Gịnị Mere Ụjọ Anaghị Ekwe M Kọọrọ Ndị Ọzọ Ihe M Kweere?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Gịnị Mere Ụjọ Anaghị Ekwe M Kọọrọ Ndị Ọzọ Ihe M Kweere?
“N’ụlọ akwụkwọ anyị, enweela m ọtụtụ ohere ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị m kweere. Ma o nweghị nke n’ime ha m kwuru okwu.”—Udochukwu. *
“Otu ụbọchị na klas anyị, onye nkụzi anyị jụrụ anyị ihe anyị chere banyere ozizi evolushọn. Amaara m na nke a bụ ohere magburu onwe ya iji kọọrọ ndị ọzọ ihe m kweere. Ma ozugbo ahụ obi malitere ịkụ m kpum kpum, ekwughịzi m ihe ọ bụla. Ka e mechara, obi jọwara m njọ.”—Nnenna.
Ọ BỤRỤ na ị bụ Onye Kraịst na-eto eto, ikekwe ụdị ihe a mere Udochukwu na Nnenna emetụla gị. O nwere ike eziokwu ndị dị na Baịbụl na-atọ gị ụtọ otú ọ na-atọ ha, ọ na-agụkwa gị agụụ ịkọrọ ya ndị ọzọ. Ma o nwere ike mgbe ọ bụla i chetara ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị i kweere, obi awụnye gị n’afọ. Ma i nwere ike ịmụtakwu otú ị ga-esi na-akata obi. Olee otú ị ga-esi akata obi? Gbalịa mee ihe ndị a a kọwara n’okpuru ebe a tupu unu emepee akwụkwọ n’oge ọzọ:
1. Chọpụta ihe ndị na-atụ gị ụjọ. Mgbe ọ bụla i chetara otú ị ga-esi kọọrọ ndị ọzọ ihe ndị i kweere, ihe mbụ na-abatakarị gị n’obi bụ otú ndị ọzọ ga-esi chịa gị ọchị! Ma mgbe ụfọdụ, ụjọ ahụ ji gị nwere ike ịkwụsịlata ma i dee ihe ndị ahụ na-atụ gị ụjọ n’akwụkwọ.
Dezuo ahịrịokwu a.
▪ Ọ bụrụ na m kọọrọ ndị ọzọ nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị ihe ndị m kweere, ihe nwere ike ime bụ:
․․․․․
Obi nwere ike isi gị ike ma ị ghọta na ihe ndị na-atụ gị ụjọ nwere ike ịbụ ihe ndị na-atụ ndị na-eto eto ibe gị ndị ọzọ bụ́ Ndị Kraịst ụjọ. Dị ka ihe atụ, Chinedu, onye dị afọ iri na anọ, sịrị, “Ụjọ m bụ na ụmụaka ibe m ga-achị m ọchị nakwa na ha ga-akọrọ ndị ọzọ na o nwere ka m si akpa àgwà.” Udochukwu, bụ́ onye e kwuru okwu ya ná mmalite, sịrị, “Ụjọ m bụ na mmadụ nwere ike ịjụ m ajụjụ m na-agaghị azali.”
2. Were nsogbu ahụ ka ihe ị ga-emerili. Ihe ndị a na-atụ gị ụjọ ọ̀ bụ na ha erughị ịtụ gị ụjọ? *
Ọ bụchaghị otú ahụ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Nneka, sịrị: “Ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ibe m mere ka hà chọrọ ịma ihe ndị m kweere. Ma ha mechara were ihe ndị m gwara ha mawa m njakịrị n’ihu ndị ọzọ.” Nkechi, onye dị afọ iri na asaa, kọrọ ihe mere ya n’otu oge, sị: “Otu nwa akwụkwọ ibe m gụrụ otu amaokwu Baịbụl na Baịbụl nke ya, gụọkwa amaokwu Baịbụl ahụ na Baịbụl nke m, hụ na otú e si dee ha abụghị otu. O kwuru na Baịbụl nke m dị iche. Ihe ahụ o kwuru enyeghị m ọnụ okwu! Amaghị m ihe m ga-agwa ya agwa.”Ihe ndị a nwere ike ime ka ezigbo ụjọ jide onye na-eto eto! Ma kama ịgbawara nsogbu ndị ahụ ọsọ, were ha dị ka ihe na-abịara Onye Kraịst ọ bụla. (2 Timoti 3:12) Chidị, onye dị afọ iri na atọ, sịrị: “Jizọs kwuru na a ga-akpagbu ndị na-eso ụzọ ya, n’ihi ya, anyị ekwesịghị ịtụwa anya na mmadụ niile ga-anabata anyị ma ọ bụ nabata ihe ndị anyị kweere.”—Jọn 15:20.
3. Cheta uru ndị ọ ga-abara gị. È nwere ihe ọma nwere ike isi n’ihe e weere na ọ bụ nsogbu pụta? Amaka, onye dị afọ iri abụọ na otu, chere otú ahụ. Ọ sịrị: “Ọ na-esi ike ịkọwara ndị na-ekweghị na Baịbụl ihe ndị i kweere, ma ịkọwara ya ndị ọzọ na-enyere gị aka ịghọta ihe ndị i kweere nke ọma.”—Ndị Rom 12:2.
Laghachigodị n’ihe mbụ ahụ i dere na o nwere ike ime ma ị kọọrọ ụmụ akwụkwọ ibe gị ihe ndị i kweere. Chegodị ihe ọma abụọ o nwere ike ịrụpụta ma dee ha n’okpuru ebe a.
1 ․․․․․
2 ․․․․․
Ihe ga-enyere gị aka: Olee otú ịkọrọ ndị ọzọ ihe i kweere nwere ike isi nye aka mee ka ụmụ akwụkwọ ibe gị ghara ịna-enyekarị gị nsogbu ka i soro ha mee ihe ọjọọ? Olee otú ime ya ga-esi nye aka mee ka obi na-esikwu gị ike? Olee otú ọ ga-esi gosi na ị hụrụ Jehova Chineke n’anya? Oleekwa otú ọ ga-esi gosi na Chineke hụrụ gị n’anya?—Ilu 23:15.
4. Jikere ejikere. Ilu 15:28 sịrị: “Obi onye ezi omume na-atụgharị uche iji zaa okwu.” Ka ị na-eche ihe ị ga-aza ma a jụọ gị ajụjụ, chebakwara ajụjụ ndị mmadụ nwere ike ịjụ gị echiche. Mee nchọnchọ n’ajụjụ ndị ahụ, ma hazie ihe ị ga-aza otú ga-adịrị gị mfe isi zaa ha.—Gụọ igbe bụ́ “Kwadebe Ihe Ị Ga-aza,” na peeji nke 23.
5. Bido ebido. Ọ bụrụ na i jikerela ịkọrọ ndị ọzọ ihe i kweere, olee otú i kwesịrị isi malite? E nwere ọtụtụ ụzọ i nwere ike isi malite. Ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị i kweere nwere otú ya na igwu mmiri si yie: Ụfọdụ ndị na-eji nwayọọ nwayọọ banye ná mmiri; ebe ndị ọzọ na-amaba amaba. N’otu aka ahụ, i nwere ike ime ka onye ji nwayọọ nwayọọ na-abanye ná mmiri site n’ịmalite mkparịta ụka gị n’isiokwu na-agbasaghị Chineke ma jiri nke nta nke nta banye n’isiokwu gbasara Chineke. Ma ọ bụrụ na obi gị na-agwa gị na o nwere ike ị gaghị ama otú ị ga-esi si n’okwu na-agbasaghị Chineke banye n’okwu gbasara Chineke, ihe nwere ike ịkacha mma ime bụ ‘ịmaba’ ozugbo n’okwu Baịbụl. (Luk 12:11, 12) Azụbụike, onye dị afọ iri na asaa, sịrị:“Iche echiche otú m ga-esi akọrọ ndị ọzọ ihe m kweere na-aka abụrụ m nsogbu karịa ime ya eme. M bidohaala ebido, ọ na-adị mfe karịa otú m chere!” *
6. Nwee ezi uche. Dị nnọọ ka ị na-agaghị amaba ná mmiri na-emighị emi, kpachara anya ka ị ghara ịmaba n’arụmụka na-enweghị isi. Cheta na e nwere oge ikwu okwu na oge ịgbachi nkịtị. (Ekliziastis 3:1, 7) O nwedịrị mgbe Jizọs jụrụ ịza ajụjụ ndị a jụrụ ya. (Matiu 26:62, 63) Chetakwa ihe a Baịbụl kwuru: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya; ma ndị na-enweghị uche agabigawo, ewee rie ha nra.”—Ilu 22:3, Bible Nsọ nke Union Version.
Ọ bụrụ na ị chọpụta na mkparịta ụka unu agawala ịghọ arụmụka, ‘amabala n’ime ya.’ Kama nke ahụ, gwa onye ahụ okwu ole na ole gbara ọkpụrụkpụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwa klas gị amaa gị njakịrị, sị, ‘Gịnị mere ị naghị aṅụ sịga?’ ihe i nwere ike ịgwa ya bụ, ‘Achọghị m ịkpatara m onwe m ọrịa!’ Ihe onye ahụ ga-ekwuzi ka ị ga-eji mara ma ị̀ ga-akọwakwuru ya ihe ndị i kweere ka ị̀ ga-agbachi ya nkịtị.
Ọ bụrụ na i soro ihe ndị a e kwuru, ọ ga-enyere gị aka ‘ịdị njikere mgbe niile ịzara ọnụ gị’ banyere ihe i kweere. (1 Pita 3:15) N’eziokwu, na ị dịla njikere apụtaghị na ụjọ apụọla gị n’ahụ́. Ifeọma, onye dị afọ iri na asatọ, kwuru, sị: “Mgbe ị kọwaara ndị ọzọ ihe ndị i kweere n’agbanyeghị na ụjọ ji gị, ọ na-eme ka ị gwa onwe gị na o nweela otu ezigbo ihe i mere—i meriela ụjọ ahụ ji gị, meriekwa obi abụọ ahụ ị na-enwe na ị gaghị emeli ya. Ọ bụrụkwa na ọ gara nke ọma, obi ga-atọkwu gị ụtọ! Obi ga-adị gị ụtọ na ị katara obi kwuo okwu.”
Ị gaa n’Ịntanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
^ par. 11 Ndị sụgharịrị Baịbụl ji okwu dịgasị iche sụgharịa ya. Ma, ụfọdụ n’ime ha sụgharịrị ya kpọmkwem otú ọ dị n’asụsụ mbụ e ji dee Baịbụl karịa ibe ha.
^ par. 19 Gụọ igbe bụ́ “Otú E Si Ebido Mkparịta Ụka,” nke dị na peeji nke 24.
IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE
▪ Ọ̀ ga-abụ na ihe ndị a ka nwa akwụkwọ ibe gị na-eche?
‘Amaara m na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. I nwere ike iche na m bịara ịma gị njakịrị, ma n’eziokwu, ana m akwanyere gị ùgwù. Gịnị mere obi ji eru gị ala n’agbanyeghị nsogbu juru n’ụwa a? Ezigbo ụjọ ji m. Agha ò nwere ike ịda n’obodo anyị a otu ụbọchị? Mama m na papa m hà ga-enwekwa ego ha ga-eji na-akwụrụ m ụgwọ akwụkwọ? M̀ ga-ala akwụkwọ taa n’udo n’enweghị nwa akwụkwọ ibe m tiri m ihe? Enwere m ọtụtụ ajụjụ ndị m ga-achọ ka a zaa m, ma o yiri ka ị maara ihe ị ga-eji ndụ gị eme. Ọ̀ ga-abụ n’ihi okpukpe gị? M ga-achọ ka anyị kparịta ya, ma amaghị m otú m ga-esi ekwulite ya. Ọ ga-amasị m ma i buru ụzọ kwulite ya.’
