Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee ụdị uwe m kwesịrị iyi?

Olee ụdị uwe m kwesịrị iyi?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Olee ụdị uwe m kwesịrị iyi?

Rut chọrọ ịpụ apụ, ma ụdị uwe o yi chọọ ịpụ riri ndị mụrụ ya ọnụ. Ihe pụrụ papa ya n’ọnụ bụ, “Agwakwala m na ọ bụ ihe a ka i yi apụ.” Ihe ahụ o kwuru juru Rut anya, ya asị ya, “Ò nwere ihe o mere? Ọ́ bụghị naanị ka m soro ndị enyi m gaa zụrụ ihe?” Mama ya asị ya, “Ị gaghị eyi ihe ahụ apụ!” Rut ejiri olu ákwá sị, “Mama, ụdị ihe a ka ndị ọgbọ m niile na-eyi, . . . o nwekwara ihe ọ na-egosi!” Papa ya ejiri olu ike, sị ya, “Ihe ahụ ọ na-egosi adịghị anyị mma!” Ngwa, were ọsọ gaa yipụ ihe ahụ! Ma i yipụghị ya ị gaghị esi ebe a apụ.”

Ọ BỤGHỊ taa ka uwe seweere ndị nne na nna na ụmụ ha okwu. * O nwere ike mgbe ndị mụrụ gị hà ka gị, ụdị ihe a seere ha na ndị mụrụ ha okwu. N’oge ahụ, o nwekwara ike ha nọ na-eche ihe ị na-eche ugbu a! Ma ugbu a, otú ha si ele ihe anya agbanweela, nke a na-emekwa ka ihe gbasara uwe ị ga-eyi na-esekarịrị gị na ha okwu.

Ị sị: Ọ dị m mma n’ahụ́.

Ha asị: Ọ dịghị mma n’anya.

Ị sị: Ọ mara ezigbo mma!

Ha asị: Ọ tapagidere gị atapagide n’ahụ́.

Ị sị: Ọ daghị ọnụ.

Ha asị: kwesịghị ịda ọnụ. . . . Ọ ha ka uwe ụmụaka!

È nwere otú ọgụ na mgba a ga-esi akwụsị? Ee! Megan, onye dị afọ iri abụọ na atọ ugbu a, ma ihe ga-akwụsị ya. Ọ sịrị: “Ọ bụghị ihe gị na ha ga-arụwara ụka, ihe unu ga-eme bụ ikwekọrịta.” Ọ̀ ga-ekwe omume gị na ha ikwekọrịta? Ọ̀ pụtaziri na ị ga na-ejike ka onye mama? Mbanụ! Nkwekọrịta a na-ekwu okwu ya ebe a bụ na gị na ndị mụrụ gị ga-anọkọ kwurịta ihe na-esere unu, ma kpebie ihe ga-adị ma gị ma ha mma. Olee uru ọ ga-abara gị?

1. Ị ga na-adị ọgọ n’anya, ma n’anya ndị ọgbọ gị.

2. Ndị mụrụ gị agaghị na-akatọkarị uwe ndị ị na-eyi.

3. Ndị mụrụ gị hụwa na ị na-eyi uwe dị mma, ha nwedịrị ike ịhapụ gị ka i jiri aka gị na-ekpebi ihe ndị ọzọ ị chọrọ ime.

Ugbu a, ka anyị leba anya n’ihe i kwesịrị ime ma ị chọọ ịzụ uwe. Were ya na ị hụrụ otu uwe n’ahịa ma ọ bụkwanụ na ị hụrụ nke otu enyi gị yi, ya adị gị ka ị̀ ga-enwerịrị ya. Ihe mbụ ị ga-eme bụ . . .

Chebara Ihe Baịbụl Kwuru Echiche

Baịbụl ekwughị ọtụtụ ihe banyere uwe. N’eziokwu, i nwere ike iji nkeji ole na ole gụchaa ihe niile e kwuru gbasara uwe n’Akwụkwọ Nsọ! Ma ná nkeji ole na ole ahụ, ị ga-amụta ọtụtụ ihe ndị ga-abara gị ezigbo uru. Dị ka ihe atụ:

▪ Baịbụl gwara ụmụ nwaanyị ka ha na-achọ onwe ha mma “n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè.”—1 Timoti 2:9, 10.

