Ì Kwesịrị Ịkwụ Ụgwọ Maka Okwuchukwu E Kwuuru Gị?
Echiche Baịbụl
Ì Kwesịrị Ịkwụ Ụgwọ Maka Okwuchukwu E Kwuuru Gị?
N’ỌTỤTỤ mba, ndị isi chọọchị na ndị isi okpukpe ndị ọzọ na-ana ndị òtù ha ego ma ha kwuoro ha okwuchukwu. O nwere ike ịbụ okwu agbamakwụkwọ, okwu olili ozu ma ọ bụkwanụ ma ha mee ha baptizim. Mgbe ụfọdụ, ego a na-ana ha na-eru ọtụtụ puku naịra.
Ndị ọchịchị na-akwụ ụfọdụ ndị ụkọchukwu ụgwọ kwa ọnwa maka ikwuru ha okwuchukwu na ikpere ha ekpere n’oge ha na-eme ememme nakwa ná nzukọ ndị omeiwu na-enwe kwa ụbọchị. Ọrụ ndị ahụ ha na-arụ nwere ike ime ndị mmadụ obi ụtọ. Ndị chọọchị nwekwara mkpa ndị na-efu ha ego. Ma Baịbụl ọ̀ kwadoro ka a na-akwụ ụdị ụgwọ ndị ahụ ma ọ bụdị ka a na-eme ndị mmadụ ka ha chee na ọ bụ iwu na ha ga-akwụ ụgwọ ndị ahụ?
‘Ọ̀ Bụ Ụlọ Ahịa’?
Mgbe Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, ndị ndú okpukpe ndị Juu na ndị ọzọ na-eji oge a na-eme ememme ndị Juu akpa ego, nke ka nke, n’oge Ememme Ngabiga. Jizọs ò lere ha anya ọma? Mbanụ! Baịbụl gwadịrị anyị na “ọ wụfukwara mkpụrụ ego nke ndị na-agbanwe ego ma kpuo tebụl ha ihu.” Jizọs sịrị: “Kwụsịnụ ime ka ụlọ Nna m bụrụ ụlọ ahịa!”—Jọn 2:14-16.
Ụdị ihe a emebuola n’oge Maịka onye amụma, onye dịrị ndụ na narị afọ nke asatọ Tupu Oge Anyị. Baịbụl kwuru na ndị ndú okpukpe ndị Izrel “kpọrọ ikpe ziri ezi asị,” nakwa na ndị nchụàjà ha “anaghị ezi ihe ma ọ bụrụ na a kwụghị ha ụgwọ.” Ka ha na-eme ihe ndị ahụ, ha nọkwa na-ekwu na Chineke nọnyeere ha. Ha kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na Jehova anọghị n’etiti anyị?” (Maịka 3:9, 11) Ma Jehova Chineke anọghị n’etiti ha, ọ kwadoghịkwa ihe ha na-eme. Kama ọ kpọrọ ihe ahụ ha na-eme asị, o sikwa n’ọnụ onye amụma ya mee ka o doo anya na ọ kpọrọ ya asị.
Ọtụtụ ndị ndú okpukpe nke oge a nwere ụdị anyaukwu ahụ, ọ bụ ya mere ha ji eme ebe ha na-efe ofufe ka ọ bụrụ “ụlọ ahịa.” N’eziokwu, okpukpe dị iche iche e nwere n’ụwa na-etinye aka n’azụmahịa. Otú ha na-esikarị akpata ego bụ ire ihe oyiyi a tụrụ atụ na ndị a kpụrụ akpụ na ọtụtụ ihe ndị ọzọ e ji efe ofufe. *—1 Jọn 5:21.
“Unu Natara n’Efu, Na-enyenụ n’Efu”
Mgbe Jizọs na-ezipụ ndịozi ya ka ha gaa kwusaa ozi ọma, gwọọ ndị ọrịa ma kpọlitedị ndị nwụrụ anwụ, ọ gwara ha, sị: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Matiu 10:7, 8) N’eziokwu, ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs ekwesịghị ịnara ndị mmadụ ego ma ha zie ha ozi ọma ma ọ bụ kpeere ha ekpere. Ihe ọzọkwa bụ na Jizọs n’onwe ya mere ihe ahụ ọ gwara ha, ọ naraghị ndị mmadụ ego mgbe o meere ha ihe ndị ahụ.
