Olee Ihe M Ga-eme Banyere Nchegbu Ndị M Na-enwe n’Ụlọ Akwụkwọ?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Olee Ihe M Ga-eme Banyere Nchegbu Ndị M Na-enwe n’Ụlọ Akwụkwọ?
“Nchegbu ndị ị na-enwe n’ụlọ akwụkwọ anaghị ebelata mgbe i tolitetụkwuru—naanị ihe na-emenụ bụ na ihe ndị na-akpata ha na-agbanwe.”—James, New Zealand. *
“Nchegbu ndị m nwere n’ụlọ akwụkwọ buru nnọọ ibu nke na ọ na-adị m ka m tiwe mkpu ákwá.”—Sharon, United States.
Ọ̀ NA-ADỊ gị ka ndị mụrụ gị anatụghị aghọta otú ihe na-esiruru gị ike n’ụlọ akwụkwọ? Ee, ha nwere ike ịgwa gị na o nweghị ụgwọ ụlọ ị na-akwụ, nakwa na o nweghị ezinụlọ ị na-akpa afọ ha nke i ji enwe onye ị na-arụrụ ọrụ ị chọrọ ime ihe dị ya mma. Ma, o nwere ike ịbụ na ị na-eche na nsogbu ị na-enwe n’ụlọ akwụkwọ ha ka nke nne na nna gị—ma ọ bụdị karịa ya.
Naanị ịga akwụkwọ na ịlọta alọta nwere ike ịdị na-agwụ gị ike. Tara, bụ́ onye bi na United States, kwuru, sị: “A na-alụkarị ọgụ n’ime bọs ụlọ akwụkwọ anyị. Ọkwọ ụgbọala anyị ga-akwụsị ma gwa onye ọ bụla ka ọ rịtuo. Nke a ga-egbukwa anyị ọkara awa ma ọ bụ karịa.”
Nchegbu ọ̀ na-akwụsị ozugbo ị rutere n’ụlọ akwụkwọ? N’ebeekwanụ! Ikekwe, ọnọdụ gị yiri nke ndị kwuru okwu ndị dị n’okpuru ebe a.
▪ Nchegbu ndị nkụzi na-akpata.
“Ndị nkụzi m chọrọ ka m bụrụ ọkaibe ma gbaa onye mbụ ma o kwe mee, ma ime ihe a ha chọrọ n’aka m anaghị adịrị m mfe.”—Sandra, Fiji.
“Ndị nkụzi na-agbalịsi ike ịhụ na ụmụ akwụkwọ na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, karịsịa ma ọ bụrụ na nwa akwụkwọ ahụ matụ ihe. Ndị nkụzi anyị na-akwanye anyị ọkụ n’ahụ́ ime nke ọma n’ụlọ akwụkwọ.”—April, United States.
“Ọ bụrụgodị na o nwere ezigbo ihe ndị ị chọrọ iji ndụ gị mee, ụfọdụ ndị nkụzi ga-eme ka i yie onye iberibe ma ọ bụrụ na ihe ị na-achụ abụghị agụmakwụkwọ ahụ ha chere na i kwesịrị ịchụ.”—Naomi, United States.
Olee otú nchegbu ndị nkụzi na-akpata si emetụta gị?
․․․․․
▪ Nchegbu ndị ọgbọ na-akpata.
“Ụmụaka nọ na kọleji na-aka enwe ohere ime ihe sọrọ ha, ha na-akakwa enupụ isi. Ọ bụrụ na i soghị ha na-eme otú ha na-eme, ha ga-asị na ị maghị ebe a nọ.”—Kevin, United States.
“Kwa ụbọchị, a na-anwa m ịṅụ mmanya na inwe mmekọahụ. Mgbe ụfọdụ, ọ na-esi ike ịjụ isonyere ha.”—Aaron, New Zealand.
“Ugbu a m dị afọ iri na abụọ, ihe kasị echegbu m bụ nsogbu a na-enye m inwe enyi nwoke mụ na ya ga na-eso akpapụ. Ihe onye ọ bụla nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị na-ajụ m bụ, ‘Olee nnọọ otú ị ga-esi nọrọ n’enweghị enyi nwoke?’”—Alexandria, United States.
“Ndị mmadụ nọ na-enye m nsogbu ka m meta otu nwatakịrị nwoke enyi ma soro ya na-akpapụ. Mgbe m jụrụ ime otú ahụ, ha sịrị na mụ na nwaanyị ibe m na-edina. Ihe a na-emekwanụ mgbe m ka dị naanị afọ iri!”—Christa, Australia.
Olee otú nchegbu ndị ọgbọ na-akpata si emetụta gị?
․․․․․
▪ Nchegbu ị na-enwe n’ihi otú ụmụ klas unu ga-esi ele ihe okpukpe gị na-akụzi anya.
