Ihe Ezinụlọ Ga-atụle
Ihe Ezinụlọ Ga-atụle
Olee Ndị Rụrụ Ọrụ A?
1. Olee ndị ọkụ azụ̀ abụọ bụ́ ụmụ Zebedi, bụrụkwa ndịozi Jizọs?
Dee azịza ya n’okpuru ebe a.
IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Matiu 4:21, 22.
․․․․․
2. Gịnị bụ aha ndịozi abụọ ọzọ bụ́kwa ndị ọkụ azụ̀?
IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Matiu 4:18.
․․․․․
IHE A GA-EKWURỊTA:
Gịnị mere Jizọs ji kwuo na ndị na-eso ụzọ ya ga-abụ “ndị na-akụta mmadụ”? (Matiu 4:19) Olee otú ịkụ azụ̀ na ịkụta mmadụ si yie, oleekwa ihe dị iche na ha abụọ?
GỊNỊ KA Ị MA BANYERE ANDRU ONYEOZI?
3. Tupu Andru aghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs, ònye ka ọ bụ onye na-eso ụzọ ya?
IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Mak 1:4; Jọn 1:35-40.
․․․․․
4. Ònye ka Andru kọọrọ banyere Jizọs, gịnịkwa mechara mee?
IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Jọn 1:40-42.
․․․․․
IHE A GA-EKWURỊTA:
Gịnị mere o ji dị mma ịkọrọ ndị ikwu gị ihe ị ma banyere Jizọs? Ma, olee otú ụfọdụ ndị ikwu gị nwere ike isi were ihe ị kọọrọ ha?
IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ Matiu 10:32-37.
SITE NA MAGAZIN A
Zaa ajụjụ ndị a, ma denye amaokwu Baịbụl ndị na-adịghị na ya.
PEEJI NKE 3 Gịnị ka onye nwere uche na-eme? Ilu 14:․․․
PEEJI NKE 8 Olee aha Chineke nyere onwe ya? Aịzaya 42:․․․
PEEJI NKE 18 Gịnị ka “iwe iwe na-akpata”? Ilu 30:․․․
PEEJI NKE 22 Gịnị ka e mere ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi? Jud:․․․
AZỊZA
1. Jems na Jọn.
2. Pita na Andru.
3. Jọn onye na-eme Baptizim.
4. Nwanne ya bụ́ Pita, o mechakwara ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs.