Ọ Mụtara Ihe Otú Ha Si Mụta
Ọ Mụtara Ihe Otú Ha Si Mụta
● Otu nwaanyị nke gaferela afọ iri atọ, onye ya na di ya na ụmụ ya atọ bi n’obodo Kentọki, nke dị n’Amerịka dere, sị, “Mụ na ndị ezinụlọ m eritela nnukwu uru n’akwụkwọ niile Ndịàmà Jehova nyere anyị.” Ọ sịrị: “Nke kacha atọ m ụtọ iji kụziere ụmụ m ihe bụ Akwụkwọ M nke Akụkọ Baịbụl. Ana m amụta ihe mgbe ọ bụla m ji ya akụziri ha ihe.”
E sere ọtụtụ ihe ndị mara mma n’akwụkwọ a, a kọkwara akụkọ Baịbụl ndị a kọrọ na ya otú ha si mee. Dị ka ihe atụ, ná nkebi nke 2, akụkọ ndị so na ya bụ: “Eze Ọjọọ Amalite Ịchị Ijipt,” “Ụzọ E Si Zọpụta Nwa Ọhụrụ Bụ́ Mozis,” “Ihe Mere Mozis Ji Gbaa Ọsọ,” “Mozis na Erọn Ejee Ịhụ Fero,” “Ihe Otiti Iri Ahụ,” na “Ịgafe Oké Osimiri Uhie.”
Ná nkebi nke 6 n’akwụkwọ ahụ, nke isiokwu ya bụ “Site n’Ọmụmụ Jizọs Ruo n’Ọnwụ Ya,” e nwere ọtụtụ akụkọ ndị a kọrọ banyere ndụ Jizọs, malite mgbe a mụrụ ya ruo mgbe ọ nwụrụ. Ụfọdụ n’ime akụkọ ndị dị na ya bụ, “A Mụọ Jizọs n’Ụlọ Anụ” na “Ndị Ikom Otu Kpakpando Duziri.” Isiokwu nke ikpeazụ a kwuru na ndị na-akọwa kpakpando, ndị a na-akpọkwa “ndị amamihe,” letara Jizọs mgbe ọ nọ “n’ime ụlọ” ọ bụghị mgbe ọ nọ n’ụlọ anụ ebe a nọ mụọ ya. Mgbe ha batara n’ụlọ ahụ, ha “hụrụ nwata ahụ ka ya na nne ya Marịa nọ.” Chineke gwaziri ụmụ nwoke a ka ha ghara ịlaghachi na nke Herọd, n’ihi na ọ chọrọ igbu Jizọs. Gịnị ka nke a na-agwa anyị banyere onye mere ka kpakpando ahụ pụta?—Matiu 2:1, 11, 12, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.
I nwekwara ike iso ụmụ gị mụta ihe mgbe ị na-agụ akwụkwọ ahụ bụ́ Akwụkwọ M nke Akụkọ Baịbụl. Akụkọ dị na ya dị otu narị na iri na isii. Ha bụkwa akụkọ banyere ndị mmadụ na ihe ndị mere eme a kọrọ na Baịbụl. Ọ bụrụ na ị chọrọ inweta akwụkwọ a, biko gwa Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ka Onyeàmà Jehova bịa na nke gị, biko dọkapụta ala ala peeji a ma dejupụta ya. I dejupụtachaa ya, jiri adres dị ebe ahụ zite ya ma ọ bụkwanụ adres nke kwesịrị ekwesị dị na peeji nke 5 na magazin a.
□ Biko, wetara m otu akwụkwọ a e sere n’ebe a.
Dee asụsụ ị chọrọ ya.
□ Biko, bịanụ n’ụlọ m kụziere m Baịbụl n’efu.