Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Kwesịrị Iji Ihe Oyiyi Efe Chineke?

È Kwesịrị Iji Ihe Oyiyi Efe Chineke?

Echiche Baịbụl

È Kwesịrị Iji Ihe Oyiyi Efe Chineke?

“A kụziiri m na ihe oyiyi ga-eme ka m bịarukwuo Chineke nso.”—Mack.

“Ihe oyiyi okpukpe juru n’ụlọ anyị. Anyị chere na nke a masịrị Chineke.”—Herta.

“Anyị na-akpọrọ ihe oyiyi ụfọdụ isiala. Anyị echetụghị otú Chineke ga-esi lee nke a anya.”—Sandra.

OLEE otú i si lee ihe ndị ahụ e kwuru n’elu anya? Ọtụtụ ndị chere na ihe oyiyi okpukpe na-enyere ha aka ife Chineke. Nke a ọ̀ bụ eziokwu? Nke ka nke, olee otú Chineke si ele okwu ahụ anya? Ka anyị tụlee ihe Okwu ya e dere ede, bụ́ Baịbụl Nsọ, kwuru.

Otú Chineke Si Ele Ihe Oyiyi Okpukpe Anya

Ihe oyiyi okpukpe bụ ụdị ihe oyiyi ọ bụla a na-akwanyere ùgwù ma ọ bụ na-efe ofufe. Ọ gụnyere obe, ihe a kpụrụ akpụ, foto, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ yiri ihe ndị dị n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa. * A na-efekwa ọkọlọtọ efe.

Iji ihe oyiyi ndị dị otú ahụ efe ofufe malitere kemgbe ọtụtụ puku afọ gara aga. Ọ bụ ya mere na mgbe Chineke na-enye mba Izrel e kepụtara ọhụrụ Iwu Iri ahụ n’afọ 1513 T.O.A., o kwuru hoo haa otú o si ele ihe oyiyi okpukpe anya. O kwuru, sị: “Emerela onwe gị ihe oyiyi a pịrị apị ma ọ bụ ọdịdị nke yiri ihe ọ bụla dị n’eluigwe ma ọ bụ nke dị n’elu ụwa ma ọ bụ nke dị na mmiri n’okpuru ụwa. Akpọrọla ha isiala, ekwekwala ka a rata gị ife ha ofufe, n’ihi na mụ onwe m bụ́ Jehova Chineke gị bụ Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.”—Ọpụpụ 20:4, 5.

Ị̀ hụrụ ihe abụọ Chineke sịrị ha emela? Nke mbụ, ndị ya agaghị eme ihe oyiyi ha ga-eji na-efe ofufe, nke abụọ, ha agaghị ‘akpọrọ ha isiala’ ma ọ bụ fee ha ofufe. Gịnị mere Onye Okike anyị ji sị anyị emela ihe oyiyi? Otu ihe mere anyị na-ekwesịghị iji mee ihe oyiyi nke Chineke bụ na “ọ dịghị mmadụ hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla.” Jehova enweghị ụdị ahụ́ ụmụ mmadụ nwere, kama nke ahụ, ọ bụ mmụọ ma biri n’ógbè ndị mmụọ. (Jọn 1:18; 4:24) Otu n’ime ihe ndị mere anyị na-agaghị eji mee ihe oyiyi nke ihe ọ bụla bụ na Chineke chọrọ naanị “ofufe a na-ekewaghị ekewa.” O kwuru, sị: “Agaghị m enye onye ọzọ nsọpụrụ m, agaghịkwa m enye ihe oyiyi a pịrị apị otuto m.” (Aịzaya 42:8) N’ihi nke a, ọ dịkwa njọ mmadụ ime ihe oyiyi ma sị na ọ na-enyere ya aka ife ofufe. Mgbe otu onye ndú Izrel aha ya bụ Erọn mere ya, ezigbo iwe were Jehova.—Ọpụpụ 32:4-10.

Ihe Mere Anyị Na-ekwesịghị Iji Kpọọrọ Ha Isiala?

Baịbụl kwuru banyere arụsị, sị: “Ha nwere ọnụ, ma ha apụghị ikwu okwu; ha nwere anya, ma ha apụghị ịhụ ụzọ; ha nwere ntị, ma ha apụghị ịnụ ihe.” O nyeziri anyị ịdọ aka ná ntị a na-emetụ n’ahụ́: “Ndị na-eme ha ga-adị nnọọ ka ha”—ha ga-akwụsị ịdị ndụ!—Abụ Ọma 115:4-8.