Obi nwere ike ịmapụ gị ma e kwute okwu ‘imeru ihe n’ókè.’ Ihe i nwere ike ichewe bụ, ‘Ọ̀ pụtaziri na m ga na-eyi mmeriamaka?’ Mbanụ! N’ebe a, imeru ihe n’ókè pụtara na uwe gị ga-egosi na ị na-akwanyere onwe gị ùgwù nakwa na ị na-echebara ndị ọzọ echiche. (2 Ndị Kọrịnt 6:3) E nwere ọtụtụ uwe ndị ị ga-eyi ya egosi na ị na-eme otú ahụ. Daniele, onye dị afọ iri abụọ na atọ, sịrị: “O nwere ike isitụrụ gị ike ime, ma i nwere ike iyi uwe ndị mara mma nke na-agaghị eme ka a gbawa gị nkiri.”

▪ A bịa n’ihe gbasara ejiji, Baịbụl kwuru na i kwesịrị ilekwasị anya ná “mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi”—ma ọ bụ dị ka Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society si kwuo ya, ‘mma si n’ime ime gị pụta.’—1 Pita 3:4.

Iyi uwe na-ewu ewu nwere ike ime ka ị ghọọ onye a na-agba nkiri, ma n’ikpeazụ, ọ bụ mma gị nke si n’ime ime ga-eme ka ma ndị torola eto ma ndị na-eto eto ibe gị kwanyewere gị ùgwù. Ọ̀ bụ eziokwu na ndị na-eto eto ibe gị ga-eso kwanyewere gị ùgwù? Ee—hanwa nwedịrị ike ịma na iyi uwe ga-eme ka a gbawa mmadụ nkiri adịghị mma. Briteni, onye dị afọ iri na isii kwuru, sị: “Ọ na-ewute m ma m hụ otú ụmụ agbọghọ si agba onwe ha ọtọ, sị na ha yi uwe, n’ihi na ha chọrọ ka ụmụ nwoke hụ ha!” Nwa agbọghọ ọzọ, aha ya bụ Kee, kwetakwara n’ihe a o kwuru. Mgbe ọ na-ekwu banyere otu onye bụ́bu enyi ya nwaanyị, ọ sịrị: “Uwe ya niile bụ uwe ‘hụrụ m hụrụ m.’ Ọ chọrọ ka ụmụ okorobịa lewe ya, ọ bụ ya mere o ji eyi ihe ọ bụla nwere ike ịdọta ha.”

Ihe Ị Ga-eburu n’Uche Banyere Uwe: E yila uwe ọ bụla ga-atapagide gị n’ahụ́. Ọ na-eme ka i yie onye na-achụ nwoke nakwa onye ihe gbasara onwe ya na-echu ụra. Ụdị uwe a nwekwara ike ime ka ụmụ nwoke chụwa gị ma ọ bụ dinaa gị n’ike. Ma iyi uwe dị mma na-eme ka mma gị pụtakwuo ìhè, meekwa ka a na-ahụkwu àgwà ọma gị.

Jụọ Ndị Mụrụ Gị Ihe Ha Chere

Ọ dịghị mma ịchịnye uwe ị maara na ọ dịghị mma n’akpa akwụkwọ gị ma yiri ya ma i ruo n’ụlọ akwụkwọ. Ndị mụrụ gị ga-atụkwasịkwu gị obi ma ọ bụrụ na ị na-akọrọ ha ihe niile ma na-agwa ha eziokwu, ọbụnadị ịkọrọ ha ihe ndị ị maara na ị ga-ezochiliri ha. N’eziokwu, ọ ga-adị mma ma ị jụọ ha ihe ha chere banyere uwe ị chọrọ ịzụ.—Ilu 15:22.