Pọl onyeozi mere ihe ahụ Jizọs mere, ọ bụ ya mere o ji kwusaara ndị mmadụ ozi ọma “n’anaghị ihe ọ bụla.” (1 Ndị Kọrịnt 9:18) Ọ chọọ inweta ego ọ ga-eji gboo mkpa ya, ya akpaa ákwà ụlọikwuu. (Ọrụ 18:1-3) Ọ bụ ya mere o ji nwee ike ikwu banyere onwe ya na ndị ọzọ ha na ya so eje ozi ọma, sị: “Anyị abụghị ndị na-ere okwu Chineke ere dị ka ọtụtụ ndị bụ.” (2 Ndị Kọrịnt 2:17) Ma oleekwanụ otú ọgbakọ ga-esi enweta ego ha ga-eji eme mkpa ha, dị ka ịzụta ala ma ọ bụ ịkwụ ụgwọ ebe ha ga-anọ na-amụ ihe?
“Chineke Hụrụ Onye Na-eji Obi Ụtọ Enye Ihe n’Anya”
Ọ bụ onyinye ndị mmadụ ji obi ha nye ka Ndịàmà Jehova si enweta ego ha ji eme ihe ndị dị ha mkpa. Ha na-eme ihe a Baịbụl kwuru, nke bụ́: “Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.” (2 Ndị Kọrịnt 9:7) Ọ bụ ya mere Ndịàmà Jehova anaghị ere akwụkwọ ha ere, ha anaghịkwa ana ego ma ha mee ndị mmadụ baptizim, kwuoro ha okwu agbamakwụkwọ ma ọ bụ okwu olili ozu. Ha anaghịkwa ana otu ụzọ n’ụzọ iri ma ọ bụ na-ebugharị efere ụtụ n’oge ọmụmụ ihe ha. Onye chọrọ inye onyinye iji kwadoo ọrụ ikwusa ozi ọma ha na-arụ n’ụwa niile nwere ike itinye ya n’igbe onyinye ndị e dewere n’ebe ha na-anọ efe ofufe.
Ọ bụkwa onyinye a ndị mmadụ ji obi ha nye ka Ndịàmà Jehova n’ụwa niile ji arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, Ụlọ Mgbakọ ha, alaka ụlọ ọrụ ha, na ebe ndị ha na-ebi akwụkwọ. Otú ahụkwa ka ha si enweta ihe ndị ha ji agbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka. Ụfọdụ ndị na-enye onyinye ndị a nwere ike inye naanị obere onyinye dị ka nke nwaanyị ahụ di ya nwụrụ nke dara ogbenye, onye Jizọs jara mma. (Luk 21:2) Ndị ọzọ na-enyekwa nnukwu ihe. N’agbanyeghị otú ihe mmadụ nyere hà, ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru ma na-enye otú aka ruru ha na-enwe afọ ojuju na ezigbo obi ụtọ, Chineke na-agọzikwa ha.—Ọrụ 20:35; 2 Ndị Kọrịnt 8:12.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 8 Gụọ isiokwu bụ́ “Echiche Baịbụl: È Kwesịrị Iji Ihe Oyiyi Efe Chineke?” nke gbara na Teta! Ọktoba–Disemba 2008.
Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?
● Gịnị ka Jizọs gwara ndị nọ n’ụlọ nsọ na-ere ahịa?—Jọn 2:14-16.
● Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi ọ̀ naara ndị mmadụ ego maka ozi ọma o ziri ha na ọrụ ebube ọ rụrụ?—2 Ndị Kọrịnt 2:17.
● Olee otú Jehova chọrọ ka anyị si na-enye onyinye?—2 Ndị Kọrịnt 9:7.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 25]
“Kwụsịnụ ime ka ụlọ Nna m bụrụ ụlọ ahịa!”—Jọn 2:14-16