Ọ̀ Dị Mma Nwoke na Nwaanyị Ibu Ụzọ Biri Tupu Ha Alụọ?
Echiche Baịbụl
Ọ̀ Dị Mma Nwoke na Nwaanyị Ibu Ụzọ Biri Tupu Ha Alụọ?
Ì NWERE ike ịga zụrụ uwe n’ahịa n’ebughị ụzọ yitụ ya mara ma ọ̀ ga-adịkwa gị mma n’ahụ́? Ọtụtụ ndị agaghị eme ụdị ihe ahụ. A sị ka e kwuwe, ọ bụrụ na i mechaa chọpụta na uwe ahụ abaghị gị ma ọ bụ na ọ karịrị gị, ọ pụtara na ma ego gị ma oge gị alaala n’iyi.
Otú ahụ ka ọtụtụ ndị si ele alụmdi na nwunye anya. Ha weere na ọ ka mma ka nwoke na nwaanyị biri tupu ha alụọ. Ihe ha na-eche bụ, ‘Ọ bụrụ na ọ dabaraghị ha, onye ọ bụla agawara onwe ya n’agaghị kwuwe okwu ịgba alụkwaghịm, bụ́ okwu ga-ewe oge na ego tupu e kwuchaa ya.’
O nwere ike, ụfọdụ ndị na-eche ụdị ihe a ahụla ka otu enyi ha lụrụ di ma ọ bụ nwunye si na-ata ahụhụ n’aka nwunye ya ma ọ bụ di ya. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha ahụla nsogbu na-adị n’ezinụlọ ebe di na nwunye na-ahụghị ibe ha n’anya. N’ihi ihe ndị a, ha na-ewere na nwoke na nwaanyị ibu ụzọ biri tupu ha alụọ ga-eme ka ha gbaara nsogbu ọsọ.
Gịnị ka Baịbụl nwere ikwu n’okwu a? Tupu anyị azawa ajụjụ a, ọ dị mkpa ịtụle ihe Okwu Chineke kwuru banyere alụmdi na nwunye.
“Otu Anụ Ahụ́”
Baịbụl gosiri na alụmdi na nwunye abụghị ihe a ga-eji na-egwuri egwu. Nke a ekwesịghịkwa iju anyị anya n’ihi na ọ bụ Jehova Chineke n’onwe ya bidoro ma kwadoo ka anyị na-alụ di ma ọ bụ nwunye. (Jenesis 2:21-24) Ná mmalite mgbe Jehova mere ndokwa a, o zubere na nwoke na nwaanyị ga-abụ “otu anụ ahụ́” ma ha lụọ. (Jenesis 2:24) Mgbe Jizọs kwuru ihe a e kwuru na Jenesis, o kwukwara, sị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—Matiu 19:6.
N’eziokwu, ụfọdụ ndị na-emecha gbaa alụkwaghịm. * Ma, ọ bụrụ na nke a emee, ọ bụghị n’ihi na o nwere ihe Chineke, onye bidoro alụmdi na nwunye, na-emetaghị; kama, ọ bụ n’ihi na otu onye n’ime ha ma ọ bụ ha abụọ anaghị eme ihe ha kwere ibe ha ná nkwa n’ụbọchị ha gbara akwụkwọ.
Iji maa atụ: Were ya na otu nwoke na otu nwaanyị nwere otu ụgbọala, ma ha abụọ anaghị elekọta ya otú ndị rụrụ ụgbọala ahụ si kwuo ka e si na-elekọta ya. Ọ bụrụ na ụgbọala ahụ enwee nsogbu n’ihi na a naghị elekọta ya anya, ònye ka a ga-ata ụta? Ọ̀ bụ ndị rụrụ ya, ka ọ̀ bụ ndị nwe ụgbọala ahụ, bụ́ ndị na-ekweghị elekọta ya otú e kwesịrị isi na-elekọta ya?
Otú ahụ ka ọ dịkwa n’alụmdi na nwunye. Ọ bụrụ na di na nwunye na-agbalịsi ike ibi n’udo ma kpebie ịna-eme ihe Baịbụl kwuru ma ha
nwee nsogbu, ọ ga-esi ike ha agbaa alụkwaghịm. Obi na-esi ha ike na ọ dịghị onye ga-ahapụ ibe ya, n’ihi na ha ekwela ibe ha nkwa na obi ha ga-adị n’alụmdi na nwunye ha. Mgbe obi ha dịgidere n’alụmdi na nwunye ha ka ha ga-anọgide na-ahụ ibe ha n’anya.“Zere Ịkwa Iko”
Ma, ụfọdụ ka nwere ike iche, sị: ‘Ọ́ gaghị aka mma ma ha buru ụzọ biri? Ibu ụzọ biri tupu ha alụọ ọ́ bụghị ya ga-egosi na ha ghọtara na alụmdi na nwunye bụ ihe dị nsọ?’
