Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị ka m ga-eme ka obi kwụsị ịna-ajọkarị m njọ?

Gịnị ka m ga-eme ka obi kwụsị ịna-ajọkarị m njọ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Gịnị ka m ga-eme ka obi kwụsị ịna-ajọkarị m njọ?

“Mgbe ọ bụla ndị enyi m nwere nsogbu ha na-amaghị ihe ha ga-eme banyere ya, ọ bụ m na-agwa ha otú ha ga-esi dozie nsogbu ahụ ma mee ka obi dị ha mma. Ma ihe ọtụtụ ndị na-amaghị bụ na ọ na-abụ m laruo n’ụlọ anyị, mụ ebewe ákwá.”​—Kellie. *

“Mgbe obi na-adịghị m mma, m na-anọrọ onwe m. E nwegodị onye kpọrọ m ka m bịa na nke ya, ana m achọta otu ihe m ga-agwa ya na ọ bụ ya mere m gaghị abịa. Ama m otú esi ezochiri ndị ezinụlọ anyị otú obi dị m. Ha na-eche na obi dị m mma.”—Rick.

Ọ̀ DỊTỤLA mgbe ọ dị gị otú ahụ ọ dị Kellie na Rick? Ya bụrụ na ọ dịtụla, echekwala na e nwere ihe na-eme gị. Nke bụ́ eziokwu bụ na onye ọ bụla n’ime anyị na-enwe mgbe obi na-ajọ ya njọ. Ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị fere Chineke, bụ́ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, nwedịrị mgbe obi jọrọ ha njọ.

Mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịma ihe mere obi ji ajọ gị njọ; mgbe ụfọdụkwa, ị gaghị ama. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu, aha ya bụ Anna, kwuru, sị: “Ọ bụghị naanị mgbe e nwere ihe ọjọọ merenụ ka obi na-ajọ mmadụ njọ. Obi nwere ike ibido jọwa mmadụ njọ mgbe ọ bụla, ọ sọgodị ya ya bụrụ na onye ahụ enweghị nsogbu ọ bụla. Ọ na-eju m anya otú ụdị ihe ahụ si eme, ma ọ na-eme eme!”

Ma è nwere ihe na-akpata obi ji ajọ gị njọ ma ọ bụ na e nweghị ihe na-akpata ya, gịnị ka i nwere ike ime ma obi jọwa gị njọ?

Nke Mbụ: Kọọrọ ya onye ọzọ. Baịbụl sịrị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.”—Ilu 17:17.

Kellie: “Ọ na-atụ m n’anya otú obi si eru m ala ma m kọchaara onye ọzọ otú obi dị m. Ugbu a, onye ọzọ amatala ihe mụ na ya na-alụ. M na-ewere ya na e nweela onye ga-eji ụdọ dọpụta m n’olulu m dabara na ya!”

Aro: N’okpuru ebe a, dee aha otu “ezi enyi” gị i nwere ike ịkọrọ otú obi dị gị ma obi jọwa gị njọ.

․․․․․

Nke Abụọ: Detuo otú obi dị gị. Ọ bụrụ na obi na-ajọ gị njọ na-eme ka ike ụwa gwụ gị, gbalịa detuo otú obi dị gị n’akwụkwọ. N’Abụ Ọma ndị Devid dere n’ike mmụọ nsọ, o nwere oge ndị o dere otú obi dị ya mgbe obi na-ajọ ya njọ. (Abụ Ọma 6:6) Idetu otú obi dị gị ga-enyere gị aka ‘ichekwa ezi amamihe na ikike iche echiche.’—Ilu 3:21.

Heather: “Idetu otú obi dị m na-enyere m aka ịkpakọ uche m ọnụ, n’ihi na obi ahụ na-ajọ m njọ mere ka m chewe ọtụtụ ihe. Mgbe i detuchara otú obi dị gị ma nwee ike ịghọta ihe na-eme obi ji ajọ gị njọ, obi ahụ na-ajọ gị njọ ga-akwụsịtụ.”

