M̀ Kwesịrị Inwe Ezigbo Ndị Enyi?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
M̀ Kwesịrị Inwe Ezigbo Ndị Enyi?
“Iwe jide m, m na-achọ onye m ga-akọsara otú ọ dị m n’obi. Mgbe obi na-adịghị m mma, m na-achọ onye ga-akasi m obi. Mgbe obi dị m ụtọ, m na-achọ onye mụ na ya ga-eso ṅụrịa. A sị m kwuo, inwe ndị enyi dị ezigbo mkpa.”—Brittany.
E KWUOLA na ụmụntakịrị chọrọ ndị ha na ha ga na-egwuri egwu, ebe ndị na-eto eto chọrọ ndị enyi. Gịnị dị iche na ha abụọ?
Onye gị na ya na-egwuri egwu bụ onye na-anọnyere gị.
Enyi gị bụ onye ihe na-amasị gị na-amasị ya.
Baịbụl kwukwara na “ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.” (Ilu 17:17) Ihe a e kwuru ebe a karịrị ụdị ndị enyi i ga-enweta n’ebe a na-egwuri egwu!
Eziokwu: Ka ị na-etokwu, ọ dị mkpa na ị ga-enwe ndị enyi
(1) Nwere àgwà ndị dị mma.
(2) Na-ebi ụdị ndụ Baịbụl kwadoro.
(3) Ga-enyere gị aka ịkpa àgwà ọma.
Ajụjụ: Olee otú ị ga-esi mara ma ndị enyi gị hà na-eme ihe ndị a e kwuru? Ka anyị lebara ha anya otu otu.
Ihe Mbụ E Ji Ama Ezigbo Enyi Àgwà Ọma
Ihe i kwesịrị ịma. Ọ bụghị onye ọ bụla kwuru na ọ bụ enyi gị ga-abụli ezigbo enyi. Baịbụl kwudịrị na “e nwere ndị enyi na-achọkarị ịkụrisị ibe ha.” (Ilu 18:24) I nwere ike iche na o siri ike ịhụ enyi ga-eme ụdị ihe a. Ma chegodị nke a: Ò nwetụla onye sị na ya bụ enyi gị ma ya aghọọ gị aghụghọ? Ò nwetụla nke ji gị gbaa asịrị ma ọ bụ kọọrọ ndị ọzọ ihe ị na-emeghị? Ihe ndị dị otú ahụ nwere ike ime ka ị gharazie ịtụkwasị onye ọ bụla sị na ọ bụ enyi gị obi. * Ma cheta na inwe ezigbo ndị enyi ka mma karịa inwe ọtụtụ ndị enyi!
Ihe i nwere ike ime. Họrọ ndị enyi àgwà ha dị mma mmụta.
“Onye ọ bụla na-ekwu okwu ọma banyere enyi m bụ́ Fiona. Achọkwara m ka ndị mmadụ na-ekwu okwu ọma banyere m. Achọrọ m ịdị ka ya. Otú ahụ e si ekwu okwu ọma banyere ya na-atọ m ụtọ.”—Yvette, ọ dị afọ 17.
Megodị ihe a.
1. Gụọ Ndị Galeshia 5:22, 23.
2. Jụọ onwe gị, sị, ‘Ndị enyi m, hà na-akpa àgwà ndị so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ”?’
3. Depụta aha ndị enyi gị gị na ha kacha akpachi anya n’okpuru ebe a. I dee aha onye nke ọ bụla, i dee àgwà i ji mara ya.
Aha Àgwà
․․․․․ ․․․․․
․․․․․ ․․․․․
․․․․․ ․․․․․
Ihe Ga-enyere Gị Aka: Ọ bụrụ naanị àgwà ọjọọ onye ahụ ka ị na-echeta, mara na o nwere ike ịdị mkpa ka ị chọwa ndị enyi ka mma!
Ihe nke Abụọ E Ji Ama Ezigbo Enyi—Ụdị Ndụ Baịbụl Kwadoro
Ihe i kwesịrị ịma. Ọ bụrụ na ọ dị gị ọkụ n’ahụ́ inweta ndị enyi, o yikarịrị ka i ga-enweta ndị enyi ọjọọ. Baịbụl kwuru, sị: “Ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.” (Ilu 13:20) Okwu ahụ bụ́ “ndị nzuzu” adịghị ekwu maka ndị na-amaghị ihe. Ihe ọ na-ekwu bụ maka ndị na-adịghị achọ igere ndụmọdụ dị mma, kama ya, ha ana-ebi ndụ ọjọọ. Ọ bụ ụdị ndị enyi ahụ ka ị na-ekwesịghị inwe!
