Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

I Nwere Ike Ime Ka Ụbụrụ Gị Na-echetakwu Ihe!

I Nwere Ike Ime Ka Ụbụrụ Gị Na-echetakwu Ihe!

I Nwere Ike Ime Ka Ụbụrụ Gị Na-echetakwu Ihe!

“Icheta ihe na-eme ka ndụ anyị ka mma. Ma ọ́ bụghị ya, ụbọchị ọ bụla ga-adị anyị ka ànyị malitere ụwa n’isi, nke pụtara na anyị agaghịdị na-ama onye anyị bụ n’ụtụtụ ọ bụla anyị tetara ụra. Ihe mere n’ụbọchị nke ọ bụla ga-adị ka ò nweghị ihe jikọrọ ya na ihe mere n’ụbọchị nke gara aga; anyị agaghịkwa amụta ihe site n’ihe ndị mere n’oge gara aga ma ọ bụ tụọ anya ihe ga-eme n’ọdịnihu.”—“MYSTERIES OF THE MIND.”

Ọ NA-ABỤ ọnwa ole na ole gachaa, ụmụ nnụnụ ụfọdụ aka na-echeta ebe ha kwakọbara nri ha ga-eri n’oge oyi, ọsa ana-echetakwa ebe o zoro mkpụrụ akwụ ọ ga-ata, ma anyị nwere ike chefuo ebe anyị debere mkpịsị ugodi anyị ji gbachie ụzọ otu awa gara aga. Gịnị kpatara ya? Ọtụtụ n’ime anyị na-ekwu na ha na-echezọkarị ihe. Ma, ọ bụ ezie na ụbụrụ mmadụ ezughị okè, o nwere nnọọ ike ịmụta ihe na icheta ihe. Ka ụbụrụ anyị nwee ike ịmụta ihe na icheta ihe, anyị kwesịrị iji ya na-arụ ọrụ mgbe niile.

Ọ Ga-emeli Ọtụtụ Ihe

Ụbụrụ mmadụ dị ihe dị ka otu kilogram na ọkara n’arọ, ọ fọkwara obere ka ọ ha ka grep, ma ụmụ obere akwara ndị dị n’ime ya ruru otu narị ijeri, ha niile na-arụkọkwa ọrụ ọnụ. Otu akwara nwere ike inwe ihe jikọrọ ya na otu narị puku akwara ndị ọzọ. Otú akwara ndị a si arụkọ ọrụ na-eme ka ụbụrụ nwee ike ịghọta ọtụtụ ihe ma chekwaa ha. Ma ebe nsogbu dị bụ ma mmadụ ọ̀ ga-enwekwa ike icheta ihe ndị ahụ mgbe ọ chọrọ ha. Ụfọdụ ndị na-echeta ihe ngwa ngwa, ọbụna ndị na-agụghị akwụkwọ ma ọ bụ ndị gụtụrụ obere.

Dị ka ihe atụ, n’Ọdịda Anyanwụ Africa, ndị na-agụghị akwụkwọ, bụ́ ndị na-akọ banyere ihe ndị mere n’obodo n’oge gara aga, nwere ike icheta aha ndị obodo ha biri ndụ ọtụtụ afọ gara aga. Ọ bụ ndị a nyeere onye America na-ede uri bụ́ Alex Haley, bụ́ onye akwụkwọ ya bụ́ Roots nwetara ihe nrite Pulitzer, aka ịchọpụta agbụrụ o si na ya na Gambia site n’ịkpọrọ ya aha ndị ezinụlọ ya ruo ọgbọ isii gara aga. Haley sịrị: “Ana m ekele ndị Africa a na-akọ ihe ndị mere ọtụtụ afọ gara aga. Ihe a na-ekwu n’Africa nke bụ́ na ọ bụrụ na otu n’ime ha anwụọ, ọ na-adị ka ebe otu ọ́bá akwụkwọ gbara ọkụ, bụ eziokwu.”

Tụleekwa ihe atụ nke otu onye Ịtali a ma ama n’iduzi ukwe nke aha ya bụ Arturo Toscanini, bụ́ onye a chọpụtara na ọ bụ ọkà n’iduzi ukwe mgbe ọ dị afọ iri na itoolu, mgbe a kpọrọ ya ka ọ bịa duzie ukwe onye ọzọ gaara eduzi. N’agbanyeghị na anya na-enye ya nsogbu, o duziri ndị kwere ukwe ma meekwa ihe nkiri a na-akpọ Aida n’eleghị anya n’akwụkwọ!

Ụdị ihe a nwere ike ịtụ anyị n’anya. Ma, ọtụtụ mmadụ nwere ike icheta ihe karịa ka ha chere. Ị̀ ga-achọ ka ụbụrụ gị na-echetakwu ihe?

Otú Ị Ga-esi Mee Ka Ụbụrụ Gị Na-echetakwu Ihe

E nwere ihe atọ ụbụrụ mmadụ na-eme: ịghọta ihe, ichekwa ya, na icheta ya. Ụbụrụ gị na-ebu ụzọ amata ihe ma ghọta ya. Ọ na-echekwazi ihe ahụ ka i nwee ike icheta ya n’ọdịnihu. Mmadụ na-echefu ihe mgbe ụbụrụ na-emeghị otu n’ime ihe atọ ndị a.

Ụbụrụ nwere akụkụ dị iche iche. Otu akụkụ na-echeta ihe imi nụrụ ísìsì ya, ihe anya hụrụ, ihe ire nụrụ ụtọ ya, na ihe ahụ́ metụrụ. Akụkụ ọzọ na-echeta ihe ruo ogologo oge. Akụkụ ọzọ ana-echetakwa ihe ole na ole merenụ ma chefuo ha ka obere oge gasịrị. Ọ bụ ya na-eme ka anyị nwee ike ịgbakọta ọnụ ọgụgụ n’isi, icheta nọmba telefon anyị chọrọ ịkpọ ruo mgbe anyị kpọchara ya, na icheta ihe ndị mbụ ahịrịokwu anyị na-agụ ma ọ bụ na-egere kwuru mgbe anyị nọ n’akụkụ ikpeazụ nke ahịrịokwu ahụ. Ma o doro anya na ihe ndị na-adị n’akụkụ ụbụrụ nke na-echeta ihe ruo obere oge anaghị adịte aka.

Ọ bụrụ na o nwere ihe ị chọrọ ịna-echeta mgbe niile, ọ ga-anọrịrị n’akụkụ ụbụrụ nke na-echeta ihe ruo ogologo oge. Olee otú ị ga-esi tinye ya ebe ahụ? Ihe ndị na-esonụ ga-enyere gị aka.

Mmasị Nwee mmasị n’ihe ahụ ị chọrọ icheta, ma na-agwa onwe gị ihe mere i ji mụta ya. O nwee ihe i tinyere obi gị na ya, ị ga na-echeta ihe ahụ ngwa ngwa. Nke a na-enyere ndị na-amụ Baịbụl ezigbo aka. Ọ bụrụ na ihe ha bu n’obi na-agụ Baịbụl bụ iji bịarukwuo Chineke nso nakwa iji kụziere ya ndị ọzọ, ọ ga-eme ka ha na-echetakwu nnọọ ihe ha na-agụ.—Ilu 7:3; 2 Timoti 3:16.

Ige ntị Akwụkwọ bụ́ Mysteries of the Mind kwuru, sị: “Ihe mere ọtụtụ ndị ji ‘echefukarị ihe’ bụ na ha anaghị ege ntị.” Gịnị ga-enyere gị aka ige ntị? Nwee mmasị n’ihe a na-ekwu, detuokwa ihe ụfọdụ edetuo ma o kwe omume. Idetu ihe edetu ga-eme ka uche gị dịrị n’ihe a na-ekwu, meekwa ka i nwee ike ịtụle ihe i dere mgbe e mechara.

Nghọta Ilu 4:7 sịrị: “Were ihe niile ị na-enweta nweta nghọta.” Ọ bụrụ na ị ghọtaghị ihe a kụziri ma ọ bụ ihe e kwuru, ị gaghị echetacha ya, ma ọ bụrụdị na ị ga-echeta ya echeta. Nghọta ga-eme ka ị hụ otú otu ihe e kwuru si gbasa ihe ndị ọzọ e kwukwara, ma mezie ka ha doo gị anya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye na-amụ otú e si arụzi ụgbọala aghọta otú njin ụgbọala si arụ ọrụ, ọ ga-echeta ihe niile banyere njin ahụ nke ọma.