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 24]
IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU
“O nweela mgbe ụfọdụ ụmụaka chịrị m ọchị n’ihi na m kọọrọ ha ihe m kweere. Ma ha na-ahapụkarị m ma ha chọpụta na ọchị ha na-achị m anaghị eru m n’ahụ́.”—Francesca, o si mba Luxembourg.
“Ọ bụrụ na ị naghị agwa ndị mmadụ ihe ndị i kweere, i nwere ike chefuo na ị bụ Onye Kraịst ma mewe otú onye ọ bụla ọzọ si eme. I kwesịghị ịbụ onye na-eso ndị ọzọ eme otú ha si eme; i kwesịrị ịkwụrụ n’ụkwụ gị abụọ.”—Samantha, o si mba United States.
“Mgbe m dị obere, achọghị m ịdị iche n’ụmụaka ndị ọzọ. Ma, ka oge na-aga, abịara m ghọta otú okwukwe m si eme ka ndụ m ka mma. Ịghọta nke a mere ka obi sikwuo m ike—o mere ka m na-akọrọ ndị ọzọ ihe m kweere n’atụghị ụjọ.”—Jason, o si mba New Zealand.
[Igbe dị na peeji nke 24]
OTÚ E SI EBIDO MKPARỊTA ỤKA
▪ “Olee ihe ị na-eme atụmatụ ime ma anyị mechie akwụkwọ?” [Ya zachaa, gị agwa ya ihe ndị gbasara ofufe Chineke ị na-eme atụmatụ ime, ndị dị ka, ịga mgbakọ distrikti ma ọ bụ iwepụtakwu oge jee ozi ọma.]
▪ Kwuo otu ihe ị nụrụ n’akụkọ ụwa, jụzie ya, sị: “Ị̀ nụrụ ya? Olee ihe i chere banyere akụkọ ahụ?”
▪ “Ì chere na nsogbu ego e nwere n’ụwa taa [ma ọ bụkwanụ kpọọ nsogbu ọzọ aha] ga-aka mma? [Chere ka ọ zaa.] Gịnị mere i ji chee otú ahụ?”
▪ “Gịnị ka i chere banyere okpukpe dị iche iche e nwere n’ụwa?”
▪ “Olee ihe i bu n’obi ime n’afọ ise na-abịa abịa?” [Ya zachaa, gị agwa ya atụmatụ ndị ị na-eme iji jekwuoro Chineke ozi.]
[Chaatị dị na peeji nke 23]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Kwadebe Ihe Ị Ga-aza Chakapụta igbe a!
Aro: Gị na ndị mụrụ gị na ndị enyi gị kwurịta ihe ndị a e dere ebe a. Dee ihe n’ebe e nyere gị ohere ka i dee ihe. Mgbe ahụzi, lee ma ị̀ ga-echetali ajụjụ ndị ọzọ ụmụ klas gị nwere ike ịjụ gị.
Ajụjụ Azịza
Omume Gịnị ka i chere → Akpọghị m ndị na-eme →
banyere nwoke idina ụdị ihe ahụ asị, ma
nwoke ma ọ bụ akpọrọ m ụdị omume
nwaanyị idina ahụ asị.
nwaanyị?
Okwu nwoke na nwaanyị
Gịnị mere na i → Ekpebiela m na →
nweghị onye na- o nweghị onye na-abụghị
abụghị nwoke ma ọ nwoke ma ọ bụ
bụ nwaanyị ibe gị nwaanyị ibe m mụ
gị na ya na-akpa? na ya ga-akpa ruo
mgbe m tokwuru.
