Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ị Ka Nwere Obi Ụtọ”

“Ị Ka Nwere Obi Ụtọ”

“Ị Ka Nwere Obi Ụtọ”

● Camila na-arịa ọrịa na-eme ka ọbara na-akọ ya n’ahụ́, ka akwara ndị dị n’ahụ́ ya ghara ịrụ ọrụ nke ọma, nakwa ka ọ ghara ito nke ọma. Nke a mere ka ọ dị naanị sentimita iri asaa na ise n’ogologo n’agbanyeghị na ọ dị afọ asatọ. Nne na nna Camila, bụ́ Ndịàmà Jehova, kpebiri ịkpọ ya gaa n’otu nnọkọ ndị ọrụ ahụ́ ike haziri n’otu ebe a na-anọ eme ihe nkiri n’obodo ha bụ́ Ajentina. Ha nọ n’ebe ihu, ndị bịakwara ebe ahụ dị narị ise.

Mgbe otu dọkịta na-ekwu okwu, ọ tụrụ Camila aka mgbe ọ na-akọwa otú onye nwere ezigbo ahụ́ ike kwesịrị ịdị. Ebe ọ bụ na ọ maghị ihe ọ bụla banyere ọrịa Camila na afọ ole ọ dị, ọ jụrụ mama ya, sị: “Afọ ole ka nwa a dị?”

Marisa bụ́ mama Camila, sịrị: “Ọ dị afọ asatọ.”

Dọkịta ahụ jụrụ ya, sị: “Ị̀ sị ọnwa asatọ?”

Marisa sịrị ya, “Ee e, afọ asatọ.”

Ihe a ọ zara juru dọkịta ahụ anya. Ọ gwaziri mama Camila ka ya na nwa ya gbagote n’elu ebe ọ nọ na-ekwu okwu ka ọ jụọ ya ajụjụ ụfọdụ. Mgbe Marisa kọchara otú ndị dọkịta sirila lebara Camila anya na ụzọ dị iche iche ha gbalịrịla isi gwọọ ya, dọkịta ahụ sịrị: “E nwere ọtụtụ ndị nne ọ na-abụ ụmụ ha nwee obere ahụ́ ọkụ ha ebewe ákwá. Ma kemgbe afọ asaa a gwọwara Camila, e meekwala ihe niile e nwere ike imere ya, ị ka nwere obi ụtọ. Gịnị nyeere gị aka inwe obi ụtọ?”

Marisa gwaziri ndị ahụ gbakọtara ebe ahụ na ihe mere ya ji enwe obi ụtọ bụ n’ihi olileanya ya nwere ná nkwa Chineke kwere na Baịbụl, nke bụ́ na oge na-abịa mgbe ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa ọhụrụ nke ọrịa, ahụhụ na ọnwụ na-agaghị adị. (Aịzaya 33:24; Mkpughe 21:3, 4) N’ikpeazụ, Marisa kọwara otú Ndịàmà Jehova n’ụwa niile si dịrị n’otu nakwa otú ịhụnanya ha nwere n’etiti onwe ha si enyere ha aka idi nsogbu na ihe isi ike ndị ha na-enwe ná ndụ.—Jọn 13:35.

Mgbe a gbasara nnọkọ ahụ, otu nwaanyị bịakwutere Marisa ma rịọ ya ka ọ kọwakwuoro ya ihe ndị ahụ o kwuru. Ebe ọ bụ na nwaanyị ahụ nwere mmasị ịmụ Baịbụl, o kwetara ka a bịa n’ụlọ ya mụwara ya Baịbụl n’efu. N’ụwa niile, Ndịàmà Jehova na-agwa ndị ji obi ha niile chọọ ịghọta ihe Baịbụl na-akụzi, nakwa ndị chọrọ ịma ihe ndị magburu onwe ha Chineke ga-emere ụmụ mmadụ, ka ha mụwara ha Baịbụl.

[Foto dị na peeji nke 25]

Marisa na nwa ya bụ́ Camila, onye dị afọ asatọ