Ihe Baịbụl zara doro anya. Pọl dere, sị: “Zere ịkwa iko.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:3) E ji okwu ahụ bụ́ “ịkwa iko” akọwa ụdị mmekọahụ ọ bụla na-abụghị n’etiti di na nwunye. Nke a pụtara na ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị n’alụbeghị alụ ebiri na-enwe mmekọahụ, ha na-akwa iko, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ha bu n’obi ịlụ. N’ihi ya, Baịbụl kwuru na ọ dị njọ ma nwoke na nwaanyị biri n’alụghị alụ—ọ sọgodị ya ya bụrụ na ha bu n’obi imecha lụọ.
Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ ghọọla ihe ndị mgbe ochie? Ụfọdụ nwere ike ile ya anya otú ahụ. A sị ka e kwuwe, n’ọtụtụ mba, nwoke na nwaanyị biri n’alụghị alụ, a naghị ele ha anya ọjọọ—ma hà bu n’obi ịlụ ma ha ebughị n’obi ịlụ. Ma chegodị ihe ndị ọ na-akpata. Ndị na-ebu ụzọ ebi tupu ha alụọ, ọ̀ bụ na ha anaghị enwe nsogbu? Hà na-aka ndị nke lụrụ alụ tupu ha ebiwe enwe obi ụtọ? Ọ̀ na-eme ka ha ghara ịgba n’èzí ma ha mechaa lụọ karịa ndị nke bu ụzọ lụọ tupu ha ebiwe? Nchọpụta ndị e mere gosiri na ọ bụ ndị nke bu ụzọ biwe tupu ha alụwa na-aka enwe nsogbu. N’eziokwu, a chọpụtala na ndị bu ụzọ biri tupu ha alụwa na-aka enwe nsogbu ma ha lụchaa, ọ bụkwa ha na-agbakarị alụkwaghịm n’ikpeazụ.
Ụfọdụ ndị ọkachamara ga-asị na ụdị nchọpụta ahụ abụghị eziokwu. Otu ọkà n’akparamàgwà mmadụ, dere, sị: “Otú ndị kpebiri ibu ụzọ [biri] tupu ha alụwa si ele ihe anya dị iche ná ndị nke kpebiri ịlụ n’ebughị ụzọ [biri].” Ihe ọ na-ekwu bụ na ibu ụzọ biri abụghị ya bụ okwu; ihe bụ́ okwu bụ ma hà “ji alụmdi na nwunye ha kpọrọ ihe.”
A sịgodị na ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu, ihe ọ na-egosi bụ na ọ dị mkpa ile alụmdi na nwunye anya otú Chineke si ele ya. Baịbụl sịrị: “Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ niile.” (Ndị Hibru 13:4) Mgbe nwoke na nwaanyị kwere onwe ha nkwa na ha ga-abụ otu anụ ahụ́, ma na-akwanyere onye bidoro alụmdi na nwunye ùgwù, ha na-adị ka ụdọ a tụkọtara ọnụ, bụ́ nke a na-apụghị ịdọbi ngwa ngwa.—Ekliziastis 4:12.
Ka anyị laghachigodị n’ihe atụ ahụ anyị ji bido. Ọ dị mma ibu ụzọ yitụ uwe ị chọrọ ịzụ tupu ị zụrụ ya. Ma iji ya tụnyere ibu ụzọ biri tupu a lụwa adabaghị adaba. Kama ihe e nwere ike iji tụnyere ya bụ iwepụta ezigbo oge mata onye ị chọrọ ịlụ nke ọma. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị anaghị eme ihe a dị ezigbo mkpa, ma ọ bụ otu n’ime ihe ndị na-eme ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 9 Baịbụl kwuru na ihe nwere ike ime ka di ma ọ bụ nwunye gbaa ibe ya alụkwaghịm ma lụọ onye ọzọ bụ ma otu onye n’ime ha kwaa iko.—Matiu 19:9.
Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?
▪ Gịnị mere Baịbụl ji kwuo na ọ bụ naanị ndị bụ́ di na nwunye kwesịrị inwe mmekọahụ?—Abụ Ọma 84:11; 1 Ndị Kọrịnt 6:18.
▪ Olee àgwà ndị i kwesịrị ịchọ n’onye ị ga-alụ?—Rut 1:16, 17; Ilu 31:10-31.
[Igbe dị na peeji nke 23]
‘Ọ NA-EMEHIE MEGIDE AHỤ́ NKE YA’
Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-akwa iko na-emehie megide ahụ́ nke ya.” (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Ọ dịbeghị anya o dokwuru anya na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu, n’ihi na enweela ọtụtụ nde mmadụ ndị ọrịa o biri n’ájá ọcha na ọrịa ndị ọzọ a na-ebute ná mmekọahụ gburu. Ma ọ bụghị ebe ahụ ka okwu biri. Nchọpụta ndị e mere na-egosi na ndị na-eto eto ndị maliterela inwe mmekọahụ na-aka ada mbà n’obi ma na-achọkarịkwa igbu onwe ha karịa ndị nke na-anaghị enwe mmekọahụ. Ọtụtụ n’ime ndị a na-enwe mmekọahụ na-atụtakwa ime ọkwà. Ụfọdụ n’ime ha na-etekwa ime ahụ. N’ihi ihe ndị a niile, anyị ga-ahụ na ihe Baịbụl kwuru banyere inwe mmekọahụ abụghị ihe ndị mgbe ochie.