Aro: Ụfọdụ ndị na-ekpebi inwe akwụkwọ ebe ha ga na-edetu otú obi dị ha. Ọ bụrụ na i kpebie ịna-ede ya, gịnị na gịnị ka i nwere ike idenye n’akwụkwọ ahụ? Mgbe obi na-ajọ gị njọ, detuo otú ahụ obi dị gị n’akwụkwọ nakwa ihe i chere kpatara ya. Otu ọnwa gaa, gụọ ihe ahụ i dere. Ihe ahụ mere obi ji na-ajọ gị njọ ọ̀ kwụsịla ime ka obi na-ajọ gị njọ? Ọ bụrụ na ọ kwụsịla, dee ihe nyeere gị aka.

Nke Atọ: Rịọ Chineke ka o nyere gị aka. Baịbụl kwuru na i kpee ekpere banyere ihe na-enye gị nsogbu n’obi, ‘udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi gị na ike iche echiche gị nche.’—Ndị Filipaị 4:7.

Esther: “Agbalịrị m ịchọpụta ihe mere obi ji ajọkarị m njọ, ma o kweghị m. Arịọrọ m Jehova ka o nyere m aka inwe obi ụtọ. Obi ịna-ajọ m njọ mgbe a na-enweghị ihe m ma kpatara ya agwụla m ike. Ekpere ahụ m kpere nyere aka mee ka obi kwụsị ịna-ajọ m njọ. Eledakwala ekpere anya!”

Aro: Gụọ Abụ Ọma 139:23, 24 ma hụ otú i nwere ike isi kpegara Jehova ekpere. Gwa Jehova otú obi dị gị, rịọkwa ya ka o nyere gị aka ịchọpụta ihe na-akpata obi ji ajọ gị njọ.

Ihe ọzọkwa nwere ike inyere gị aka bụ ndụmọdụ bara uru ndị dị n’Okwu Chineke. (Abụ Ọma 119:105) Ị na-agụkarị okwu ndị na-agba ume e kwuru na Baịbụl, o nwere ike inyere gị aka ịna-eche echiche dị mma, mee ka obi dị gị mma, àgwà ị ga na-akpa adịkwa mma. (Abụ Ọma 1:1-3) E nwere akụkọ ndị na-agba ume, ndị na-emekwa mmadụ obi ụtọ, a kọrọ n’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi. Ebe ọzọ ị ga-enweta ihe ga-enyere gị aka ịma ebe ị ga-agụta ihe ndị ga-agba gị ume na Baịbụl bụ n’isiokwu bụ́ “Onye M Ga-eṅomi,” nke dị ụzọ itoolu n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2, nke Ndịàmà Jehova bipụtara. Ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha n’isiokwu ahụ bụ Josef, Hezekaya, Lidia, na Devid. Na peeji nke 227, ị ga-agụtadị na e nwere oge ihe ndị Pọl onyeozi na-anaghị emete mere ka obi na-ajọ ya njọ, gụtakwa otú o si merie nsogbu ahụ.

Ma ọ́ bụrụkwanụ na mbọ niile ị gbara emeghị ka obi kwụsị ịjọ gị njọ?

Ihe Ị Ga-eme ma Obi Na-ajọ Gị Njọ Ekweghị Akwụsị

Ryan kwuru, sị: “O nwere ụtụtụ ụfọdụ m ga-eteta ụra, ọ naghị agụ m isi n’ebe m dina bilie, ọ na-adị m ka o nweghị uru ndụ m dị baara m.” Obi jọwa Ryan njọ, ọ na-adịte aka. Ụdị obi ịjọ njọ a bụ ọrịa, e nwekwara ọtụtụ ndị na-arịa ya. Nchọpụta e mere gosiri na n’ime ndị na-eto eto anọ ọ bụla, ihe dị ka otu onye n’ime ha na-enwe ụdị obi ịjọ njọ nke na-adịte aka tupu ha eruo ogo mmadụ.