Ma gịnị mere ị ga-eji jụọ ha ihe ha chere? Ihe nwere ike ịgbata gị n’uche bụ na o nweghị uwe ọ bụla masịrị gị ha ga-ekweta na ọ dị mma. Ma ọ bụchaghị eziokwu. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị ihe niile masịrị gị na-amasị papa gị na mama gị, ma mgbe ụfọdụ, ọ bụ ya ga-enyere gị aka ime mkpebi dị mma. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa, aha ya bụ Natalin, sịrị: “Aro ndị mụrụ m na-atụrụ m na-abara m uru, n’ihi na agaghị m achọ ka uwe m yi si n’ụlọ pụọ menye m ihere ma ọ bụ mee ka ndị mmadụ kwuwe okwu ọjọọ banyere m.”

E wezụga nke ahụ, nke bụ́ eziokwu bụ: Ebe ị ka bi n’ụlọ ndị mụrụ gị, i kwesịrị irubere ha isi. (Ndị Kọlọsi 3:20) Ma mgbe ị ghọtara otú ndị mụrụ gị si ele ihe anya, hanwa aghọtakwa otú i si ele ihe anya, ọ ga-eju gị anya ịma na gị na ha na-ekwekọrịta n’ọtụtụ ihe. Ọ bụrụ na gị na ha ana-aghọta ibe unu, okwu gbasara uwe agaghị na-esere unu okwu!

Ihe Ị Ga-eburu n’Uche Banyere Uwe: Mgbe ị na-azụ uwe ọhụrụ, chee otú ọ ga-adị gị n’ahụ́ ma i yiri ya. Uwe gafere ikpere ụkwụ gị mgbe ị kwụ ọtọ nwere ike ịgbago elu ma ị nọdụ ala ma ọ bụ hulata ka ị tụtụrụ ihe. Ọ bụrụ na o kwe mee, jụọ mama gị ma ọ bụ papa gị ma ọ bụkwanụ otu enyi gị torola eto ihe o chere banyere uwe ị chọrọ ịzụ.

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ọ bụ eziokwu na ndị e bu n’uche dee isiokwu a bụ ụmụ nwaanyị, ihe ndị e kwuru na ya ga-abakwara ụmụ nwoke uru. Gụọ igbe bụ́,  “Oleekwanụ Maka Ụmụ Nwoke?”

IHE NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

Ọ bụrụ na e nwere uwe ị chọrọ ịzụ, jụọ onwe gị, sị:

▪ M yiri ya, olee ihe ọ “ga-agwa” ndị mmadụ banyere m?

▪ Olee otú ọ ga-adị ndị mmadụ ma ha hụ m?

▪ Ọ̀ bụ otú ahụ ka m chọrọ ka ndị mmadụ si na-ele m anya?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 15]

ebe ị ga-edepụta ihe ga-enyere gị aka ịma ụdị uwe dị mma

Ihe Ị Ga-Eme: Depụta ihe e dere na peeji a n’akwụkwọ ọzọ. Gwa ndị mụrụ gị ka ha dejupụta akụkụ aka nri ya, ebe gịnwa ga-edejupụta akụkụ aka ekpe ya. E mechaa, nye ndị mụrụ gị nke ahụ i dere, narakwa ha nke hanwa dere. Gị na ha kwurịtazie ihe ndị unu dere. È nwere ihe ndị tụrụ gị n’anya? Olee ihe ọhụrụ ị mụtara banyere otú ndị mụrụ gị si ele ihe anya, oleekwa nke hanwa mụtara banyere otú i si ele ihe anya?

NKE GỊ NKE NDỊ MỤRỤ GỊ

Chegodị echiche banyere otu Chegodị echiche banyere otu

uwe ị ga-achọ iyi ma ọ bụ ịzụ. uwe nwa unu ga-achọ iyi ma ọ bụ ịzụ.