Nhazi Jikọta ihe ndị yiri ibe ha ọnụ. Dị ka ihe atụ, ọ ga-adịrị gị mfe icheta ihe ndị e ji esi nri ma i jikọta ha ọnụ—ụdị anụ niile ị chọrọ ịzụ, ụdị akwụkwọ nri niile ị chọrọ ịzụ, ụdị mkpụrụ osisi niile ị chọrọ ịzụ, na ihe ndị ọzọ. Ọzọkwa, kebie ihe ndị ị nụrụ obere obere ka ọ ghara ịkarị ụzọ ise ma ọ bụ ụzọ asaa otú ọ ga-ekwe gị ncheta. Ọ na-akacha mma ikewa nọmba telefon ụzọ abụọ otú ọ ga-adị mfe ncheta. Ihe ọzọ ga-enyere gị aka bụ idetu ihe ndị ị chọrọ icheta n’usoro a b, ch.

Ịgụghachi ma ọ bụ ikwupụta ya Ikwupụta ihe ị chọrọ icheta ugboro ugboro (dị ka okwu ma ọ bụ ahịrịokwu nke asụsụ na-abụghị nke gị) ga-eme ka i nwee ike icheta ya. Olee otú o si eme ya? Nke mbụ, ikwupụta ya ekwupụta ga-eme ka uche gị dịrị na ya. Nke abụọ, onye nkụzi gị nwere ike ịgwa gị ozugbo ma ì kwutere ya ma ọ̀ bụ na i kwuteghị ya. Nke atọ, ige ma onwe gị ma ndị ọzọ ntị ga-eme ka akụkụ ụbụrụ gị ndị ọzọ na-arụ ọrụ.

Jiri uche gị hụ ya Jiri uche gị hụ ihe ahụ ị chọrọ icheta. O nwekwara ike ịbara gị uru ise ihe ahụ i ji uche gị hụ n’akwụkwọ. Dịkwa ka ọ na-adị mgbe i kwupụtara ihe ị chọrọ icheta ekwupụta, iji uche ahụ ihe ị chọrọ icheta ga-eme ka akụkụ niile nke ụbụrụ gị na-arụ ọrụ. Ka akụkụ niile nke ụbụrụ gị na-arụ ọrụ, otú ahụ ka ụbụrụ gị ga na-echetakwu ihe.

Ntụnyere Mgbe ị na-amụ ihe ọhụrụ, jiri ya tụnyere ihe ọzọ ị ma ama. Iji ihe ị na-amụ atụnyere ihe ndị dị adị n’ụbụrụ gị na-eme ka ọ dịrị gị mfe ịghọta ya na icheta ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ nwere isi ukwu ma ọ bụ ọkpụrụkpụ anya, i nwere ike iji ya na-echeta aha ya. Ọ bụrụ na i jiri ihe ị chọrọ icheta tụnyere otu ihe na-atọ ọchị, ọ ga-adịkwuru gị nnọọ mfe icheta ya. N’eziokwu, anyị kwesịrị ịna-eche banyere ndị anyị chọrọ icheta na ihe ndị anyị chọrọ icheta.

Akwụkwọ bụ́ Searching for Memory kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anyị anaghị echebara ihe ndị anyị na-eme echiche nke ọma ma buru ụzọ hazie ihe ndị anyị chọrọ ime, ma ọ bụkwanụ ghara ichebara ihe ndị na-eme gburugburu anyị na ihe ndị merela anyị ná ndụ echiche, anyị agaghị na-echetacha ebe ndị anyị garala na ihe ndị anyị merela ná ndụ.”

Mee ka ọ bamie gị n’ụbụrụ Kwe ka ihe ahụ ị mụtara bamie gị n’ụbụrụ. Otu ụzọ kasị mmasị isi mee nke a bụ ịmụgharị ihe ahụ a kụziiri gị, ikekwe site n’ịkọwara ya onye ọzọ. Ọ bụrụ na i nwere ahụmahụ dị ụtọ ma ọ bụ na ị gụtara ihe gbara gị ume na Baịbụl ma ọ bụ n’akwụkwọ e ji amụ Baịbụl, kọọrọ ya onye ọzọ. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ọ ga-abara unu abụọ uru—ọ ga-abami gị n’ụbụrụ, gbaakwa enyi gị ahụ ume. Ọ bụ ya mere e ji ekwu na ịgụ ihe ka egwú na-eme ka a ghara ichefu ya.

Iji Otu Ihe Echeta Ihe Ọzọ Na-enye Aka

Ndị ọkà okwu a ma ama na Gris nakwa na Rom oge gboo na-ekwu okwu ruo ogologo oge n’eleghị anya n’akwụkwọ. Gịnị nyeere ha aka? Ọ bụ iji otu ihe echeta ihe ọzọ. Iji otu ihe echeta ihe ọzọ na-enyere anyị aka ibute ihe n’isi anyị ruo ogologo oge ma nwee ike icheta ya mgbe ọ bụla anyị chọrọ ya.

Ndị ọkà okwu a ma ama na Gris oge gboo na-eji otu ihe echeta ebe ha debere ihe, ọ bụkwa onye Gris na-ede uri bụ́ Simonides nke Ceos bụ onye mbụ kọwara otú e si eji otu ihe echeta ihe ọzọ n’afọ 477 Tupu Oge Anyị. Ka mmadụ nwee ike iji otu ihe echeta ihe ọzọ, ọ ga-ahazi ihe ndị ahụ ọ chọrọ icheta ahazi, jiri uche ya na-ahụ ihe ndị ahụ, jirikwa ha na-atụnyere ihe ndị ọ na-ahụkarị n’ụzọ ma ọ bụ n’ime ụlọ ya. Ndị chọrọ isi otú a echeta ihe na-eji uche ha ahụ ihe ndị ha chọrọ icheta ma jiri ha tụnyere ihe ndị ha hụrụ n’ụzọ. Ha chọọ icheta ihe ndị ahụ, naanị ihe ha ga-eme bụ iji uche ha hụkwa ihe ndị ahụ ha hụrụ n’ụzọ.—Lee igbe bụ́  “Jiri Uche Gị Hụ Ihe Ndị Ga-echetara Gị Ihe.”

Ná nnyocha a na-eji Ndị Kasị Echeta Ihe n’Ụwa Niile eme kwa afọ, a chọpụtara na ihe mere ha ji echeta ihe karịa ndị ọzọ abụghị n’ihi na ha maara nnọọ ihe karịa ibe ha. Ọtụtụ n’ime ha nọdị n’agbata afọ iri anọ na afọ iri ise. Gịnị na-enyere ha aka? Ọtụtụ n’ime ha kwuru na ihe na-enyere ha aka bụ na ha na-eji otu ihe echeta ihe ọzọ.

Ò nwere okwu ndị ị chọrọ icheta? Otu ụzọ magburu onwe ya isi cheta ha bụ inye ha aha mkpirisi, ya bụ, ijikọta mkpụrụ akwụkwọ ndị mbụ nke okwu ndị ahụ ọnụ ma jiri ya mee otu mkpụrụ okwu. Ọtụtụ ndị North America na-eji aha mkpirisi Bekee bụ́ “HOMES” echeta aha Nnukwu Ọdọ Mmiri ise e nwere n’ebe ahụ, ha bụ, Huron, Ontario, Michigan, Erie, na Superior. Ụzọ ọzọ e si echeta ihe ya na nke a yiri bụ iji mkpụrụ akwụkwọ echeta ihe, ndị Hibru oge ochie jikwa ya cheta ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, n’ọtụtụ abụ ọma, e ji usoro e si agụ a, b, ch ndị Hibru malite amaokwu nke ọ bụla. (Lee Abụ Ọma 25, 34, 37, 111, 112, na 119.) Otú a mara mma e si echeta ihe nyeere ndị na-agụ abụ aka icheta amaokwu niile dị n’Abụ Ọma 119, bụ́ nke dị otu narị na iri asaa na isii!

N’eziokwu, i nwere ike ịzụ ụbụrụ gị ma mee ka ọ na-echetakwu ihe. Nnyocha e mere na-egosi na e nwere ike iji ụbụrụ anyị tụnyere uru ahụ́. Anyị jiri ya na-arụ ọrụ, ya ana-esikwu ike, ọbụna mgbe anyị merela agadi.

[Igbe dị na peeji nke 27]

IHE NDỊ ỌZỌ GA-ENYERE GỊ AKA

▪ Nyere ụbụrụ gị aka ka ọ na-echetakwu ihe site n’ịmụ ihe ọhụrụ, asụsụ ọhụrụ, ma ọ bụ otu e si akpọ otu ngwá egwú.