Olee otú ị ga-esi mara ma obi na-ajọ gị njọ ọ̀ bụ nke ọrịa? Ihe ụfọdụ e ji ama onye nke ya bụ ọrịa bụ na àgwà onye ahụ ga-agbanwe, ọ ga na-ewekarịzi iwe, na-achọkarịzi ịnọrọ onwe ya, ọ gaghị na-enwezi mmasị n’ọtụtụ ihe ndị ọ na-emebu, ọ gaghị na-erizi nri otú o si eribu ma na-ehi ụra otú o si ehibu, obi ya ga na-amakarị ya ikpe ma ọ bụ ya ana-echekarị na o nweghị uru ya bara.

Nke bụ́ eziokwu bụ na a na-enwe mgbe otu ma ọ bụ ihe karịrị otu n’ime ihe ndị a a kpọrọ aha na-eme ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ anyị niile. Ma ọ bụrụ na izu ole na ole agaa, ihe ahụ na-eme gị akwụsịghị, ọ ga-adị mma ma ị gwa ndị mụrụ gị na ị ga-achọ ịhụ dọkịta. Dọkịta nweziri ike inyere gị aka ịchọpụta ma obi ahụ na-ajọ gị njọ ọ̀ bụ nke ọrịa. *

Ọ bụrụ na obi na-ajọ gị njọ na-adịte aka, o nwere ike ịbụ nke ọrịa. I kwesịghịkwa imewe ihere na i nwere nsogbu a. Ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa a enwetawala onwe ha kemgbe ha gaara ya ụlọ ọgwụ. N’ihi ya, ma obi na-ajọ gị njọ ọ̀ bụ nke nkịtị ma ọ bụ nke ọrịa, cheta okwu a na-akasi obi e dere n’Abụ Ọma 34:18. Ebe ahụ sị: “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.”

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 23 Obi ịjọ njọ nke na-adịte aka na-eme ka ụfọdụ ndị na-eto eto chewe echiche igbu onwe ha. Ọ bụrụ na e nwetụla mgbe i chere echiche igbu onwe gị, egbula oge ịkọrọ ya otu onye toro eto, bụ́ onye ị tụkwasịrị obi.—Gụọ Teta! nke Julaị–Septemba 2008, peeji nke 16-18.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

È nwere uru dị n’ibepụ ákwá?

“Mgbe mbụ, ọ na-esiri m ike ibe ákwá, ma ugbu a, achọpụtala m na ibe ákwá na-enyere m aka mgbe ọ bụla obi jọwara m njọ. M bee ákwá, ọ na-adị m ka è buturu m ibu arọ m bu. Ana m ebido iche echiche otú dị mma, obi na-esikwa m ike na ihe ga-emecha dị mma.”—Leanne.

Olee otú ndị ọzọ nwere ike isi nyere gị aka idi obi na-ajọkarị gị njọ?

“Mgbe ọ bụla obi jọwara m njọ, ana m agbalị ka naanị m ghara ịnọ. Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, o nwere ike dị mkpa na m ga-anọ naanị m, chebara ihe mere obi ji na-ajọ m njọ echiche, eleghịkwa anya bee ezigbo ákwá. E mechazie, ama m na ọ dị mkpa ka m nọrọ ebe ndị mmadụ nọ n’ihi na ọ ga-enyere m aka iwepụ obi m n’ihe ọ bụla na-eme obi ji na-ajọ m njọ.”—Christine.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 13]

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

“Obi na-ajọkarị m njọ mgbe ọ bụla m chewere naanị banyere onwe m. N’ihi ya, mgbe ọ bụla m nyeere ndị ọzọ aka, ana m akwụsị iche banyere onwe m, nke ahụ na-emekwa ka obi kwụsị ịjọ m njọ.”

“Obi anaghị ajọkarị m njọ mgbe m na-emega ahụ́ ma na-emechi ya anya, n’ihi na ọ na-eme ka ihe banyere onwe m na-eme m obi ụtọ. M megachaa ahụ́, ike na-agwụ m nke na m na-echefuzi na obi na-ajọ m njọ!”

[Foto]

Drenelle

Rebekah

[Foto dị na peeji nke 14]

Obi ịjọ mmadụ njọ dị ka olulu. Ọ bụrụ na mmadụ enyere gị aka, gịnwa agbalịsiekwa ike, i nwere ike isi na ya pụta