“Ọ na-esiri gị ike ịgwa ụmụ klas gị ihe okpukpe gị na-akụzi n’ihi na ị maghị otú ha ga-esizi na-ele gị anya. Ị ga na-echegbu onwe gị na ha ga na-ele gị anya dị ka onye gbapụrụ iche.”—Carol, Hawaii.
“N’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ụmụaka na-aṅụ ọgwụ ọjọọ na mmanya na-aba n’anya, na-enwekwa mmekọahụ. Nke a na-akpata nnukwu nchegbu n’ihi na ị gaghị achọ ka ụmụaka ibe gị chịwa gị ọchị n’ihi na ị na-erubere ụkpụrụ Baịbụl isi.”—Susan, United States.
Olee otú nchegbu ị na-enwe n’ihi otú e nwere ike isi na-ele ihe okpukpe gị na-akụzi anya si emetụta gị?
․․․․․
▪ Ihe ndị ọzọ na-akpata nchegbu. Kanye akara na nke kasị emetụta gị—ma ọ bụkwanụ gị edee nke ọ bụ n’onwe gị.
□ Oge ule ruwe
□ Ihe omume ụlọ akwụkwọ a ga-eme n’ụlọ
□ Otú nne gị na nna gị si atụ anya ihe karịrị akarị n’aka gị
□ Imezu ihe ndị karịrị akarị ị na-atụ onwe gị anya n’aka
□ Ndị ọchọ okwu ma ọ bụ ndị chọrọ idina gị n’ike
□ Ihe ọzọ ․․․․․
Ihe Ise Ga-ebelata Nchegbu Gị
Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị otú ị ga-esi gachaa akwụkwọ n’enwetụghị nnọọ ihe ga-echegbu gị. N’eziokwu, oké nchegbu nwere ike ime ka mmadụ chee na a na-emegbu ya emegbu. Eze Sọlọmọn maara ihe dere, sị: “Mmegbu pụrụ ime ka onye maara ihe na-eme ara ara.” (Ekliziastis 7:7) Ma, i kwesịghị ikwe ka nchegbu mee ka i mewe ara ara. Isi ihe dị na ya bụ ịmụta otú e si emeri nchegbu.
Imeri nchegbu dị ka ibuli ihe dị arọ. Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ibuli ihe dị arọ n’emerụghị onwe ya ahụ́, ọ ga-akwadorịrị akwado. Ọ ga-ebuli ihe ahụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ gaghịkwa ebu nke ọ na-agaghị ebuli. Ọ bụrụ na o mee ihe ndị a, ọ ga-ebuli ihe ahụ ma ghara imerụ onwe ya ahụ́. Ma, ọ bụrụ na o meghị ihe ndị a, o nwere ike imerụ onwe ya ahụ́.
N’otu aka ahụ, i nwere ike imeri nchegbu ndị ị na-enwe ma rụzuo ihe ndị dị gị mkpa ịrụzu n’emerụghị onwe gị ahụ́. Olee otú ị ga-esi mee ya? Mee ihe ndị na-esonụ:
1. Chọpụta ihe ndị na-akpatara gị nchegbu. Otu ilu amamihe dị na ya kwuru, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.” (Ilu 22:3) Ma, ị gaghị ezonahụ oké nchegbu ma ọ bụrụ na i bughị ụzọ mata ihe nwere ike ịkpatara gị ya. Ngwa, leghachi anya n’ihe ndị ahụ i deturu. Olee ihe kasị akpatara gị nchegbu?
2. Mee nchọnchọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ihe na-echegbu gị bụ ihe omume tara akpụ a ga-eme n’ụlọ, mee nchọnchọ iji mata aro ndị a tụrụ n’isiokwu bụ́, “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị—Olee Otú M Pụrụ Isi Nweta Oge Iji Mee Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ E Nyere M Ime n’Ụlọ?” nke gbara na Teta! nke February 8, 2004. Ọ bụrụ na a na-anwa gị iso otu nwa klas unu nwee mmekọahụ, ị ga-ahụ ndụmọdụ ndị bara uru n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị—Gịnị Ka M Ga-eme Ma Mmadụ Gwa M Ka Mụ na Ya Mewe Enyi Maka Mmekọahụ?’” nke gbara na Teta! nke April–June 2007.
3. Buru ụzọ kpebie ihe ị ga-ekwu. Ọ bụrụ na ihe na-echegbu gị bụ ihe ụmụ klas unu ga-ekwu ma ha mata ihe okpukpe gị na-akụzi, echerela ruo mgbe nsogbu pụtara tupu i chewe ihe ị ga-ekwu ma ọ bụ ihe ị ga-eme. (Ilu 29:25) Kelsey, bụ́ onye dị afọ iri na asatọ kwuru, sị: “Ihe nyeere m aka bụ na akwadoro m akwado tupu nsogbu adapụta. Eburula m ụzọ kpebie otú m ga-esi kọwaa ihe ndị m kweere.” Aaron, bụ́ onye dị afọ iri na asatọ, nke bi na Belgium, mekwara otu ihe ahụ. Ọ sịrị: “Eburu m ụzọ chee banyere ajụjụ ndị ha ga-ajụ m, kwadozie ihe m ga-aza ma ha jụọ ha. A sị na emeghị m otú ahụ, o nwetụghị ihe m gaara ekwu banyere ihe ndị m kweere.”