▪ Lekwasị anya n’ihe ndị kacha mkpa.

▪ Mụta iji otu ihe echeta ihe ọzọ.

▪ Na-aṅụ mmiri nke ọma. Ọ bụrụ na mmiri agwụ gị n’ahụ́, o nwere ike ime ka isi ghara ịkpakọ gị ọnụ.

▪ Na-arahụ ụra nke ọma. Ọ bụ mgbe mmadụ na-arahụ ụra ka ụbụrụ ya na-echekwa ihe ndị mere n’ụbọchị.

▪ Hụ na ahụ́ ruru gị ala mgbe ị na-amụ ihe. Oké nchegbu na-eme ka kemikal dị n’ahụ́ mmadụ a na-akpọ cortisol pụta, bụ́kwanụ nke nwere ike ime ka akwara ndị dị n’ụbụrụ ghara ịrụ ọrụ nke ọma.

▪ Esela sịga, aṅụkwala oké mmanya. Mmanya na-eme ka mmadụ ghara icheta ihe ndị dị n’akụkụ ụbụrụ nke na-echeta ihe ruo obere oge, ịṅụ oké mmanya nwekwara ike ime ka vitamin na-eme ka ụbụrụ na-arụ ọrụ nke ọma kọọ mmadụ n’ahụ́. Ise sịga na-ebelata ikuku ndụ nke na-aga n’ụbụrụ. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 36 Ebe e si nweta ya bụ na magazin a na-akpọ Brain & Mind nke dị n’Ịntanet.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 28, 29]

 JIRI UCHE GỊ HỤ IHE NDỊ GA-ECHETARA GỊ IHE

Olee otú i nwere ike isi cheta ihe ndị a na-eri eri ị chọrọ ịzụ, dị ka bred, àkwá, mmiri ara ehi, na bọta? Gbalịa iji uche gị “hụ” ihe ndị dị n’ime ụlọ gị bụ́ ndị ga-echetara gị ihe ndị ị chọrọ ịzụ.

Jiri uche gị hụ fom oche dị n’ụlọ gị, ọ ga-echetara gị bred ị chọrọ ịzụ

ebe ọkụkọ kpu n’àkwá dị n’okpuru ọkụ e ji agụ akwụkwọ

ebe azụ̀ na-egwugharị n’ime n’udu a wụnyere mmiri ara ehi

ebe bọta tekasịrị n’ihu televishọn

Ọ bụrụ na ihe ị chọrọ iji cheta ihe bụ ihe na-atọ ọchị, ọ ga-adịkwuru gị nnọọ mfe icheta ya! Ị garuo n’ahịa, gbalịa cheta ihe ndị ahụ i ji tụnyere ihe ndị ị chọrọ ịzụ.

[Igbe dị na peeji nke 29]

NWEE OBI ỤTỌ NA I NWERE IKE ICHEFU IHE!

Chegodị otú ndụ gị gaara adị ma ọ bụrụ na ị na-echetacha ihe niile metụrụla ná ndụ gị, ma ndị dị mkpa ma ndị na-adịghị. Isi agaghị akpakọcha gị ọnụ, ì cheghị otú ahụ? Magazin bụ́ New Scientist kwuru na otu nwaanyị nke ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na ọ na-echeta ihe niile mere ná ndụ ya “kọwara na icheta ihe mgbe niile ‘na-agwụ ya ezigbo ike, na ya anaghị akwụsịli ya ma ọ bụ chịkwaa ya,’ na ọ bụkwaara ya ‘ibu arọ.’” Obi dị anyị ụtọ na ọtụtụ n’ime anyị enweghị ụdị nsogbu ahụ n’ihi na, dị ka ndị na-eme nnyocha si kwuo, ihe ndị na-adịghịzi mkpa ma ọ bụ ihe ndị na-abaghịzi uru na-apụ anyị n’uche. Magazin bụ́ New Scientist kwuru, sị, “Ichefu ihe bụ otu nnukwu ihe na-egosi na ụbụrụ anyị na-arụ ọrụ nke ọma. Ọ bụrụ na anyị echefuo ihe dị mkpa, . . . naanị ihe ọ na-egosi bụ na ụbụrụ anyị na-ewepụsị ihe karịa otú o kwesịrị.”