji kwere na e kere mmadụ eke kama ikwere na mmadụ si n’enwe pụta?

□ Gịnị bụ Alaeze Chineke, oleekwa otú m nwere ike isi gosi mmadụ na ọ dị adị?

□ Olee otú m nwere ike isi kọwaara mmadụ ihe m kweere banyere ihe na-eme mmadụ mgbe ọ nwụrụ?

□ Olee ihe mere obi kwesịrị iji sie m ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ?

□ Olee otú m nwere ike isi mata okpukpe nke bụ́ ezi okpukpe?

□ ․․․․․

Ihe Ịma Aka nke 2: Ịga Ozi Ọma

Ihe mere o ji esi ike. Ịgwa ndị mmadụ banyere Baịbụl—ma ọ bụ izute nwa akwụkwọ ibe gị mgbe ị nọ n’ozi ọma—nwere ike ịtụ gị ụjọ.

Ihe mere i kwesịrị iji mee ya. Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu, sị: “Mee ndị [mmadụ] ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) E nwekwara ihe ndị ọzọ mere i kwesịrị iji na-aga ozi ọma. Nchọpụta ndị e mere gosiri na n’ọtụtụ ebe, ihe ka ọtụtụ ná ndị na-eto eto kweere na Chineke nakwa na Baịbụl. N’agbanyeghị nke ahụ, otu ndị ahụ na-eto eto enweghị olileanya doro anya maka ọdịnihu. Ka ị na-amụ Baịbụl, ị mụtala ọtụtụ n’ime ihe ndị ahụ ndị ọgbọ gị na-achọ achọ, bụ́kwa ndị dị ha mkpa!

Ihe ụfọdụ ndị ọgbọ gị kwuru. “Mụ na enyi m kwadebere otú anyị ga-esi malite izi ndị mmadụ ozi ọma ha enwee ike ige anyị ntị, anyị mụtakwara ihe anyị ga-ekwu iji mee ka onye na-achọghị ige anyị ntị gee anyị ntị na otú e si eme nletaghachi. Ozugbo m malitere itinyekwu mgbalị n’ozi m, ọ tọwakwuru m ụtọ.”—Nelisa.

“Otu nwanna nwaanyị enyerela m nnọọ aka! O ji afọ isii tọọ m, ọ na-akpọkwa m aga ozi ọma, mgbe ụfọdụkwa, ọ na-azụnye m nri ụtụtụ. O gosiri m ebe ndị na-agba ume na Baịbụl bụ́ ndị nyeere m aka ịgbanwe otú m si ele ihe anya. Achọpụtara m na n’ihi ezi ihe nlereanya ya, m na-enwezi ike ikwu ihe ndị ga-adọta mmasị ndị mmadụ karịa. Ọ dịghị otú m ga-esi kwụghachi ya ụgwọ maka ihe o meere m!”—Shontay.

Ihe i nwere ike ime. Ya bụrụ na ndị mụrụ gị ekwe gị, chọta otu onye tọrọ gị n’ọgbakọ unu bụ́ onye gị na ya ga na-eso aga ozi ọma. (Ọrụ 16:1-3) Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụ ígwè ka a na-eji amụcha ígwè. Otú ahụ ka ihu mmadụ na-amụcha ihu mmadụ ibe ya.” (Ilu 27:17) Ọ dị ọtụtụ uru ị ga-erite ma ọ bụrụ na gị na ndị tọrọ gị bụ́ ndị nwerela ọtụtụ ahụmahụ ana-akpa. Alexis, bụ́ onye dị afọ iri na itoolu kwuru, sị: “N’ezie ahụ́ na-eru m ala mgbe mụ na ndị tọrọ m nọ.”

Otú i nwere ike isi mee ya. N’okpuru ebe a, detuo aha onye nọ n’ọgbakọ unu ma e wezụga ndị mụrụ gị bụ́ onye nwere ike inyere gị aka n’ozi.

□ ․․․․․

Ihe Ịma Aka nke 3: Ịga Ọmụmụ Ihe Ndị Kraịst

Ihe mere o ji esi ike. Mgbe ị nọsịrị ọdụ na klas malite n’ụtụtụ ruo ná mgbede, ige okwu sitere na Baịbụl ruo otu awa ma ọ bụ abụọ nwere ike iyi gị ka ọ̀ bụ ige ya ruo mgbe ebighị ebi.

Ihe mere i kwesịrị iji mee ya. Baịbụl gbara Ndị Kraịst ume, sị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị, dị ka ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.”—Ndị Hibru 10:24, 25.

Ihe ụfọdụ ndị ọgbọ gị kwuru. “Ị ga-akwadorịrị akwado maka ọmụmụ ihe. Mgbe ụfọdụ, ị ga-arụ ahụ́ gị ụka iji mee ya. Mgbe ị kwadoro akwado, ọmụmụ ihe ga-atọ gị ụtọ n’ihi na ị maara ihe a na-aga ịtụle, i nwedịrị ike itinye ọnụ.”—Elda.

“N’otu oge, achọpụtawara m na mgbe m zara ajụjụ n’ọmụmụ ihe, ọmụmụ ihe na-atọkwu m ụtọ.”—Jessica.

Ihe i nwere ike ime. Wepụta oge iji kwadoo tupu ị gawa ọmụmụ ihe, ya kwekwa gị omume, zaa ajụjụ. Nke a ga-enyere gị aka ile onwe gị anya na i so n’ihe a na-eme.

Dị ka ihe atụ: Olee nke ka ụtọ—ile egwuregwu na televishọn ka ọ̀ bụ iso na-eme egwuregwu ahụ n’ọgbọ egwuregwu? O doro anya na iso na-eme ihe na-eme obi ụtọ karịa ikiri ya ekiri. Ọ́ gaghị adị mma ka i lee ọmụmụ ihe Ndị Kraịst anya otú ahụ?

Otú i nwere ike isi mee ya. N’ohere e wepụtara n’okpuru ebe a, dee mgbe i nwere ike iwepụta naanị nkeji iri atọ iji kwadoo maka ọmụmụ ihe ọgbakọ.

□ ․․․․․

Ọtụtụ ndị na-eto eto ahụla na ihe Abụ Ọma 34:8 kwuru bụ eziokwu, bụ́ nke kwuru, sị: “Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.” Ọ̀ ga-atọ gị ụtọ naanị ịnụ na e nwere nri bụ e richaa a mịchaa aka? Ọ́ gaghị aka amasị gị ma i detụ ya ọnụ n’onwe gị? Ọ bụ otú ahụ ka ife Chineke dị. Nwalee ma hụ otú o si enye obi ụtọ iso na-eme ihe ndị metụtara ofufe Chineke. Baịbụl kwuru na onye na-abụghị naanị onye na-anụ anụ kama onye na-eme ya eme “ga-enwe obi ụtọ n’ime ya eme.”—Jems 1:25.

Ị gaa n’Ịntanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 19 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Olee ihe mere ihe ndị metụtara ofufe Chineke nwere ike iji na-eyi ndị na-eto eto ka ihe na-agwụ ike?

▪ N’ime akụkụ atọ nke ofufe Chineke a tụlere n’isiokwu a, olee nke ị ga-achọ ịrụ ọrụ na ya, oleekwa otú ị ga-esi mee ya?

[Foto dị na peeji nke 24 na 25]

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgbasi ike, ọ dị gị mkpa ịdị na na-emega ahụ́. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgbasi ike n’ofufe ị na-efe Chineke, ọ dị gị mkpa ịdị na-amụ Okwu Chineke