▪ Olee ihe mere uwe ahụ ji ▪ Gịnị ka unu chere mere nwa

masị gị? N’ime ihe ndị a unu ji nwee mmasị n’uwe ahụ?

e dere n’okpuru ebe a, dee 1 N’ime ihe ndị a e dere

ihe nke mbụ mere i ji chọọ n’okpuru ebe a, denyenụ 1 n’ihe

ịzụ uwe ahụ, dee 2 n’ihe nke nke mbụ unu chere mere nwa

abụọ, derezie ya otú ahụ na-aga. unu ji chọọ ịzụ uwe ahụ, denyekwanụ

2 n’ihe nke abụọ, derezienụ

ya otú ahụ na-aga.

․․․․․ Aha ụlọ ọrụ kwara uwe ahụ ․․․․․ Aha ụlọ ọrụ kwara uwe ahụ

․․․․․ Ọ ga-eme ka ụmụ

nwoke gbawa m nkiri ․․․․․ Ọ ga-eme ka ụmụ nwoke gbawa ya nkiri

․․․․․ Ndị na-eto eto ibe m na-eyi ya ․․․․․ Ndị na-eto eto ibe ya na-eyi ya

․․․․․ Ọ dị m mma n’ahụ́ ․․․․․ Ọ dị ya mma n’ahụ́

․․․․․ Ọ daghị ọnụ ․․․․․ Ọ daghị ọnụ

․․․․․ Ihe ọzọ ․․․․․ ․․․․․ Ihe ọzọ ․․․․․

▪ Ihe mbụ ndị mụrụ m nwere ike ▪ Ihe mbụ anyị mere mgbe anyị

ime ma ha hụ ya bụ hụrụ ya bụ

“Anwakwala ya anwa!” “Anwakwala ya anwa!”

“Ọ masị gị.” “Ọ masị gị.”

“Nsogbu adịghị.” “Nsogbu adịghị.”

▪ Ihe nwere ike ime ka ha jụ bụ ▪ Ihe mere anyị ji jụ bụ

“Ọ tapagidere gị atapagide n’ahụ́.” “Ọ tapagidere ya atapagide n’ahụ́.”

“Ọ dịghị mma n’anya.” “Ọ dịghị mma n’anya.”

“Ọ na-ewu ewu.” “Ọ na-ewu ewu.”

“Ọ ga-eme ka ndị mmadụ chewe “Ọ ga-eme ka ndị mmadụ chewe na

na ndị mụrụ gị azụghị gị azụ.” anyị azụghị ya azụ.”

“Ọ dị oké ọnụ.” “Ọ dị oké ọnụ.”

Ihe ọzọ ․․․․․ Ihe ọzọ ․․․․․

ÀNYỊ NWERE IKE INWE OTU OLU?

▪ Olee uru ihe a ndị mụrụ m ▪ Ihe mere anyị achọghị ka

kwuru ga-abara m? nwa anyị yiri uwe a ọ̀ bụ naanị

n’ihi na ọ masịghị anyị?

․․․․․ Ee O nwere ike Mba

▪ Gịnị ka e nwere ike ime ka ▪ Gịnị ka e nwere ike ime ka

uwe a dị mma oyiyi? uwe a dị mma oyiyi?

․․․․․ ․․․․․

IHE M KPEBIRI IME

․․․․․

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 16]

“Ọ dịghị njọ ma ị zụrụ uwe a kwara otú ị chọrọ ya, ma ọ bụrụhaala na otú e si kwaa ya emegideghị ihe e dere na Baịbụl. Ị gaa n’ahịa, ị ga-ahụ ọtụtụ uwe ndị dị mma, ndị ga-amakwa gị mma n’ahụ́, o nweghịkwa onye ga-ele gị anya ọjọọ ma i yiri ha.”—Derik.

“Mgbe m ka na-eto eto, achọrọ m ịna-emere otú o si masị m. Achọghị m ka a na-agwa m ihe m ga-eyi. Ma ka oge na-aga, achọpụtara m na ndị mmadụ anaghị akwanyere m ùgwù otú o kwesịrị. Ma mgbe m mechara gewe ntị n’ihe ndị mụrụ m na ndị ọzọ toro eto na-agwa m banyere uwe ndị m na-eyi, ndị mmadụ malitere ịkwanyere m ùgwù.”—Megan.

“M hụ ụmụ agbọghọ ndị na-eyi uwe ndị na-atapagide ha n’ahụ́, ọ na-eme ka m ghara ịna-akwanyere ha ùgwù otú m si akwanyeburu ha. Ma m hụ ndị yi uwe dị mma, ihe m na-ekwu n’obi m bụ, ‘Otú a ka m ga-achọ ka ndị mmadụ si na-ele m anya.’”—Natalin.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 17]

 OLEEKWANỤ MAKA ỤMỤ NWOKE?

Ndụmọdụ Baịbụl ndị a tụlere n’isiokwu a gbasakwara ụmụ nwoke. Na-emeru ihe n’ókè. Mee ka a hụ mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi gị, nke bụ́ mma si n’ime ime gị. Mgbe ị chọrọ ịzụ uwe, jụọ onwe gị sị: ‘Gịnị ka ọ ga-agwa ndị mmadụ banyere m? Ihe a ọ ga-agwa ha, ọ̀ bụ ụdị onye m bụ n’eziokwu?’ Cheta na e nwere ọtụtụ ihe uwe mmadụ yi na-ekwu banyere onye ahụ. Hụ na uwe ndị ị na-eyi na-egosi ụdị onye ị bụ n’eziokwu!

[Igbe dị na peeji nke 17]

IHE NDỊ MỤRỤ ỤMỤ KWESỊRỊ IBURU N’UCHE

Cheta ihe ahụ a kọrọ ná mmalite isiokwu a ma were ya na Rut bụ nwa gị nwaanyị. O nyeghị gị ọnụ okwu mgbe ị hụrụ ka o yi uwe tapagidere ya n’ahụ́ na-achọ ịpụ. N’anya gị, ọ gba ọtọ. Ihe pụrụ gị n’ọnụ bụ, “Ngwa, gaa yipụ ihe ahụ ozugbo, ma ọ́ bụghị ya, o nweghị ebe ị na-aga!” Mba ahụ ị baara ya nwere ike ime ka ọ gaa yipụ uwe ahụ. A sị ka e kwuwe, ọ bụ nwa gị nwaanyị, ihe ị gwara ya mee ka ọ ga-eme. Ma olee otú ị ga-esi nyere ya aka ka ọ na-ama uwe kwesịrị ekwesị iyi?

▪ Nke mbụ, cheta na nsogbu iyi uwe na-adịghị mma nwere ike ịkpatara nwa gị kwesịrị ichu ya ụra otú o si echu gịnwa, ma ọ bụdị ka na-echu ya ụra. Nke bụ́ eziokwu bụ na nwa gị agaghị achọ ka ndị ọzọ na-ele ya anya ka onye iberiibe, ma ọ bụdị ka ụmụ nwoke chụgharịwa ya. Wetuo obi ala kọwaara ya na uwe na-adịghị mma anaghị eme ka mmadụ makwuo mma. * Tụọrọ ya aro ụdị uwe ka mma iyi.

▪ Nke abụọ, “meenụ ka mmadụ niile mara na unu nwere ezi uche.” (Ndị Filipaị 4:5) Jụọ onwe gị, sị, ‘Otú uwe ahụ dị, ò megidere ihe Baịbụl kwuru ka ọ̀ bụ naanị n’ihi na ọ dịghị otú m chọrọ ka ọ dịrị?’ (2 Ndị Kọrịnt 1:24) Ihe bụ́ nsogbu bụrụ na ọ dịghị otú ị chọrọ ya, ì nwere ike ịhapụ ya ka o yiwe ya?

▪ Nke atọ, agwala nwa gị naanị na uwe ahụ adịghị mma. Nyere ya aka ịmata uwe kwesịrị ekwesị. Ọ ga-aka abara ma gị ma ya uru.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 77 O nwere ike nwa gị nwaanyị na-echekarị echiche banyere otú ọ dị, n’ihi ya, lezie anya ka ị ghara ikwu ihe ga-eme ka o chewe na ya jọrọ njọ karịa ndị ọgbọ ya ndị ọzọ.