Ịnọpụ iche Gịnị mere na ị naghị → Ana m akwanyere obodo →
agụ ukwe e ji eto anyị ùgwù, ma anaghị
mba anyị? m efe ya ofufe. Ikwe ukwe
e ji eto mba anyị bụ ife
ala anyị ofufe.
Ọbara Gịnị mere unu anaghị → Ana m ekwe ka a mịnye m →
ekwe ka a mịnye unu ọgwụ nwere ike ịgwọ m ọrịa
ọbara? —ụdị nke na-agaghị ebunye m
ọrịa o biri n’ájá ọcha.
Ma Baịbụl kwuru ka anyị zere ọbara, ọ bụ ya mere na anyị
anaghị ekwe ka a mịnye
anyị ọbara.
Nhọrọ Onye dị otú a → A na-akụziri anyị ihe →
ma ọ bụ onye dị otú a Chineke chọrọ ka anyị na-eme,
bụ onye òtù unu ma anaghị amanye anyị ime ha!
ma o mere ihe dị otú a. Onye ọ bụla ga-eji aka ya kpebie
Gịnị mere gịnwa agaghị ma ọ̀ ga-eme ya ma ọ bụ
eme ya? na ọ gaghị eme ya.
Okike ihe Gịnị mere i kweghị → Olee ihe mere m ga-eji →
n’ozizi evolushọn? kwere n’ozizi evolushọn?
Ndị ọkà mmụta sayensị o kwesịrị
ịka doo anya ekweghịdị n’otu ihe!
Ajụjụ ọzọ Nchọnchọ Azịza
Omume → Ì cheghị na ịkpọ → 1 Ndị Kọrịnt 6:9, → Mba,
omume ahụ asị 10; Ajụjụ Ndị n’ihi na akpọrọ m omume
na-egosi na ị Na-eto Eto Na-ajụ kpọrọ ha asị? —Azịza Ndị Na-adị rụrụ arụ niile asị—ma
Irè, Nke 2, isi ụdị nke a ma ụdị ọ bụla ọzọ.
nke 28. * Okwu nwoke na nwaanyị
→ Ọ̀ bụ okpukpe gị → Abụ Sọlọmọn 8:4; Ee. Anyị na-akpa
→ mere i ji kpebie → Ajụjụ Ndị Na-eto naanị mgbe anyị dị
→ ime otú ahụ? → Eto Na-ajụ— Azịza njikere ịlụ, amakwa m
→ Ndị Na-adị Irè, na adịbeghị m njikere
→ Nke 2, isi nke 1. ugbu a!
Ịnọpụ iche
→ Ọ̀ pụtara na ị gaghị → Aịzaya 2:4; Jọn → Ee, ọtụtụ nde Ndịàmà
→ alụrụ obodo → 13:35; Gịnị n’Ezie → Jehova ndị nọ ná mba
→ unu ọgụ? → Ka Bible Na-akụzi? dị ọzọ agaghị
→ peeji nke 148-151. * nekwekwa alụso mba a ọgụ.
Ọbara → Ma ọ bụrụkwanụ na → Ọrụ 5:28, 29; → ․․․․․
→ ị na-aga ịnwụ? → Ndị Hibru 11:6; akwụkwọ
→ Chineke ọ́ gaghị → Bible Na-akụzi,
→ agbaghara gị ma nke 129-131.
→ i kwe ka a mịnye
→ gị ọbara?
Nhọrọ → Nke ahụ ọ́ pụtaghị → ․․․․․ → ․․․․․
→ na onye ọ bụla
→ na-eme otú
→ masịrị ya?
Okike ihe
→ ․․․․․ → ․․․․․ → ․․․․․
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 56 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.
^ par. 59 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.
[Foto dị na peeji nke 24]
Ịkọrọ ndị ọzọ ihe i kweere yiri ka igwu mmiri. I nwere ike jiri nwayọọ nwayọọ banye—ma ọ bụkwanụ gị amaba amaba!