Ife arụsị bụkwa ikpe na-ezighị ezi. Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú obi ga-adị m ma m nye nwa m onyinye dị oké ọnụ ahịa, ya anara m ya gawara onwe ya gaa kelewe onye ọ na-amatụghị onye ọ bụ ma ọ bụ ihe na-adịghị ndụ?’ Nke a ga-enyere gị aka ịghọta otú obi na-adị Onye Okike anyị na Onye na-enye anyị ndụ mgbe ndị ọzọ—gụnyere arụsị na-adịghị ndụ—na-anara otuto na ofufe e kwesịrị inye ya.—Mkpughe 4:11.

Cheekwa echiche otú o si bụrụ ihe ihere mmadụ—bụ́ onye Chineke mere n’onyinyo ya—ife ihe na-adịghị ndụ ofufe! (Jenesis 1:27) Aịzaya onye amụma dere banyere ndị mere nnọọ otú ahụ, sị: “Ihe aka mmadụ rụrụ ka ha na-akpọrọ isiala, bụ́ ihe mkpịsị aka mmadụ mere. A na-ewetu mmadụ ala, wee mee ka mmadụ dị ala, [Jehova Chineke apụghịkwa] ịgbaghara ha.”—Aịzaya 2:8, 9.

Ihe mere ofufe ụgha jidị ewe Chineke iwe karịsịa bụ na, n’ikwu eziokwu, ọ bụ ife ndị mmụọ ọjọọ—bụ́ ndị iro Chineke. Mgbe ụmụ Izrel hapụrụ Jehova ma malite ife arụsị, Diuterọnọmi 32:17 sịrị na ha “na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ àjà, ọ bụghị Chineke.”

Ndị na-eso ụzọ Jizọs nke oge gboo hà fere ihe oyiyi ofufe ma ọ bụ jiri ha mere ihe na-enyere ha aka n’ofufe? Mba! Onyeozi Jizọs bụ́ Jọn dere, sị: “Ụmụntakịrị, kpacharanụ anya ka unu ghara ikpere arụsị.” (1 Jọn 5:21) Akwụkwọ bụ́ Early Church History to the Death of Constantine kwuru, sị: “O nweghị ihe o yiri ka ọ̀ gaara aka asọ ndị na-eso ụzọ oge gboo oyi karịa ife ihe oyiyi ofufe.”

Ụdị Ofufe nke Bụ́ Ezigbo Ya

Jizọs kwuru, sị: “Ndị na-efe ezi ofufe ga-efe Nna m n’ime mmụọ na n’eziokwu, n’ihi na, n’ezie, Nna m na-achọ ka ndị dị otú ahụ fee ya ofufe.” (Jọn 4:23) Ee, Chineke chọrọ ka anyị mara ya dị ka onye dị adị—mara ihe ndị na-amasị ya, ihe ndị ọ kpọrọ asị, ụkpụrụ ya, na ihe o zubere maka anyị. (Jọn 17:3) N’eziokwu, ọ bụ ya mere o ji mee ka e dee Baịbụl. (2 Timoti 3:16) Ọzọkwa, ebe ọ bụ na Chineke ‘anọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ,’ anyị nwere ike ikpegara ya ekpere n’oge ọ bụla, n’ebe ọ bụla, n’ejighịkwa ihe oyiyi okpukpe.—Ọrụ 17:27.

Sandra, bụ́ onye e kwuru ihe o kwuru ná mmalite, kwuru, sị: “Mgbe m bara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova, o nweghị ihe oyiyi m hụrụ e ji efe ofufe ebe ahụ. Ndịàmà ji Baịbụl gosi m àgwà Chineke na ihe ndị ọ chọrọ n’aka ụmụ mmadụ. N’ihi ya, amụtara m otú m ga-esi kpee ekpere Chineke anụ ya. Ugbu a, echere m na amatala m Onye Okike nke ọma, ghọọkwa enyi ya.” Ee, Sandra hụrụ otú eziokwu Baịbụl si eme ka mmadụ nwee ume, na-atọpụkwa mmadụ n’agbụ. (Jọn 8:32) O nwekwara ike ịdị gị otú ahụ.

[Ihe odide ala ala peeji]

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Gịnị mere anyị kwesịrị iji zere iji ụdị ihe oyiyi ọ bụla efe ofufe?—Abụ Ọma 115:4-8; 1 Jọn 5:21.

▪ Olee otú e kwesịrị isi fee ezi Chineke ofufe?—Jọn 4:24.

▪ Olee otú i nwere ike isi mụta eziokwu banyere Chineke, oleekwa uru ọ ga-abara gị?—Jọn 8:32; 17:3.