Ihe i nwere ike ime. Kama imete onye ọ bụla ị hụrụ enyi, na-ahọ ndị ga-abụ enyi gị ahọ. (Abụ Ọma 26:4) Nke a apụtaghị na ị ga-akpọ ndị mmadụ asị. Ya bụrụ na ị na-ahọ ndị enyi ahọ, ihe ọ pụtara bụ na i nwere ike ịhụ “ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye ajọ omume, n’etiti onye na-ejere Chineke ozi na onye na-adịghị ejere ya ozi.”—Malakaị 3:18.
Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, ma ọ na-ahọ ndị ‘ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu ya’ ahọ. (Abụ Ọma 15:1-5) I nwekwara ike ime otu ihe ahụ. Ọ bụrụ na i na-ebi ndụ otú Chineke chọrọ, o yiri nnọọ ka ndị na-agbalịkwa ibi ndụ otú ahụ ga-achọ ka gị na ha bụrụ enyi. Ha ga-emecha bụrụ ụdị ndị enyi kacha mma i nwere!
“Obi dị m ụtọ na ndị mụrụ m nyeere m aka ịchọta ndị enyi na-ebi ndụ otú Chineke chọrọ, ndị bụ́kwa ndị ọgbọ m.”—Christopher, ọ dị afọ 13.
Megodị ihe a.
Zaa ajụjụ ndị a:
▪ Mụ na ndị enyi m nọrọ, ọ̀ na-adịkarị m ka hà nwere ike ịranye m ime ihe m maara na ọ dị njọ?
□ Ee □ Mba
▪ Ọ̀ na-esiri m ike igosi ndị mụrụ m ndị enyi m n’ihi na ụjọ na-atụ m na ndị mụrụ m nwere ike ịgwa m ka mụ na ha kwụsị ịkpa?
□ Ee □ Mba
Ihe Ga-enyere Gị Aka: Ọ bụrụ na ị zara ee n’ajụjụ abụọ ahụ, mara na ị ga-achọwa ndị enyi àgwà ha ka mma. Ọ̀ gaghị adị mma ma ibu ụzọ meta ndị tọtụrụ gị enyi, bụ́ ndị na-akpa ezigbo àgwà e ji mara Ndị Kraịst?
Ihe nke Atọ E Ji Ama Ezigbo Enyi—Inyere Gị Aka Ịkpa Àgwà Ọma
Ihe i kwesịrị ịma. Baịbụl kwuru, sị: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.” (1 Ndị Kọrịnt 15:33) Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Lauren sịrị: “Naanị mgbe ụmụ akwụkwọ ibe m na-ekwe ka mụ na ha dịrị ná mma bụ mgbe m mere ihe ha gwara m mee. Enweghị m enyi, n’ihi ya amalitere m ịkpa àgwà ka ha naanị ka mụ na ha bụrụ enyi.” Lauren chọpụtara na ọ bụrụ na mmadụ ana-akpa àgwà otú ndị ọzọ chọrọ ka ọ na-akpa, onye ahụ ga-adị ka oche a na-akwagharị akwagharị nke ndị na-akpụ isi ji akpụ isi, ha ga na-akwagharị onye ahụ ebe ọ bụla ha chọrọ. Ị karịala onye a ga-eme ụdị ihe a!
Ihe i nwere ike ime. Gị na ndị na-achọkarị ka ị gbanwee àgwà gị ma kpawa àgwà ka ha kwụsị ịkpa. Ọ bụrụ na i mee nke a, obi ga-adịkwu gị ụtọ, nke ahụ ga-emekwa ka i nwekwuo ohere imete ezigbo ndị enyi, ya bụ, ụdị ndị enyi ga-enyere gị aka ịkpa àgwà ọma.—Ndị Rom 12:2.
“Ezigbo enyi m bụ́ Clint bụ nwa okoro isi jụrụ oyi na onye na-aghọta otú ọ dị ndị ọzọ, ọ bụ nnọọ onye na-agba m ume.”—Jason, ọ dị afọ 21.
Megodị ihe a.
Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a:
▪ M̀ na-agbanwe ụdị uwe ndị m na-eyi, otú m si ekwu okwu, ma ọ bụ otú m si akpa àgwà iji mee ka obi dị ndị enyi m mma?
□ Ee □ Mba
▪ M̀ na-aga ebe ndị m nwere ike ịnọ mụta àgwà ọjọọ, bụ́kwanụ ebe m na-agaghị achọ ịga ma e wezụga na ndị enyi m na-aga ya?
□ Ee □ Mba
Ihe Ga-enyere Gị Aka: Ọ bụrụ na ị zara ee n’ajụjụ abụọ a, gakwuru ndị mụrụ gị ma ọ bụ onye ọzọ toro eto ka ha gwa gị ihe ị ga-eme. Ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, i nwere ike ịgakwuru otu okenye ọgbakọ ma gwa ya ka o nyere gị aka ịhọrọ ndị enyi ga-eme ka ị na-akpa ezi àgwà.
Ị gaa n’Ịntanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 14 N’eziokwu, ọ dịghị onye na-adịghị emehie. (Ndị Rom 3:23) N’ihi ya, ọ bụrụ na enyi gị emee gị ihe wutere gị ma mechaa gosi na o wutere ya, cheta na “ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.”—1 Pita 4:8.
IHE NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE
▪ Olee àgwà ndị kacha amasị gị ị ga-achọ ka enyi gị nwee, gịnịkwa mere ị ga-eji chọọ ka o nwee ya?
▪ Olee àgwà ndị ọ dị mkpa ka i nwee iji bụrụ ezigbo enyi?
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 24]
IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU
“Mgbe ndị mụrụ m gwara m ka m kwụsị iso ụdị ndị enyi mụ na ha na-esobu, ihe m kwuru n’obi m bụ na ọ bụ naanị ha ka mụ na ha nwere ike ịkpa. Ma ndụmọdụ ahụ ndị mụrụ m nyere m dị mma n’ihi na mgbe anya mechara mepee m, abịara m chọpụta na ezigbo ndị enyi juru eju.”—Cole.
“Ikwusa ozi ọma bụ ụzọ kasị mma m si amata ndị mụ na ha nọ n’ọgbakọ. Ọ bụ n’ozi ọma ka m si amata ma ndị na-eto eto ma ndị agadi. Mụ na ndị hụrụ Jehova n’anya na-anọkwa mgbe niile.”—Yvette.
“Ekpere m ekpere ka m nweta ndị enyi ma mechaa chọpụta na ọ dịghị ihe m na-eme iji chọta ha. N’ihi ya, amalitere m ibu ụzọ akpanyere ndị ọzọ ụka mgbe m bịara ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. Ọ dịghị anya mụ enwee ọtụtụ ndị enyi ọhụrụ. Ugbu a, anaghị m anọkarịzi naanị m.”—Sam.
[Igbe dị na peeji nke 25]
MEGODỊ IHE NDỊ A
Jụọ ndị mụrụ gị otú e si enweta ezigbo ndị enyi. Jụọ ha ụdị ndị enyi ha nwere mgbe ha hà ka gị. Ò nwere ihe ọ na-abụ ha cheta banyere ndị ha họọrọ ịbụ enyi ha ya ana-ewute ha? Ọ bụrụ na o nwere, gịnị kpatara ya? Jụọ ha otú ị ga-esi zere ụfọdụ n’ime nsogbu ndị ha dabara na ya.
Mee ka ndị mụrụ gị mata ndị enyi gị. Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ime nke a, jụọ onwe gị sị, ‘Gịnị mere o ji esiri m ike?’ È nwere ihe ụfọdụ ndị enyi gị na-eme ị maara na ndị mụrụ gị agaghị anabata? Ọ bụrụ na e nwere, mara na ọ dị mkpa ka i lezikwuo anya n’ụdị ndị enyi ị na-ahọrọ.
[Igbe dị na peeji nke 25]
IHE ATỌ GA-ENYERE GỊ AKA INWE EZIGBO NDỊ ENYI
▪ Na-ege ntị nke ọma. Gosi na i bu ọdịmma ndị enyi gị n’uche.—Ndị Filipaị 2:4.
▪ Na-agbaghara. Atụla anya na ha ga na-emetecha ihe niile. “Anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.”—Jems 3:2.
▪ Na-enyetụ ha ohere. Ọ dịghị mkpa ka gị na ndị enyi gị na-anọ mgbe niile. Ezigbo ndị enyi na-anọ ya mgbe ọ bụla ị chọrọ ha.—Ekliziastis 4:9, 10.
[Foto dị na peeji nke 23]
Ọ bụrụ na ị na-akpa àgwà otú ndị ọzọ chọrọ ka ị na-akpa, naanị ka gị na ha dịrị ná mma, ị ga-adị ka oche a na-akwagharị akwagharị nke ndị na-akpụ isi ji akpụ isi, ha ga na-akwagharị gị ebe ọ bụla ha chọrọ