4. Agbarala ya ọsọ. Ọtụtụ nsogbu agaghị akwụsị ma i leghara ha anya. Kama nke ahụ, ha na-akakarị njọ ma kpatakwuoro gị nchegbu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ime ka a mara gị dị ka Onyeàmà ozugbo o kwere mee nwere nnọọ ike ichebe gị. Marchet, bụ́ onye dị afọ iri abụọ ugbu a, kwuru, sị: “Ozugbo anyị gafere na klas ọhụrụ, ana m amalite mkparịta ụka ụfọdụ m maara na ha ga-enye m ohere ịkọwa ụkpụrụ ndị m na-agbaso, bụ́ ndị dabeere na Baịbụl. Achọpụtara m na ka m na-egbukwu oge ime ka a mata na m bụ Onyeàmà, otú ahụ ka ọ na-esikwuru m ike ime ya. Mgbe m mere ka a mata ihe ndị m kweere ma gbalịa ibi ndụ kwekọrọ na ha n’afọ ahụ niile, o nyeere m aka.”
5. Rịọ maka enyemaka. Ọbụna onye na-ebuli ihe dị ezigbo arọ nwere ndị nke ọ na-agaghị ebuli. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị gị. Ma, ọ dịghị gị mkpa ibuwe ibu ahụ naanị gị. (Ndị Galeshia 6:2) Ọ́ gaghị adị mma ma ị kọọrọ ndị mụrụ gị ma ọ bụ Ndị Kraịst ọzọ maara nke a na-akọ? Gosi ha ihe ndị i dere ná mmalite nke isiokwu a. Gị na ha kwurịta otú ha nwere ike isi nyere gị aka ịnagide ụfọdụ n’ime nchegbu ndị a. Liz, bụ́ onye bi na Ireland, gwara papa ya na ụjọ ji ya na a ga-achị ya ọchị maka okpukpe ya. Liz sịrị: “Kwa ụbọchị, papa m na-ekpere m ekpere tupu ya akwọga m n’ụlọ akwụkwọ. Nke a na-emekarị ka obi ruo m ala.”
È Nwere Ezigbo Nchegbu?
O nwere ike isiri gị ike ikweta, ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dị mma na ị na-enwe nchegbu. N’ihi gịnị? O nwere ike ịbụ ihe na-egosi na ị dị uchu, nakwa na akọnuche gị ka na-arụsi ọrụ ike. Lee otú Baịbụl si kọwaa onye o yiri ka ò nweghị ihe na-echegbu ya ma ọlị: “Ruo ole mgbe ka ị ga-edina n’ebe ahụ n’enweghị ihe ị na-eme? Olee mgbe ị ga-ebili ma kwụsị ihi ụra? Hitụ ụra. Rotụ ụra. Kụkụkọta aka gị na ụkwụ gị. Na mberede, ihe niile ga-efunahụ gị, ka à ga-asị na ọ bụ ndị oji egbe ezu bịara bukọrọ ha.”—Ilu 6:9-11, Contemporary English Version.
Heidi, bụ́ onye dị afọ iri na isii, kọwara ya nnọọ nke ọma. O kwuru, sị, “Ụlọ akwụkwọ nwere ike iyi ebe jọgburu onwe ya ná njọ, ma nsogbu ndị ị na-enwe n’ebe ahụ bụkwa otu nsogbu ndị ị ga na-enwe n’ebe ọrụ.” N’eziokwu, imeri nchegbu adịghị mfe, ma ọ bụrụ na i mee ihe ndị i kwesịrị ime banyere ya, ọ gaghị egbu gị. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ ga-eme ka ị gbasikwuo ike.
Ị gaa n’Ịntanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype
[Ihe odide ala ala peeji]
^ par. 3 A gbanwere aha ụfọdụ ndị dị n’isiokwu a agbanwe.
IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE
▪ Olee ihe ndị nwere ike igosi na ị na-echegbu onwe gị?
▪ Olee ihe mere ịchọwa imetecha ihe niile ga-eji nnọọ kpatakwuoro gị nchegbu?
▪ Olee ndị i nwere ike ịkọsara ma ọ bụrụ na nchegbu gị akarịwala gị?
[Foto dị na peeji nke 22]
Imeri nchegbu dị ka ibuli ihe dị arọ—ọ ga-eme ka ị gbasie ike ma i bulie ya nke ọma